Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

ISI NKE IRI NA ASATọ

Baptizim na Mmekọrịta Gị na Chineke

Baptizim na Mmekọrịta Gị na Chineke

Olee otú Ndị Kraịst si eme baptizim?

Olee ihe ndị ọ ga-adị mkpa ka i mee iji ruo eru maka baptizim?

Olee otú mmadụ si arara onwe ya nye Chineke?

Olee nzube bụ́ isi e ji eme baptizim?

“LEE! Mmiri; gịnị na-egbochi ime m baptizim?” Ọ bụ onye Etiopia na-arụ n’obí eze jụrụ ajụjụ ahụ na narị afọ mbụ. Onye Kraịst aha ya bụ Filip emewo ka o doo ya anya na Jizọs bụ Mezaịa ahụ e kwere ná nkwa. N’ịbụ onye ihe ọ mụtara n’Akwụkwọ Nsọ kpaliri, nwoke Etiopia ahụ mere ihe. O gosipụtara na ya chọrọ ka e mee ya baptizim!—Ọrụ 8:26-36.

Onye Etiopia na-arụ ọrụ n’obí eze na narị afọ mbụ

2 Ọ bụrụ na i sorowo Ndịàmà Jehova mụọ isiakwụkwọ ndị bu ụzọ n’akwụkwọ a nke ọma, ị pụrụ ịchọ ịjụ, sị: ‘Gịnị na-egbochi ime m baptizim?’ Ka ọ na-erula ugbu a, ị mataworị nkwa Bible kwere maka ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs. (Luk 23:43; Mkpughe 21:3, 4) Ị mụtawokwa banyere ihe bụ́ n’ezie ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ nakwa banyere olileanya mbilite n’ọnwụ. (Eklisiastis 9:5; Jọn 5:28, 29) Ma eleghị anya, i sowo Ndịàmà Jehova na-aga nzukọ ọgbakọ ha, ị hụwokwa n’onwe gị na ha na-ekpe ezi okpukpe. (Jọn 13:35) Nke kakwarị mkpa, o yiri ka ị malitewo iso Jehova Chineke na-enwe mmekọrịta.

3 Olee otú ị pụrụ isi gosi na ị chọrọ ijere Chineke ozi? Jizọs gwara ụmụazụ ya, sị: “Gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptizim.” (Matiu 28:19) Jizọs n’onwe ya setịpụrụ ihe nlereanya na nke a site n’ịbụ onye e mere baptizim n’ime mmiri. E fesaghị ya mmiri efesa, a wụsaghịkwa ya mmiri n’isi. (Matiu 3:16) Okwu ahụ bụ́ “mee baptizim” sitere n’okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “mikpuo.” N’ihi ya, baptizim Ndị Kraịst pụtara ịbụ onye e mikpuru n’ime mmiri kpamkpam.

4 A chọrọ ka ndị nile chọrọ iso Jehova Chineke na-enwe mmekọrịta bụrụ ndị e mere baptizim n’ime mmiri. Baptizim na-egosipụta n’ihu ọha na ị chọrọ ijere Chineke ozi. Ọ na-egosi na ime uche Jehova na-atọ gị ụtọ. (Abụ Ọma 40:7, 8) Otú ọ dị, iji ruo eru maka baptizim, ọ dị ihe ụfọdụ ị na-aghaghị ime.

IHE ỌMỤMA NA OKWUKWE DỊ MKPA

5 Ị maliteworị ime ihe mbụ i kwesịrị ime. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụ site n’inweta ihe ọmụma banyere Jehova Chineke na Jizọs Kraịst, ikekwe site n’ịmụchi Bible anya. (Jọn 17:3) Ma, a ka nwere ihe ndị ọzọ ọ dị mkpa ka ị mụta. Ndị Kraịst kwesịrị ịbụ ndị ‘jupụtara n’ezi ihe ọmụma nke uche [Chineke].’ (Ndị Kọlọsi 1:9) Ịga nzukọ ọgbakọ Ndịàmà Jehova ga-enyere gị nnọọ aka n’akụkụ a. Ọ dị mkpa ka ị na-aga nzukọ ndị dị otú ahụ. (Ndị Hibru 10:24, 25) Ịgachi nzukọ anya ga-enyere gị aka inwetakwu ihe ọmụma banyere Chineke.

Inweta ezi ihe ọmụma nke Okwu Chineke bụ ihe dị mkpa a ga-eme iji ruo eru maka baptizim

Ọmụmụ Bible

6 Otú ọ dị, ọ dịghị mkpa na ị ga-amata ihe nile dị n’ime Bible iji ruo eru maka baptizim. Onye Etiopia ahụ na-arụ n’obí eze nwere ihe ọmụma ụfọdụ banyere Akwụkwọ Nsọ, ma ọ chọrọ enyemaka iji ghọta akụkụ ya ụfọdụ. (Ọrụ 8:30, 31) N’otu aka ahụ, ị ka nwere ọtụtụ ihe ị ga-amụta. N’eziokwu, ị ga-anọgide na-amụ banyere Chineke n’akwụsịghị akwụsị. (Eklisiastis 3:11) Otú ọ dị, tupu e mee gị baptizim, ọ dị mkpa ka ị mata ma nakwere ma ọ dịghị ihe ọzọ ozizi ndị bụ́ isi nke Bible. (Ndị Hibru 5:12) Ozizi ndị dị otú ahụ na-agụnye ihe ndị bụ́ eziokwu banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ na mkpa aha Chineke na Alaeze ya dị.

7 Otú ọ dị, o bighị nanị n’inwe ihe ọmụma n’ihi na “ma okwukwe adịghị ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị [Chineke] ezi mma.” (Ndị Hibru 11:6) Bible na-agwa anyị na mgbe ụfọdụ ndị nọ n’obodo oge ochie bụ́ Kọrint nụrụ ozi Ndị Kraịst, ha “malitere ikwere nakwa ịbụ ndị e mere baptizim.” (Ọrụ 18:8) N’otu aka ahụ, ịmụ Bible kwesịrị ime ka i nwee okwukwe siri ike na ọ bụ Okwu Chineke nke e dere site n’ike mmụọ nsọ. Ọmụmụ Bible kwesịrị inyere gị aka inwe okwukwe ná nkwa Chineke, o kwesịkwara inyere gị aka ikwenyesi ike na àjà Jizọs pụrụ ịzọpụta ndụ.—Joshua 23:14; Ọrụ 4:12; 2 Timoti 3:16, 17.

ỊKỤZIRI NDỊ ỌZỌ EZIOKWU BIBLE

8 Ka okwukwe gị na-esiwanye ike, obi agaghị ekwe gị ịhapụ ịgwa ndị ọzọ ihe ndị ị mụtaworo. (Jeremaịa 20:9) Ị ga-enwe nnọọ ọchịchọ siri ike ịkọrọ ndị ọzọ banyere Chineke na nzube ya.—2 Ndị Kọrint 4:13.

Okwukwe kwesịrị ịkpali gị ịkọrọ ndị ọzọ ihe ndị i kweere

Nwoke na-ezi onye ọzọ ozi ọma

9 Ị pụrụ ịmalite ịkọrọ ndị ọzọ eziokwu Bible site n’iji nkà na-agwa ndị ikwu gị, ndị enyi gị, ndị agbata obi gị, na ndị ọrụ ibe gị banyere ya. Ka oge na-aga, ị ga-achọ ikere òkè n’ọrụ nkwusa a haziri ahazi nke Ndịàmà Jehova na-arụ. Mgbe i nwere ọchịchọ dị otú ahụ, alala azụ isoro Onyeàmà na-akụziri gị Bible kwurịta nke ahụ. Ọ bụrụ na o yie ka ì ruru eru ikere òkè n’ọrụ nkwusa, a ga-eme ndokwa ka gị na onye na-eduziri gị ọmụmụ Bible soro ndị okenye abụọ nke ọgbakọ zukọọ.

10 Nke a ga-eme ka i nwee ike ịmatakwu ụfọdụ ndị okenye ọgbakọ, bụ́ ndị na-azụ ìgwè atụrụ Chineke. (Ọrụ 20:28; 1 Pita 5:2, 3) Ọ bụrụ na ndị okenye ahụ achọpụta na ị ghọtara ozizi ndị bụ́ isi nke Bible ma kwenye na ha, na ị na-ebi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke, nakwa na ị chọrọ n’ezie ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ha ga-agwa gị na i ruru eru ikere òkè n’ọrụ nkwusa dị ka onye nkwusa ozi ọma, bụ́ onye a na-emebeghị baptizim.

11 N’aka nke ọzọ, ọ pụrụ ịdị mkpa ka i mee mgbanwe ụfọdụ n’ụzọ i si ebi ndụ nakwa n’àgwà gị iji ruo eru ikwusa ozi ọma. Nke a pụrụ ịgụnye ịkwụsị ihe ụfọdụ ị na-ezo ezo eme. N’ihi ya, tupu i kwuo na ị chọrọ ịghọ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim, ọ dị mkpa ka ị kwụsị ime mmehie ndị dị oké njọ, ndị dị ka mmekọahụ rụrụ arụ, aṅụrụma, na ịṅụ ọgwụ ọjọọ.—1 Ndị Kọrint 6:9, 10; Ndị Galeshia 5:19-21.

NCHEGHARỊ NA NCHIGHARỊ

12 Ọ dị ihe ndị ọzọ ị ga-emerịrị tupu i ruo eru maka baptizim. Pita onyeozi kwuru, sị: “Chegharịanụ, chigharịakwanụ ka e wee hichapụ mmehie unu.” (Ọrụ 3:19) Ichegharị bụ igosipụta ezi mwute maka ihe i mere. Nchegharị dị nnọọ mkpa ma ọ bụrụ na mmadụ ebiwo ndụ rụrụ arụ, ma ọ dịkwa mkpa ọbụna ma ọ bụrụ na mmadụ ebiwo ndụ dịtụ ọcha. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na mmadụ nile bụ ndị mmehie, mgbaghara Chineke dịkwa ha mkpa. (Ndị Rom 3:23; 5:12) Tupu ị malite ịmụ Bible, ị maghị ihe bụ́ uche Chineke. Ya mere, o nweghị otú ọ ga-esi bụrụ na i biwo ndụ kwekọrọ nnọọ n’uche ya. N’ihi ya, nchegharị dị gị mkpa.

13Nchigharị aghaghị isochi ‘nchegharị.’ Ị ga-emerịrị ihe karịrị ịkwa ụta. Ọ dị mkpa ka ị kwụsị ụdị ndụ ị na-ebibu ma kpebisie ike na ị ga-eme ihe ziri ezi site ugbu a gawa. Ị ghaghị igosipụta nchegharị ma chigharịa tupu e mee gị baptizim.

Ị RARA ONWE GỊ NYE

14 Ọ dị ihe ọzọ dị mkpa ị ga-eme tupu e mee gị baptizim. Ị ghaghị ịrara onwe gị nye Jehova Chineke.

15 Mgbe ị na-arara onwe gị nye Jehova Chineke n’ekpere siri ike, ị na-ekwe ya nkwa ife nanị ya ofufe ruo mgbe ebighị ebi. (Deuterọnọmi 6:15) Otú ọ dị, n’ihi gịnị ka mmadụ ga-eji chọọ ime otú ahụ? Ọ dị mma, ka e were ya na nwa okorobịa nwere nwa agbọghọ ọ na-elenyere anya. Ka ọ na-amatakwu ya ma hụ na o nwere àgwà ọma, otú ahụ ka ọ ga na-enwewanye mmasị n’ebe ọ nọ. Ka oge na-aga, ọ ga-enwe mkpali ịgwa ya na ya chọrọ ịlụ ya. N’eziokwu, ịlụ nwanyị nwekwara ibu nke ya. Ma ịhụnanya ga-akpali ya iwere nzọụkwụ ahụ dị mkpa.

16 Ọ bụrụ na ị mata Jehova ma hụ ya n’anya, ị ga-enwe mkpali iji obi gị dum jeere ya ozi n’ekweghị ka ihe ọ bụla dọlaa gị azụ n’ofufe ị na-efe ya. Onye ọ bụla nke chọrọ iso Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs Kraịst, aghaghị “ịjụ onwe ya.” (Mak 8:34) Anyị na-ajụ onwe anyị site n’ịhụ na ọchịchọ na ihe mgbaru ọsọ onwe onye adịghị egbochi anyị irubere Chineke isi n’ụzọ zuru ezu. Ya mere, tupu e mee gị baptizim, ime uche Jehova Chineke aghaghị ịbụ nzube gị bụ́ isi ná ndụ.—1 Pita 4:2.

IMERI ỤJỌ ỌDỊDA

17 Obi adịghị aka ụfọdụ ndị ịrara onwe ha nye Jehova n’ihi na ha na-atụ ụjọ iwere nzọụkwụ ahụ dị mkpa. Ha pụrụ ịtụ ụjọ na ha ga-aza ajụjụ n’ihu Chineke dị ka Ndị Kraịst raara onwe ha nye. N’ihi ịtụ ụjọ na ha pụrụ ịda ma ọ bụ mechuo Jehova ihu, ha na-eche na ọ kasị mma ịghara ịrara onwe ha nye ya.

18 Ka ị na-amụta ịhụ Jehova n’anya, ị ga-enwe mkpali ịrara onwe gị nye ya na ime ihe nile i nwere ike ime iji bie ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nraranye ahụ. (Eklisiastis 5:4) Mgbe i mesịrị nraranye, ị ga-achọ n’ezie ‘ije ije n’ụzọ kwesịrị Jehova iji bụrụ onye na-eme ihe na-amasị ya n’ụzọ zuru ezu.’ (Ndị Kọlọsi 1:10) N’ihi ịhụnanya i nwere n’ebe Chineke nọ, ị gaghị eche na ime uche ya sibigara ike ókè. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-ekwenyere Jọn onyeozi, bụ́ onye dere, sị: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị debe ihe ndị o nyere n’iwu; ma ihe ndị o nyere n’iwu adịghịkwa arọ.”—1 Jọn 5:3.

19 Ọ bụghị iwu na ị ga-ezu okè tupu ị rara onwe gị nye Chineke. Jehova maara adịghị ike gị, ọ dịghịkwa mgbe ọ ga-atụ anya ka i mee karịa ókè i nwere ike ime. (Abụ Ọma 103:14) Ọ chọrọ ka i nwee ihe ịga nke ọma, ọ ga-akwado ma nyere gị aka. (Aịsaịa 41:10) I kwesịrị ijide n’aka na ọ bụrụ na ị tụkwasị Jehova obi gị nile, ọ “ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie.”—Ilu 3:5, 6.

IGOSIPỤTA NRARANYE GỊ SITE N’ỊBỤ ONYE E MERE BAPTIZIM

20 Ịtụgharị uche n’ihe ndị a anyị tụlere ugbu a pụrụ inyere gị aka ịrara onwe gị nye Jehova n’ekpere. Onye ọ bụla nke hụrụ Chineke n’anya aghaghị ‘ime nkwupụta ihu ọha maka nzọpụta.’ (Ndị Rom 10:10) Olee otú ị ga-esi mee nke ahụ?

Ị̀ rarawo onwe gị nye Chineke n’ekpere?

Nwoke na-ekpe ekpere

21 Mee ka onyeisi oche ndị nlekọta nke ọgbakọ gị mara na ị chọrọ ka e mee gị baptizim. Ọ ga-eme ndokwa ka ụfọdụ ndị okenye soro gị tụlee ọtụtụ ajụjụ ndị metụtara ozizi ndị bụ́ isi nke Bible. Ọ bụrụ na ndị okenye a ekweta na i ruru eru, ha ga-agwa gị na a pụrụ ime gị baptizim ná mgbakọ na-abịanụ.* A na-ekwukarị okwu na-atụleghachi ihe baptizim pụtara n’oge ndị dị otú ahụ. Ọkà okwu na-agwazi ndị nile a na-aga ime baptizim ka ha zaa ajụjụ abụọ dị mfe dị ka ụzọ isi jiri ọnụ mee “nkwupụta ihu ọha” banyere okwukwe ha.

22 Ọ bụ baptizim ahụ n’onwe ya na-eme ka a mata gị n’ihu ọha dị ka onye rarawooro onwe ya nye Chineke, nke bụkwa otu n’ime Ndịàmà Jehova ugbu a. A na-emikpu ndị a na-eme baptizim n’ime mmiri iji gosipụta n’ihu ọha na ha ararawo onwe ha nye Jehova.

IHE BAPTIZIM GỊ PỤTARA

23 Jizọs kwuru na a ga-eme ndị na-eso ụzọ ya baptizim “n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ.” (Matiu 28:19) Nke a pụtara na onye a na-aga ime baptizim nakweere ịbụisi Jehova Chineke na nke Jizọs Kraịst. (Abụ Ọma 83:18; Matiu 28:18) Ọ ghọtakwara ókè mmụọ nsọ Chineke ma ọ bụ ike ya nọ n’ọrụ na-ekere.—Ndị Galeshia 5:22, 23; 2 Pita 1:21.

Baptizim pụtara ịnwụ n’ụzọ ndụ anyị mbụ na ịdịghachi ndụ iji mee uche Chineke

Nwoke a na-eme baptizim

24 Otú ọ dị, baptizim abụghị ịsa ahụ́ nkịtị. Ọ na-egosipụta otu ihe dị nnọọ mkpa. Ịbụ onye e mikpuru n’ime mmiri na-egosipụta na ị nwụwo n’ụzọ ndụ gị mbụ. Ịbụ onye e si n’ime mmiri kulite na-egosi na ị dị ndụ ugbu a ime uche Chineke. Chetakwa na ọ bụ Jehova Chineke n’onwe ya ka ị raara onwe gị nye, ọ bụghị otu ọrụ, ihe omume, mmadụ ndị ọzọ, ma ọ bụ otu òtù. Nrara ị raara onwe gị nye na ịbụ onye e mere baptizim bụ mmalite nke ezi ọbụbụenyi gị na Chineke—ezi mmekọrịta nke gị na ya.—Abụ Ọma 25:14.

25 Ọ pụtaghị na e mehaala gị Baptizim nzọpụta abụrụla nke gị. Pọl onyeozi dere, sị: “Nọgidenụ jiri egwu na ịma jijiji na-arụpụta nzọpụta nke onwe unu.” (Ndị Filipaị 2:12) Baptizim bụ nanị mmalite. Ajụjụ abụrụ, Olee otú ị pụrụ isi nọgide n’ịhụnanya Chineke? Isiakwụkwọ nke ikpeazụ ga-aza ajụjụ a.

IHE BIBLE NA-AKỤZI

  • Baptizim Ndị Kraịst na-agụnye imikpu mmadụ n’ime mmiri kpamkpam, ọ bụghị ifesa ya mmiri.—Matiu 3:16.
  • Ihe ndị mbụ na-eduga n’ịbụ onye e mere baptizim bụ inweta ihe ọmụma na igosipụta okwukwe, ihe ndị na-esochi ha bụ nchegharị, nchigharị, na ịrara onwe onye nye Chineke.—Jọn 17:3; Ọrụ 3:19; 18:8.
  • Iji rara onwe gị nye Jehova, ị ghaghị ịjụ onwe gị, ọbụna dị ka ndị mmadụ na-ajụ onwe ha iji soro Jizọs.—Mak 8:34.
  • Baptizim na-egosipụta mmadụ ịnwụ n’ụzọ ndụ ya mbụ na ịdịghachi ndụ iji mee uche Chineke.—1 Pita 4:2.

*  Baptizim na-eso n’ihe ndị a na-emekarị ná mgbakọ ukwu na nke nta nke Ndịàmà Jehova na-enwe kwa afọ.


Ajụjụ nke Paragraf Ndị A Na-Amụ Amụ

1. N’ihi gịnị ka otu onye Etiopia na-arụ n’obí eze ji kwuo ka e mee ya baptizim?

2. N’ihi gịnị ka i ji kwesị ichesi echiche ike banyere baptizim?

3. (a) Iwu dị aṅaa ka Jizọs nyere ụmụazụ ya? (b) Olee otú e si eme baptizim ime mmiri?

4. Gịnị ka ịbụ onye e mere baptizim n’ime mmiri na-egosipụta?

5. (a) Olee ihe mbụ ị ga-eme iji ruo eru maka baptizim? (b) N’ihi gịnị ka nzukọ Ndị Kraịst ji dị mkpa?

6. Ihe ọmụma hà aṅaa nke Bible ka ị na-aghaghị inweta iji ruo eru maka baptizim?

7. Mmetụta dị aṅaa ka ịmụ Bible kwesịrị inwe n’ahụ́ gị?

8. Gịnị ga-akpali gị ịkọrọ ndị ọzọ ihe ndị ị mụtaworo?

9, 10. (a) Ole ndị ka ị pụrụ ịmalite ịkọrọ eziokwu Bible? (b) Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị chọrọ ikere òkè n’ọrụ nkwusa a haziri ahazi nke Ndịàmà Jehova na-arụ?

11. Mgbanwe ndị dị aṅaa ka ụfọdụ na-aghaghị ime tupu ha eruo eru ikwusa ozi ọma?

12. N’ihi gịnị ka nchegharị ji dị mkpa?

13. Gịnị bụ nchigharị?

14. Olee ihe dị mkpa ị ga-emerịrị tupu e mee gị baptizim?

15, 16. Gịnị ka ịrara onwe gị nye Chineke pụtara, gịnịkwa na-akpali mmadụ ime nke a?

17. Gịnị mere obi adịghị aka ụfọdụ ndị ịrara onwe ha nye Chineke?

18. Gịnị pụrụ ịkpali gị ịrara onwe gị nye Jehova?

19. N’ihi gịnị ka ị na-ekwesịghị ịtụ egwu ịrara onwe gị nye Chineke?

20. N’ihi gịnị ka mmadụ ga-eji mee ka ọha mara banyere nrara ọ raara onwe ya nye Jehova?

21, 22. Olee otú ị pụrụ isi mee “nkwupụta ihu ọha” banyere okwukwe gị?

23. Gịnị ka ịbụ onye e mere baptizim “n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ” pụtara?

24, 25. (a) Gịnị ka baptizim na-egosipụta? (b) Olee ajụjụ dị mkpa ka a zaa?