Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

ISI NKE IRI

Ndị Mmụọ E Kere Eke—Otú Ha Si Emetụta Anyị

Ndị Mmụọ E Kere Eke—Otú Ha Si Emetụta Anyị

Ndị mmụọ ozi hà na-enyere mmadụ aka?

Olee otú ndị ajọ mmụọ siworo metụta ndị mmadụ?

Ànyị kwesịrị ịtụ ndị ajọ mmụọ egwu?

ỊMATA mmadụ na-agụnyekarị ịmata banyere ezinụlọ ya. N’otu aka ahụ, ịmata Jehova Chineke na-agụnye ịmatakwu banyere ezinụlọ ya nke ndị mmụọ ozi mejupụtara. Bible na-akpọ ndị mmụọ ozi “ụmụ Chineke.” (Job 38:7) N’ihi ya, òkè dị aṅaa ka ha na-ekere n’imezu nzube Chineke? Ọ̀ dịwo mgbe ha keere òkè n’ihe omume nke mmadụ? Ndị mmụọ ozi hà na-emetụta ndụ gị? Ya bụrụ otú ahụ, ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa?

2 Bible zoro aka n’ebe ndị mmụọ ozi nọ ọtụtụ narị ugboro. Ka anyị tụlee ole na ole n’ime ebe ndị ahụ e zoro aka na ha iji mụtakwuo banyere ndị mmụọ ozi. Olee otú ndị mmụọ ozi si malite? Ndị Kọlọsi 1:16 na-ekwu, sị: “E sitere n’aka ya [Jizọs Kraịst] kee ihe ndị ọzọ nile n’eluigwe na n’elu ụwa.” N’ihi ya, Jehova Chineke sitere n’aka Ọkpara ya kee nke ọ bụla n’ime ndị nile bụ́ mmụọ, bụ́ ndị a na-akpọ ndị mmụọ ozi. Ole ka ndị mmụọ ozi dị? Bible na-egosi na e kere ọtụtụ narị nde ndị mmụọ ozi, ha nile dịchakwa ike.—Abụ Ọma 103:20.*

3 Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-agwa anyị na mgbe a tọrọ ntọala ụwa, ‘ụmụ Chineke nile tisiri mkpu ọṅụ ike.’ (Job 38:4-7) N’ihi ya, ndị mmụọ ozi adịwala adị ogologo oge tupu e kee mmadụ, ọbụna tupu e kee ụwa. Akụkụ Bible a na-egosikwa na ndị mmụọ ozi na-enwe mmetụta, n’ihi na o kwuru na ha ‘na-etikọ mkpu ọṅụ.’ Rịba ama na ‘ụmụ Chineke nile’ ṅụrịkọrọ ọṅụ. N’oge ahụ, ndị mmụọ ozi nile so n’ezinụlọ dị n’otu nke na-ejere Jehova Chineke ozi.

NKWADO NA NCHEBE NKE NDỊ MMỤỌ OZI NA-ENYE

Mmụọ ozi na-eche Daniel nche n’olulu ọdụm

“Chineke m ezitewo mmụọ ozi Ya, wee kpuchite ọnụ ọdụm ndị a.”—Daniel 6:22

4 Kemgbe ahụ ha hụsịrị ka e kere mmadụ abụọ mbụ ahụ, ndị mmụọ e kere eke na-ekwesị ntụkwasị obi egosiwo nnọọ mmasị n’ebe ezinụlọ mmadụ nke na-amụba amụba nọ nakwa ná mmezu nke nzube Chineke. (Ilu 8:30, 31; 1 Pita 1:11, 12) Otú ọ dị, ka oge na-aga, ndị mmụọ ozi ahụ hụrụ na ihe ka ọtụtụ n’ezinụlọ mmadụ kwụsịrị ijere Onye kere ha nke na-ahụ n’anya ozi. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke ahụ wutere ndị mmụọ ozi ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi. N’aka nke ọzọ, mgbe ọ bụla ọbụna otu onye laghachikwutere Jehova, “ọṅụ na-adị n’etiti ndị mmụọ ozi.” (Luk 15:10) Ebe ọ bụ na ndị mmụọ ozi nwere nchegbu miri emi otú ahụ maka ọdịmma nke ndị na-ejere Chineke ozi, ọ bụghị ihe ijuanya na Jehova ezigawo ndị mmụọ ozi ugboro ugboro ichebe ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi nọ n’ụwa, nakwa iwusi ha ike. (Ndị Hibru 1:7, 14) Tụlee ihe atụ ụfọdụ.

5 Ndị mmụọ ozi abụọ nyeere nwoke ezi omume ahụ bụ́ Lọt na ụmụ ya ndị nwanyị aka ịlanarị mbibi nke ajọ obodo ndị ahụ bụ́ Sọdọm na Gọmọra site n’isi ebe ahụ dupụta ha. (Jenesis 19:15, 16) Ka ọtụtụ narị afọ gasịrị, a tụbara Daniel onye amụma n’olulu ọdụm, ma ọkọ akọghị ya, o kwukwara, sị: “Chineke m ezitewo mmụọ ozi Ya, wee kpuchite ọnụ ọdụm ndị a.” (Daniel 6:22) Na narị afọ mbụ nke O.A., otu mmụọ ozi tọhapụrụ Pita onyeozi n’ụlọ mkpọrọ. (Ọrụ 12:6-11) Ọzọkwa, ndị mmụọ ozi wusiri Jizọs ike ná mmalite nke ozi elu ala ya. (Mak 1:13) Nwa obere oge kwa tupu Jizọs anwụọ, otu mmụọ ozi bịakwutere ya ma “mee ka ọ dị ike.” (Luk 22:43) Lee ihe na-akasi obi ọ na-aghaghị ịbụworo Jizọs n’oge ndị ahụ dị oké mkpa ná ndụ ya!

6 Taa, ndị mmụọ ozi adịghịzi abịakwute ndị Chineke nọ n’ụwa n’ụzọ a na-ahụ anya. N’agbanyeghị na mmadụ apụghị ịhụ ha, ndị mmụọ ozi Chineke, bụ́ ndị dị ike, ka na-echebe ndị ya, karịsịa pụọ n’ihe ọ bụla pụrụ imerụ ha ahụ́ n’ụzọ ime mmụọ. Bible na-ekwu, sị: “Mmụọ ozi nke Jehova na-ama ụlọikwuu ya gburugburu ndị na-atụ egwu Ya, o wee dọpụta ha.” (Abụ Ọma 34:7) N’ihi gịnị ka okwu ahụ kwesịrị iji mee ka anyị kuda nnọọ ume? Ọ bụ n’ihi na e nwere ndị mmụọ e kere eke dị ize ndụ bụ́ ndị na-achọ ibibi anyị! Ole ndị ka ha bụ? Olee otú ha si malite? N’ụzọ dị aṅaa ka ha si agbalị imerụ anyị ahụ́? Iji nweta azịza ha, ka anyị tụlee ná mkpirikpi ihe mere ná mmalite akụkọ ihe mere eme nke mmadụ.

NDỊ MMỤỌ E KERE EKE NDỊ BỤ́ NDỊ IRO ANYỊ

7 Dị ka anyị hụworo n’Isi nke 3 n’akwụkwọ a, otu n’ime ndị mmụọ ozi zụlitere ọchịchọ ịchị ndị ọzọ ma si otú ahụ nupụrụ Chineke isi. Ka e mesịrị, mmụọ ozi a ghọrọ onye a maara dị ka Setan bụ́ Ekwensu. (Mkpughe 12:9) Ka ọ na-erula na narị afọ nke 16, mgbe Setan duhiesịrị Iv, Setan nwere ihe ịga nke ọma n’ime ka ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile gbakụta Chineke azụ, e wezụga mmadụ ole na ole kwesịrị ntụkwasị obi, ndị dị ka Ebel, Ịnọk, na Noa.—Ndị Hibru 11:4, 5, 7.

8 N’oge Noa, ndị mmụọ ozi ndị ọzọ nupụụrụ Jehova isi. Ha hapụrụ ebe ha nọ n’ezinụlọ eluigwe nke Chineke, gbadata n’ụwa, ma nwoghara ahụ́ mmadụ. N’ihi gịnị? Anyị na-agụ na Jenesis 6:2, sị: “Ụmụ ndị ikom nke Chineke hụrụ ụmụ ndị inyom nke mmadụ na ha mara mma; ha wee lụtara onwe ha ndị inyom site ná ndị nile ha họpụtara.” Ma Jehova Chineke ekweghị ka omume ndị mmụọ ozi a nakwa arụrụala nke ihe a kpọrọ mmadụ mụtara n’aka ha, dịgide. O wetara iju mmiri zuru ụwa ọnụ ma kpochapụ ndị ajọ omume nile, o chebekwara nanị ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi. (Jenesis 7:17, 23) N’ihi ya, a manyere ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi, ma ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ, ịgbahapụ anụ ahụ́ ha ma laghachi n’eluigwe dị ka ndị mmụọ e kere eke. Ha dụnyeere Ekwensu úkwù, bụ́ onye ghọrọ “onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ.”—Matiu 9:34.

9 Mgbe ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi laghachiri eluigwe, e mesoro ha dị ka ndị a jụrụ ajụ, dị nnọọ ka e mesoro onye na-achị ha, bụ́ Setan. (2 Pita 2:4) Ọ bụ ezie na ha apụghịzi inwoghara ahụ́ mmadụ, ha ka na-akpa ike n’ebe ụmụ mmadụ nọ. N’eziokwu, site n’enyemaka nke ndị mmụọ ọjọọ a, Setan “na-eduhie ụwa dum mmadụ bi.” (Mkpughe 12:9; 1 Jọn 5:19) N’ụzọ dị aṅaa? N’ụzọ bụ́ isi, ndị mmụọ ọjọọ na-eji ụzọ ndị ha chere ga-agara ha nke ọma eme ihe iji duhie ndị mmadụ. (2 Ndị Kọrint 2:11) Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ụzọ ndị a.

OTÚ NDỊ MMỤỌ ỌJỌỌ NA-ESI EDUHIE NDỊ MMADỤ

10 Ndị mmụọ ọjọọ na-eji mgbaasị eme ihe iji duhie ndị mmadụ. Mgbaasị bụ iso ndị mmụọ ọjọọ na-emekọ ihe kpọmkwem ma ọ bụkwanụ iso ha na-emekọ ihe site n’aka ndị na-ajụ mmụọ ase. Bible na-akatọ mgbaasị ma na-adọ anyị aka ná ntị isepụ aka n’ihe ọ bụla gbasara ya. (Ndị Galeshia 5:19-21) Mgbaasị na-emere ndị mmụọ ọjọọ ihe ihe ụrà na-emere onye ọ́kụ̀ azụ̀. Onye ọ́kụ̀ azụ̀ na-eji ihe ụrà dị iche iche eme ihe iji gbute ụdị azụ̀ dị iche iche. N’otu aka ahụ, ndị ajọ mmụọ na-eji ụdị mgbaasị dị iche iche eme ihe iji na-achịkwa ụdị mmadụ dị iche iche.

1. Chaatị zodịak; 2. Ịgụ akara aka; 3. Nkume kristal; 4. Nwoke na-agụ kaadị mgbaasị

Ndị mmụọ ọjọọ na-eji ụzọ dị iche iche eme ihe iji duhie ndị mmadụ

11 Otu n’ime ihe ụrà ndị ndị mmụọ ọjọọ na-eji eme ihe bụ ịgba afa. Gịnị bụ ịgba afa? Ọ bụ ịnwa ịmata banyere ọdịnihu ma ọ bụ banyere ihe a na-amaghị ama. Ụdị ụfọdụ nke ịgba afa bụ ịgụ kpakpando, ịgụ akara aka, ime anwansi, ize nrọ. Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị na-eche na ịgba afa adịghị emerụ ahụ́, Bible na-egosi na ndị dibịa afa na ndị ajọ mmụọ na-arụkọ ọrụ. Dị ka ihe atụ, Ọrụ Ndị Ozi 16:16-18 kwuru banyere “mmụọ ọjọọ nke a na-ajụta ase,” bụ́ nke nyeere otu nwa agbọghọ aka “ịkọ ọdịnihu.” Ma, ọ pụghịzi ime otú ahụ mgbe a chụpụrụ mmụọ ọjọọ n’ime ya.

12 Ụzọ ọzọ ndị mmụọ ọjọọ na-esi eduhie ndị mmadụ bụ site n’ịgba ha ume ịjụ ndị nwụrụ anwụ ihe. A na-ejikarị echiche na-ezighị ezi banyere ndị nwụrụ anwụ eduhie ndị na-eru újú ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ anwụ. Dibịa afa pụrụ inye ihe ọmụma pụrụ iche ma ọ bụ jiri olu yiri nke onye ahụ nwụrụ anwụ kwuo okwu. N’ihi ya, ọtụtụ ndị na-ekwenyesi ike na ndị nwụrụ anwụ dị ndụ n’ezie nakwa na ịjụ ha ihe ga-enyere ndị dị ndụ aka ịnagide mwute ha na-enwe. Ma “nkasi obi” ọ bụla e si otú ahụ nweta abụghị ezigbo ya, ọ dịkwa ize ndụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ndị mmụọ ọjọọ pụrụ iṅomi olu onye nwụrụ anwụ ma nye dibịa afa ihe ọmụma banyere onye ahụ nwụrụ anwụ. (1 Samuel 28:3-19) Ọzọkwa, dị ka anyị hụrụ n’Isi nke 6 n’akwụkwọ a, ndị nwụrụ anwụ akwụsịwo ịdị adị. (Abụ Ọma 115:17) N’ihi ya, “onye na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ihe” bụ onye ndị ajọ mmụọ duhieworo, ọ na-emekwa ihe megidere uche Chineke. (Deuterọnọmi 18:10, 11; Aịsaịa 8:19) N’ihi ya, mụrụ anya ka i wee nwee ike ịjụ ihe ụrà a dị ize ndụ nke ndị mmụọ ọjọọ na-eji eme ihe.

13 Ọ bụghị nanị na ndị ajọ mmụọ na-eduhie ndị mmadụ kamakwa ha na-emenye ha egwu. Taa, Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya maara na ọ fọdụrụ nanị “oge dị mkpirikpi” ka a kwụsị ha ịkpa ike, ha dịkwa obi ọjọọ ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. (Mkpughe 12:12, 17) N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ puku ndị na-atụbu ndị ajọ mmụọ dị otú ahụ egwu kwa ụbọchị enwerewo onwe ha. Olee otú ha si mee nke ahụ? Gịnị ka mmadụ pụrụ ime ọbụna ma ọ bụrụ na o tinyeworị aka ná mgbaasị?

ỤZỌ ISI NA-EGUZOGIDE NDỊ AJỌ MMỤỌ

14 Bible na-agwa anyị otú anyị pụrụ isi guzogide ndị ajọ mmụọ nakwa otú anyị pụrụ isi nwere onwe anyị pụọ n’aka ha. Tụlee ihe atụ nke Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ bụ́ ndị nọ n’obodo Efesọs. Ụfọdụ n’ime ha na-eme mgbaasị tupu ha aghọọ Ndị Kraịst. Mgbe ha kpebiri ịkwụsị mgbaasị, gịnị ka ha mere? Bible na-ekwu, sị: “Ọnụ ọgụgụ dịtụ ukwuu nke ndị na-eme majik chịkọtara akwụkwọ ha ma kpọọ ha ọkụ n’ihu mmadụ nile.” (Ọrụ 19:19) Site n’ibibi akwụkwọ majik ha, ndị ahụ ghọrọ Ndị Kraịst ọhụrụ setịpụụrụ ndị chọrọ iguzogide ndị ajọ mmụọ taa ihe nlereanya. Ọ dị mkpa ka ndị chọrọ ijere Jehova ozi bibie ihe nile metụtara mgbaasị. Nke ahụ na-agụnye akwụkwọ, magazin, vidio, akwụkwọ ịma ọkwa, na egwú ndị e tinyere na teepu, bụ́ ndị na-akwado mgbaasị ma na-eme ka o yie ihe dị mma ma na-akpali mmasị. Ha ga-ebibikwa ọtụmọkpọ ma ọ bụ ihe ndị ọzọ ha ji echebe onwe ha.—1 Ndị Kọrint 10:21.

ỤZỌ ISI GUZOGIDE NDỊ AJỌ MMỤỌ

  • Bibisịa ihe ndị metụtara mgbaasị
  • Na-amụ Bible
  • Na-ekpegakwara Chineke ekpere
Nwoke na-eme ihe ndị ga-enyere ya aka ịhapụ mgbaasị

15 Afọ ole na ole mgbe Ndị Kraịst nọ n’Efesọs bibisịrị akwụkwọ majik ha, Pọl onyeozi deere ha akwụkwọ, sị: “Anyị nwere mgba…megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ.” (Ndị Efesọs 6:12) Ndị mmụọ ọjọọ ahụ ezughị ike. Ha ka nọ na-anwa inwe mmeri. N’ihi ya, olee ihe ọzọ dị mkpa ka Ndị Kraịst ahụ mee? “Karịsịa ihe nile,” ka Pọl kwuru, “burunụ ọta ukwu bụ́ okwukwe, bụ́ nke unu ga-eji nwee ike imenyụ akụ́ ụta nile na-ere ọkụ nke ajọ onye ahụ [Setan].” (Ndị Efesọs 6:16) Ka ọta nke okwukwe anyị na-esiwanye ike, otú ahụ ka anyị ga-enwekwu ike iguzogidesi ìgwè ndị mmụọ ọjọọ ike.—Matiu 17:20.

16 Oleezi otú anyị pụrụ isi mee ka okwukwe anyị siwanye ike? Ọ bụ site n’ịmụ Bible. Mgbidi na-esi ike ma ọ bụrụ na ntọala ya siri ike. N’otu aka ahụ, okwukwe anyị ịbụ nke siri ike na-adabere n’ụzọ dị ukwu n’otú ntọala ya, bụ́ ezi ihe ọmụma nke Okwu Chineke, bụ́ Bible, siruru ike. Ọ bụrụ na anyị na-agụ ma na-amụ Bible kwa ụbọchị, okwukwe anyị ga-esi ike. Dị ka mgbidi siri ike, okwukwe dị otú ahụ ga-echebe anyị pụọ n’aka ndị ajọ mmụọ.—1 Jọn 5:5.

17 Olee ihe ọzọ ọ dị mkpa ka Ndị Kraịst ahụ nọ n’Efesọs mee? Ọ dị mkpa ka ha nwetakwuo nchebe ebe ọ bụ na ha bi n’obodo nke ofufe ndị mmụọ ọjọọ jupụtara. N’ihi ya, Pọl gwara ha, sị: ‘Jirinụ ụdị ọ bụla nke ikpe ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na-anọgide n’ekpere n’oge nile n’ime mmụọ nsọ.’ (Ndị Efesọs 6:18) Ebe ọ bụ na anyị onwe anyị kwa bi n’ụwa nke ofufe ndị mmụọ ọjọọ jupụtara, ikpegara Jehova ekpere n’ụzọ siri ike maka nchebe ya dị oké mkpa iji guzogide ndị ajọ mmụọ. N’ezie, ọ dị mkpa ka anyị jiri aha Jehova na-eme ihe n’ekpere anyị. (Ilu 18:10) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịnọgide na-arịọ Chineke n’ekpere ka ọ “gbapụta anyị n’aka ajọ onye ahụ,” bụ́ Setan Ekwensu. (Matiu 6:13) Jehova ga-aza ekpere ndị dị otú ahụ e kpesiri ike.—Abụ Ọma 145:19.

18 Ndị ajọ mmụọ dị ize ndụ, ma anyị ekwesịghị ịtụ ha egwu ma ọ bụrụ na anyị na-eguzogide Ekwensu ma na-abịaru Chineke nso site n’ime uche Ya. (Jems 4:7, 8) A kpara ike nke ndị ajọ mmụọ ókè. E nyere ha ahụhụ n’oge Noa, a ga-ekpekwa ha ikpe nke ikpeazụ n’ọdịnihu. (Jud 6) Chetakwa na ndị mmụọ ozi Jehova, bụ́ ndị dị ike, na-echebe anyị. (2 Ndị Eze 6:15-17) Ndị mmụọ ozi a nwere nnọọ mmasị ịhụ ka anyị nwere ihe ịga nke ọma n’iguzogide ndị ajọ mmụọ. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ndị mmụọ ozi ezi omume a na-aja anyị ike. N’ihi ya, ka anyị nọrọ Jehova na ezinụlọ ya nke ndị mmụọ e kere eke na-ekwesị ntụkwasị obi nso. Ka anyị zerekwa ụdị nile nke mgbaasị, na-etinyekwa ndụmọdụ nke Okwu Chineke n’ọrụ mgbe nile. (1 Pita 5:6, 7; 2 Pita 2:9) Mgbe ahụ, anyị ga-ejide n’aka na anyị ga-emeri n’ọgụ anyị na-alụso ndị ajọ mmụọ.

19 Ma n’ihi gịnị ka Chineke jiworo kwe ka ndị ajọ mmụọ na mmebi iwu, bụ́ ndị kpatawooro ndị mmadụ oké nhụjuanya, dịgide? A ga-aza ajụjụ ahụ n’isiakwụkwọ na-esonụ.

IHE BIBLE NA-AKỤZI

  • Ndị mmụọ ozi na-ekwesị ntụkwasị obi na-enyere ndị na-ejere Jehova ozi aka. —Ndị Hibru 1:7, 14.
  • Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-eduhie ndị mmadụ ma na-eme ka ha gbakụta Chineke azụ.—Mkpughe 12:9.
  • Ọ bụrụ na i mee uche Chineke ma guzogide Ekwensu, Setan ga-agbapụkwa n’ebe ị nọ.—Jems 4:7, 8.

*  Mkpughe 5:11 na-ekwu banyere ndị mmụọ ozi, bụ́ ndị ezi omume, sị: “Ọnụ ọgụgụ ha dịkwa ọtụtụ iri puku ụzọ ọtụtụ iri puku.” N’ihi ya, Bible na-egosi na e kere ọtụtụ narị nde ndị mmụọ ozi eke.


Ajụjụ nke Paragraf Ndị A Na-Amụ Amụ

1. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji chọọ ịmụta banyere ndị mmụọ ozi?

2. Olee otú ndị mmụọ ozi si malite, ole ka ha dịkwa?

3. Gịnị ka Job 38:4-7 na-agwa anyị banyere ndị mmụọ ozi?

4. Olee otú Bible si gosi na ndị mmụọ ozi na-ekwesị ntụkwasị obi nwere mmasị n’ihe ndị ụmụ mmadụ na-eme?

5. Olee ihe atụ ndị dị na Bible bụ́ ndị na-egosi mgbe ndị mmụọ ozi kwadoro ndị ohu Chineke?

6. (a) Olee otú ndị mmụọ ozi si echebe ndị Chineke taa? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa ka anyị ga-atụle ugbu a?

7. Ruo ókè hà aṅaa ka Setan nwere ihe ịga nke ọma n’ime ka ndị mmadụ gbakụta Chineke azụ?

8. (a) Olee otú ụfọdụ ndị mmụọ ozi si ghọọ ndị mmụọ ọjọọ? (b) Iji lanarị Iju Mmiri nke oge Noa, gịnị ka ndị mmụọ ọjọọ ahụ mere?

9. (a) Gịnị mere ndị mmụọ ọjọọ ahụ mgbe ha laghachiri n’eluigwe? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle banyere ndị mmụọ ọjọọ?

10. Gịnị bụ mgbaasị?

11. Gịnị bụ ịgba afa, n’ihi gịnịkwa ka anyị kwesịrị iji zere ya?

12. N’ihi gịnị ka o ji dị ize ndụ ịgbalị ịjụ ndị nwụrụ anwụ ihe?

13. Gịnị ka ọtụtụ ndị bụ́ ndị na-atụbu ndị mmụọ ọjọọ egwu meworo?

14. Dị ka Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ nọ n’Efesọs, olee otú anyị pụrụ isi nwere onwe anyị pụọ n’aka ndị ajọ mmụọ?

15. Iji guzogide ndị ajọ mmụọ, olee ihe ọ dị mkpa ka anyị mee?

16. Olee otú anyị pụrụ isi mee ka okwukwe anyị siwanye ike?

17. Gịnị ka e kwesịrị ime iji guzogide ndị ajọ mmụọ?

18, 19. (a) N’ihi gịnị ka anyị ga-eji jide n’aka na anyị ga-enwe mmeri n’ọgụ anyị na-alụso ndị ajọ mmụọ? (b) Ajụjụ dị aṅaa ka a ga-aza n’isiakwụkwọ na-esonụ?