Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

ISI NKE IRI NA ITOOLU

Nọgide n’Ịhụnanya Chineke

Nọgide n’Ịhụnanya Chineke

Gịnị ka ịhụ Chineke n’anya pụtara?

Olee otú anyị pụrụ isi nọgide n’ịhụnanya Chineke?

Gịnị ka Jehova ga-eji kwụọ ndị nọgidere n’ịhụnanya ya ụgwọ?

KA E were ya na ị na-aga n’okporo ụzọ n’ụbọchị oké ifufe na-efe. Ihu igwe agbajie. Àmụ̀mà ana-egbu, égbè eluigwe ana-agba, ka a na-ekwu, mmiri adọbiri zowe. Ị gasiwe ike, na-achọ nnọọ ebe ị ga-agbaba. Ka a na-eme, lekwa ebe mgbaba dị n’akụkụ ụzọ ahụ. E wusiri ya ike, ọ dị kọrọ kọrọ, ma dị mma ọnụnọ. Lee nnọọ ụdị ekele ị ga-enwe maka ebe ahụ dị nchebe!

Nwoke na-eze oké ifufe na-efe

Ị̀ ga-eme Jehova ebe mgbaba gị n’oge ọgba aghara ndị a?

2 Anyị na-ebi n’oge ọgba aghara. Ọnọdụ ụwa na-ajọwanye njọ. Ma, e nwere ebe mgbaba nke pụrụ ime ka anyị ghara inwe mmerụ ahụ́ na-adịgide adịgide. Gịnị ka ọ bụ? Rịba ama ihe Bible na-akụzi: “M ga-asị Jehova, Ị bụ ebe mgbaba m na ebe m e wusiri ike; Ị bụ Chineke m, Onye m na-atụkwasị obi.”—Abụ Ọma 91:2.

3 Cheedị banyere nke ahụ! Jehova, bụ́ Onye Okike na Eze eluigwe na ala, bụ ebe anyị pụrụ ịgbaba ma nweta nchebe. Ọ pụrụ ichebe anyị, n’ihi na ọ ka nnọọ onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla pụrụ imerụ anyị ahụ́ ike. Ọ bụrụgodị na e merụọ anyị ahụ́, Jehova pụrụ idozi nsogbu nile a kpataara anyị. Olee otú anyị pụrụ isi mee Jehova ebe mgbaba anyị? Ọ dị mkpa ka anyị tụkwasị ya obi. Ọzọkwa, Okwu Chineke na-agba anyị ume, sị: “Debenụ onwe unu n’ịhụnanya Chineke.” (Jud 21) Ee, ọ dị mkpa ka anyị nọgide n’ịhụnanya Chineke, na-eme ka anyị na Nna anyị nke eluigwe nọgide na-enwe nkekọ ịhụnanya. Nke ahụ ga-eme ka anyị nwee obi ike na ọ bụ ebe mgbaba anyị. Ma, olee otú anyị na ya pụrụ isi nwee nkekọ dị otú ahụ?

NABATA MA GOSI EKELE MAKA ỊHỤNANYA CHINEKE

4 Iji nọgide n’ịhụnanya Chineke, ọ dị mkpa ka anyị mata otú Jehova siworo gosipụta ịhụnanya ya n’ebe anyị nọ. Cheedị banyere ozizi ụfọdụ nke Bible bụ́ ndị ị mụtaworo n’akwụkwọ a. Dị ka Onye Okike, Jehova enyewo anyị ụwa ịbụ ebe obibi anyị mara mma. O mewo ka ihe oriri na mmiri, akụ̀ ndị sitere n’okike, anụmanụ ndị na-adọrọ mmasị, na ebe ndị mara mma, jupụta na ya. Dị ka onye chepụtara Bible, Chineke emewo ka anyị mata aha na àgwà ya. Ọzọkwa, Okwu ya na-eme ka anyị mata na o zitere Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya n’ụwa, wee kwe ka Jizọs taa ahụhụ ma nwụọ n’ihi anyị. (Jọn 3:16) Uru dị aṅaa ka onyinye ahụ baara anyị? Ọ na-eme ka anyị nwee olileanya maka ọdịnihu magburu onwe ya.

5 Olileanya anyị nwere maka ọdịnihu na-adaberekwa n’ihe ọzọ Chineke meworo. Jehova eguzobewo ọchịchị eluigwe, bụ́ Alaeze Mezaịa. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-eme ka nhụjuanya nile kwụsị, ọ ga-emekwa ka ụwa ghọọ Paradaịs. Chegodị banyere nke ahụ! Anyị ga-ebi n’ime ya n’udo nakwa n’obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 37:29) Ka ọ dịgodị, Chineke egosiwo anyị ụzọ kasị mma isi bie ndụ ugbu a. O nyewokwa anyị ihe ùgwù nke ikpe ekpere, bụ́ nke ga-eme ka anyị na-agwa ya okwu n’enweghị ihe mgbochi. Ndị a bụ nanị ụzọ ole na ole Jehova siworo gosipụta ịhụnanya ya n’ebe ihe nile a kpọrọ mmadụ nakwa gị onwe gị nọ.

6 Ajụjụ dị mkpa ị ga-atụle bụ: Olee otú m ga-esi gosi ekele maka ịhụnanya Jehova? Ọtụtụ ndị ga-asị, “Ihe m ga-eme bụ ịhụ Jehova n’anya dị ka ọ hụrụ m.” Ọ̀ bụ otú ahụ ka i si ele ya anya? Jizọs kwuru na iwu a bụ iwu kachasị iwu nile: “Ị ghaghị iji obi gị dum, jirikwa mkpụrụ obi gị dum, jirikwa uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Matiu 22:37) N’ezie, i nwere ọtụtụ ihe mere ị ga-eji hụ Jehova Chineke n’anya. Ma inwe mmetụta na i nwere ịhụnanya dị otú ahụ ọ̀ bụ nanị ihe na-egosi na i ji obi gị dum, uche gị dum, mkpụrụ obi gị dum, hụ Jehova n’anya?

Mkpụrụ osisi apụl

7 Dị ka a kọwara na Bible, ịhụ Chineke n’anya ebighị nanị n’inwe mmetụta. Ọ bụ ezie na inwe mmetụta ịhụnanya n’ebe Jehova nọ dị oké mkpa, mmetụta dị otú ahụ bụ nanị mmalite nke inwe ezi ịhụnanya n’ebe ọ nọ. Mkpụrụ apụl dị mkpa iji nwee osisi apụl. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ị chọrọ ịta apụl, ị̀ ga-enwe afọ ojuju ma ọ bụrụ na mmadụ enye gị nanị mkpụrụ apụl? Mbanụ! N’otu aka ahụ, inwe mmetụta ịhụnanya n’ebe Jehova Chineke nọ bụ nanị mmalite nke inwe ezi ịhụnanya n’ebe ọ nọ. Bible na-akụzi, sị: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị debe ihe ndị o nyere n’iwu; ma ihe ndị o nyere n’iwu adịghịkwa arọ.” (1 Jọn 5:3) Ịhụnanya mmadụ nwere n’ebe Chineke nọ aghaghị ịmịpụta ezi mkpụrụ tupu a mara na ọ bụ nke ezigbo ya. A ghaghị igosipụta ya n’omume.—Matiu 7:16-20.

8 Anyị na-egosipụta ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ mgbe anyị debere ihe ndị o nyere n’iwu ma gbasoo ụkpụrụ ya. Ime nke ahụ esibigaghị ike ókè. Kama ịbụ ibu arọ, e mere iwu Jehova otú ọ ga-enyere anyị aka ibi ndụ dị mma, nke na-enye obi ụtọ na afọ ojuju. (Aịsaịa 48:17, 18) Site n’ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nduzi Jehova, anyị na-egosi Nna anyị nke eluigwe na anyị nwere ekele n’ezie maka ihe nile o mewooro anyị. Ọ dịkwa mwute na ọ bụ mmadụ ole na ole n’ụwa taa na-egosi ekele dị otú ahụ. Anyị ekwesịghị ịbụ ndị na-enweghị ekele, dị ka ụfọdụ ndị dịrị ndụ mgbe Jizọs nọ n’ụwa. Jizọs gwọrọ ndị ekpenta iri, ma ọ bụ nanị otu laghachiri wee kelee ya. (Luk 17:12-17) N’ezie, anyị kwesịrị ịdị ka otu ahụ nke nwere ekele, ọ bụghị dị ka mmadụ itoolu ahụ na-enweghị ekele!

9 Gịnịkwanụ bụ ihe ndị Jehova nyere n’iwu, bụ́ ndị anyị kwesịrị idebe? Anyị atụlewo ọtụtụ n’ime ha n’akwụkwọ a, ma ka anyị tụleghachi ole na ole n’ime ha. Idebe ihe ndị Chineke nyere n’iwu ga-enyere anyị aka ịnọgide n’ịhụnanya Chineke.

NA-ABỊARU NNỌỌ JEHOVA NSO

10 Ịmata banyere Jehova bụ otu ihe dị oké mkpa a ga-eme iji bịaruo ya nso. Ọ bụ ihe e kwesịrị ịnọgide na-eme. Ọ bụrụ na ị nọ n’ézì na-anya ọkụ n’abalị oyi na-atụsi ike, ị̀ ga-ekwe ka ọkụ ahụ nyụọ? Ee e. Ị ga-anọgide na-akwanye ya nkụ ka ọkụ ahụ nọgide na-enwu. Nke ahụ pụrụ nnọọ ịbụ ihe ga-edebe gị ndụ! Dị ka nkụ na-eme ka ọkụ nọgide na-enwu, otú ahụ ka “ihe ọmụma Chineke” na-eme ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ na-esiwanye ike.—Ilu 2:1-5.

Dị nnọọ ka ọkụ, ịhụnanya i nwere n’ebe Jehova nọ chọrọ ihe ga-eme ka ọ nọgide na-enwu

Nwoke na-aṅa ọkụ

11 Jizọs chọrọ ka ụmụazụ ya nọgide na-enwe nnọọ ịhụnanya n’ebe Jehova nọ, na-enwekwa nnọọ mmasị n’Okwu ya dị oké ọnụ ahịa, nke bụ́kwa eziokwu. Mgbe a kpọlitesịrị Jizọs n’ọnwụ, ọ kụziiri mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya banyere ụfọdụ n’ime amụma ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, bụ́ ndị mezuru n’ebe ọ nọ. Mmetụta dị aṅaa ka o nwere n’ahụ́ ha? Mgbe nke ahụ gasịrị, ha kwuru, sị: “Ọ̀ bụ na obi ekporoghị anyị ọkụ ka ọ nọ na-agwa anyị okwu n’okporo ụzọ, ka ọ nọ na-emepere anyị Akwụkwọ Nsọ nke ọma?”—Luk 24:32.

12 Mgbe mbụ ị mụtara ihe ndị Bible na-akụzi n’ezie, ị̀ chọpụtara na ị malitere inwe obi ụtọ, ịnụ ọkụ n’obi, nakwa ịhụnanya n’ebe Chineke nọ? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na i mere otú ahụ. Ọtụtụ ndị emewokwa otú ahụ. Ihe bụ́ isiokwu ugbu a bụ ịnọgide na-enwe ịhụnanya siri ike nakwa ịghara ikwe ka ọ jụọ oyi. Anyị ekwesịghị iṅomi omume nke ụwa dị ugbu a. Jizọs buru amụma, sị: “Ịhụnanya nke ndị ka n’ọnụ ọgụgụ ga-ajụkwa oyi.” (Matiu 24:12) Olee otú ị pụrụ isi mee ka ịhụnanya i nwere n’ebe Jehova nọ na mmasị i nwere n’eziokwu nke Bible ghara ịjụ oyi?

13 Nọgide na-enweta ihe ọmụma banyere Jehova Chineke na Jizọs Kraịst. (Jọn 17:3) Na-atụgharị uche, ma ọ bụ na-echebara ihe ndị ị na-amụta n’Okwu Chineke echiche, ma jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị ka nke a na-akụziri m banyere Jehova Chineke? Olee ihe ọzọ ọ na-agwa m nke mere m ga-eji jiri obi m dum, uche m dum, mkpụrụ obi m dum, hụ Jehova n’anya?’ (1 Timoti 4:15) Ntụgharị uche dị otú ahụ ga-eme ka ị nọgide na-enwe nnọọ ịhụnanya n’ebe Jehova nọ.

14 Ụzọ ọzọ ị ga-esi mee ka ịhụnanya i nwere n’ebe Jehova nọ dịgide bụ site n’ịdị na-ekpe ekpere mgbe nile. (1 Ndị Tesalonaịka 5:17) N’Isi nke 17 nke akwụkwọ a, anyị mụtara na ekpere bụ onyinye dị oké ọnụ ahịa nke sitere n’aka Chineke. Dị nnọọ ka mmadụ na ibe ya na-enwe mmekọrịta chiri anya ma ọ bụrụ na ha na-enwe nkwurịta okwu mgbe nile n’enweghị ihe mgbochi, otú ahụ ka mmekọrịta anyị na Jehova ga-anọgide na-echi anya ma ọ bụrụ na anyị na-ekpegara ya ekpere mgbe nile. Ọ dị mkpa ka anyị ghara ikwe ka ekpere anyị ghọọ ihe e bu n’isi—okwu ndị anyị na-ekwukarị, bụ́ ndị anyị na-agụ ka egwú, ndị na-esighị anyị n’ala ala obi. Anyị kwesịrị ịdị na-agwa Jehova okwu dị ka nwatakịrị na-esi agwa nna ya ọ hụrụ n’anya okwu. Otú ọ dị, anyị kwesịrị imepe obi anyị ma jiri nkwanye ùgwù na-agwa ya okwu n’enweghị ihe mgbochi ọ bụla. (Abụ Ọma 62:8) Ee, ọmụmụ Bible onwe onye na ekpere sitere n’ala ala obi bụ akụkụ ndị dị oké mkpa nke ofufe anyị, ha na-enyekwara anyị aka ịnọgide n’ịhụnanya Chineke.

NWETA OBI ỤTỌ N’OFUFE Ị NA-EFE JEHOVA

15 Ọmụmụ Bible onwe onye na ekpere bụ ofufe anyị pụrụ inye ọbụna mgbe anyị nọ nanị anyị. Otú ọ dị, ka anyị tụlee otu akụkụ nke ofufe, bụ́ nke anyị na-enye n’ihu ọha: ịgwa ndị ọzọ banyere ihe ndị anyị kweere. Ị̀ malitewo ịkụziri ndị ọzọ eziokwu Bible? Ya bụrụ otú ahụ, i nwere ihe ùgwù magburu onwe ya. (Luk 1:74) Mgbe anyị na-akụziri ndị ọzọ ihe ndị bụ́ eziokwu anyị mụtara banyere Jehova Chineke, anyị na-arụ otu ọrụ dị oké mkpa e nyere ezi Ndị Kraịst nile—ikwusa oziọma nke Alaeze Chineke.—Matiu 24:14; 28:19, 20.

16 Pọl onyeozi lere ozi ya anya dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa, ọ kpọkwara ya akụ̀. (2 Ndị Kọrint 4:7) Ịgwa ndị mmadụ banyere Jehova Chineke na nzube ya bụ ọrụ kasị mma ị pụrụ ịrụ. Ọ bụ ozi anyị na-ejere Onyenwenụ kasịnụ, ọ na-ewetakwa ụgwọ ọrụ kasịnụ. Site n’ikere òkè n’ọrụ a, ị na-enyere ndị nwere obi eziokwu aka ịbịaru Nna anyị nke eluigwe nso na ịbata n’ụzọ ahụ na-eduga ná ndụ ebighị ebi! Ọ̀ dị ọrụ pụrụ inye afọ ojuju karịa ya? Ọzọkwa, ịgba àmà banyere Jehova na Okwu ya na-eme ka okwukwe na ịhụnanya i nwere n’ebe ọ nọ sikwuo ike. Jehova na-enwekwa ekele maka mgbalị ndị ị na-eme. (Ndị Hibru 6:10) Iji ịdị uchu na-arụ ọrụ dị otú ahụ ga-enyere gị aka ịnọgide n’ịhụnanya Chineke.—1 Ndị Kọrint 15:58.

17 Ọ dị mkpa ka anyị cheta na ọrụ nkwusa Alaeze ahụ dị oké mkpa. Bible na-ekwu, sị: “Kwusaa okwu ahụ, nọgidesie ike na ya.” (2 Timoti 4:2) N’ihi gịnị ka ime nke a ji dị oké mkpa taa? Okwu Chineke na-agwa anyị, sị: “Oké ụbọchị Jehova dị nso, ọ dị nso, ọ na-emekwa ngwa nke ukwuu.” (Zefanaịa 1:14) Ee, oge eruwela mgbe Jehova ga-eweta usoro ihe a nile ná njedebe. Ọ dị mkpa ka a dọọ ndị mmadụ aka ná ntị! Ọ dị mkpa ka ha mata na ugbu a bụ oge ha ga-ahọrọ Jehova dị ka Eze ha. Ọgwụgwụ ‘agaghị anọ ọdụ.’—Habakuk 2:3.

18 Jehova chọrọ ka anyị soro ezi Ndị Kraịst na-efe ya ofufe n’ihu ọha. Ọ bụ ya mere Okwu ya ji sị: “Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ, ghara ịdị na-ahapụ nzukọ nke anyị onwe anyị, dị ka ọ bụ omenala ụfọdụ ndị, kama ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume, na-emekwa otú ahụ karị ka unu na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.” (Ndị Hibru 10:24, 25) Mgbe anyị sooro ndị kwere ekwe ibe anyị nọkọọ ná nzukọ Ndị Kraịst, ọ na-abụ ohere magburu onwe ya ito na ife Chineke anyị hụrụ n’anya. Anyị na-ewulikwa ibe anyị elu ma na-agba ibe anyị ume.

19 Ka anyị na-eso ndị ọzọ na-efe Jehova na-akpakọrịta, anyị na-ewusi nkekọ nke ịhụnanya na ọbụbụenyi dị n’ọgbakọ ike. Ọ dị mkpa ka anyị na-ahụ ebe ibe anyị na-eme nke ọma, dị ka Jehova na-ahụ ebe anyị onwe anyị na-eme nke ọma. Atụla anya na ndị kwere ekwe ibe gị ga-emetacha ihe nile. Cheta na anyị nile na-eto n’ọ̀tụ̀tụ̀ dịgasị iche iche n’ụzọ ime mmụọ nakwa na onye ọ bụla n’ime anyị na-emehie ihe. (Ndị Kọlọsi 3:13) Na-agbalị isoro ndị hụrụ nnọọ Jehova n’anya na-akpakọrịta n’ụzọ chiri anya, ị ga-ahụkwa na ị ga na-eto eto n’ụzọ ime mmụọ. Ee, isoro ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ime mmụọ gị na-efe Jehova ofufe ga-enyere gị aka ịnọgide n’ịhụnanya Chineke. Olee otú Jehova na-esi agọzi ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe ya ofufe ma si otú ahụ nọgide n’ịhụnanya ya?

GBALỊA INWETA “NDỤ AHỤ NKE BỤ́ NDỤ N’EZIE”

20 Jehova ga-eji ndụ kwụọ ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi ụgwọ, ma olee ụdị ndụ ọ bụ? Ọ dị mma, ndụ ị dị ugbu a ọ̀ bụ ndụ n’ezie? Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị pụrụ ịsị na azịza ya doro anya. A sị kwuwe, anyị na-eku ume, na-eri nri, na-aṅụ ihe ọṅụṅụ. N’ezie, anyị dị ndụ. Mgbe ọ bụla anyị nwere obi ụtọ, anyị pụrụ ọbụna ikwu, sị: “Nke a bụ ezi ndụ!” Otú ọ dị, Bible na-egosi na ọ dịghị mmadụ ọ bụla taa dị ezi ndụ ma e si n’otu ụzọ dị mkpa lee ya anya.

Ezinụlọ obi dị ụtọ na paradaịs

Jehova chọrọ ka i nweta “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.” Ị̀ ga-enweta ya?

21 Okwu Chineke na-agba anyị ume ‘ijidesi aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.’ (1 Timoti 6:19) Okwu ndị ahụ na-egosi na “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie” bụ ihe anyị na-atụ anya inweta n’ọdịnihu. Ee, mgbe anyị zuru okè, anyị ga-adị ndụ n’ụzọ kwekọrọ nnọọ n’ihe okwu ahụ pụtara, n’ihi na anyị ga-adị ndụ dị ka Chineke zubere ka anyị dịrị na mbụ. Mgbe anyị ga-ebi na paradaịs elu ala n’ahụ́ ike zuru okè, n’udo, nakwa n’obi ụtọ, “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie”—ndụ ebighị ebi—ga-abụzi nke anyị. (1 Timoti 6:12) Nke ahụ ọ́ bụghị olileanya magburu onwe ya?

22 Olee otú anyị pụrụ isi “jidesie aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie”? Ka Pọl na-ekwu okwu n’otu isiokwu ahụ, ọ gbara Ndị Kraịst ume, “ịrụ ọrụ ọma” na ‘ịba ọgaranya n’ezi ọrụ.’ (1 Timoti 6:18) Ya mere, n’ụzọ doro anya, ọ dabeere n’ụzọ dị ukwuu n’otú anyị si etinye eziokwu ndị anyị mụtaworo n’ime Bible n’ọrụ. Ma Pọl ọ̀ na-ekwu na anyị na-arụta “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie” n’ọrụ ọma? Ee e, n’ihi na atụmanya dị otú ahụ magburu onwe ya dabeere nnọọ na Chineke igosi anyị ‘obiọma na-erughịrị mmadụ.’ (Ndị Rom 5:15) Otú ọ dị, Jehova na-enwe obi ụtọ ịkwụ ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere ya ozi ụgwọ. Ọ chọrọ ịhụ ka ị na-ebi “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.” Ndị nọgidere n’ịhụnanya Chineke ga-enweta ndụ ebighị ebi dị otú ahụ, nke na-eme ka e nwee obi ụtọ na ahụ́ iru ala.

23 Onye ọ bụla n’ime anyị ga-eme nke ọma ịjụ onwe ya, sị, ‘Àna m efe Chineke n’ụzọ o kwuru na Bible?’ Ọ bụrụ na anyị agbalịsie ike ịhụ na azịza ya nọgidere na-abụ ee kwa ụbọchị, mgbe ahụ anyị na-eme ihe anyị kwesịrị ime. Anyị pụrụ inwe obi ike na Jehova bụ ebe mgbaba anyị. Ọ ga-echebe ndị ya na-ekwesị ntụkwasị obi gabiga ụbọchị ikpeazụ nke usoro ihe ochie a. Jehova ga-akpọbatakwa anyị n’usoro ihe ọhụrụ dị ebube nke dị nso ugbu a. Lee ka anyị ga-esi nwee obi ụtọ ịnọ ya mgbe oge ahụ ga-abịa! Lee ka anyị ga-esi nwee obi ụtọ na anyị mere nhọrọ ziri ezi n’ụbọchị ikpeazụ ndị a! Ọ bụrụ na i mee nhọrọ ndị dị otú ahụ ugbu a, ị ga-enweta “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie,” bụ́ ndụ nke dị otú Jehova Chineke zubere ka ọ dị, ruo mgbe nile ebighị ebi!

IHE BIBLE NA-AKỤZI

  • Anyị na-egosipụta ezi ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ site n’idebe ihe ndị o nyere n’iwu na ịgbaso ụkpụrụ ya.—1 Jọn 5:3.
  • Ịmụ Okwu Chineke, iji obi anyị dum na-ekpegara Jehova ekpere, ịkụziri ndị ọzọ banyere ya, na ife ya ofufe ná nzukọ Ndị Kraịst, ga-enyere anyị aka ịnọgide n’ịhụnanya Chineke.—Matiu 24:14; 28:19, 20; Jọn 17:3; 1 Ndị Tesalonaịka 5:17; Ndị Hibru 10:24, 25.
  • Ndị na-anọgide n’ịhụnanya Chineke nwere olileanya nke inweta “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.”—1 Timoti 6:12, 19; Jud 21.

Ajụjụ nke Paragraf Ndị A Na-Amụ Amụ

1, 2. Olee ebe anyị pụrụ ịgbaba ma nweta nchebe taa?

3. Olee otú anyị pụrụ isi mee Jehova ebe mgbaba anyị?

4, 5. Olee ụzọ ụfọdụ Jehova siworo gosipụta ịhụnanya ya n’ebe anyị nọ?

6. Olee otú ị pụrụ isi nabata ịhụnanya Jehova gosiworo gị?

7. Ọ̀ dị ihe ọzọ ịhụ Chineke n’anya gụnyere ma e wezụga inwe mmetụta? Kọwaa.

8, 9. Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta ịhụnanya na ekele anyị nwere n’ebe Chineke nọ?

10. Kọwaa ihe mere o ji dị mkpa ịnọgide na-enweta ihe ọmụma banyere Jehova Chineke.

11. Mmetụta dị aṅaa ka ozizi Jizọs nwere n’ahụ́ ụmụazụ ya?

12, 13. (a) Gịnị na-eme ịhụnanya nke ihe ka ọtụtụ n’ihe a kpọrọ mmadụ taa nwere n’ebe Chineke nọ nakwa mmasị ha nwere n’ebe Bible dị? (b) Olee otú anyị pụrụ isi mee ka ịhụnanya anyị ghara ịjụ oyi?

14. Olee otú ekpere pụrụ isi nyere anyị aka ịnọgide na-ahụ Jehova n’anya?

15, 16. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji zie ezi ile ọrụ nkwusa Alaeze ahụ anya dị ka ihe ùgwù na akụ̀?

17. N’ihi gịnị ka ozi Ndị Kraịst ji dị oké mkpa taa?

18. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị isoro ezi Ndị Kraịst na-efe Jehova n’ihu ọha?

19. Olee otú anyị pụrụ isi mee ka nkekọ ịhụnanya dị n’ọgbakọ Ndị Kraịst sikwuo ike?

20, 21. Gịnị bụ “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie,” n’ihi gịnịkwa ka o ji bụrụ olileanya magburu onwe ya?

22. Olee otú ị pụrụ isi “jidesie aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie”?

23. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịnọgide n’ịhụnanya Chineke?

GỤKWUO GBASARA YA

Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị?

Baịbụl na-enyere ọtụtụ ndị aka ịmata azịza ajụjụ ndị dị ezigbo mkpa. Ị̀ ga-achọ ka Baịbụl nyere gị aka?