Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

IHE ODIDE NTụKWASị

Ihe Mere Ezi Ndị Kraịst Adịghị Eji Obe Efe Ofufe

Ihe Mere Ezi Ndị Kraịst Adịghị Eji Obe Efe Ofufe

ỌTỤTỤ nde ndị mmadụ na-asọpụrụ ma na-akwanyere obe ùgwù. Akwụkwọ bụ́ The Encyclopædia Britannica kpọrọ obe “ihe oyiyi bụ́ isi e ji eme ihe n’okpukpe Ndị Kraịst.” Otú ọ dị, ezi Ndị Kraịst adịghị eji obe efe ofufe. N’ihi gịnị?

Otu ezigbo ihe mere na ha adịghị eme otú ahụ bụ na Jizọs Kraịst anwụghị n’elu obe. Okwu Grik a na-asụgharịkarị ịbụ “obe” bụ stau·ros′. N’ụzọ bụ́ isi, ọ pụtara “osisi kwụ ọtọ.” The Companion Bible na-akọwa, sị: “[Stau·ros′] apụtatụghị osisi abụọ nke e ji otu n’ime ha tụbichie nke ọzọ…Ọ dịghị ihe ọ bụla dị n’asụsụ Grik ahụ e ji dee [Agba Ọhụrụ] nke na-egosidị na ọ bụ osisi abụọ.”

N’ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ, ndị so dee Bible jiri okwu ọzọ mee ihe maka ihe e ji kpọgbuo Jizọs. Ọ bụ okwu Grik bụ́ xy′lon. (Ọrụ 5:30; 10:39; 13:29; Ndị Galeshia 3:13; 1 Pita 2:24) Okwu a pụtara nanị “ogwe osisi” ma ọ bụ “okpiri.”

N’ịkọwa ihe mere e ji akpọgbukarị ndị mmadu n’otu osisi kwụ ọtọ, akwụkwọ bụ́ Das Kreuz und die Kreuzigung (Obe na Mkpọgide n’Obe), nke Hermann Fulda dere, na-ekwu, sị: “A dịghị enwetakebe osisi n’ebe ndị ahụ a họọrọ ịnọ egbu ndị mmadụ n’ihu ọha. N’ihi ya, a na-egwunye otu ogwe osisi n’ala. A na-achịli ndị omekome aka elu ma kegide ma ọ bụ kpọgide ha n’osisi a.”

Otú ọ dị, ọ bụ n’Okwu Chineke ka a na-enweta ihe àmà kasị doo anya. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Kraịst, site n’ịzụrụ anyị, tọhapụrụ anyị n’ọbụbụ ọnụ nke Iwu ahụ site n’ịghọ ọbụbụ ọnụ n’ọnọdụ anyị, n’ihi na e dere, sị: ‘Onye a bụrụ ọnụ ka onye ọ bụla a kwụbara n’osisi bụ.’ ” (Ndị Galeshia 3:13) N’ebe a, Pọl na-ehota Deuterọnọmi 21:22, 23, bụ́ nke na-ezo aka n’ụzọ doro anya n’ebe osisi dị, ọ bụghị obe. Ebe ọ bụ na ihe dị otú ahụ e ji akpọgbu mmadụ na-eme ka mmadụ bụrụ “ọbụbụ ọnụ,” ọ gaghị ekwesị ekwesị Ndị Kraịst iji onyinyo nke Kraịst a kpọgburu akpọgbu chọọ ụlọ ha mma.

E nweghị ihe àmà ọ bụla na-egosi na n’ime afọ 300 mbụ gaferenụ mgbe Kraịst nwụsịrị, na ndị na-azọrọ na ha bụ Ndị Kraịst jiri obe mee ihe mgbe ha na-efe ofufe. Otú ọ dị, na narị afọ nke anọ, Eze Ukwu na-ekpere arụsị bụ́ Constantine ghọrọ onye òtù nke Iso Ụzọ Kraịst nke na-adịghịzi agbaso ụkpụrụ Kraịst, ọ kwalitekwara iji obe eme ihe na ya. Ihe ọ sọkwara ya bụrụ ebumnobi Constantine, ọ dịghị ihe jikọrọ Jizọs Kraịst na obe. N’eziokwu, obe sitere n’aka ndị ọgọ mmụọ. New Catholic Encyclopedia na-ekweta, sị: “Ndị dịrị ndụ tupu oge Ndị Kraịst nakwa ndị na-abụghị Ndị Kraịst jichara obe mee ihe.” Akwụkwọ ndị ọzọ jikọkwara obe na ife ihe ndị e kere eke ofufe nakwa ememe mmekọahụ nke ndị ọgọ mmụọ.

Gịnịzi mere e ji anabata iji ihe oyiyi a nke ndị ọgọ mmụọ eme ihe? Ma eleghị anya, ọ bụ iji mee ka ọ dịrị ndị ọgọ mmụọ mfe ịnakwere “Iso Ụzọ Kraịst.” Otú ọ dị, Bible katọrọ n’ụzọ doro anya ife ihe oyiyi ọ bụla nke ndị ọgọ mmụọ ofufe. (2 Ndị Kọrint 6:14-18) Akwụkwọ Nsọ machibidokwara ụdị ikpere arụsị nile. (Ọpụpụ 20:4, 5; 1 Ndị Kọrint 10:14) N’ihi ya, e nwere ezigbo ihe mere na ezi Ndị Kraịst adịghị eji obe eme ihe mgbe ha na-efe ofufe.*


*  Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere obe, lee Ụlọ Nche nke November 15, 1992, peeji nke 7, bụ́ nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

← Gụọ isiokwu