Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

ISI NKE ATỌ

Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?

Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?

Gịnị bụ nzube Chineke maka ihe a kpọrọ mmadụ?

Olee ụzọ e siworo maa Chineke aka?

Ụdị ndụ dị aṅaa ka a ga-ebi n’ụwa n’ọdịnihu?

NZUBE Chineke maka ụwa magburu nnọọ onwe ya. Jehova chọrọ ka ndị nwere obi ụtọ, ndị ahụ́ siri ike, jupụta n’ụwa. Bible na-ekwu na ‘Chineke kụrụ ubi nke a gbara ogige n’Iden’ nakwa na ‘o mere ka osisi nile ọ bụla puo, bụ́ nke a na-achọsi ike n’ile anya, nke dịkwa mma ihe oriri.’ Mgbe Chineke kesịrị nwoke na nwanyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, O debere ha n’ebe obibi ahụ mara mma ma gwa ha, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu.” (Jenesis 1:28; 2:8, 9, 15) N’ihi ya, ọ bụ nzube Chineke ka ụmụ mmadụ mụọ ụmụ, mee ka ókèala nke ebe obibi ahụ bụ́ ubi gbasaruo ụwa nile, ma na-elekọta ụmụ anụmanụ.

2 Ì chere na nzube Jehova Chineke bụ́ ka ụmụ mmadụ biri na paradaịs elu ala ga-emezu? “Ekwuwo m,” ka Chineke na-asị, “M ga-emekwa ya.” (Aịsaịa 46:9-11; 55:11) Ee, ihe ọ bụla Chineke zubere, ọ ga-emerịrị ya! Ọ na-ekwu na “ọ bụghị ihe tọgbọrọ n’efu ka O kere [ụwa]” kama “ọ bụ ka e wee biri n’ime ya ka Ọ kpụrụ ya.” (Aịsaịa 45:18) Ụdị ndị dị aṅaa ka Chineke chọrọ ka ha biri n’ụwa? Ruokwa ogologo oge hà aṅaa ka ọ chọrọ ka ha biri n’ebe a? Bible na-aza, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29; Mkpughe 21:3, 4.

3 O doro anya na nke a emebeghị. Ugbu a, ndị mmadụ na-ada ọrịa, na-anwụkwa anwụ; ọbụna ha na-alụ ọgụ ma na-egburịta ibe ha. Ihe agaghịzi ka e si chee ya. Otú ọ dị, n’ezie, Chineke ezubeghị na ụwa ga-adị otú ọ dị taa! Oleezi otú mmiri si baa n’opi ụgbọgụrụ? Gịnị mere nzube Chineke emezubeghị? Ọ dịghị akwụkwọ akụkọ ihe mere eme mmadụ dere nke pụrụ ịgwa anyị, n’ihi na nsogbu ahụ malitere n’eluigwe.

MMALITE NKE OTU ONYE IRO

4 Akwụkwọ mbụ nke Bible kwuru banyere onye na-emegide Chineke bụ́ onye kparutere n’ogige Iden. A kọwara ya dị ka “agwọ,” ma onye mmegide ahụ abụghị anụmanụ nkịtị. Akwụkwọ ikpeazụ nke Bible na-eme ka a mata ya dị ka “onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa nile mmadụ bi.” A na-akpọkwa ya “agwọ ochie ahụ.” (Jenesis 3:1; Mkpughe 12:9) Mmụọ ozi a nke dị ike, ma ọ bụ mmụọ a e kere eke nke a na-adịghị ahụ anya, jiri agwọ mee ihe n’ịgwa Iv okwu, dị nnọọ ka onye nwere nkà pụrụ ime ka o yie ka ọ̀ bụ nwa bebi nke dịdebere ya na-ekwu ihe ọ bụ ya onwe ya na-ekwu. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na onye ahụ bụ́ mmụọ nọ ya mgbe Chineke kwadebere ụwa maka ụmụ mmadụ.—Job 38:4, 7.

5 Otú ọ dị, ebe ọ bụ na ihe nile Jehova kere zuru okè, ònye mere “Ekwensu” a, “Setan” a? N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, otu n’ime ụmụ ndị ikom dị ike nke Chineke mere onwe ya Ekwensu. Olee otú nke a pụrụ isi mee? N’ezie, taa, onye na-akpabu ezi àgwà pụrụ ịghọ onye ohi. Olee otú nke ahụ si eme? Onye ahụ pụrụ ikwe ka ọchịchọ na-ezighị ezi sie ike n’obi ya. Ọ bụrụ na ọ nọgide na-eche banyere ya, ọchịchọ ahụ na-ezighị ezi pụrụ isi nnọọ ike. Ọ bụrụzie na o nwee ohere, ọ pụrụ imezu ọchịchọ ọjọọ ahụ o bu n’obi kemgbe.—Jems 1:13-15.

6 Ihe a ka Setan bụ́ Ekwensu mere. O doro anya na ọ nụrụ mgbe Chineke na-agwa Adam na Iv ka ha mụjupụta ụwa. (Jenesis 1:27, 28) Ihe àmà na-egosi na Setan chere, sị, ‘Ụmụ mmadụ nile a pụdịrị ife m ofufe kama ife Chineke!’ N’ihi ya, ọchịchọ ọjọọ batara ya n’obi. N’ikpeazụ, o mere ihe iji ghọgbuo Iv site n’ịgwa ya ihe na-abụghị eziokwu banyere Chineke. (Jenesis 3:1-5) O si otú ahụ ghọọ “Ekwensu,” nke pụtara “Onye Nkwutọ.” N’otu oge ahụ, ọ ghọrọ “Setan,” nke pụtara “Onye Mmegide.”

7 Site n’iji ụgha na aghụghọ mee ihe, Setan bụ́ Ekwensu mere ka Adam na Iv nupụrụ Chineke isi. (Jenesis 2:17; 3:6) N’ihi ya, ha mesịrị nwụọ, dị ka Chineke kwuru na ha ga-anwụ ma ọ bụrụ na ha enupụ isi. (Jenesis 3:17-19) Ebe ọ bụ na Adam ghọrọ onye na-ezughị okè mgbe o mehiere, ụmụ ya nile ketara mmehie site n’aka ya. (Ndị Rom 5:12) A pụrụ iji pan e ji eme bred mee ihe atụ nke a. Ọ bụrụ na ọ dị ebe pan ahụ kụkpọrọ akụkpọ, olee otú ogbe bred nke ọ bụla e ji pan ahụ mee ga-adị? Ogbe bred nke ọ bụla ga-enwe ebe bara ime. N’otu aka ahụ, mmadụ ọ bụla ketara “nkụkpọ” nke ezughị okè site n’aka Adam. Ọ bụ ya mere mmadụ nile ji aka nká, na-anwụkwa anwụ.—Ndị Rom 3:23.

8 Mgbe Setan dubara Adam na Iv imehie megide Chineke, ọ na-akpali nnupụisi n’ezie. Ọ nọ na-ama ụzọ Jehova si achị isi aka. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, Setan na-ekwu, sị: ‘Chineke amaghị achị. Ọ na-ekwu okwu ụgha, na-egbochikwa ihe ọma ịbịara ndị ọ na-achị. Ọ dịghị ndị mmadụ mkpa ka Chineke na-achị ha. Ha pụrụ ikpebiri onwe ha ihe bụ́ ezi ihe na ihe ọjọọ. Ihe ga-adịrị ha mma ma m chịwa.’ Olee ihe Chineke ga-eme banyere ịma aka mkparị dị otú ahụ? Ụfọdụ na-eche na Chineke gaara egbu ndị nnupụisi ahụ. Ma nke ahụ ọ̀ gaara enye azịza banyere ihe ịma aka Setan? Ọ̀ gaara egosi na ụzọ Chineke si achị ziri ezi?

9 Ebe Jehova bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi n’ụzọ zuru okè, o gbughị ndị nnupụisi ahụ ozugbo. O kpebiri na ọ ga-adị mkpa ka oge ụfọdụ gafee iji nye azịza banyere ihe ịma aka Setan n’ụzọ na-eju afọ nakwa iji gosi na Ekwensu bụ onye ụgha. N’ihi ya, Chineke kpebiri na ya ga-ekwe ka ụmụ mmadụ chịa onwe ha ruo oge ụfọdụ n’okpuru nduzi Setan. N’Isi nke 11 nke akwụkwọ a, a ga-atụle ihe mere Jehova ji mee otú ahụ na ihe mere o jiworo kwe ka ogologo oge gafee tupu ya edozie ihe iseokwu ndị a. Otú ọ dị, ọ dị mma ugbu a ichebara nke a echiche: Adam na Iv hà mere ihe ziri ezi n’ikwere ihe Setan, bụ́ onye na-emetụbereghị ha ihe ọma ọ bụla, gwara ha? Ò ziri ezi ha ikwere na Jehova, bụ́ onye nyere ha ihe nile ha nwere, bụ onye ụgha obi tara mmiri? Gịnị ka ị gaara eme?

10 Ọ dị mma ichebara ajụjụ ndị a echiche n’ihi na onye ọ bụla n’ime anyị na-eche ihe iseokwu ndị yiri ha ihu taa. Ee, i nwere ohere ịdụnyere Jehova úkwù n’inye azịza banyere ihe ịma aka Setan. Ị pụrụ ịnakwere Jehova dị ka Onye Ọchịchị gị ma nye aka n’igosi na Setan bụ onye ụgha. (Abụ Ọma 73:28; Ilu 27:11) N’ụzọ dị mwute, ọ bụ nanị mmadụ ole na ole n’ime ọtụtụ ijeri ndị mmadụ n’ụwa a na-eme mkpebi dị otú ahụ. Nke a na-ewelite ajụjụ dị mkpa, Bible ọ̀ na-akụzi n’ezie na Setan na-achị ụwa a?

ÒNYE NA-ACHỊ ỤWA A?

Setan ọ̀ gaara enye Jizọs alaeze nile nke ụwa ma a sị na ha abụghị nke ya?

Jizọs jụrụ ọnwụnwa Setan nwara ya inye ya ikike ịchị ụwa

11 Ọ dịghị mgbe Jizọs rụrụ ụka na ọ bụghị Setan na-achị ụwa. Ọ dị mgbe Setan ji ụzọ ọrụ ebube gosi Jizọs “alaeze nile nke ụwa na ebube ha.” Mgbe nke ahụ gasịrị, Setan kwere Jizọs nkwa, sị: “Ihe ndị a nile ka m ga-enye gị ma ọ bụrụ na ị daa n’ala kpọọ isiala nye m.” (Matiu 4:8, 9; Luk 4:5, 6) Cheedị banyere nke a. Nkwa ahụ ọ̀ gaara abụrụ Jizọs ọnwụnwa ma ọ bụrụ na ọ bụghị Setan na-achị alaeze ndị a. Jizọs ekwughị na ọchịchị ndị a nile nke ụwa abụghị nke Setan. N’ezie, Jizọs gaara ekwu otú ahụ ma a sị na ọ bụghị Setan na-enye ha ike.

12 N’ezie, Jehova bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile, Onye Okike nke eluigwe na ala nke dị ịtụnanya. (Mkpughe 4:11) Ma, ọ dịghị ebe Bible kwuru na ọ bụ Jehova Chineke ma ọ bụ Jizọs Kraịst na-achị ụwa a. N’eziokwu, Jizọs zoro aka kpọmkwem n’ebe Setan nọ dị ka “onye na-achị ụwa a.” (Jọn 12:31; 14:30; 16:11) Ọbụna Bible zoro aka n’ebe Setan bụ́ Ekwensu nọ dị ka “chi nke usoro ihe a.” (2 Ndị Kọrint 4:3, 4) Banyere onye mmegide a, ma ọ bụ Setan, Onye Kraịst bụ́ Jọn onyeozi dere, sị: “Ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.”—1 Jọn 5:19.

OTÚ A GA-ESI EWEPỤ ỤWA SETAN

13 Ka afọ na-agafe, ụwa na-adịwanye ize ndụ. O jupụtara ná ndị na-eburịta agha, ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-adịghị akwụwa aka ọtọ, ndị ndú okpukpe ihu abụọ, na ndị omekome obi tara mmiri. Ụwa n’ozuzu ya enwekwaghị mmekwata. Bible na-ekpughe na o ruwela mgbe Chineke ga-ekpochapụ ajọ ụwa a n’agha Amagedọn. A ga-eji ụwa ọhụrụ ezi omume dochie ya.—Mkpughe 16:14-16.

14 Jehova Chineke họọrọ Jizọs Kraịst ịbụ Onye Ọchịchị nke Alaeze, ma ọ bụ ọchịchị, eluigwe Ya. Mgbe dị anya gara aga, Bible buru amụma, sị: “A mụworo anyị otu nwa, otu nwa nwoke ka e nyeworo anyị; ịbụ onyeisi ga-adịkwasịkwa n’ubu ya: a ga-akpọkwa aha ya…Onyeisi Udo. Ọ dịghị ọgwụgwụ ọ bụla ịba ụba nke ịbụ onyeisi Ya na udo Ya ga-agwụ.” (Aịsaịa 9:6, 7) Banyere ọchịchị a, Jizọs kụziiri ụmụazụ ya ikpe ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:10) Dị ka anyị ga-ahụ n’akwụkwọ a, n’oge na-adịghị anya Alaeze Chineke ga-ewepụ ọchịchị nile nke ụwa a, a ga-ejikwa ya dochie ha nile. (Daniel 2:44) Mgbe ahụ, Alaeze Chineke ga-eweta paradaịs n’elu ala.

ỤWA ỌHỤRỤ DỊ NSO!

15 Bible na-emesi anyị obi ike, sị: “E nwere eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ndị anyị na-echere dị ka nkwa [Chineke] si dị, ezi omume gajekwa ibi n’ime ha.” (2 Pita 3:13; Aịsaịa 65:17) Oge ụfọdụ, mgbe Bible na-ekwu banyere “ụwa,” ọ pụtara ndị bi n’ụwa. (Jenesis 11:1) N’ihi ya, “ụwa ọhụrụ” ezi omume bụ ọha ụmụ mmadụ nwere ihu ọma Chineke.

16 Jizọs kwere nkwa na n’ụwa ọhụrụ ahụ na-abịanụ, ndị nwere ihu ọma Chineke ga-enweta onyinye nke “ndụ ebighị ebi.” (Mak 10:30) Biko sapeta Jọn 3:16 na 17:3, ma gụọ ihe Jizọs kwuru na anyị aghaghị ime iji nweta ndụ ebighị ebi. Ugbu a, jiri Bible tụlee ngọzi ndị ahụ ruru eru ịnata onyinye ahụ magburu onwe ya nke sitere n’aka Chineke ga-enweta na Paradaịs elu ala ahụ na-abịanụ.

17Mmebi iwu, agha, ime mpụ, na ime ihe ike agaghịzi adị. “Onye na-emebi iwu agaghị adịkwa…Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala.” (Abụ Ọma 37:10, 11) Udo ga-adị n’ihi na ‘Chineke ga-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa.’ (Abụ Ọma 46:9; Aịsaịa 2:4) Mgbe ahụ ‘onye ezi omume ga-ama akwụkwọ dị ka osisi ndụ; ọtụtụ udo ga-adịkwa ruo mgbe ọnwa na-agaghị adị’—nke ahụ pụtakwara ruo mgbe ebighị ebi!—Abụ Ọma 72:7.

18Ndị na-efe Jehova, ga-anọ ná ntụkwasị obi. Ruo ogologo oge ndị Izrel nke oge Bible rubeere Chineke isi, ha nọrọ ná nchebe. (Levitikọs 25:18, 19) Lee ka ọ ga-esi magbuo onwe ya ịnọ ná nchebe otú ahụ na Paradaịs!—Aịsaịa 32:18; Maịka 4:4.

19A gaghị enwe ụkọ nri. Ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile.” (Abụ Ọma 72:16) Jehova Chineke ga-agọzi ndị ya na-eme ezi omume, ‘ala ga-emekwa ihe omume ya.’—Abụ Ọma 67:6.

Ndị mmadụ si n’agbụrụ dị iche iche nọkọtara ọnụ na Paradaịs

20Ụwa nile ga-aghọ paradaịs. A ga-ewu ebe obibi ndị ọhụrụ ma nwee gburugburu ebe ndị mara mma n’ala nke ụmụ mmadụ na-eme mmehie mebiri na mbụ. (Aịsaịa 65:21-24; Mkpughe 11:18) Ka oge na-aga, akụkụ ụwa ndị e budaworo n’okpuru ga na-agbasa ruo mgbe ụwa nile ghọrọ ebe mara mma, nke na-emepụtakwa ihe dị ka ogige Iden. Chineke agaghị ahapụ ma ọlị ‘ịsaghe aka Ya na iwere ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.’—Abụ Ọma 145:16.

21Udo ga-adị n’etiti mmadụ na anụmanụ. Anụ ọhịa na anụ ụlọ ga-atakọ nri. Ọbụna obere nwatakịrị agaghị atụ anụmanụ ndị dị ize ndụ ugbu a ụjọ.—Aịsaịa 11:6-9; 65:25.

22Ọrịa agaghịzi adị. Dị ka Onye Ọchịchị nke Alaeze eluigwe nke Chineke, Jizọs ga-agwọ ọrịa n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu karịa otú ọ gwọrọ mgbe ọ nọ n’ụwa. (Matiu 9:35; Mak 1:40-42; Jọn 5:5-9) Mgbe ahụ “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.”—Aịsaịa 33:24; 35:5, 6.

23A ga-eme ka ndị a hụrụ n’anya nwụrụ anwụ dịghachi ndụ ma nwee atụmanya nke anwụghị anwụ ma ọlị. A ga-eme ka ndị nile nọ n’ụra ọnwụ, bụ́ ndị nọ ná ncheta Chineke, dịghachi ndụ. N’eziokwu, “a gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.”—Ọrụ 24:15; Jọn 5:28, 29.

24 Lee ọdịnihu magburu onwe ya na-echere ndị họọrọ ịmụta banyere Onye Okike Ukwu anyị, bụ́ Jehova Chineke, na ijere ya ozi! Ọ bụ Paradaịs elu ala nke na-abịanụ ka Jizọs zoro aka na ya mgbe o kwere onye mmebi iwu ahụ nke nwụrụ n’akụkụ ya nkwa, sị: “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” (Luk 23:43) Ọ dị mkpa ka anyị mụtakwuo banyere Jizọs Kraịst, bụ́ onye a ga-esite n’aka ya mee ka ngọzi ndị a nile kwe omume.

IHE BIBLE NA-AKỤZI

  • Nzube Chineke, bụ́ ime ka ụwa ghọọ paradaịs, ga-emezu.—Aịsaịa 45:18; 55:11.
  • Ọ bụ Setan na-achị ụwa ugbu a.—Jọn 12:31; 1 Jọn 5:19.
  • N’ụwa ọhụrụ na-abịanụ, Chineke ga-awụkwasị ngọzi ya n’ahụ́ ihe a kpọrọ mmadụ.—Abụ Ọma 37:10, 11, 29.

Ajụjụ nke Paragraf Ndị A Na-Amụ Amụ

1. Gịnị bụ nzube Chineke maka ụwa?

2. (a) Olee otú anyị si mara na nzube Chineke maka ụwa ga-emezu? (b) Gịnị ka Bible na-ekwu banyere ụmụ mmadụ ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi?

3. Ọnọdụ ndị dị aṅaa dị mwute ka e nwere n’ụwa ugbu a, oleekwa ajụjụ ndị nke a na-ewelite?

4, 5. (a) Ònye n’ezie jiri agwọ mee ihe n’ịgwa Iv okwu? (b) Olee otú onye na-akpabu ezi àgwà pụrụ isi ghọọ onye ohi?

6. Olee otú otu nwa Chineke bụ́ mmụọ nke dị ike si ghọọ Setan bụ́ Ekwensu?

7. (a) N’ihi gịnị ka Adam na Iv ji nwụọ? (b) N’ihi gịnị ka ụmụ Adam nile ji aka nká, na-anwụkwa anwụ?

8, 9. (a) Ihe ịma aka dị aṅaa ka ihe àmà na-egosi na Setan welitere? (b) N’ihi gịnị ka Chineke na-ejighị gbuo ndị nnupụisi ahụ ozugbo?

10. Olee otú ị pụrụ isi dụnyere Jehova úkwù n’inye azịza banyere ihe ịma aka Setan?

11, 12. (a) Olee otú ọnwụnwa a nwara Jizọs si gosi na ọ bụ Setan na-achị ụwa a? (b) Olee ihe ọzọ na-egosi na ọ bụ Setan na-achị ụwa a?

13. N’ihi gịnị ka ụwa ọhụrụ ji dị mkpa?

14. Ònye ka Chineke họrọwooro ịbụ Onye Ọchịchị nke Alaeze Ya, oleekwa otú e si buo nke a n’amụma?

15. Gịnị bụ “ụwa ọhụrụ” ahụ?

16. Gịnị bụ onyinye dị oké ọnụ ahịa Chineke ga-enye ndị nwere ihu ọma ya, gịnịkwa ka anyị na-aghaghị ime iji nweta ya?

17, 18. Olee otú anyị ga-esi jide n’aka na a ga-enwe udo ma nọrọ ná nchebe n’ebe nile n’ụwa?

19. Olee otú anyị si mara na ihe oriri ga-ejupụta n’ụwa ọhụrụ nke Chineke?

20. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji nwee obi ike na ụwa nile ga-aghọparadaịs?

21. Gịnị na-egosi na udo ga-adị n’etiti mmadụ na anụmanụ?

22. Gịnị ga-eme ọrịa?

23. N’ihi gịnị ka mbilite n’ọnwụ ga-eji mee ka anyị ṅụrịa?

24. Olee otú atụmanya nke ibi na Paradaịs elu ala dị gị n’obi?