Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

ISI NKE ISII

Ebee Ka Ndị Nwụrụ Anwụ Gara

Ebee Ka Ndị Nwụrụ Anwụ Gara

Gịnị na-eme anyị mgbe anyị nwụrụ?

N’ihi gịnị ka anyị ji anwụ anwụ?

N’ihi gịnị ka ịmara ihe ndị bụ́ eziokwu banyere ọnwụ ji bụrụ ihe na-akasi obi?

NDỊ mmadụ echebaworo ajụjụ ndị a echiche ruo ọtụtụ puku afọ. Ajụjụ ndị ahụ dịkwa mkpa. N’agbanyeghị onye anyị bụ ma ọ bụ ebe anyị bi, azịza ha na-emetụta onye ọ bụla n’ime anyị.

2 N’isiakwụkwọ bu nke a ụzọ, anyị tụlere otú àjà mgbapụta Jizọs Kraịst si meghee ụzọ maka inweta ndụ ebighị ebi. Anyị mụtakwara na Bible buru amụma banyere mgbe ‘ọnwụ na-agaghị adị ọzọ.’ (Mkpughe 21:4) Ka ọ dịgodị, anyị nile na-anwụ anwụ. Eze Solomọn maara ihe kwuru, sị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ.” (Eklisiastis 9:5) Anyị na-agbalị ịdị ogologo ndụ dị ka o kwere mee. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị na-eche banyere ihe ga-eme anyị mgbe anyị nwụrụ.

3 Mgbe ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ, anyị na-eru újú. Anyị pụkwara ịjụ, sị: ‘Ọnọdụ dị aṅaa ka ha nọ na ya? Hà na-ata ahụhụ? Hà na-eche anyị nche? Ànyị pụrụ inyere ha aka? Ọ̀ dị mgbe anyị ga-ahụ ha ọzọ?’ Okpukpe ndị e nwere n’ụwa na-aza ajụjụ ndị a n’ụzọ dịgasị iche iche. Ụfọdụ ndị na-akụzi na ọ bụrụ na i bie ndụ dị mma, ị ga-aga eluigwe, ma ọ bụrụ na i bie ndụ ọjọọ, ị ga-aga n’ebe a na-emekpa mmadụ ahụ́ n’ọkụ. Okpukpe ndị ọzọ na-akụzi na mgbe mmadụ nwụrụ, ọ na-aga n’ala mmụọ iji nọnyere ndị nna nna ya. Okpukpe ndị ọzọ kwa na-akụzi na ndị nwụrụ anwụ na-aga n’ala mmụọ ka e kpee ha ikpe, e mesịa, ha alọ ụwa.

4 Ozizi ndị dị otú ahụ okpukpe dị iche iche na-ezi na-arụtụcha aka n’otu ihe—na ọ dị ihe na-esi n’ahụ́ anyị apụ mgbe anyị nwụrụ. E lewe ihe ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okpukpe nile, ma ndị nke gara aga ma ndị nke e nwere ugbu a, na-ekwu, anyị na-adịgide ndụ n’ụzọ ụfọdụ ruo mgbe ebighị ebi, nweekwa ikike ịhụ ụzọ, ịnụ ihe, na iche echiche. Ma, olee otú nke ahụ pụrụ isi kwe omume? Ọ bụ ụbụrụ na-eme ka anyị nwee ike ịhụ ụzọ, ịnụ ihe, na iche echiche. Mgbe mmadụ nwụrụ, ụbụrụ ya na-akwụsị ịrụ ọrụ. Ikike ncheta ya, mmetụta ọ na-enwe, na ikike ndị o nwere ịhụ ụzọ na ịnụ ihe, adịghị anọgide na-arụrụ onwe ha ọrụ n’ụzọ ụfọdụ dị omimi. Ha adịghị anọgide na-arụ ọrụ mgbe ụbụrụ anyị nwụsịrị.

GỊNỊ NA-EME N’EZIE MGBE MMADỤ NWỤRỤ?

Kandụl a fụnyụrụ afụnyụ

Olee ebe ire ọkụ a gara?

5 Ihe na-eme mgbe mmadụ nwụrụ abụghị ihe omimi nye Jehova, bụ́ Onye kere ụbụrụ. Ọ maara ihe bụ́ eziokwu, n’Okwu ya kwa, bụ́ Bible, ọ na-akọwa ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ nọ na ya. Ihe doro anya ọ na-akụzi bụ: Mgbe mmadụ nwụrụ, ọ na-akwụsị ịdị ndụ. Ọnwụ bụ ọnọdụ megidere ndụ. Ndị nwụrụ anwụ adịghị ahụ ụzọ, ha adịghị anụ ihe ma ọ bụ eche echiche. Ọ dịghị akụkụ ahụ́ anyị ọ bụla na-adị ndụ mgbe anyị nwụsịrị. Anyị enweghị mkpụrụ obi ma ọ bụ mmụọ na-adịghị anwụ anwụ.*

6 Mgbe Solomọn kwusịrị na ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ, o dere, sị: ‘Ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.’ Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ kọwakwuru eziokwu ahụ bụ́ isi site n’ikwu na ndị nwụrụ anwụ apụghị ịhụ mmadụ n’anya ma ọ bụ kpọọ mmadụ asị nakwa na “ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị [n’ili].” (Eklisiastis 9:5, 6, 10) N’otu aka ahụ, Abụ Ọma 146:4 na-ekwu na mgbe mmadụ nwụrụ, “echiche ya nile alawo n’iyi.” Anyị na-anwụ anwụ, anyị adịghịkwa adị ndụ ebe ọzọ mgbe anyị nwụsịrị. Ndụ anyị yiri ire ọkụ kandụl. Ọ bụrụ na a fụnyụọ ya, ọ dịghị aga ebe ọzọ. Ọ nyụrụ anyụ.

IHE JIZỌS KWURU BANYERE ỌNWỤ

7 Jizọs Kraịst kwuru okwu banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ. O kwuru okwu banyere ọnọdụ Lazarọs, bụ́ nwoke ọ maara nke ọma nke nwụwokwara anwụ. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Lazarọs enyi anyị agawo izu ike.” Ndị na-eso ụzọ Jizọs chere na ọ na-ekwu na Lazarọs nọ na-ehi ụra iji gbakee n’ọrịa ya. Ha dara ya. Jizọs kọwara, sị: “Lazarọs anwụwo.” (Jọn 11:11-14) Rịba ama na Jizọs ji ọnwụ tụnyere izu ike na ụra. Lazarọs agaghị eluigwe ma ọ bụ ọkụ ala mmụọ. Ọ gakwurughị ndị mmụọ ozi ma ọ bụ ndị nna nna ya. Lazarọs anọghị na-ejikere ịlọ ụwa dị ka onye ọzọ. Ọ nọ na-ezu ike n’ọnwụ, dị ka à ga-asị na ọ nọ n’oké ụra n’arọghị nrọ ọ bụla. Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ ji ọnwụ tụnyere ụra. Dị ka ihe atụ, mgbe e ji nkume tụgbuo Stivin onye na-eso ụzọ, Bible kwuru na ọ “dara n’ụra.” (Ọrụ 7:60) N’otu aka ahụ, Pọl onyeozi dere banyere ụfọdụ ndị n’oge ya, bụ́ ndị ‘dara n’ụra’ ọnwụ.—1 Ndị Kọrint 15:6.

Di na nwunye obi dị ụtọ

Jehova mere mmadụ ka ọ dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’elu ala

8 Chineke ò zubere ná mmalite ka mmadụ na-anwụ anwụ? Ọ dịghị ma ọlị! Jehova mere mmadụ ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ụwa. Dị ka anyị mụworo n’akwụkwọ a, Chineke debere di na nwunye mbụ ahụ na paradaịs mara mma. O nyere ha ezigbo ahụ́ ike. Nanị ihe Jehova chọrọ bụ ihe ga-adịrị ha mma. Ọ̀ dị nna ọ bụla na-ahụ n’anya nke ga-achọ ka ụmụ ya nweta ihe mgbu nke ịka nká na ọnwụ? Ee e! Jehova hụrụ ụmụ ya n’anya, ọ chọkwara ka ha nwee obi ụtọ na-adịghị agwụ agwụ n’ụwa. Banyere ụmụ mmadụ, Bible na-ekwu, sị: “Mgbe ebighị ebi ka [Jehova] tinyeworo n’obi ha.” (Eklisiastis 3:11) Chineke kere anyị inwe ọchịchọ nke ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. O mewokwa ndokwa iji hụ na e mezuru ọchịchọ ahụ.

IHE MERE NDỊ MMADỤ JI ANWỤ ANWỤ

9 N’ihi gịnịzi ka mmadụ ji na-anwụ anwụ? Iji chọta azịza ya, anyị aghaghị ịtụle ihe mere mgbe e nwere nanị otu nwoke na otu nwanyị n’ụwa. Bible na-akọwa, sị: “Jehova, bụ́ Chineke, wee mee ka osisi nile ọ bụla si n’ala puo, bụ́ nke a na-achọsi ike n’ile anya, nke dịkwa mma ihe oriri.” (Jenesis 2:9) Otú ọ dị, ọ dị otu ihe ọ sịrị ka a ghara ime. Jehova gwara Adam, sị: “Mkpụrụ nke sitere n’osisi nile ọ bụla nke ubi a a gbara ogige ka ị ga na-eri eri: ma mkpụrụ nke sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ, gị erila mkpụrụ sitere na ya: n’ihi na n’ụbọchị ị ga-eri mkpụrụ sitere na ya ị ghaghị ịnwụ anwụ.” (Jenesis 2:16, 17) Iwu a esighị ike ndebe. E nwere ọtụtụ mkpụrụ osisi ndị ọzọ Adam na Iv pụrụ iri. Ma ha nwere ohere magburu onwe ya ugbu a iji gosipụta ekele ha nwere n’ebe Onye ahụ nke nyeworo ha ihe nile, gụnyere ndụ zuru okè, nọ. Irube isi na ya ga-egosikwa na ha na-akwanyere ịbụisi nke Nna ha nke eluigwe ùgwù nakwa na ha chọrọ ka o jiri ịhụnanya na-eduzi ha.

10 N’ụzọ dị mwute, di na nwunye mbụ ahụ họọrọ inupụrụ Jehova isi. N’iji agwọ kwuo okwu, Setan jụrụ, Iv, sị: “Ọ̀ ga-abụ ezie na Chineke sịrị, Unu erila mkpụrụ sitere n’osisi ọ bụla nke ubi a a gbara ogige?” Iv ewee zaa, sị: “Anyị na-eri mkpụrụ osisi nile nke ubi a a gbara ogige: ma mkpụrụ nke osisi ahụ nke dị n’etiti ubi a a gbara ogige, Chineke asịwo, Unu erila mkpụrụ sitere na ya, unu emetụkwala ya aka, ka unu wee ghara ịnwụ anwụ.”—Jenesis 3:1-3.

11 Setan kwuru, sị: “Ọ dịghị ọnwụ unu [ga-anwụ].” “Chineke maara na n’ụbọchị unu ga-eri mkpụrụ sitere na ya, mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya unu, unu ewee dị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.” (Jenesis 3:4, 5) Setan chọrọ ka Iv kwere na ọ ga-erite uru site n’iri mkpụrụ osisi ahụ a sịrị ha erila. Dị ka Setan si kwuo, Iv pụrụ ikpebiri onwe ya ihe bụ́ ezi ihe na ihe bụ́ ihe ọjọọ; Iv pụrụ ime ihe ọ bụla ọ chọrọ. Setan gwakwara ya na ihe Jehova sịrị ga-eme ya ma o rie mkpụrụ osisi ahụ abụghị eziokwu. Iv kweere ihe Setan kwuru. N’ihi ya, o weere ụfọdụ n’ime mkpụrụ osisi ahụ rie. Ka e mesịrị, o nyere di ya ụfọdụ, di ya eriekwa ụfọdụ n’ime ya. Ha sara anya na mmiri mee ya. Ha ma na ha na-eme kpọmkwem ihe Chineke gwara ha emela. Site n’iri mkpụrụ osisi ahụ, ha kpachaara anya nupụ isi n’iwu na-esighị ike, nke ezi uche dịkwa na ya. Ha lelịrị Nna ha nke eluigwe na ịbụisi ya. Ha enweghị ihe ngọpụ ọ bụla maka ịghara ịkwanyere Onye Kere ha nke na-ahụ n’anya ùgwù!

12 Iji maa atụ: Olee otú ọ ga-adị gị mgbe ị zụlitesịrị nwa nwoke ma ọ bụ nwa nwanyị, ya amalite inupụrụ gị isi n’ụzọ na-egosi na o nweghị nsọpụrụ ma ọ bụ ịhụnanya n’ebe ị nọ? Nke ahụ ga-agbawa gị obi. Chezienụ ụdị mwute Jehova na-aghaghị inwewo mgbe ma Adam ma Iv nupụụrụ ya isi.

Chineke ji ájá kee Adam

E si n’ájá kpụọ Adam, ọ laghachikwara n’ájá

13 Jehova enweghị ihe mere ọ ga-eji debe Adam na Iv nupụụrụ ya isi ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ha nwụrụ, dị nnọọ ka o kwuru na ha ga-anwụ. Adam na Iv kwụsịrị ịdị adị. Ha agaghị n’ógbè ndị mmụọ. Ọ bụ ihe Jehova gwara Adam mgbe ọ gbasịrị ya ajụjụ banyere nnupụisi ya mere anyị ji mata banyere nke a. Chineke kwuru, sị: “Ị ga-alọta n’ala; n’ihi na e siri na ya wepụta gị; n’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alọta.” (Jenesis 3:19) Chineke sitere n’ájá dị n’ala kpụọ Adam. (Jenesis 2:7) Tupu ya emee otú ahụ, Adam adịghị adị. N’ihi ya, mgbe Jehova kwuru na Adam ga-alaghachi n’ájá, ihe O bu n’uche bụ na Adam ga-alaghachi n’ọnọdụ nke adịghị adị. Adam ga-abụ onye na-adịghị ndụ otú ahụ ájá e ji kpụọ ya bụ ihe na-adịghị ndụ.

14 Adam na Iv gaara anọ ndụ taa, ma ha nwụrụ n’ihi na ha họọrọ inupụrụ Chineke isi ma si otú ahụ mehie. Ihe mere anyị ji anwụ anwụ bụ na Adam bufere ụmụ ya nile mmehie na ọnwụ. (Ndị Rom 5:12) Mmehie ahụ yiri ajọ ọrịa si n’ọbara bụ́ nke ọ na-adịghị onye ọ bụla pụrụ ịgbanahụ ya. Ọnwụ ọ na-akpata bụ n’ihi ọnụ a bụrụ mmadụ. Ọnwụ bụ onye iro, ọ bụghị enyi. (1 Ndị Kọrint 15:26) Lee ka anyị si nwee ekele na Jehova nyere ihe mgbapụta ahụ iji napụta anyị n’aka onye iro a dị egwu!

Ọ BARA URU ỊMARA IHE NDỊ BÚ EZIOKWU BANYERE ỌNWỤ

15 Ihe Bible na-akụzi banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ nọ na ya na-akasi obi. Dị ka anyị hụworo, ndị nwụrụ anwụ adịghị enwe ihe mgbu ma ọ bụ obi mgbawa. Ọ dịghị ihe mere a ga-eji tụwa ha egwu, n’ihi na ha apụghị imerụ anyị ahụ́. Enyemaka anyị adịghị ha mkpa, ha apụghịkwa inyere anyị aka. Anyị apụghị isoro ha kwurịta okwu, ha apụghịkwa isoro anyị kwurịta okwu. Ọtụtụ ndị ndú okpukpe na-azọrọ na ha pụrụ inyere ndị nwụrụ anwụ aka, ndị kwekwara na ihe ndị ndú dị otú ahụ na-ekwu bụ eziokwu na-enye ha ego. Ma ịmata ihe ndị bụ́ eziokwu ga-eme ka ndị na-akụzi ụgha dị otú ahụ ghara ịghọgbu anyị.

16 Okpukpe gị ò kweere n’ihe Bible na-akụzi banyere ndị nwụrụ anwụ? Ọtụtụ ekweghị. N’ihi gịnị? N’ihi na Setan agwagbuwo ozizi ha. Ọ na-eji okpukpe ụgha eme ka ndị mmadụ kwere na mgbe ahụ́ ha nwụrụ na ha na-anọgide na-adị ndụ n’ógbè ndị mmụọ. Nke a bụ ụgha Setan na-agwakọta ya na ụgha ndị ọzọ iji mee ka ndị mmadụ gbakụta Jehova Chineke azụ. N’ụzọ dị aṅaa?

17 Dị ka e kwuru n’elu, ụfọdụ okpukpe na-akụzi na ọ bụrụ na mmadụ ebie ndụ ọjọọ, mgbe ọ nwụrụ, ọ ga-aga ebe a na-emekpa mmadụ ahụ́ n’ime ọkụ ruo mgbe ebighị ebi. Ozizi a na-akparị Chineke. Jehova bụ Chineke ịhụnanya, ọ dịghịkwa mgbe ọ ga-eme ka ndị mmadụ taa ahụhụ n’ụzọ dị otú a. (1 Jọn 4:8) Olee otú ọ ga-adị gị ma ị hụ nwoke na-enye nwatakịrị nupụrụ isi ahụhụ site n’itinye aka ya n’ọkụ. Ị̀ ga-akwanyere nwoke dị otú ahụ ùgwù? N’eziokwu, ị̀ ga-achọdị ka e nwee ihe ga-ejikọ gị na ya? Ọ dịghị ma ọlị! O yikarịrị ka ị ga-eche na obi tara ya mmiri. Ma, Setan chọrọ ka anyị kwenye na Jehova na-emekpa ndị mmadụ ahụ́ n’ime ọkụ ruo mgbe ebighị ebi!

18 Setan na-ejikwa okpukpe ụfọdụ eme ihe iji kụzie na mgbe mmadụ nwụrụ, ọ na-aghọ mmụọ bụ́ nke ndị dị ndụ na-aghaghị ịkwanyere ùgwù ma na-asọpụrụ. Dị ka ozizi a si dị, mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ pụrụ ịghọ ezigbo ndị enyi ma ọ bụ ajọ ndị iro. Ọtụtụ ndị kweere ụgha a. Ha na-atụ ndị nwụrụ anwụ egwu ma na-asọpụrụ ha, na-efekwa ha ofufe. N’ụzọ dị iche, Bible na-akụzi na ndị nwụrụ anwụ na-ehi ụra nakwa na anyị kwesịrị ife nanị ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, bụ́ Onye Okike anyị na Onye Na-enye Ihe.—Mkpughe 4:11.

19 Ịmata ihe ndị bụ́ eziokwu banyere ndị nwụrụ anwụ ga-echebe gị pụọ n’ịbụ onye e ji ụgha dị iche iche nke okpukpe duhie. Ọ ga-enyekwara gị aka ịghọta ozizi ndị ọzọ nke Bible. Dị ka ihe atụ, mgbe ị ghọtara na ndị mmadụ adịghị aga n’ógbè ndị mmụọ mgbe ha nwụrụ, ị ga-abịa lee nkwa nke ndụ ebighị ebi n’ime paradaịs elu ala anya dị ka nke ga-abara gị uru n’ezie.

20 Ogologo oge gara aga, onye ezi omume ahụ bụ́ Job jụrụ, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ ga-adị ndụ ọzọ?” (Job 14:14) À pụrụ ime ka onye na-adịghị ndụ nke na-ehi ụra ọnwụ dịghachi ndụ? Ihe Bible na-akụzi banyere nke a na-akasi nnọọ obi, dị ka isiakwụkwọ na-esonụ ga-egosi.

IHE BIBLE NA-AKỤZI

  • Ndị nwụrụ anwụ adịghị ahụ ụzọ ma ọ bụ na-anụ ihe ma ọ bụ na-eche echiche. —Eklisiastis 9:5.
  • Ndị nwụrụ anwụ na-ezu ike; ha adịghị ata ahụhụ.—Jọn 11:11.
  • Anyị na-anwụ anwụ n’ihi na anyị ketara mmehie site n’aka Adam.—Ndị Rom 5:12.

*  Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere okwu bụ́ “mkpụrụ obi” na “mmụọ,” biko lee Ihe Odide Ntụkwasị.


Ajụjụ nke Paragraf Ndị A Na-Amụ Amụ

1-3. Ajụjụ ndị dị aṅaa ka ndị mmadụ na-ajụ banyere ọnwụ, azịza ndị dịkwa aṅaa ka okpukpe dị iche iche na-enye?

4. Olee echiche bụ́ isi ọtụtụ okpukpe nwere banyere ọnwụ?

5, 6. Gịnị ka Bible na-akụzi banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ?

7. Olee otú Jizọs si gosi ihe ọnwụ dị ka ya?

8. Olee otú anyị si mara na Chineke ezubeghị ka mmadụ na-anwụ anwụ?

9. Olee ihe Jehova sịrị Adam emela, n’ihi gịnịkwa ka iwu a na-ejighị bụrụ nke siri ike ndebe?

10, 11. (a) Olee otú di na nwunye mbụ ahụ si nupụrụ Chineke isi? (b) N’ihi gịnị ka nnupụisi nke Adam na Iv na-ejighị bụrụ obere okwu?

12. Gịnị pụrụ inyere anyị aka ịghọta otú obi dị Jehova mgbe Adam na Iv nupụụrụ ya isi?

13. Gịnị ka Jehova kwuru ga-eme Adam mgbe ọ nwụrụ, gịnịkwa ka ọ pụtara?

14. N’ihi gịnị ka anyị ji anwụ anwụ?

15. N’ihi gịnị ka ịmata ihe ndị bụ́ eziokwu banyere ndị nwụrụ anwụ ji akasi obi?

16. Ònye gwagbuworo ozizi nke ọtụtụ okpukpe, n’ụzọ dịkwa aṅaa?

17. N’ihi gịnị ka ozizi nke imekpa mmadụ ahụ́ ruo mgbe ebighị ebi ji bụrụ nke na-akparị Jehova?

18. Olee ụgha okpukpe nke ife ndị nwụrụ anwụ dabeere na ya?

19. Ịmata ihe ndị bụ́ eziokwu banyere ọnwụ na-enyere anyị aka ịghọta ozizi ọzọ dị aṅaa nke Bible?

20. Ajụjụ dị aṅaa ka anyị ga-atụle n’isiakwụkwọ na-esonụ?

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Bụ Hel? Ọ̀ Bụ Ebe A Na-ata Mmadụ Ahụhụ Ruo Ebighị Ebi?

À na-ata ndị mmehie ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ? Ọ̀ bụ ụgwọ ọrụ nke mmehie? Gụọ ihe a ka ị mata ihe Baịbụl zara n’ajụjụ ndị a.