Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

IHE ODIDE NTụKWASị

Jizọs Kraịst—Mezaịa ahụ E Kwere ná Nkwa

Jizọs Kraịst—Mezaịa ahụ E Kwere ná Nkwa

IJI nyere anyị aka ịmata onye bụ Mezaịa ahụ, Jehova Chineke kpaliri ọtụtụ ndị amụma nke Bible ikwu ihe ụfọdụ banyere ọmụmụ, ozi, na ọnwụ nke Onye Nnapụta a e kwere ná nkwa. Amụma ndị a nile nke Bible mezuru n’ebe Jizọs Kraịst nọ. Ha na-enye nnọọ ihe ọmụma zuru ezu ma zie ezi. Iji maa atụ, ka anyị tụlee amụma ole na ole ndị kwuru banyere ihe ndị ga-eme n’oge ọmụmụ nke Mezaịa ahụ nakwa n’oge ọ bụ nwata.

Aịzaịa onye amụma buru amụma na Mezaịa ahụ ga-esite n’eriri Eze Devid. (Aịsaịa 9:7) N’ezie, Jizọs si n’usoro ọmụmụ Devid.—Matiu 1:1, 6-17.

Maịka, bụ́ onye amụma ọzọ nke Chineke, buru amụma na nwa a ga-emesị ghọọ onye ọchịchị nakwa na a ga-amụ ya na “Betlehem Efrata.” (Maịka 5:2) N’oge a mụrụ Jizọs, e nwere obodo abụọ a na-akpọ Betlehem. Otu dị nso na Nazaret n’akụkụ ebe ugwu nke mba ahụ, nke ọzọ dịdebekwara Jeruselem nke dị na Juda. Ihe a na-akpọbu Betlehem nke dịdebere Jeruselem bụ Efrata. A mụrụ Jizọs n’obodo ahụ, kpọmkwem dị ka amụma ahụ si kwuo!—Matiu 2:1.

Amụma ọzọ nke Bible kwuru na ‘a ga-akpọpụta Ọkpara Chineke n’Ijipt.’ A kpọọrọ nwa ahụ bụ́ Jizọs gaa Ijipt. A kpọlatara ya mgbe Herọd nwụsịrị, wee si otú ahụ mezuo amụma ahụ.—Hosea 11:1; Matiu 2:15.

Na chaatị bụ́ [“Amụma Ndị E Buru Banyere Mezaịa Ahụ”], akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e depụtara n’okpuru okwu bụ́ “Amụma,” na-enye ihe ọmụma banyere Mezaịa ahụ. Biko jiri akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a tụnyere akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e depụtara n’okpuru okwu bụ́ “Mmezu Ya.” Ime otú ahụ ga-eme ka i kwenyesikwuo ike na Okwu Chineke bụ eziokwu.

Ka ị na-agụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a, buru n’uche na e deturu ụfọdụ n’ime ha ndị bụ́ amụma ọtụtụ narị afọ tupu a mụọ Jizọs. Jizọs kwuru, sị: “Ihe nile e dere n’iwu Mozis na n’akwụkwọ ndị amụma na Abụ Ọma banyere m aghaghị imezu.” (Luk 24:44) Dị ka Bible na-egosi n’ụzọ doro anya, ha mezuru n’ezie—n’ụzọ zuru ezu!

AMỤMA NDỊ E BURU BANYERE MEZAỊA AHỤ
IHE MERENỤ AMỤMA MMEZU YA
A mụrụ ya n’ebo Juda Jenesis 49:10 Luk 3:23-33
Nwa agbọghọ na-amaghị nwoke mụrụ ya Aịsaịa 7:14 Matiu 1:18-25
O sitere n’eriri Eze Devid Aịsaịa 9:7 Matiu 1:1, 6-17
Jehova kwuru na ọ bụ Ọkpara ya Abụ Ọma 2:7 Matiu 3:17
Ọtụtụ ndị ekweghị na ya Aịsaịa 53:1 Jọn 12:37, 38
O ji ịnyịnya ibu banye na Jeruselem Zekaraịa 9:9 Matiu 21:1-9
Ezigbo enyi ya raara ya nye Abụ Ọma 41:9 Jọn 13:18, 21-30
A raara ya nye n’ọnụ ego ọlaọcha 30 Zekaraịa 11:12 Matiu 26:14-16
Ọ gbara nkịtị n’ihu ndị na-ebo ya ebubo Aịsaịa 53:7 Matiu 27:11-14
E fere ǹzà maka uwe ya Abụ Ọma 22:18 Matiu 27:35
A kwara ya emo mgbe ọ nọ n’elu osisi Abụ Ọma 22:7, 8 Matiu 27:39-43
Ọ dịghị ọkpụkpụ ya ọ bụla a gbajiri Abụ Ọma 34:20 Jọn 19:33, 36
E liri ya n’etiti ndị ọgaranya Aịsaịa 53:9 Matiu 27:57-60
A kpọlitere ya tupu o ree ure Abụ Ọma 16:10 Ọrụ 2:24, 27
E buliri ya elu gaa n’aka nri nke Chineke Abụ Ọma 110:1 Ọrụ 7:56

← Gụọ isiokwu