Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

Nke A Ọ̀ Bụ Ihe Chineke Zubere?

Nke A Ọ̀ Bụ Ihe Chineke Zubere?

Ọ BỤRỤ na ị gụọ akwụkwọ akụkọ, ma ọ bụ kirie televishọn, ma ọ bụ gee redio, ị ga-achọpụta na akụkọ banyere mpụ, agha, na iyi ọha egwu jupụtara na ha! Chegodị echiche banyere nsogbu ndị nke i nwere. Ma eleghị anya, ọrịa ma ọ bụ ọnwụ nke onye ị hụrụ n’anya na-egbu gị mgbu n’obi. Ị pụrụ inwe mmetụta yiri nke ezi mmadụ ahụ́ bụ́ Job, bụ́ onye sịrị na ‘ahụhụ juru ya afọ.’—Job 10:15.

Jụọ onwe gị, sị:

  • Nke a ọ̀ bụ ihe Chineke zubere maka m nakwa maka ihe nile a kpọrọ mmadụ?
  • Olee ebe m pụrụ inweta enyemaka iji nagide nsogbu m nile?
  • È nwere olileanya na ọ dị mgbe anyị ga-enwe udo n’ụwa?

Bible na-aza ajụjụ ndị a n’ụzọ na-eju afọ.

BIBLE NA-AKỤZI NA CHINEKE GA-EME KA E NWEE MGBANWE NDỊ A N’ỤWA.

Nwoke mere agadi bụzi okorobịa

“Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.”—Mkpughe 21:4.


Nwata nwaanyị dara ngwọrọ nke na-agbazi ọsọ

“Onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele.”—Aịsaịa 35:6


Nwoke kpuru ìsì nke na-ahụzi ụzọ

“A ga-emeghe anya ndị ìsì.” —Aịsaịa 35:5.


Nwaanyị nke na-aṅụrị ọṅụ ịhụ onye ọ hụrụ n’anya a kpọlitere n’ọnwụ

‘Ndị nile nọ n’ili ncheta ga-apụta.’—Jọn 5:28, 29


Nwa okoro nke gbakere n’ọrịa ya

“Onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.”—Aịsaịa 33:24.


Ubi ọka

“Ọtụtụ ọka [ga-adị] n’ala.”—Abụ Ọma 72:16.


RITE URU N’IHE NDỊ BIBLE NA-AKỤZI

Ụmụ nwoke abụọ na-amụ Baịbụl

Adịla ngwa iwere ihe ndị a dị ka nanị nrọ efu. Chineke ekwewo nkwa ime ihe ndị a, Bible na-akọwakwa otú ọ ga-esi mee ha.

Ma Bible na-eme ihe karịrị nke ahụ. Ọ na-ekwu ihe ga-enyere gị aka ibi ndụ na-eju afọ n’ezie ọbụna ugbu a. Chetụdị banyere nchegbu na nsogbu ndị i nwere. Ha pụrụ ịgụnye nsogbu ego, nsogbu ezinụlọ, ahụ́ adịghị ike, ma ọ bụ ọnwụ nke onye ị hụrụ n’anya. Bible pụrụ inyere gị aka ịnagide nsogbu taa, ọ pụkwara iwetara gị nkasi obi site n’ịza ajụjụ ndị dị ka ndị a

  • N’ihi gịnị ka anyị ji ata ahụhụ?
  • Olee otú anyị pụrụ isi nagide nchegbu nke ndụ?
  • Olee otú anyị pụrụ isi mee ka ndụ ezinụlọ anyị bụrụ nke na-enye obi ụtọ karị?
  • Gịnị na-eme anyị mgbe anyị nwụrụ?
  • Ànyị ga-ahụ ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ọzọ?
  • Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na Chineke ga-emezu nkwa ya maka ọdịnihu?

Ọgụgụ ị na-agụ akwụkwọ a gosiri na ọ ga-amasị gị ịmata ihe Bible na-akụzi. Akwụkwọ a ga-enyere gị aka. Ị ga-ahụ na paragraf nke ọ bụla nwere ajụjụ ya na ya kwekọrọ n’ala ala peeji. Ọ masịwo ọtụtụ nde mmadụ iji ajụjụ na azịza eme ihe mgbe ha na Ndịàmà Jehova na-ekwurịta banyere Bible. Anyị nwere olileanya na ọ ga-amasịkwa gị. Ka Chineke gọzie gị ka ị na-enwe ahụmahụ na-akpali akpali ugbu a na nke na-enye afọ ojuju nke ịmụta ihe Bible na-akụzi n’ezie!

MARA BIBLE GỊ

Bible

Ọ BỤ akwụkwọ 66 mejupụtara Bible. Akwụkwọ ndị a nwegasịrị isi na amaokwu dị iche iche maka ịchọta ihe na ha ngwa ngwa. Mgbe e zoro aka n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ n’akwụkwọ a, nọmba nke mbụ bụ isi nke akwụkwọ Bible, nke na-esokwa ya bụ amaokwu. Dị ka ihe atụ, “2 Timoti 3:16” pụtara akwụkwọ ozi nke abụọ e degaara Timoti, isi 3, amaokwu nke 16.

Ị ga-ama Bible ngwa ngwa site n’ịgụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha n’akwụkwọ a. Ọzọkwa, gịnị ma ị malite ịgụ Bible kwa ụbọchị? Site n’ịgụ isiakwụkwọ atọ ruo ise n’otu ụbọchị, ị pụrụ ịgụcha Bible n’otu afọ.

GỤKWUO GBASARA YA

Olee Otú Anyị na Ndị Mmadụ Si Amụ Baịbụl?

A ma Ndịàmà Jehova ama n’ụwa niile na ha na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl n’anaghị ha ego. Lee otú ha si eme ya.