Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

IHE ODIDE NTụKWASị

Ihe Ndị Bụ́ Eziokwu Banyere Nna ahụ, Ọkpara ahụ, na Mmụọ Nsọ

Ihe Ndị Bụ́ Eziokwu Banyere Nna ahụ, Ọkpara ahụ, na Mmụọ Nsọ

NDỊ kweere n’ozizi Atọ n’Ime Otu na-ekwu na Chineke dị atọ bụrụ otu—Nna, Ọkpara, na Mmụọ Nsọ. A sịrị na ha atọ hà nhata, na ha atọ pụrụ ime ihe nile, nakwa na ha atọ enweghị mmalite. Ya mere, dị ka ozizi Atọ n’Ime Otu si dị, Nna ahụ bụ Chineke, Ọkpara ahụ bụ Chineke, Mmụọ Nsọ bụkwa Chineke, ma ha atọ abụrụ nanị otu Chineke.

Ọtụtụ ndị kweere n’Atọ n’Ime Otu na-ekweta na ha agaghị akọwali ozizi a. Ma ha pụrụ iche na ọ dị n’ime Bible. O kwesịrị ka a rịba ama na okwu ahụ bụ́ “Atọ n’Ime Otu” adịghị n’ime Bible. Ma è nwere ihe na-akwado Atọ n’Ime Otu n’ime Bible? Iji zaa ajụjụ a, ka anyị tụlee otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ nke ndị kweere n’Atọ n’Ime Otu na-ehotakarị iji kwadoo ozizi ahụ.

“OKWU AHỤ BỤRỤKWA CHINEKE”

Jọn 1:1 na-ekwu, sị: “Na mbụ ka Okwu ahụ dịrị, Okwu ahụ na Chineke dịkwara, Okwu ahụ bụrụkwa Chineke.” (Union Version) Ná mgbada nke isiakwụkwọ ahụ, Jọn onyeozi gosiri n’ụzọ doro anya na “Okwu ahụ” bụ Jizọs. (Jọn 1:14) Otú ọ dị, ebe ọ bụ na a kpọrọ Okwu ahụ Chineke, ụfọdụ ndị na-ekwubi na Ọkpara ahụ na Nna ahụ aghaghị ịbụ akụkụ nke otu Chineke ahụ.

Chetakwa na e deburu akụkụ Bible a n’asụsụ Grik. Ka e mesịrị, ndị nsụgharị sụgharịrị okwu Grik ahụ gaa n’asụsụ ndị ọzọ. Ma ọtụtụ ndị nsụgharị Bible ejighị nkebi ahịrịokwu ahụ bụ́ “Okwu ahụ bụrụkwa Chineke” mee ihe. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? N’ihi ihe ọmụma ha nwere banyere asụsụ Grik nke e ji dee Bible, ndị nsụgharị ahụ kwubiri na e kwesịrị ịsụgharị nkebi ahịrịokwu ahụ bụ́, “Okwu ahụ bụrụkwa Chineke,” n’ụzọ dị iche. Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? Ndị a bụ ihe atụ ole na ole: “Logos [Okwu] ahụ dị n’ụdị nke chi.” (A New Translation of the Bible) “Okwu ahụ bụ chi.” (The New Testament in an Improved Version) “Okwu ahụ na Chineke nọrọ, o nwekwara ọdịdị nke Chineke.” (The Translator’s New Testament) Dị ka nsụgharị ndị a na-egosi, Okwu ahụ abụghị Chineke n’onwe ya.* Kama nke ahụ, n’ihi ịbụ onye nọ n’ọnọdụ dị elu karịa ihe ndị ọzọ Jehova kere, a kpọrọ Okwu ahụ “chi.” N’ebe a, okwu ahụ bụ́ “chi” pụtara “dike.”

NWETAKWUO IHE ỌMỤMA

Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ amaghị asụsụ Grik nke e ji dee Bible. N’ihi ya, olee otú ị pụrụ isi mara ihe Jọn onyeozi bu n’uche? Cheedị banyere ihe atụ a: Otu onye nkụzi na-akọwara ụmụ akwụkwọ ya otu isiokwu. Ka e mesịrị, ụmụ akwụkwọ ahụ ghọtara nkọwa ahụ n’ụzọ dịgasị iche iche. Olee otú ụmụ akwụkwọ ahụ pụrụ isi dozie nsogbu ahụ? Ha pụrụ ịrịọ onye nkụzi ahụ ka o nyekwuo ha ihe ọmụma. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na inwetakwu ihe ọmụma ga-enyere ha aka ịghọta isiokwu ahụ nke ọma karị. N’otu aka ahụ, iji ghọta ihe Jọn 1:1 pụtara, ị pụrụ ịtụle Oziọma Jọn iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere ọkwá Jizọs. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na inwetakwu ihe ọmụma banyere isiokwu a ga-enyere gị aka iru ná nkwubi okwu ziri ezi.

Dị ka ihe atụ, tụlee ihe Jọn dekwuru n’isi nke 1, amaokwu nke 18: “Ọ dịghị onye hụworo Chineke [nke Pụrụ Ime Ihe Nile] n’oge ọ bụla.” Otú ọ dị, ndị mmadụ ahụwo Jizọs, bụ́ Ọkpara ahụ, n’ihi na Jọn kwuru, sị: “Okwu ahụ [Jizọs] wee ghọọ anụ ahụ́, bụ́ mmadụ, o wee biri n’etiti anyị, anyị kirikwara otuto ya.” (Jọn 1:14, Union Version) Oleezi otú Ọkpara ahụ ga-esi bụrụ akụkụ nke Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile? Jọn kwukwara na Okwu ahụ “na Chineke nọkwa.” Ma, olee otú mmadụ pụrụ isi soro onye ọzọ nọrọ ma bụrụkwa onye ahụ? (Jọn 1:34) E wezụga nke ahụ, dị ka e dekọrọ na Jọn 17:3, Jizọs gosiri ọdịiche doro anya nke dị n’etiti ya onwe ya na Nna ya nke eluigwe. Ọ kpọrọ Nna ya “nanị ezi Chineke ahụ.” Ná ngwụsị nke Oziọma ya, Jọn chịkọtara ihe nile site n’ikwu, sị: “E detuwo ihe ndị a ka unu wee kwere na Jizọs bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke.” (Jọn 20:31) Rịba ama na a kpọrọ Jizọs Ọkpara Chineke, a kpọghị ya Chineke. Ihe ọmụma a e nyekwuru n’Oziọma Jọn na-egosi otú e kwesịrị isi ghọta Jọn 1:1. Jizọs, bụ́ Okwu ahụ, bụ “chi” n’echiche bụ́ na ọ nọ n’ọnọdụ dị elu, ma ọ bụghị otu ọnọdụ ahụ Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile nọ.

CHỌPỤTA IHE NDỊ BÚ EZIOKWU

Chebara ihe atụ ahụ e nyere banyere onye nkụzi na ụmụ akwụkwọ ya echiche ọzọ. Ka e were ya na ụfọdụ n’ime ha ka nwere obi abụọ, ọbụna mgbe ha nụsịrị nkọwa onye nkụzi ahụ nyekwuru. Gịnị ka ha pụrụ ime? Ha pụrụ ịgakwuru onye nkụzi ọzọ ka o nyekwuo ha ihe ọmụma banyere isiokwu ahụ. Ọ bụrụ na onye nkụzi nke ọzọ ahụ ekwuo ihe kwekọrọ ná nkọwa ahụ onye nkụzi nke mbụ ahụ nyere, ihe ka ọtụtụ n’ụmụ akwụkwọ ahụ pụziri ịkwụsị inwe obi abụọ. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na ihe Jọn onye so dee Bible kwuru banyere ihe jikọrọ Jizọs na Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile edoghị gị anya, ị pụrụ ịtụle ihe onye ọzọ so dee Bible kwuru iji nwetakwuo ihe ọmụma. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe Matiu dere. Banyere ọgwụgwụ nke usoro ihe a, ọ sịrị na Jizọs kwuru, sị: “Ọ dịghị onye maara banyere ụbọchị na awa ahụ, ndị mmụọ ozi nke eluigwe amaghị, Ọkpara ahụ amaghịkwa, kama nanị Nna m maara.” (Matiu 24:36) Olee otú okwu ndị a si akwado echiche bụ́ na Jizọs abụghị Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile?

Jizọs kwuru na Nna ahụ maara ihe karịa Ọkpara ahụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na Jizọs bụkwa Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile, ọ ga-ama ihe Nna ya ma. Ya mere, Ọkpara ahụ na Nna ahụ apụghị ịha nhata. Ma, ụfọdụ ndị pụrụ ikwu, sị: ‘O nwere mgbe Jizọs bụ mmadụ, nweekwa mgbe ọ bụ chi. N’ebe a, o kwuru okwu dị ka mmadụ nkịtị.’ Ọ bụrụgodị na echiche ahụ ziri ezi, gịnịkwanụ banyere mmụọ nsọ? Ọ bụrụ na ọ bụ akụkụ nke otu Chineke ahụ dị ka Nna ahụ, n’ihi gịnị ka Jizọs na-ejighị kwuo na mmụọ nsọ ma ihe Nna ahụ ma?

Ka ị na-amụ Bible na-aga, ị ga-amatakwu ọtụtụ akụkụ Bible ndị na-akọwa isiokwu a. Ha na-akwado ihe ndị bụ́ eziokwu banyere Nna ahụ, Ọkpara ahụ, na mmụọ nsọ.—Abụ Ọma 90:2; Ọrụ 7:55; Ndị Kọlọsi 1:15.


*  Iji nwetakwuo nkọwa banyere ụkpụrụ ndị na-achịkwa ụtọasụsụ Grik, bụ́ ndị a gbasoro na Jọn 1:1, lee peeji nke 26-29 nke broshuọ bụ́ Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, bụ́ nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

← Gụọ isiokwu

GỤKWUO GBASARA YA

Okwu ahụ Ọ̀ Bụ “Chineke” Ka Ọ̀ Bụ “chi”?

Olee otú e kwesịrị isi ghọta Jọn 1:1?