Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

ISI NKE IRI NA ABỤỌ

Ibi Ndụ n’Ụzọ Na-amasị Chineke

Ibi Ndụ n’Ụzọ Na-amasị Chineke

Olee otú ị pụrụ isi bụrụ enyi Chineke?

N’ụzọ dị aṅaa ka aka Setan mara Jehova si gbasa gị?

Olee omume ndị na-adịghị amasị Jehova?

Olee otú ị pụrụ isi bie ndụ n’ụzọ na-amasị Chineke?

OLEE ụdị onye ị ga-achọ ka ọ bụrụ enyi gị? O yikarịrị ka ọ̀ bụ onye na-eche echiche otú i si eche, onye ihe na-amasị gị na-amasị, nakwa onye ụkpụrụ gị na ya bụ otu. Ọ bụkwa onye nwere àgwà ọma, ndị dị ka ikwu eziokwu na obiọma, ka ị ga-enwe mmasị ka ọ na-akpa gị nso.

2 Kemgbe ụwa, Chineke anọwo na-ahọrọ mmadụ ụfọdụ ka ha bụrụ ezi ndị enyi ya. Dị ka ihe atụ, Jehova kpọrọ Ebreham enyi ya. (Aịsaịa 41:8; Jems 2:23) Chineke zoro aka n’ebe Devid nọ dị ka “nwoke kwekọrọ n’obi m” n’ihi na ọ bụ ụdị onye Jehova hụrụ n’anya. (Ọrụ 13:22) Jehova lekwara Daniel onye amụma anya dị ka “ihe a na-achọsi ike nke ukwuu.”—Daniel 9:23.

3 N’ihi gịnị ka Jehova ji were Ebreham, Devid, na Daniel dị ka ndị enyi ya? Ọ gwara Ebreham, sị: “I gewo ntị n’olu m.” (Jenesis 22:18) N’ihi ya, Jehova na-abịaru ndị ji umeala n’obi na-eme ihe ọ gwara ha nso. “Geenụ ntị n’olu m,” ka ọ gwara ụmụ Izrel, “M ga-abụkwara unu Chineke, unu onwe unu ga-abụkwara m otu ndị.” (Jeremaịa 7:23) Ọ bụrụ na i rubere Jehova isi, gị onwe gị kwa pụrụ ịbụ enyi ya!

JEHOVA NA-EWUSI NDỊ ENYI YA IKE

4 Chegodị uru ịbụ enyi Chineke ga-abara gị. Bible na-ekwu na Jehova na-achọ ohere iji ‘gosi Onwe ya onye dị ike n’akụkụ ndị obi ha zuru okè n’ebe Ọ nọ.’ (2 Ihe E Mere 16:9) Olee otú Jehova pụrụ isi gosi onwe ya onye dị ike n’akụkụ gị? E mere ka otu ụzọ o si eme nke ahụ doo anya n’Abụ Ọma 32:8, bụ́ ebe anyị na-agụ, sị: “M [Jehova] ga-eme ka i nwee uche, M ga-ezikwa gị ihe n’ụzọ nke ị ga-eje ije n’ime ya: M ga-adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa gị n’ahụ́.”

5 Lee okwu na-emetụ n’ahụ́ nke ahụ bụ, bụ́ nke na-egosi na Jehova na-eche banyere anyị! Ọ ga-enye gị nduzi dị mkpa ma na-eche gị nche ka ị na-agbaso nduzi ya. Chineke chọrọ inyere gị aka ịnagide ọnwụnwa na ule ndị na-abịara gị. (Abụ Ọma 55:22) N’ihi ya, ọ bụrụ na i jiri obi zuru okè na-ejere Jehova ozi, ị ga-enwe obi ike dị ka ọbụ abụ ahụ, bụ́ onye sịrị: “Edowo m Jehova n’ihu m mgbe nile: n’ihi na Ọ nọ n’aka nri m, a gaghị ewezụga m n’ọnọdụ m.” (Abụ Ọma 16:8; 63:8) Ee, Jehova pụrụ inyere gị aka ibi ndụ n’ụzọ na-amasị ya. Ma dị ka ị maara, ọ dị onye iro Chineke nke ga-achọ igbochi gị ime nke ahụ.

IHE ỊMA AKA SETAN

6Isi nke 11 nke akwụkwọ a kọwara otú Setan bụ́ Ekwensu si maa ọbụbụeze Chineke aka. Setan boro Chineke ebubo na ọ ghara ụgha ma nye echiche bụ́ na Jehova emezighị emezi n’ịghara ikwe ka Adam na Iv kpebiere onwe ha ihe ọma na ihe ọjọọ. Ka Adam na Iv mehiesịrị, ụmụ ha amalitekwa ijupụta ụwa, Setan kwuru na ụmụ mmadụ ejighị ezi obi na-efe Jehova. “Ndị mmadụ adịghị ejere Chineke ozi n’ihi na ha hụrụ ya n’anya,” ka Setan kwuru. “E nye m ohere, aga m emeli ka mmadụ nile gbakụta Chineke azụ.” Akụkọ banyere nwoke ahụ aha ya bụ Job na-egosi na nke ahụ bụ ihe Setan kweere. Ònye bụ Job, oleekwa otú ebubo Setan boro Chineke si gbasa ya?

7 Job dịrị ndụ ihe dị ka afọ 3,600 gara aga. Ọ bụ ezigbo mmadụ, n’ihi na Jehova kwuru, sị: “Ọ dịghị onye dị ka ya n’ụwa, ọ bụ nwoke zuru okè, ziekwa ezi, nke na-atụ egwu Chineke, na-esikwa n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya.” (Job 1:8) Job biri ndụ n’ụzọ mere Chineke obi ụtọ.

8 Setan nyere echiche bụ́ na Job ejighị ezi obi na-efe Chineke. Ekwensu gwara Jehova, sị: “Ọ́ bụghị Gị onwe gị gbaworo ya [Job], gbaakwara ụlọ ya, gbaakwara ihe nile o nwere, ogige gburugburu? Ị gọziwo ọrụ aka ya abụọ, ihe nnweta ya agbasawokwa n’ala. Ma otú ọ dị, biko, setịpụ aka Gị, metụ ihe nile o nwere, ọ ghaghịkwa ịgbakụta Gị azụ n’ihu Gị.”—Job 1:10, 11

9 Setan si otú a zọrọ na Job na-efe Chineke n’ihi uru ọ na-erite. Ekwensu kwukwara na ọ bụrụ na a nwaa Job, ọ ga-agbakụta Chineke azụ. Olee ihe Jehova mere banyere aka Setan mara? Ebe ọ bụ na ihe iseokwu ahụ bụ banyere ebumnobi Job, Jehova kwere ka Setan nwaa Job. N’ụzọ dị otú a, ọ ga-apụta ìhè ma Job ọ̀ hụrụ Chineke n’anya ma ọ bụ na ọ hụghị ya.

A NWAA JOB

10 N’oge na-adịghị anya, Setan nwara Job n’ụzọ dị iche iche. E zuuru ụfọdụ n’ime anụmanụ Job, gbuokwa ndị ọzọ. E gburu ọnụ ọgụgụ ka ukwuu n’ime ndị na-ejere ya ozi. Nke a kpataara Job ihe isi ike akụ̀ na ụba. Ebelebe ọzọ gburu mgbe oké ifufe gburu ụmụ ya iri. Otú ọ dị, n’agbanyeghị ihe ndị a jọgburu onwe ha dakwasịrị ya, “Job emehieghị, ọ sịghịkwa na Chineke mere ihe nzuzu.”—Job 1:22.

A kwụghachiri Job ụgwọ maka ikwesị ntụkwasị obi ya

A kwụghachiri Job ụgwọ maka ikwesị ntụkwasị obi ya

11 Setan ezughị ike. Ọ ghaghị ịbụ na o chere na Job ga-agbakụta Chineke azụ ma ọ daa ọrịa n’agbanyeghị na o diwo mfu nke ihe onwunwe ya, ọnwụ nke ndị na-ejere ya ozi na nke ụmụ ya. Jehova kwere ka Setan tie Job ajọ ọrịa na-asọ oyi ma na-egbu mgbu. Ma, ọbụna nke a emeghị ka Job kwụsị inwe okwukwe n’ebe Chineke nọ. Kama nke ahụ, o kwusiri ike, sị: “Ruo mgbe m kubiri ume m gaghị esi n’ebe m nọ wezụga izu okè m!”—Job 27:5.

12 Job amaghị na ọ bụ Setan kpatara nsogbu ya. Ebe ọ bụ na Job amaghị banyere aka Ekwensu mara ọbụbụeze Jehova, o chere na ọ bụ Chineke kpatara nsogbu ya. (Job 6:4; 16:11-14) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ nọgidere na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Jehova. Nnọgide Job nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi mere ka nzọrọ Setan zọọrọ na Job na-efe Chineke n’ihi ihe ndị ọ na-erite n’aka ya, ghọọ okpookpo ụgha!

13 Ikwesị ntụkwasị obi Job mere ka ọnụ sie Jehova ike n’ịzaghachi aka Setan mara ya n’ụzọ mkparị. Job bụ n’ezie enyi Jehova, Chineke kwụrụ ya ụgwọ maka ikwesị ntụkwasị obi.—Job 42:12-17.

OTÚ O SI GBASA GỊ

14 Ihe iseokwu ahụ nke metụtara iguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke, bụ́ nke Setan welitere, abụghị nanị Job ka ọ gbasara. Ọ gbasakwara gị. E gosipụtara nke a n’ụzọ doro anya n’Ilu 27:11, bụ́ ebe Okwu Jehova na-asị: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaghachi onye na-ata m ụta okwu.” Okwu ndị a, bụ́ ndị e dere ọtụtụ afọ ka Job nwụsịrị, na-egosi na Setan ka na-ata Chineke ụta ma na-ebo ndị ohu Ya ebubo. Mgbe anyị na-ebi ndụ n’ụzọ na-amasị Jehova, anyị na-enye aka n’ezie n’inye azịza maka ebubo ụgha Setan, anyị na-esikwa otú ahụ eme ka obi Chineke ṅụrịa. Olee otú nke ahụ dị gị? Ọ́ gaghị abụ ihe magburu onwe ya iso nye azịza maka ebubo Ekwensu, ọbụna ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa na ị ghaghị ime mgbanwe ụfọdụ ná ndụ gị?

15 Rịba ama na Setan kwuru, sị: “Ihe nile nke mmadụ nwere ka ọ ga-enye n’ọnọdụ ndụ ya.” (Job 2:4) Site n’ịsị “mmadụ,” Setan mere ka o doo anya na ebubo ya agbasaghị nanị Job kama ọ gbasara mmadụ nile. Nke ahụ abụghị obere okwu. Setan enyewo echiche na i jighị ezi obi na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke. Ọ ga-amasị Ekwensu ịhụ ka i nupụụrụ Chineke isi ma hapụ ụzọ nke ezi omume mgbe ị malitere inwe ihe isi ike. Olee otú Setan pụrụ isi gbalịa imezu nke a?

16 Dị ka a tụlere n’Isi nke 10 n’akwụkwọ a, Setan na-eji ụzọ dịgasị iche iche eme ka ndị mmadụ gbakụta Chineke azụ. N’otu akụkụ, ọ na-awakpo mmadụ “dị ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, na-achọ onye ọ ga-eripịa.” (1 Pita 5:8) N’ihi ya, a pụrụ ịhụ aka ọrụ Setan mgbe ndị enyi, ndị ikwu, ma ọ bụ ndị ọzọ na-emegide mgbalị ị na-eme ịmụ Bible na itinye ihe ndị ị na-amụta n’ọrụ.* (Jọn 15:19, 20) N’aka nke ọzọ, Setan ‘na-anọgide na-enwogha onwe ya ịbụ mmụọ ozi nke ìhè.’ (2 Ndị Kọrint 11:14) Ekwensu pụrụ iji ụzọ aghụghọ duhie gị ma mee ka ị kwụsị ibi ndụ n’ụzọ na-amasị Chineke. Ọ pụkwara iji nkụda mmụọ mee ihe, ikekwe na-eme ka i chee na i rughị eru ime ihe na-amasị Chineke. (Ilu 24:10) Ma Setan ọ̀ na-eme ka “ọdụm na-ebigbọ ebigbọ” ma ọ̀ na-eme onwe ya “mmụọ ozi nke ìhè,” ihe o kwuru agbanwebeghị: Ọ na-ekwu na ọ bụrụ na ule na ọnwụnwa abịara gị, ị ga-akwụsị ijere Chineke ozi. Olee otú ị pụrụ isi nye azịza maka ihe ịma aka a ma guzosie ike n’ezi ihe nye Chineke, dị ka Job mere?

IRUBE ISI N’IHE NDỊ JEHOVA NYERE N’IWU

17 Ị pụrụ inye azịza maka ihe ịma aka Setan site n’ibi ndụ n’ụzọ na-amasị Chineke. Gịnị ka nke a na-agụnye? Bible na-aza, sị: “Ị ga-ewerekwa obi gị nile, werekwa mkpụrụ obi gị nile, werekwa ike gị nile, hụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya.” (Deuterọnọmi 6:5) Ka ị na-enwewanye ịhụnanya n’ebe Chineke nọ, ị ga na-achọsi nnọọ ike ime ihe ndị ọ chọrọ ka i mee. “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara,” ka Jọn onyeozi dere, “ka anyị debe ihe ndị o nyere n’iwu.” Ọ bụrụ na ị hụrụ Jehova n’anya site n’obi gị dum, ị ga-achọpụta na “ihe ndị o nyere n’iwu adịghịkwa arọ.”—1 Jọn 5:3.

18 Olee ihe ndị Jehova nyere n’iwu? Ụfọdụ n’ime ha gụnyere omume ndị anyị na-aghaghị izere. Dị ka ihe atụ, lee igbe nke isiokwu ya bụ “Zere Ihe Ndị Jehova Kpọrọ Asị.” N’ebe ahụ, ị ga-ahụ omume ndị e depụtara, bụ́ ndị Bible katọrọ n’ụzọ pụtara ìhè. I lee ha anya na nke mbụ ya, omume ụfọdụ e depụtara n’ebe ahụ pụrụ iyi ka hà adịchaghị njọ. Ma mgbe ị tụgharịsịrị uche n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a kpọtụrụ uche, o yikarịrị ka ị̀ ga-ahụ amamihe dị n’iwu Jehova. Ime mgbanwe n’omume gị pụrụ ịbụ ihe ịma aka kasịnụ i nwetụworo. N’agbanyeghị nke ahụ, ibi ndụ n’ụzọ na-amasị Chineke na-eweta afọ ojuju na obi ụtọ dị ukwuu. (Aịsaịa 48:17, 18) Ị ga-emelikwa ya. Olee otú anyị si mara?

ZERE IHE NDỊ JEHOVA KPỌRỌ ASỊ

Ụmụ nwoke abụọ na-eme mpụ
Di na nwunye na-aṅụ mmanya, na-esekwa sịga
Nwaanyị na-ezu ohi
  • Igbu mmadụ.—Ọpụpụ 20:13; 21:22, 23.
  • Mmekọahụ rụrụ arụ.—Levitikọs 20:10, 13, 15, 16; Ndị Rom 1:24, 26, 27, 32; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10.
  • Mgbaasị.—Deuterọnọmi 18:9-13; 1 Ndị Kọrint 10:21, 22; Ndị Galeshia 5:20, 21.
  • Ikpere arụsị.—1 Ndị Kọrint 10:14.
  • Aṅụrụma.—1 Ndị Kọrint 5:11.
  • Izu ohi.—Levitikọs 6:2, 4; Ndị Efesọs 4:28.
  • Ịgha ụgha.—Ilu 6:16, 19; Ndị Kọlọsi 3:9; Mkpughe 22:15.
  • Anyaukwu.—1 Ndị Kọrint 5:11.
  • Ime ihe ike.—Abụ Ọma 11:5; Ilu 22:24, 25; Malakaị 2:16; Ndị Galeshia 5:20.
  • Okwu na-adịghị mma.—Levitikọs 19:16; Ndị Efesọs 5:4; Ndị Kọlọsi 3:8.
  • Iji ọbara eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi.—Jenesis 9:4; Ọrụ 15:20, 28, 29.
  • Mmadụ ịjụ igboro ndị ezinụlọ ya mkpa ha.—1 Timoti 5:8.
  • Ikere òkè n’agha ma ọ bụ n’esemokwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụwa a.—Aịsaịa 2:4; Jọn 6:15; 17:16.
  • Ịkpọ ma ọ bụ ịra ụtaba, ise siga, ma ọ bụ iji ihe ndị a sị na ha bụ ọgwụ ndị e ji atụrụ ndụ eme ihe.—Mak 15:23; 2 Ndị Kọrint 7:1

19 Jehova adịghị achọ ka anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli. (Deuterọnọmi 30:11-14) Ọ maara ihe ndị anyị pụrụ ime na ihe ndị anyị na-apụghị ime karịa ka anyị maara. (Abụ Ọma 103:14) Ọzọkwa, Jehova pụrụ inye anyị ume iji rubere ya isi. Pọl onyeozi dere, sị: “Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi, ọ gaghịkwa ekwe ka a nwaa unu gabiga ihe unu pụrụ ịnagide, kama mgbe ọnwụnwa ahụ bịara ọ ga-emekwa ụzọ mgbapụ ka unu wee nwee ike idi ya.” (1 Ndị Kọrint 10:13) Iji nyere gị aka ịtachi obi, Jehova pụrụ ọbụna inye gị “ike karịrị ike nkịtị.” (2 Ndị Kọrint 4:7) Mgbe Pọl tachisịrị obi n’ọtụtụ ọnwụnwa, o kwuru, sị: “Maka ihe nile enwere m ume site n’onye ahụ nke na-enye m ike.”—Ndị Filipaị 4:13

ỊZỤLITE ÀGWÀ NDỊ NA-AMASỊ CHINEKE

20 N’ezie, ime ihe na-amasị Jehova gụnyere ihe karịrị izere ihe ndị ọ kpọrọ asị. Ọ dịkwa mkpa ka ihe ndị na-amasị ya na-amasị gị. (Ndị Rom 12:9) Ọ̀ bụ na ọ dịghị amasị gị ka ndị na-eche echiche otú i si eche, ndị ihe na-amasị gị na-amasị, nakwa ndị ụkpụrụ gị na ha bụ otu bụrụ ndị enyi gị. Ọ na-amasịkwa Jehova ka ndị dị otú ahụ bụrụ ndị enyi ya. N’ihi ya, mụta inwe mmasị n’ihe ndị na-amasị Jehova. A kọwara ụfọdụ n’ime ha n’Abụ Ọma 15:1-5, bụ́ ebe anyị na-agụ banyere ndị Chineke lere anya dị ka ndị enyi ya. Ndị enyi Jehova na-amịpụta ihe Bible na-akpọ “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.” Ọ gụnyere àgwà ndị dị ka “ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, njide onwe onye.”—Ndị Galeshia 5:22, 23.

21 Ịgụ na ịmụ Bible mgbe nile ga-enyere gị aka ịzụlite àgwà ndị na-amasị Chineke. Ịmụta ihe Chineke na-achọ n’aka gị ga-enyere gị aka ime ka echiche gị kwekọọ n’echiche Chineke. (Aịsaịa 30:20, 21) Ka ị na-enwewanye ịhụnanya n’ebe Jehova nọ, otú ahụ ka ọchịchọ i nwere ibi ndụ n’ụzọ na-amasị Chineke ga-esiwanye ike.

22 A chọrọ mgbalị iji bie ndụ n’ụzọ na-amasị Jehova. Bible ji ịgbanwe ụzọ ndụ gị tụnyere iyipụ ụdị mmadụ ochie ma yikwasị nke ọhụrụ. (Ndị Kọlọsi 3:9, 10) Ma n’ihe banyere ihe ndị Jehova nyere n’iwu, ọbụ abụ ahụ dere, sị: “N’idebe ha ka ọkpụkpụ ọrụ hiri nne na-apụta.” (Abụ Ọma 19:11) Gị onwe gị kwa ga-achọpụta na ibi ndụ n’ụzọ na-amasị Chineke nwere ụgwọ ọrụ dị ukwuu. Site n’ime otú ahụ, ị ga-enye azịza banyere ihe ịma aka Setan ma mee ka Jehova ṅụrịa!

IHE BIBLE NA-AKỤZI

  • Ị pụrụ ịghọ enyi Chineke site n’irubere ya isi.—Jems 2:23.
  • Setan ekwuwo na ọ bụghị ezi obi ka ụmụ mmadụ ji eguzosi ike n’ezi ihe.—Job 1:8, 10, 11; 2:4; Ilu 27:11.
  • Anyị aghaghị izere àgwà ndị na-adịghị amasị Chineke.—1 Ndị Kọrint 6:9, 10.
  • Anyị pụrụ ime ihe na-amasị Jehova site n’ịkpọ ihe ndị na-adịghị amasị ya asị na inwe mmasị n’ihe ndị na-amasị ya.—Ndị Rom 12:9.

*  Nke a apụtaghị na ọ bụ Setan kpọmkwem na-edunye ndị na-emegide gị. Ma Setan bụ chi nke usoro ihe a, ụwa dum dịkwa n’ike aka ya. (2 Ndị Kọrint 4:4; 1 Jọn 5:19) Ya mere, anyị pụrụ ịtụ anya na ibi ndụ n’ụzọ na-amasị Chineke agaghị amasị ọtụtụ ndị, ụfọdụ ndị ga-emegidekwa gị.


Ajụjụ nke Paragraf Ndị A Na-Amụ Amụ

1, 2. Nye ihe atụ nke ụfọdụ ndị Jehova lere anya dị ka ndị enyi ya

3. N’ihi gịnị ka Jehova na-eji ahọrọ ụfọdụ ndị mmadụ ịbụ ndị enyi ya?

4, 5. Olee otú Jehova si egosi ike ya n’akụkụ ndị ya?

6. Gịnị ka Setan kwuru banyere ụmụ mmadụ?

7, 8. (a) Gịnị mere ka Job bụrụ onye pụrụ iche n’etiti ndị biri n’oge ya? (b) Olee otú Setan si nye echiche bụ́ na Job ejighị ezi obi na-efe Chineke?

9. Olee ihe Jehova mere banyere aka Setan mara, n’ihi gịnịkwa?

10. Ọnwụnwa ndị dị aṅaa dakwasịrị Job, oleekwa otú o si meghachi omume?

11. (a) Gịnị bụ ihe nke abụọ Setan kwuru banyere Job, oleekwa otú Jehova si meghachi omume? (b) Olee otú Job si meghachi omume banyere ọrịa ya na-egbu mgbu?

12. Olee otú omume Job si gosi na ihe Ekwensu zọọrọ banyere ya bụ ụgha?

13. Gịnị ka ikwesị ntụkwasị obi Job n’ebe Chineke nọ rụpụtara?

14, 15. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na ihe ịma aka Setan welitere banyere Job gbasara mmadụ nile?

16. (a) Ụzọ ndị dị aṅaa ka Setan si na-agbalị ime ka ndị mmadụ gbakụta Chineke azụ? (b) Olee otú Ekwensu pụrụ isi jiri ụzọ ndị a mee ihe n’ebe ị nọ?

17. Gịnị bụ isi ihe mere anyị ga-eji rube isi n’ihe ndị Jehova nyere n’iwu?

18, 19. (a) Olee ihe ụfọdụ Jehova nyere n’iwu? (Lee igbe.) (b) Olee otú anyị si mara na Chineke adịghị achọ ka anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli?

20. Àgwà ndị dị aṅaa na-amasị Chineke ka i kwesịrị ịzụlite, n’ihi gịnịkwa ka ha ji dị mkpa?

21. Gịnị ga-enyere gị aka ịzụlite àgwà ndị na-amasị Chineke?

22. Gịnị ka ị ga-arụzu ma ọ bụrụ na i bie ndụ n’ụzọ na-amasị Chineke?