Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

ISI NKE IRI NA ATỌ

Ile Ndụ Anya Otú Chineke Si Ele Ya

Ile Ndụ Anya Otú Chineke Si Ele Ya

Olee otú Chineke si ele ndụ anya?

Olee otú Chineke si ele ite ime anya?

Olee otú anyị kwesịrị isi na-akwanyere ndụ ùgwù?

“JEHOVA bụ Chineke n’eziokwu,” ka Jeremaịa onye amụma kwuru. “Ya onwe ya bụ Chineke dị ndụ.” (Jeremaịa 10:10) Ọzọkwa, ọ bụ Jehova Chineke kere ihe nile dị ndụ. Ndị e kere eke nọ n’eluigwe gwara ya, sị: “I kere ihe nile, ọ bụkwa n’ihi ọchịchọ gị ka ha ji dịrị, ka e jikwa kee ha.” (Mkpughe 4:11) Mgbe ọ na-abụku Chineke abụ otuto, Eze Devid kwuru, sị: “N’ebe Ị nọ ka isi iyi ndụ dị.” (Abụ Ọma 36:9) N’ezie, ndụ bụ onyinye sitere n’aka Chineke

2 Jehova na-enyekwara anyị aka ịdịgide ndụ. (Ọrụ 17:28) Ọ na-enye anyị ihe oriri, mmiri ọṅụṅụ, na ikuku anyị na-ekuru, o nyekwara anyị ala anyị bi na ya. (Ọrụ 14:15-17) Jehova emewo nke a n’ụzọ na-eme ka ndụ na-atọ anyị ụtọ. Ma, iji nụ ụtọ ndụ n’ụzọ zuru ezu, ọ dị mkpa ka anyị mata ihe ndị Chineke nyere n’iwu ma na-erube isi na ha.—Aịsaịa 48:17, 18.

ỊKWANYERE NDỤ ÙGWÙ

3 Chineke chọrọ ka anyị na-akwanyere ndụ—nke anyị nakwa nke ndị ọzọ—ùgwù. Dị ka ihe atụ, laa azụ n’oge Adam na Iv, nwa ha bụ́ Ken wesoro nwanne ya nwoke nke ọ tọrọ, bụ́ Ebel, iwe ọkụ. Jehova dọrọ Ken aka ná ntị na iwe ya pụrụ ime ka o mehie n’ụzọ dị oké njọ. Ken leghaara ịdọ aka ná ntị ahụ anya. O “biliri imegide Ebel, bụ́ nwanne ya, wee gbuo ya.” (Jenesis 4:3-8) Jehova nyere Ken ahụhụ maka igbu nwanne ya.—Jenesis 4:9-11.

4 Ka ọtụtụ puku afọ gasịrị, Jehova nyere ụmụ Izrel iwu ndị ga-enyere ha aka ijere ya ozi n’ụzọ ọ na-anakwere. Mgbe ụfọdụ, a na-akpọ iwu a Iwu Mozis n’ihi na e nyere ya site n’aka Mozis. Otu ihe e kwuru n’Iwu Mozis ahụ bụ: “Gị egbula mmadụ.” (Deuterọnọmi 5:17) Nke a gosiri ụmụ Izrel na Chineke ji ndụ mmadụ kpọrọ ihe nakwa na ndị mmadụ kwesịrị iji ndụ ndị ọzọ kpọrọ ihe.

5 Gịnịkwanụ banyere ndụ nke nwa e bu n’afọ? Dị ka Iwu Mozis si kwuo, igbu nwa nọ n’afọ nne ya dị njọ. N’ezie, ọbụna ndụ dị otú ahụ dị oké ọnụ ahịa n’anya Jehova. (Ọpụpụ 21:22, 23; Abụ Ọma 127:3) Nke a pụtara na ite ime dị njọ.

6 Ịkwanyere ndụ ùgwù na-agụnye inwe echiche ziri ezi banyere mmadụ ibe anyị. Bible na-ekwu, sị: “Onye ọ bụla nke kpọrọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ, unu makwaara na ọ dịghị ogbu mmadụ nke ndụ ebighị ebi na-adịgide n’ime ya.” (1 Jọn 3:15) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị ndụ ebighị ebi, anyị ekwesịghị ịkpọ mmadụ ibe anyị asị n’ihi na ịkpọasị bụ isi ihe na-akpata ihe ka ọtụtụ n’ihe ike ndị mmadụ na-eme. (1 Jọn 3:11, 12) Ọ dị mkpa ka anyị mụta ịhụ ibe anyị n’anya.

ANYỊ NA-AKWANYERE NDỤ ÙGWÙ

Nwa e bụ na-afọ
  • site n’ịghara igbu nwa e bu n’afọ

Onye na-apịri mkpọ sịga
  • site n’ịkwụsị omume ndị na-adịghị ọcha

Enyi abụọ bụ́ ndị agbụrụ dị iche iche
  • site n’ịghara ịkpọ mmadụ ibe anyị asị

7 Oleekwanụ banyere ịkwanyere ndụ nke anyị ùgwù? Ọ dịghị onye ị ga-asị ka ọ nwụọ ya ekwe, ma ụfọdụ na-etinye ndụ ha n’ihe ize ndụ maka ihe ụtọ. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị na-akpọ ma ọ bụ na-ara ụtaba, na-ese siga, na-aṅụ igbo, ma ọ bụ na-eji ọgwụ ọjọọ ndị ọzọ eme ihe. Ihe ndị dị otú ahụ na-emebi ahụ́, ha na-egbukarịkwa ndị na-eji ha eme ihe. Onye ọ bụla nke na-eji ihe ndị a eme ihe adịghị ewere ndụ dị ka ihe dị nsọ. Omume ndị a adịghị ọcha n’anya Chineke. (Ndị Rom 6:19; 12:1; 2 Ndị Kọrint 7:1) Iji jeere Chineke ozi n’ụzọ ọ na-anakwere, anyị aghaghị ịhapụ omume ndị dị otú ahụ. Ọ bụ ezie na ime otú ahụ pụrụ isi nnọọ ike, Jehova pụrụ inye anyị nkwado dị mkpa. Ọ na-enwekwa obi ụtọ ná mgbalị anyị na-etinye iji ndụ anyị na-eme ihe dị ka onyinye dị oké ọnụ ahịa sitere n’aka ya.

8 Ọ bụrụ na anyị na-akwanyere ndụ ùgwù, anyị ga-eburu n’uche mkpa ọ dị ịdị na-akpachapụ anya. Anyị ekwesịghị ịdị na-eme ihe n’elezighị anya, anyị agaghịkwa eji ndụ anyị na-egwuri egwu maka ihe ụtọ. Anyị ga-ezere ịkwọ ụgbọala ara ara ma ọ bụ igwu egwuregwu ike ma ọ bụ egwuregwu ndị dị ize ndụ. (Abụ Ọma 11:5) Iwu Chineke nyere Izrel oge ochie kwuru, sị: “Mgbe ị na-ewu ụlọ ọhụrụ [nke elu ya dị mbadamba], ị ga-emekwara elu ụlọ gị ihe mgbochi gburugburu [ma ọ bụ mgbidi dị ala], ka ị ghara ime ka ọbara dị n’ụlọ gị, mgbe mmadụ ga-esi na ya daa.” (Deuterọnọmi 22:8) Iji mee ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ dị n’iwu ahụ, hụ na ihe ndị dị ka steepụ ụlọ gị nọ n’ọnọdụ dị mma ka mmadụ ghara ịzọhie ụkwụ ma daa merụọ ezigbo ahụ́. Ọ bụrụ na i nwere ụgbọala, hụ na ọ dịghị ize ndụ ọnyịnya. Ekwela ka ebe obibi gị ma ọ bụ ụgbọala gị bụrụ ihe ize ndụ nye gị onwe gị ma ọ bụ ndị ọzọ.

9 Gịnịkwanụ banyere ndụ anụmanụ? Onye Okike na-elekwa ya anya dị ka ihe dị nsọ. Chineke kwere ka a na-egbu ụmụ anụmanụ maka oriri na iji nweta ihe e ji akwa uwe ma ọ bụ iji chebe ndị mmadụ pụọ n’ihe ize ndụ. (Jenesis 3:21; 9:3; Ọpụpụ 21:28) Otú ọ dị, ịrụsa ụmụ anụmanụ arụrụala ma ọ bụ igbu ha nanị maka egwuregwu adịghị mma, ọ na-egosikwa ajọ nlelị maka ịdị nsọ nke ndụ.—Ilu 12:10.

ỊKWANYERE ỌBARA ÙGWÙ

10 Mgbe Ken gbusịrị nwanne ya bụ́ Ebel, Jehova gwara Ken, sị: “Olu ọbara nwanne gị na-etiku m site n’ala.” (Jenesis 4:10) Mgbe Chineke kwuru okwu banyere ọbara Ebel, ihe ọ na-ekwu banyere ya bụ ndụ Ebel. Ken egbuwo Ebel, ugbu a kwa, a ghaghị inye Ken ahụhụ. Ọ dị ka à ga-asị na ọbara ma ọ bụ ndụ Ebel na-etiku Jehova ka o kpee ikpe ziri ezi. E gosighachikwara ihe jikọrọ ndụ na ọbara mgbe Iju Mmiri nke ụbọchị Noa gasịrị. Tupu Iju Mmiri ahụ, ụmụ mmadụ na-eri nanị mkpụrụ osisi, akwụkwọ nri, mkpụrụ akụ́kụ́, na ụdị akị dị iche iche. Mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị, Jehova gwara Noa na ụmụ ya, sị: “Ihe nile ọ bụla nke na-akpụ akpụ, nke dị ndụ, ga-abụrụ unu ihe oriri; dị ka akwụkwọ ihe ọkụkụ ka M nyeworo unu ha nile.” Otú ọ dị, Chineke nyere ha iwu a: “Nanị anụ ahụ́ nke ndụ ya, bụ́ ọbara ya, dị n’ime ya ka unu na-agaghị eri.” (Jenesis 1:29; 9:3, 4) N’ụzọ doro anya, Jehova na-ele ndụ na ọbara nke ihe o kere eke anya dị ka otu ihe.

11 Anyị na-akwanyere ọbara ùgwù site n’ịghara iri ya. N’Iwu Jehova nyere ụmụ Izrel, o kwuru, sị: “Nwoke ọ bụla…nke na-achụ nta ihe, ma ọ bụ anụ ọhịa ma ọ bụ anụ ufe, nke a na-eri eri; ọ ga-awụsịkwa ọbara ya, were ájá kpuchie ya…. M wee sị ụmụ Izrel, Unu erila ọbara anụ ahụ́ ọ bụla.” (Levitikọs 17:13, 14) Iwu Chineke nyere ka a ghara iri ọbara anụmanụ, bụ́ nke o buru ụzọ nye Noa ihe dị ka afọ 800 tupu o nye ya ụmụ Izrel, ka dị irè. Echiche Jehova doro anya n’okwu a: Ndị ohu ya pụrụ iri anụ ma ha agaghị eri ọbara ya. Ha kwesịrị ịwụsị ọbara ya n’ala—inyeghachi Chineke ndụ nke ihe ahụ e kere eke, dị ka a pụrụ isi kwuo ya.

12 E nyekwara Ndị Kraịst iwu yiri nke ahụ. Ndịozi na ndị ikom ndị ọzọ bụ́ ndị na-edu ndú n’etiti ụmụazụ Jizọs na narị afọ mbụ zukọrọ iji kpebie iwu ndị onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst na-aghaghị irube isi na ha. Ha ruru ná nkwubi okwu a: “Mmụọ nsọ na anyị onwe anyị akwadowo ịghara ịtụkwasịkwuru unu ibu arọ, ma e wezụga ihe ndị a dị mkpa, bụ́ ịnọgide na-ezere ihe ndị a chụrụ n’àjà nye arụsị, nakwa ọbara na anụ ndị a nyagburu anyagbu [anụ ndị a hapụrụ ọbara n’ime ha] na ịkwa iko.” (Ọrụ 15:28, 29; 21:25) N’ihi ya, anyị aghaghị ‘ịnọgide na-ezere ọbara.’ N’anya Chineke, ọ dị mkpa ka anyị mee nke ahụ dịkwa ka ọ dị mkpa ka anyị zere ikpere arụsị na mmekọahụ rụrụ arụ.

Nwoke a na-amịnye mmanya na-aba n’anya n’ahụ́

Ọ bụrụ na dọkịta gị agwa gị ka ị ghara ịṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya, ị̀ ga-agbanye ya n’akwara gị?

13 Iwu banyere izere ọbara ọ̀ gụnyere mmịnye ọbara? Ee. Iji maa atụ: Ka e were ya na dọkịta gwara gị ka ị ghara ịṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya. Nke ahụ ọ̀ pụtara na i kwesịghị ịṅụ mmanya na-aba n’anya kama na ị pụrụ ịgbanye ya n’akwara? Ọ dịghị ma ọlị! N’otu aka ahụ, izere ọbara pụtara ịghara ime ka ọ banye anyị n’ahụ́ n’ụzọ ọ bụla. Ya mere, iwu ahụ bụ́ ka e zere ọbara pụtara na anyị agaghị ekwe ka onye ọ bụla mịnye anyị ọbara.

14 Ọ bụrụkwanụ na Onye Kraịst emerụọ ezigbo ahụ́ ma ọ bụ ya adị mkpa ka a waa ya ahụ́ dị ize ndụ? Ya bụrụkwanụ na dọkịta ekwuo na ọ bụrụ na ọ jụ ka a mịnye ya ọbara na ọ ga-anwụ. N’ezie, Onye Kraịst ahụ agaghị achọ ịnwụ. N’ịgbalị ichebe ndụ dị oké ọnụ ahịa Chineke nyere ya, ọ ga-anara ụdị ọgwụgwọ ndị ọzọ na-agaghị agụnye iji ọbara eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. N’ihi ya, ọ ga-achọ ka a gwọọ ya ma ọ bụrụ na o kwe mee, ọ ga-anarakwa ọgwụ ndị a na-eji edochi anya ọbara.

15 Onye Kraịst ọ̀ ga-emebi iwu Chineke nanị iji gbatịkwuo ndụ ya n’usoro ihe a? Jizọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke chọrọ ịzọpụta mkpụrụ obi [ma ọ bụ ndụ] ya ga-atụfu ya; ma onye ọ bụla nke tụfuru mkpụrụ obi ya n’ihi m ga-achọta ya.” (Matiu 16:25) Anyị achọghị ịnwụ. Ma, ọ bụrụ na anyị anwaa ịzọpụta ndụ anyị dị ugbu a site n’imebi Iwu Chineke, anyị ga-anọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị na-agaghị enweta ndụ ebighị ebi. Mgbe ahụ, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya inwe obi ike na iwu Chineke ziri ezi, na-enwe obi ike zuru ezu na ọ bụrụ na anyị anwụọ n’ihi otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ, Onye nyere anyị ndụ ga-echeta anyị ná mbilite n’ọnwụ ma nyeghachi anyị ndụ ahụ dị oké ọnụ ahịa nke o nyeworo anyị.—Jọn 5:28, 29; Ndị Hibru 11:6.

16 Taa, ndị ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi na-ekpebisi ike ịgbaso ntụziaka o nyere banyere ọbara. Ha agaghị eri ya n’ụdị ọ bụla. Ha agaghịkwa anara ọbara iji gwọọ ọrịa.* Ha kwenyesiri ike na Onye kere ọbara maara ihe ga-akasị mma maka ha. Ì kwere na ọ maara?

OTU IHE KWESỊRỊ EKWESỊ E JI ỌBARA MEE

Olee otú ị pụrụ isi gosi na i ji ndụ na ọbara akpọrọ ihe?

Onye ọrịa na-agwa dọkịta okwu

17 Iwu Mozis mere ka otu ihe kwesịrị ekwesị e ji ọbara mee pụta ìhè. Banyere ofufe a chọrọ ka Izrel oge ochie na-efe, Jehova nyere iwu, sị: “Ndụ nke anụ ahụ́, n’ọbara ka ọ dị: Mụ onwe m enyewokwa unu ya n’elu ebe ịchụàjà ikpuchiri mkpụrụ obi unu mmehie ha: n’ihi na ọbara ka ọ bụ nke na-ekpuchi mmehie.” (Levitikọs 17:11) Ọ bụrụ na ụmụ Izrel emee mmehie, a pụrụ ịgbaghara ha ma ọ bụrụ na ha ejiri anụmanụ chụọ àjà ma fesa ọbara ya ụfọdụ n’ebe ịchụàjà nke dị n’ụlọikwuu (ma ọ bụ nke dị n’ụlọ nsọ Chineke bụ́ nke e jizi na-eme ihe ka oge na-aga). Nanị ihe kwesịrị ekwesị e ji ọbara mee bụ àjà ndị ahụ e ji ya chụọ.

18 Ezi Ndị Kraịst anọghị n’okpuru Iwu Mozis, n’ihi ya kwa, ha adịghị eji anụmanụ achụ àjà ma na-efesa ọbara anụmanụ n’ebe ịchụàjà. (Ndị Hibru 10:1) Otú ọ dị, ojiji e jiri ọbara mee ihe n’ebe ịchụàjà n’Izrel oge ochie sere onyinyo àjà dị oké ọnụ ahịa nke a ga-eji Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs Kraịst chụọ. Dị ka anyị mụrụ n’Isi nke 5 nke akwụkwọ a, mgbe ọ bụ mmadụ, Jizọs nyere ndụ ya n’ihi anyị site n’ikwe ka a wụsịa ọbara ya otú ahụ e si achụ àjà. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ rịgooro n’eluigwe ma, nanị otu ugboro, nye Chineke uru nke ọbara ya a wụsịrị. (Ndị Hibru 9:11, 12) Nke ahụ ghọrọ ihe ndabere maka ịgbaghara anyị mmehie, o mekwara ka anyị nwee ohere nke ịdị ndụ ebighị ebi. (Matiu 20:28; Jọn 3:16) Lee nnọọ ka ojiji e jiri ọbara mee ihe otú ahụ si bụrụ nke bara oké uru! (1 Pita 1:18, 19) Ọ bụ nanị site n’inwe okwukwe n’uru nke ọbara Jizọs a wụsịrị ka anyị ga-enweta nzọpụta.

19 Anyị kwesịrị inwe nnọọ ekele n’ebe Jehova Chineke nọ maka ndụ o ji ịhụnanya nye anyị! Nke ahụ ó kwesịghị ịkpali anyị ịgwa ndị ọzọ banyere ohere ha nwere inweta ndụ ebighị ebi ma ọ bụrụ na ha enwee okwukwe n’àjà Jizọs? Ile ndụ mmadụ ibe anyị anya otú Chineke si ele ya ga-akpali anyị iji ịnụ ọkụ n’obi na ịdị uchu na-eme nke a. (Ezikiel 3:17-21) Ọ bụrụ na anyị ejiri ịdị uchu mezuo nke a, anyị ga-enwe ike ikwu dị ka Pọl onyeozi kwuru, sị: “Adị m ọcha n’ebe ọbara mmadụ nile dị, n’ihi na alabeghị m azụ n’ịgwa unu nzube nile nke Chineke.” (Ọrụ 20:26, 27) Ịgwa ndị mmadụ banyere Chineke na nzube ya bụ ụzọ dị mma isi gosi na anyị ji ndụ na ọbara akpọrọ ihe nke ukwuu.

IHE BIBLE NA-AKỤZI

  • Ndụ bụ onyinye sitere n’aka Chineke —Abụ Ọma 36:9; Mkpughe 4:11.
  • Ite ime dị njọ, ebe ọ bụ na ndụ nke nwatakịrị e bu n’afọ dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke.—Ọpụpụ 21:22, 23; Abụ Ọma 127:3.
  • Anyị na-akwanyere ndụ ùgwù site n’ịghara itinye ya n’ihe ize ndụ nakwa site n’ịghara iri ọbara.—Deuterọnọmi 5:17; Ọrụ 15:28, 29.

*  Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere ọgwụ ndị e ji edochi anya mmịnye ọbara, lee Teta! nke January 8, 2000, peeji nke 7-11, bụ́ nke Ndịàmà Jehova bipụtara.


Ajụjụ nke Paragraf Ndị A Na-Amụ Amụ

1. Ònye kere ihe nile dị ndụ?

2. Ụzọ dị aṅaa ka Chineke si enyere anyị aka ịdịgide ndụ?

3. Olee otú Chineke si lee ogbugbu e gburu Ebel anya?

4. N’Iwu Mozis, olee otú Chineke si mee ka ụzọ e kwesịrị isi na-ele ndụ anya pụta ìhè?

5. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ite ime anya?

6. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịkpọ mmadụ ibe anyị asị?

7. Olee omume ụfọdụ ndị na-egosi akwanyereghị ndụ ùgwù?

8. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji buru n’uche mkpa ọ dị ịdị na-akpachapụ anya?

9. Ọ bụrụ na anyị na-akwanyere ndụ ùgwù, olee otú anyị ga-esi na-emeso ụmụ anụmanụ?

10. Olee otú Chineke siworo gosi na ya na-ele ndụ na ọbara anya dị ka otu ihe?

11. Gịnị ka Chineke kwuru ka a ghara iji ọbara na-eme kemgbe oge Noa?

12. Iwu dị aṅaa nke metụtara ọbara, bụ́kwa nke ka dị irè taa, ka mmụọ nsọ nyere na narị afọ mbụ?

13. Nye ihe atụ nke na-egosi na iwu ahụ e nyere ka e zere ọbara gụnyere mmịnye ọbara.

14, 15. Ọ bụrụ na dọkịta ekwuo na Onye Kraịst aghaghị ịnara mmịnye ọbara, gịnị ka ọ ga-eme, n’ihi gịnịkwa?

16. Gịnị ka ndị ohu Chineke na-ekpebisi ike ime banyere ọbara?

17. N’Izrel oge ochie, olee otu ihe e ji ọbara mee bụ́ nke Jehova Chineke nabatara?

18. Uru na ngọzi ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ inweta site ná mwụsị a wụsịrị ọbara Jizọs?

19. Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji dị “ọcha n’ebe ọbara mmadụ nile dị”?