Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

ISI NKE ABỤỌ

Bible—Akwụkwọ Sitere n’Aka Chineke

Bible—Akwụkwọ Sitere n’Aka Chineke

N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Bible si dị iche n’akwụkwọ ọ bụla ọzọ?

Olee otú Bible pụrụ isi nyere gị aka ịnagide nsogbu ndị i nwere?

N’ihi gịnị ka ị pụrụ iji tụkwasị amụma ndị e dekọrọ na Bible obi?

Ị̀ PỤRỤ icheta oge ezi enyi gị nyere gị onyinye pụrụ iche? Ma eleghị anya, ọ bụghị nanị na nke ahụ masịrị gị kamakwa o mere gị obi ụtọ. N’ezie, ọ dị ihe onyinye e nyere gị na-egosi banyere onye nyere gị ya—na o ji ọbụbụenyi gị na ya kpọrọ ihe. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na i kelere enyi gị maka otú o si jiri obi ya nile nye gị onyinye.

2 Bible bụ onyinye sitere n’aka Chineke, bụ́ nke anyị pụrụ inwe ekele maka ya n’ezie. Akwụkwọ a pụrụ iche na-ekpughe ihe ndị anyị na-apụghị ịchọta ebe ọ bụla ọzọ. Dị ka ihe atụ, ọ na-agwa anyị banyere otú e si kee eluigwe nke jupụtara na kpakpando, ụwa, nakwa nwoke na nwanyị mbụ. Bible nwere ụkpụrụ ndị a pụrụ ịdabere na ha, bụ́ ndị ga-enyere anyị aka ịnagide nsogbu na nchegbu ndị a na-enwe ná ndụ. Ọ na-akọwa otú Chineke ga-esi mezuo nzube ya ma weta ọnọdụ ndị ka mma n’ụwa. Lee ka Bible si bụrụ onyinye na-akpali mmasị!

3 Bible bụkwa onyinye na-enye obi ụtọ, n’ihi na ọ dị ihe ọ na-ekpughe banyere Onye nyere ya, bụ́ Jehova Chineke. Eziokwu ahụ bụ́ na o nyere akwụkwọ dị otú ahụ bụ ihe na-agba akaebe na ọ chọrọ ka anyị mara ya nke ọma. N’ezie, Bible pụrụ inyere gị aka ịbịaru Jehova nso.

4 Ọ bụrụ na i nwere Bible, ị bụ otu n’ime ọtụtụ ndị nwere ya. E bipụtawo Bible n’ozuzu ya ma ọ bụ n’akụkụ ya ụfọdụ n’ihe karịrị asụsụ 2,300, n’ihi ya kwa, ihe karịrị pasent 90 nke ndị bi n’ụwa pụrụ inweta ya. Ná nkezi, a na-ekesa ihe karịrị otu nde Bible kwa izu! E bipụtawo ọtụtụ ijeri Bible n’ozuzu ya ma ọ bụ n’akụkụ ya ụfọdụ. N’ezie, ọ dịghị akwụkwọ ọzọ dị ka Bible.

E nwere “New World Translation of the Holy Scriptures” n’ọtụtụ asụsụ

E nwere Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’ọtụtụ asụsụ

5 Ọzọkwa, Bible “sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke.” (2 Timoti 3:16) N’ụzọ dị aṅaa? Bible n’onwe ya na-aza, sị: “Ndị mmadụ sitere na Chineke kwuo okwu mgbe mmụọ nsọ na-edu ha.” (2 Pita 1:21) Iji maa atụ: Ọchụ ntá ego pụrụ ịgwa odeakwụkwọ ya ka o dee akwụkwọ ozi. Ihe ọ ga-ede n’akwụkwọ ozi ahụ bụ echiche na ntụziaka nke ọchụ ntá ego ahụ. N’ihi ya, ọ bụ akwụkwọ ozi ọchụ ntá ego ahụ n’ezie, ọ bụghị nke odeakwụkwọ ya. N’otu aka ahụ, Bible nwere ozi sitere n’aka Chineke, o siteghị n’aka ndị mmadụ dere ya. N’ezie, Bible dum bụ “okwu Chineke.”—1 Ndị Tesalonaịka 2:13.

O NWERE NKWEKỌ MA ZIE EZI

6 O were ihe karịrị afọ 1,600 iji dee Bible. Ndị dere ya biri ndụ n’oge dịgasị iche iche, nọrọkwa n’ọnọdụ dị iche iche. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị ọrụ ugbo, ndị ọkụ azụ, na ndị ọzụzụ atụrụ. Ndị ọzọ bụ ndị amụma, ndị ikpe, na ndị eze. Luk, bụ́ onye so dee Oziọma ahụ, bụ dọkịta. N’agbanyeghị ọnọdụ dịgasị iche iche nke ndị dere ya, Bible nwere nkwekọ site ná mmalite ruo ná ngwụsị ya.*

7 Akwụkwọ mbụ nke Bible na-agwa anyị otú nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ si malite. Akwụkwọ nke ikpeazụ na-egosi na ụwa dum ga-aghọ paradaịs, ma ọ bụ ubi a gbara ogige. Akụkụ dị iche iche nke Bible na-ekwu banyere ihe ndị mere n’ọtụtụ puku afọ, ha na-enyekwa aka n’ụzọ ụfọdụ n’ime ka a ghọta mmezu nke nzube Chineke. Akụkụ dị iche iche nke Bible nwere nnọọ nkwekọrịta, ma ọ bụnụ ihe anyị ga-atụ anya ya n’akwụkwọ sitere n’aka Chineke.

8 Bible ziri ezi n’ihe banyere nkà mmụta sayensị. Ọ kụziri ihe ndị a chọpụtara na ha bara uru ka ogologo oge gasịrị. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ Levitikọs nwere iwu ndị e nyere Izrel oge ochie banyere ịkpọpụ onye na-arịa ụdị ọrịa ụfọdụ iche na idebe ihe ọcha, ebe mba ndị gbara ha gburugburu na-amaghị ihe ọ bụla banyere ihe ndị dị otú ahụ. N’oge mgbe a na-ekwu ihe ndị na-ezighị ezi banyere ọdịdị nke ụwa, Bible zoro aka na ya dị ka ihe dị gburugburu. (Aịsaịa 40:22) Bible kwuru n’ụzọ ziri ezi na ụwa ‘na-ekokwasị n’ihe na-abụghị ihe.’ (Job 26:7) N’ezie, Bible abụghị akwụkwọ nkà mmụta sayensị. Ma, mgbe o kwuru ihe metụtara nkà mmụta sayensị, ọ na-ezi ezi. Nke a ọ́ bụghị ihe anyị ga-atụ anya ya n’akwụkwọ sitere n’aka Chineke?

9 Bible ziri ezi n’ihe banyere akụkọ ihe mere eme, a pụkwara ịtụkwasị ya obi. Ọ kapịrị okwu ọnụ n’akụkọ ya. Ọ na-agụnye ọ bụghị nanị aha ndị mmadụ kamakwa usoro ọmụmụ ha.# N’ụzọ dị iche n’ebe ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme nke ụwa nọ, bụ́ ndị na-adịghị ekwukebe mmeri e meriri ndị nke ha, ndị so dee Bible kwuru eziokwu, ọbụna dekọọ mmejọ nke ha onwe ha na mba ha. Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ Bible bụ́ Ọnụ Ọgụgụ, onye dere ya, bụ́ Mozis, kwetara na ya mejọrọ nnọọ ihe, bụ́ nke mere ka a dọọ ya aka ná ntị n’ụzọ siri ike. (Ọnụ Ọgụgụ 20:2-12) A dịghị ahụcha eziokwu otú ahụ n’ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme ndị ọzọ, ma a na-ahụ ya n’ime Bible n’ihi na ọ bụ akwụkwọ sitere n’aka Chineke.

AKWỤKWỌ NA-EGOSIPỤTA AMAMIHE BARA URU

10 Ebe ọ bụ na Bible sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ ‘bara uru maka izi ihe, maka ịdọ aka ná ntị, maka ime ka ihe guzozie.’ (2 Timoti 3:16) Ee, Bible bụ akwụkwọ bara uru. Ọ na-egosipụta na ọ ghọtara ọdịdị nke ụmụ mmadụ nke ọma. Nke ahụ abụghị ihe ijuanya, n’ihi na Onye o sitere n’aka ya, bụ́ Jehova Chineke, bụ Onye Okike! Ọ ghọtara otú anyị si eche echiche na mmetụta ndị anyị na-enwe karịa anyị. Ọzọkwa, Jehova maara ihe ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ. Ọ makwaara ụzọ ndụ ndị anyị kwesịrị izere.

11 Tụlee okwu Jizọs nke a kpọrọ Ozizi Elu Ugwu, bụ́ nke e dekọrọ na Matiu isi nke 5 ruo isi nke 7. N’ozizi a bụ́ ịgba, Jizọs kwuru okwu banyere ọtụtụ ihe, gụnyere ụzọ isi nweta ezi obi ụtọ, ụzọ isi dozie nsogbu, ụzọ isi kpee ekpere, na ụzọ isi lee ihe onwunwe anya n’ụzọ ziri ezi. Okwu Jizọs ka dị ike ma baa uru taa otú ahụ ha dị mgbe o kwuru ha.

12 Ụfọdụ ụkpụrụ Bible metụtara ndụ ezinụlọ, ọrụ, àgwà, na iso ndị ọzọ na-enwe mmekọrịta. Ụkpụrụ Bible na-emetụta mmadụ nile, ndụmọdụ ya na-aba uru mgbe nile. A chịkọtara amamihe dị na Bible n’okwu Chineke kwuru site n’ọnụ Aịzaịa onye amụma: “Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru.”—Aịsaịa 48:17.

AKWỤKWỌ AMỤMA

13 Bible nwere ọtụtụ amụma, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha mezuworo. Tụlee otu ihe atụ. Site n’ọnụ Aịzaịa onye amụma, bụ́ onye dịrị ndụ na narị afọ nke asatọ T.O.A., Jehova buru amụma na a ga-ebibi obodo Babilọn. (Aịsaịa 13:19; 14:22, 23) E kwuru ihe dị iche iche ga-ewere ọnọdụ iji gosi kpọmkwem otú nke a ga-esi mee. Usuu ndị agha nke ga-awakpo Babilọn ga-eme ka mmiri dị n’osimiri ya takọọ ma jiri ụkwụ banye n’obodo ahụ n’alụghị agha ọ bụla. Ọ bụghị nanị nke ahụ. Amụma Aịzaịa ọbụna kpọrọ aha eze ga-emeri Babilọn—Saịrọs.—Aịsaịa 44:27-45:2.

Aịzaịa, bụ́ onye so dee Bible, buru amụma banyere ọdịda Babilọn

Nwoke na-agụ banyere otú e si bibie Babịlọn

14 Ihe dị ka afọ 200 mgbe nke ahụ gasịrị—n’abalị nke October 5/6, 539 T.O.A.—usuu ndị agha mara ụlọikwuu na nso Babilọn. Ònye bụ ọchịagha ha? Eze peshia aha ya bụ́ Saịrọs. O wee bụrụ otú a ka e si kwadebe ala maka mmezu nke amụma dị ịtụnanya. Ma usuu ndị agha Saịrọs hà ga-abanye na Babịlọn n’alụghị agha ọ bụla, dị ka e buru n’amụma?

15 Ndị Babịlọn nọ na-eme ememe n’abalị ahụ ma chee na ha nọ ná nchebe n’obodo ha nnukwu mgbidi gbara gburugburu. N’oge ahụ, Saịrọs jiri nkà chee osimiri ahụ na-asọfe n’obodo ukwu ahụ ihu n’ebe ọzọ. N’oge na-adịghị anya mmiri ahụ talatara otú ndị agha ya ga-enwe ike iji ụkwụ gafere na ya ma rute ná mgbidi obodo ahụ. Ma olee otú ndị agha Saịrọs ga-esi gafee ná mgbidi Babilọn? N’ihi otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ, n’abalị ahụ, e chezọrọ imechi ọnụ ụzọ obodo ahụ!

16 E buru amụma banyere Babilọn, sị: “Ọ gaghị abụ ebe obibi ọzọ ruo mgbe ebighị ebi; a gaghị ebikwa n’ime ya ruo ọgbọ nile: onye Arebia agaghị amakwa ụlọikwuu ya n’ebe ahụ; ndị ọzụzụ atụrụ agaghị emekwa ka atụrụ ha makpuo n’ebe ahụ.” (Aịsaịa 13:20) Amụma a ekwughị nanị banyere ọdịda nke obodo. Ọ na-egosi na Babilọn ga-atọgbọrọ n’efu ruo mgbe ebighị ebi. Ị pụrụ ịhụ ihe àmà na-egosi na okwu ndị a mezuru. Ebe Babilọn oge ochie dịbu, bụ́ nke mmadụ na-ebighịzi na ya—nke dị ihe dị ka kilomita 80 n’ebe ndịda Baghdad, Iraq—bụ ihe akaebe na-egosi na ihe Jehova kwuru site n’ọnụ Aịzaịa emezuwo: “M ga-ewerekwa azịza, bụ́ mkpochapụ, zachapụ ya.”—Aịsaịa 14:22, 23.%

Mkpọmkpọ ebe nke Babịlọn

Mkpọmkpọ ebe nke Babịlọn

17 Ịmata na Bible bụ akwụkwọ nwere amụma a pụrụ ịtụkwasị obi na-ewusi okwukwe ike, ọ́ bụghị ya? N’ezie, ebe ọ bụ na Jehova Chineke mezuru nkwa ndị o kwere n’oge ndị gara aga, anyị nwere ihe mere anyị ga-eji nwee obi ike na ọ ga-emezukwa nkwa o kwere maka ụwa paradaịs. (Ọnụ Ọgụgụ 23:19) N’ezie, anyị nwere “olileanya ndụ ebighị ebi nke Chineke, onye na-apụghị ịgha ụgha, kwere ná nkwa tupu mgbe dị anya gara aga.”—Taịtọs 1:2.^

“OKWU CHINEKE DỊ NDỤ”

18 Ihe ndị anyị tụleworo n’isiakwụkwọ a emewo ka o doo anya na Bible bụ n’ezie akwụkwọ pụrụ iche. Ma, ọ bụghị nanị nkwekọrịta nke akụkụ ya dị iche iche, izi ezi ya n’ihe banyere nkà mmụta sayensị nakwa n’akụkọ ihe mere eme, amamihe bara uru ọ na-egosipụta, na amụma ya ndị a pụrụ ịdabere na ha, mere o ji baa uru. Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi dere, sị: “Okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike, dịkwa nkọ karịa mma agha ihu abụọ ọ bụla, na-amapukwa amapu ọbụna ruo n’ikewa mkpụrụ obi na mmụọ, nakwa nkwonkwo na ụmị ha, o nwekwara ike ịchọpụta echiche na ebumnuche nke obi.”—Hibru 4:12.

19 Ịgụ “okwu” Chineke ma ọ bụ ozi ya nke dị n’ime Bible pụrụ ịgbanwe ndụ anyị. Ọ pụrụ inyere anyị aka inyocha onwe anyị ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Anyị pụrụ ikwu na anyị hụrụ Chineke n’anya, ma otú anyị si emeghachi omume n’ihe Okwu ya e dere site n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible, na-akụzi ga-ekpughe ihe bụ́ echiche anyị n’ezie, ọbụna ebumnuche nke obi.

20 Bible bụ n’ezie akwụkwọ sitere n’aka Chineke. Ọ bụ akwụkwọ e kwesịrị ịgụ, ịmụ, na iji akpọrọ oké ihe. Gosi na i nwere ekele maka onyinye a sitere n’aka Chineke site n’ịnọgide na-atụle ihe ndị dị n’ime ya. Ka ị na-eme otú ahụ, ị ga-aghọta nke ọma ihe Chineke na-ezube maka ihe a kpọrọ mmadụ. A ga-atụle kpọmkwem ihe nzube ahụ bụ na otú ọ ga-esi mezuo n’isiakwụkwọ na-esonụ.

IHE BIBLE NA-AKỤZI

  • Bible sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, n’ihi ya kwa o ziri ezi ma bụrụ nke a pụrụ ịtụkwasị obi.—2 Timoti 3:16.
  • Ihe ọmụma dị n’Okwu Chineke bara uru maka ndụ a na-adị kwa ụbọchị.—Aịsaịa 48:17.
  • Nkwa Chineke ndị dị na Bible ga-emezurịrị.—Ọnụ Ọgụgụ 23:19.

*  Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị na-ekwu na akụkụ ụfọdụ nke Bible na-emegide akụkụ ya ndị ọzọ, nzọrọ ndị dị otú ahụ enweghị ihe ndabere. Lee peeji nke 14-17 nke broshuọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, bụ́ nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

#  Dị ka ihe atụ, lee usoro ọmụmụ Jizọs nke e depụtara n’ụzọ zuru ezu na Luk 3:23-38.

%  Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere amụma Bible, lee peeji nke 27-29 nke broshuọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, bụ́ nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^  Mbibi nke Babilọn bụ nanị otu ihe atụ nke amụma Bible mezuru emezu. Ihe atụ ndị ọzọ na-agụnye mbibi nke Taịa na Ninive. (Ezikiel 26:1-5; Zefanaịa 2:13-15) Ọzọkwa, amụma Daniel kwuru na ọtụtụ alaeze ukwu ga-esochi ibe ha mgbe e bibisịrị Babilọn. Ha na-agụnye Midia na Peshia nakwa Gris. (Daniel 8:5-7, 20-22) Lee Ihe Odide Ntụkwasị maka ntụle nke ọtụtụ amụma ndị metụtara Mezaịa bụ́ ndị mezuru n’ebe Jizọs Kraịst nọ.


Ajụjụ nke Paragraf Ndị A Na-Amụ Amụ

1, 2. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Bible si bụrụ onyinye na-akpali mmasị nke sitere n’aka Chineke?

3. Gịnị ka onyinye Jehova nyere anyị Bible na-egosi anyị banyere Jehova, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji bụrụ ihe na-enye obi ụtọ?

4. Gịnị masịrị gị n’otú e si ekesa Bible?

5. N’ụzọ dị aṅaa ka Bible si bụrụ ihe “sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke”?

6, 7. N’ihi gịnị ka nkwekọ nke akụkụ dị iche iche nke Bible ji bụrụ ihe kwesịrị nnọọ ịrịba ama?

8. Nye ihe atụ ndị na-egosi na Bible ziri ezi ma a bịa n’ihe banyere nkà mmụta sayensị.

9. (a) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Bible si egosi na ya ziri ezi n’ihe banyere akụkọ ihe mere eme nakwa na a pụrụ ịtụkwasị ya obi? (b) Gịnị ka otú ndị dere Bible si kwuo nnọọ eziokwu na ya na-agwa gị banyere Bible?

10. N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị bụrụ ihe ijuanya na Bible bụ akwụkwọ bara uru?

11, 12. (a) Ihe ndị dị aṅaa ka Jizọs kwuru okwu banyere ha n’Ozizi Elu Ugwu ya? (b) Olee ihe ndị ọzọ Bible kwuru okwu banyere ha, n’ihi gịnịkwa ka ndụmọdụ ya ji bụrụ nke oge ya na-adịghị agafe agafe?

13. Ihe ndị dị aṅaa ka Jehova mere ka Aịzaịa onye amụma dekọọ banyere Babilọn?

14, 15. Olee otú ihe ụfọdụ Aịzaịa buru n’amụma banyere Babilọn si mezuo?

16. (a) Gịnị ka Aịzaịa buru n’amụma ga-emesị dakwasị Babilọn? (b) Olee otú amụma Aịzaịa banyere mbibi a ga-ebibi Babilọn si mezuo?

17. Olee otú mmezu nke amụma Bible si bụrụ ihe na-ewusi okwukwe ike?

18. Gịnị bụ okwu dị ike nke Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi kwuru banyere “okwu Chineke”?

19, 20. (a) Olee otú Bible pụrụ isi nyere gị aka inyocha onwe gị? (b) Olee otú ị pụrụ isi gosipụta ekele i nwere maka Bible, bụ́ onyinye pụrụ iche sitere n’aka Chineke?

GỤKWUO GBASARA YA

Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị?

Baịbụl na-enyere ọtụtụ ndị aka ịmata azịza ajụjụ ndị dị ezigbo mkpa. Ị̀ ga-achọ ka Baịbụl nyere gị aka?