Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

ISI NKE IRI NA ANỌ

Ụzọ Isi Mee Ka Ndụ Ezinụlọ Gị Na-enye Obi Ụtọ

Ụzọ Isi Mee Ka Ndụ Ezinụlọ Gị Na-enye Obi Ụtọ

Gịnị dị mkpa iji bụrụ ezigbo di?

Nwanyị ọ̀ pụrụ isi aṅaa bụrụ ezi nwunye?

Olee ihe ịbụ ezigbo nne ma ọ bụ ezigbo nna gụnyere?

Olee otú ụmụaka pụrụ isi nye aka ime ka ndụ ezinụlọ na-enye obi ụtọ?

JEHOVA CHINEKE chọrọ ka ndụ ezinụlọ gị na-enye obi ụtọ. Okwu ya, bụ́ Bible, na-enye onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ndụmọdụ, na-akọwakwa ọrụ Chineke chọrọ ka onye nke ọ bụla na-arụ. Ọ bụrụ na ndị nọ n’ezinụlọ emee òkè ha n’ụzọ kwekọrọ na ndụmọdụ Chineke, ọ ga-ewetara ha afọ ojuju. Jizọs, sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke ma na-edebe ya!”—Luk 11:28.

2 Isi ihe ga-eme ka ezinụlọ anyị na-enwe obi ụtọ bụ anyị ịghọta na ọ bụ Jehova, bụ́ onye Jizọs kpọrọ “Nna Anyị,” malitere ezinụlọ. (Matiu 6:9) Ihe mere e ji nwee ezinụlọ dị iche iche n’ụwa bụ na Nna anyị nke eluigwe chọrọ ka ha dịrị—ọ makwa n’ezie ihe na-eme ka ezinụlọ na-enwe obi ụtọ. (Ndị Efesọs 3:14, 15) N’ihi ya, gịnị ka Bible na-akụzi banyere ọrụ dịịrị onye nke ọ bụla nọ n’ezinụlọ?

Ọ BỤ CHINEKE MALITERE EZINỤLỌ MMADỤ

3 Jehova kere mmadụ abụọ mbụ, bụ́ Adam na Iv, ma jikọta ha ọnụ ịbụ di na nwunye. O tinyere ha n’ebe obibi bụ́ paradaịs elu ala, nke mara mma—ogige Iden—ma gwa ha ka ha mụọ ụmụ. “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa,” ka Jehova kwuru. (Jenesis 1:26-28; 2:18, 21-24) Nke a abụghị nnọọ akụkọ ifo, n’ihi na Jizọs gosiri na ihe Jenesis na-ekwu banyere otú ezinụlọ si malite bụ eziokwu. (Matiu 19:4, 5) Ọ bụ ezie na anyị na-eche ọtụtụ nsogbu ihu, ndụ adịghịkwa otú Chineke zubere ya, ka anyị hụ ihe mere inwe obi ụtọ n’ezinụlọ ga-ej4 Onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ pụrụ inye aka mee ka ndụ ezinụlọ na-enye obi ụtọ site n’iṅomi Chineke n’igosipụta ịhụnanya. (Ndị Efesọs 5:1, 2) Otú ọ dị, olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Chineke, ebe ọ bụ na anyị apụghị ịhụ ya anya? Anyị pụrụ ịmata otú Jehova si eme ihe n’ihi na o si n’eluigwe zite Ọkpara ya n’ụwa. (Jọn 1:14, 18) Mgbe ọ nọ n’ụwa, Ọkpara a, bụ́ Jizọs Kraịst, ṅomiri Nna ya nke eluigwe nke ọma nke na ịhụ Jizọs na ige ya ntị dị nnọọ ka iso Jehova nọrọ na ige Ya ntị. (Jọn 14:9) N’ihi ya, site n’ịmụ banyere ịhụnanya Jizọs gosipụtara nakwa n’ịgbaso ihe nlereanya ya, onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ inye aka mee ka ndụ ezinụlọ na-enye obi ụtọ karị.i kwe omume.

4 Onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ pụrụ inye aka mee ka ndụ ezinụlọ na-enye obi ụtọ site n’iṅomi Chineke n’igosipụta ịhụnanya. (Ndị Efesọs 5:1, 2) Otú ọ dị, olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Chineke, ebe ọ bụ na anyị apụghị ịhụ ya anya? Anyị pụrụ ịmata otú Jehova si eme ihe n’ihi na o si n’eluigwe zite Ọkpara ya n’ụwa. (Jọn 1:14, 18) Mgbe ọ nọ n’ụwa, Ọkpara a, bụ́ Jizọs Kraịst, ṅomiri Nna ya nke eluigwe nke ọma nke na ịhụ Jizọs na ige ya ntị dị nnọọ ka iso Jehova nọrọ na ige Ya ntị. (Jọn 14:9) N’ihi ya, site n’ịmụ banyere ịhụnanya Jizọs gosipụtara nakwa n’ịgbaso ihe nlereanya ya, onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ inye aka mee ka ndụ ezinụlọ na-enye obi ụtọ karị.

IHE NLEREANYA NKE NDỊ BÚ DI GA-AGBASO

5 Bible na-ekwu na ndị bụ́ di kwesịrị ịdị na-emeso nwunye ha otú ahụ Jisọs si emeso ndị na-eso ụzọ ya. Tụlee ntụziaka a Bible nyere: “Ndị bụ́ di, nọgidenụ na-ahụ nwunye unu n’anya, dị nnọọ ka Kraịst ahụ hụkwara ọgbakọ ahụ n’anya ma nyefee onwe ya maka ya…N’ụzọ dị otú a, ndị bụ́ di kwesịrị ịdị na-ahụ nwunye ha n’anya dị ka ahụ́ nke ha. Onye hụrụ nwunye ya n’anya hụrụ onwe ya n’anya, n’ihi na ọ dịghị nwoke kpọtụworo anụ ahụ́ nke ya asị; kama ọ na-azụ ma na-elezi ya anya, dị ka Kraịst ahụ na-emekwara ọgbakọ ahụ.”—Ndị Efesọs 5:23, 25-29.

6 Ịhụnanya Jizọs gosiri ọgbakọ nke ndị na-eso ụzọ ya bụụrụ ndị bụ́ di ihe nlereanya zuru okè. Jizọs “hụrụ ha n’anya ruo ọgwụgwụ,” chụọ ndụ ya n’àjà n’ihi ha n’agbanyeghị na ha ezughị okè. (Jọn 13:1; 15:13) N’otu aka ahụ, a na-agba ndị bụ́ di ume, sị: “Nọgidenụ na-ahụ nwunye unu n’anya, unu adịkwala na-eweso ha iwe n’ụzọ dị ilu.” (Ndị Kọlọsi 3:19) Gịnị ga-enyere onye bụ́ di aka itinye ndụmọdụ dị otú ahụ n’ọrụ, karịsịa ma ọ bụrụ na nwunye ya adịghị eji ezi uche eme ihe mgbe ụfọdụ? O kwesịrị icheta na ya onwe ya na-emehie ihe, chetakwa ihe ndị ọ na-aghaghị ime iji nweta mgbaghara Chineke. Gịnị ka ọ na-aghaghị ime? Ọ ghaghị ịgbaghara ndị mejọrọ ya, nke ahụ gụnyekwara nwunye ya. N’ezie, nwunye ya kwesịkwara ime otú ahụ. (Matiu 6:12, 14, 15) Ị̀ hụla ihe mere ụfọdụ ndị ji kwuo na alụmdi na nwunye na-aga nke ọma bụ njikọ nke mmadụ abụọ na-eme nke ọma n’ịgbaghara mmejọ?

7 Ndị bụ́ di kwesịrị iburu n’uche na Jizọs na-echebara ndị na-eso ụzọ ya echiche mgbe nile. Ọ ghọtara na ha nwere adịghị ike na mkpa anụ ahụ́. Dị ka ihe atụ, mgbe ike gwụrụ ha, o kwuru, sị: “Unu onwe unu, bịanụ nanị unu n’ebe ndị mmadụ na-adịghị anọkarị ma zurutụ ike.” (Mak 6:30-32) E kwesịkwara ichebara ndị bụ́ nwunye echiche. Bible kọwara ha dị ka “ihe ka bụrụ nke na-esighị ike,” bụ́ ndị e nyere ndị bụ́ di iwu ka ha na-ekenye “nsọpụrụ.” N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na di na nwunye nwechara “ihu ọma na-erughịrị mmadụ nke ndụ.” (1 Pita 3:7) Ndị bụ́ di kwesịrị icheta na ọ bụ ikwesị ntụkwasị obi na-eme ka mmadụ bụrụ onye Chineke hụrụ n’anya, ọ bụghị ma onye ahụ ọ̀ bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị.—Abụ Ọma 101:6.

8 Bible na-ekwu na di nke “hụrụ nwunye ya n’anya hụrụ onwe ya n’anya.” Nke a bụ n’ihi na, dị ka Jizọs kọwara, nwoke na nwunye ya “abụkwaghị anụ ahụ́ abụọ, kama otu.” (Matiu 19:6) N’ihi ya, ha ekwesịghị inwe mmasị iso onye ọzọ nwee mmekọahụ. (Ilu 5:15-21; Ndị Hibru 13:4) Ha agaghị eme otú ahụ ma ọ bụrụ na ha ejiri ezi obi na-egbo mkpa ibe ha. (1 Ndị Kọrint 7:3-5) Ihe ncheta a kwesịrị ịrịba ama: “Ọ dịghị nwoke kpọtụworo anụ ahụ́ nke ya asị; kama ọ na-azụ ma na-elezi ya anya.” Di kwesịrị ịhụ nwunye ya n’anya dị ka ọ hụrụ onwe ya n’anya, na-echeta na ya ga-aza onye bụ́ isi ya, bụ́ Jizọs Kraịst, ajụjụ.—Ndị Efesọs 5:29; 1 Ndị Kọrint 11:3.

9 Pọl onyeozi kwuru banyere ‘mmetụta dị nro nke Kraịst Jizọs nwere.’ (Ndị Filipaị 1:8) Mmetụta dị nro Jizọs nwere bụ àgwà na-eme ka ahụ́ ruo ndị ọzọ ala, nke dọkwaara mmasị ndị inyom ghọrọ ndị na-eso ụzọ ya. (Jọn 20:1, 11-13, 16) Ọ na-agụsikwa ndị bụ́ nwunye agụụ ike ka di ha na-egosi ha mmetụta dị nro.

IHE NLEREANYA NKE DỊỊRỊ NDỊ BỤ́ NWUNYE

10 Ezinụlọ bụ òtù, ọ chọkwara onyeisi iji na-aga nke ọma. Ọbụna Jizọs nwere Onye ọ na-edo onwe ya n’okpuru ya dị ka Isi ya. “Isi nke Kraịst ahụ bụ Chineke,” dịkwa ka “isi nke nwanyị bụ nwoke.” (1 Ndị Kọrint 11:3) Odido Jizọs doro onwe ya n’okpuru ịchịisi Chineke bụ ezi ihe nlereanya n’ihi na anyị nile nwere onyeisi nke anyị na-aghaghị ido onwe anyị n’okpuru ya.

11 Ndị ikom na-ezughị okè na-emehie ihe, ọtụtụ mgbe kwa ha adịghị nnọọ eru ihe a chọrọ n’aka ụdị ndị isi ezinụlọ a tụrụ anya ka ha bụrụ. N’ihi ya, gịnị ka nwunye kwesịrị ime? O kwesịghị ilelị ihe di ya na-eme ma ọ bụ gbalịa iweghara ọnọdụ ịbụisi ya. Nwunye kwesịrị icheta na a bịa n’otú Chineke si ele ihe anya, mmụọ dị jụụ na nke dị nwayọọ bara oké uru. (1 Pita 3:4) Site n’igosipụta mmụọ dị otú ahụ, ọ ga-adịrị ya mfe ido onwe ya n’okpuru dị ka Chineke si chọọ, ọbụna mgbe e nwere ọnọdụ ndị tara akpụ. Ọzọkwa, Bible na-ekwu, sị: “Nwunye kwesịrị inwe nkwanye ùgwù miri emi maka di ya.” (Ndị Efesọs 5:33) Ma gịnị ma ọ bụrụ na di ya anakwereghị Kraịst dị ka Isi ya? Bible na-agba ndị bụ́ nwunye ume, sị: “Na-edonụ onwe unu n’okpuru di nke aka unu, ka, ọ bụrụ na o nwere ndị na-adịghị erubere okwu ahụ isi, e wee rite ha n’uru n’ekwughị okwu ọ bụla site n’omume nke nwunye ha, n’ihi ịbụ ndị jiworo anya ha hụ omume unu nke dị ọcha, ya na nkwanye ùgwù miri emi.”—1 Pita 3:1, 2.

Ezi ihe nlereanya dị aṅaa ka Sera setịpụụrụ ndị bụ́ nwunye?

Ebe Sera na-agwa Ebreham okwu

12 Ma di ya ọ̀ bụ onye kwere ekwe ibe ya ma ọ bụ na ọ bụghị, ọ gaghị abụ enweghị nkwanye ùgwù ma nwanyị jiri nkà kwupụta echiche dị iche na nke di ya. Echiche ya pụrụ izi ezi, ezinụlọ ahụ dum pụkwara irite uru ma ọ bụrụ na di ya egee ya ntị. Ọ bụ ezie na Ebreham jụrụ ajụ mgbe nwunye ya, bụ́ Sera, tụrụ aro maka otu ihe bara uru ha ga-eme iji dozie otu nsogbu ha nwere n’ezinụlọ ha, Chineke gwara ya, sị: “Gee ntị n’olu ya.” (Jenesis 21:9-12) N’ezie, mgbe di mere mkpebi n’ikpeazụ bụ́ nke na-emebighị iwu Chineke, nwunye ya ga-edo onwe ya n’okpuru site n’ịkwado ya.—Ọrụ 5:29; Ndị Efesọs 5:24.

13 Iji mezuo òkè nke ya, nwunye pụrụ ilekọta ezinụlọ ya n’ọtụtụ ụzọ. Dị ka ihe atụ, Bible na-egosi na ndị lụrụ di kwesịrị “ịhụ di ha n’anya, ịhụ ụmụ ha n’anya, inwe uche zuru okè, ịdị ọcha, ịbụ ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ, ndị ezi mmadụ, na-edo onwe ha n’okpuru di nke aka ha.” (Taịtọs 2:4, 5) Nwunye na nne nke na-eme omume otú a ga-abụ onye ezinụlọ ya ga-anọgide na-ahụ n’anya ma na-akwanyere ùgwù. (Ilu 31:10, 28) Otú ọ dị, ebe ọ bụ na alụmdi na nwunye bụ nkekọ nke mmadụ abụọ na-ezughị okè, ọnọdụ ndị sibigara ike ókè pụrụ ịkpata nkewa ma ọ bụ ịgba alụkwaghịm. Bible kwuru na di na nwunye pụrụ ikewa n’ihi ihe ụfọdụ. Ma, nkewa abụghị obere okwu, n’ihi na Bible na-adụ ọdụ, sị: “Nwunye ekwesịghị ịhapụ di ya;…di ekwesịghịkwa ịhapụ nwunye ya.” (1 Ndị Kọrint 7:10, 11) Nanị ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru na a pụrụ iji maka ya gbaa alụkwaghịm bụ ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye.—Matiu 19:9.

IHE NLEREANYA ZURU OKÈ NKE DỊỊRỊ NDỊ NNE NA NNA

14 Jizọs setịpụụrụ ndị nne na nna ihe nlereanya zuru okè n’ụzọ o si mesoo ụmụaka. Mgbe ndị ọzọ gbalịrị igbochi obere ụmụaka ịbịakwute Jizọs, o kwuru, sị: “Kwenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m; unu anwala igbochi ha.” Bible kwuru na mgbe ahụ, o “kukwaara ụmụaka ahụ n’aka ya wee malite ịgọzi ha, na-ebikwasị ha aka n’isi.” (Mak 10:13-16) Ebe ọ bụ na Jizọs wepụtara oge soro obere ụmụaka nọkọọ, í kwesịghị imere ụmụ gị otu ihe ahụ? Ihe ha chọrọ abụghị ka gị na ha na-anọtụ nwa obere oge nwa obere oge kama ka ị na-ewepụta oge dị ukwuu iji soro ha nọrịa. Ọ dị mkpa ka i wepụta oge iji kụziere ha ihe, n’ihi na nke ahụ bụ ihe Jehova nyere ndị nne na nna ntụziaka ime.—Deuterọnọmi 6:4-9.

Gịnị ka ndị mụrụ ụmụ pụrụ ịmụta site n’otú Jizọs si mesoo ụmụaka?

1. Ebe Jizọs na-agwa ụmụ ntakịrị okwu; 2. Ebe nna na-agwa nwa ya nwoke okwu

15 Ka ụwa a na-ajọwanye njọ, ụmụaka chọrọ ndị nne na nna ga na-echebe ha pụọ n’aka ndị na-achọ imerụ ha ahụ́, dị ka ndị na-edina ụmụaka. Tụlee otú Jizọs si chebe ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ ndị o ji ịhụnanya kpọọ “ụmụntakịrị.” Mgbe e jidere ya, gajekwa igbu ya, Jizọs mere ka ndị na-eso ụzọ ya nwee ohere ịgbalaga. (Jọn 13:33; 18:7-9) Dị ka nne ma ọ bụ nna, ọ dị mkpa ka ị mụrụ anya iji chọpụta mgbalị ndị Ekwensu na-eme imerụ ụmụ gị ahụ́. Ọ dị mkpa ka i buru ụzọ dọọ ha aka ná ntị tupu ha abanye ná nsogbu.* (1 Pita 5:8) Ha nọ nnọọ n’ihe ize ndụ ugbu a n’ụzọ anụ ahụ́, n’ụzọ ime mmụọ, nakwa n’omume karịa mgbe ọ bụla ọzọ.

16 N’abalị bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, ndị na-eso ụzọ ya rụrụ ụka banyere onye ka ukwuu n’ime ha. Kama iwere ha iwe, Jizọs ji ịhụnanya nọgide na-agbazi ha site n’okwu ọnụ nakwa n’omume. (Luk 22:24-27; Jọn 13:3-8) Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ị̀ hụla otú ị pụrụ isi gbasoo ihe nlereanya Jizọs n’ụzọ i si agbazi ụmụ gị? N’eziokwu, e kwesịrị ịdọ ha aka ná ntị, ma a ga-eme ya n’ụzọ na-agabighị ókè, n’ejighịkwa iwe. I kwesịghị ikwu okwu n’echeghị eche “dị ka ndụpu nke mma agha.” (Jeremaịa 30:11; Ilu 12:18) I kwesịrị ịdọ nwa gị aka ná ntị n’ụzọ ọ ga-emesị chọpụta na o kwesịrị ekwesị.—Ndị Efesọs 6:4; Ndị Hibru 12:9-11.

IHE NLEREANYA NKE DỊỊRỊ ỤMỤAKA

17 Ụmụaka hà pụrụ ịmụta ihe n’aka Jizọs? Ee, ha pụrụ! Site n’ihe nlereanya nke ya, Jizọs gosiri otú ụmụaka kwesịrị isi na-erubere ndị mụrụ ha isi. “Dị nnọọ ka Nna m ziri m,” ka o kwuru, “otú a ka m na-ekwu.” Ọ gbakwụnyere, sị: “M na-eme ihe dị ya mma mgbe nile.” (Jọn 8:28, 29) Jizọs rubeere Nna ya nke eluigwe isi, Bible na-agwakwa ụmụaka ka ha na-erubere nne na nna ha isi. (Ndị Efesọs 6:1-3) Ọ bụ ezie na Jizọs bụ nwa zuru okè, o rubeere nne na nna ya, bụ́ Josef na Meri, bụ́ ndị na-ezughị okè, isi. N’ezie, nke ahụ mere ka onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ Jizọs nwee obi ụtọ!—Luk 2:4, 5, 51, 52.

18 Ụmụaka hà pụrụ ịhụ ụzọ ndị ha pụrụ isi ṅomie Jizọs ma mee ka ndị mụrụ ha nwee obi ụtọ? N’eziokwu, mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ isiri ndị na-eto eto ike irubere ndị mụrụ ha isi, ma nke ahụ bụ ihe Chineke chọrọ ka ụmụaka na-eme. (Ilu 1:8; 6:20) Jizọs na-erubere Nna ya nke eluigwe isi mgbe nile, ọbụna n’ọnọdụ ndị tara akpụ. N’otu oge, mgbe ọ bụ uche Chineke ka Jizọs mee otu ihe tara nnọọ akpụ, Jizọs kwuru, sị: “Wepụ iko a [otu ihe a chọrọ ka o mee] n’ebe m nọ.” Otú ọ dị, Jizọs mere ihe Chineke kwuru, n’ihi na ọ ghọtara na Nna ya maara ihe kasị mma. (Luk 22:42) Site n’irube isi, ụmụaka ga-eme ka ndị mụrụ ha na Nna ha nke eluigwe nwee nnọọ obi ụtọ.#—Ilu 23:22-25.

Gịnị ka ndị na-eto eto kwesịrị iche banyere ya mgbe a nwara ha ọnwụnwa?

Ebe nwatakịrị nwoke na-ajụ ọnwụnwa ụmụ akwụkwọ ibe ya nwara ya

19 Ekwensu nwara Jizọs, anyị pụkwara ijide n’aka na ọ ga-anwakwa ndị na-eto eto ime ihe ọjọọ. (Matiu 4:1-10) Setan bụ́ Ekwensu na-eji nrụgide ndị ọgbọ eme ihe, bụ́ nke na-adịghị adị mfe iguzogide. Ya mere, lee nnọọ ka o si dị mkpa ka ụmụaka ghara iso ndị na-eme ihe ọjọọ na-akpakọrịta! (1 Ndị Kọrint 15:33) Nwa nwanyị Jekọb bụ́ Daịna sooro ndị na-adịghị efe Jehova na-akpakọrịta, nke ahụ kpatakwara nnukwu nsogbu. (Jenesis 34:1, 2) Chegodị otú ọ ga-esi wute ezinụlọ ma ọ bụrụ na otu onye nọ na ya enwee mmekọahụ rụrụ arụ!—Ilu 17:21, 25.

ISI IHE NA-AKPATA OBI ỤTỌ EZINỤLỌ

20 Ọ na-adị mfe ịnagide nsogbu ndị e nwere n’ezinụlọ ma ọ bụrụ na e tinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ. N’ezie, itinye ndụmọdụ dị otú ahụ n’ọrụ bụ isi ihe na-akpata obi ụtọ ezinụlọ. N’ihi ya, ndị bụ́ di, hụnụ nwunye unu n’anya, na-emesokwanụ ha otú ahụ Jizọs si emeso ọgbakọ ya. Ndị bụ́ nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di unu, na-agbasokwanụ ihe nlereanya nke nwanyị na-ejide onwe ya nke ọma, bụ́ onye a kọwara n’Ilu 31:10-31. Ndị mụrụ ụmụ, na-enyenụ ụmụ unu ọzụzụ. (Ilu 22:6) Ndị bụ́ nna, ‘na-elekọtanụ ezinụlọ unu n’ụzọ dị mma.’ (1 Timoti 3:4, 5; 5:8) Ụmụ, na-erubekwaranụ ndị mụrụ unu isi. (Ndị Kọlọsi 3:20) Ọ dịghị onye zuru okè n’ezinụlọ, n’ihi na mmadụ nile na-emehie ihe. N’ihi ya, na-adịnụ umeala n’obi, na-arịọkwanụ ibe unu mgbaghara.

21 N’ezie, Bible nwere ọtụtụ ndụmọdụ na ntụziaka ndị bara uru, bụ́ ndị metụtara ezinụlọ. Ọzọkwa, ọ na-akụziri anyị banyere ụwa ọhụrụ Chineke nakwa paradaịs elu ala nke ndị nwere obi ụtọ, bụ́ ndị na-efe Jehova, ga-ejupụta na ya. (Mkpughe 21:3, 4) Lee nnọọ atụmanya magburu onwe ya nke ahụ bụ! Ọbụnadị ugbu a, anyị pụrụ inwe ndụ ezinụlọ na-enye obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị agbasoo ntụziaka ndị Chineke nyere n’Okwu ya, bụ́ Bible.

IHE BIBLE NA-AKỤZI

  • Ọ dị mkpa ka ndị bụ́ di hụ nwunye ha n’anya dị ka ahụ́ nke onwe ha.—Ndị Efesọs 5:25-29.
  • Ndị bụ́ nwunye kwesịrị ịhụ ezinụlọ ha n’anya ma na-akwanyere di ha ùgwù.—Taịtọs 2:4, 5.
  • Ọ dị mkpa ka ndị mụrụ ụmụ na-ahụ ụmụ ha n’anya, na-akụziri ha ihe, ma na-echebe ha.—Deuterọnọmi 6:4-9.
  • Ọ dị mkpa ka ụmụaka na-erubere ndị mụrụ ha isi.—Ndị Efesọs 6:1-3.

*  Ihe enyemaka maka ichebe ụmụaka dị n’Isi nke 32 nke akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ, bụ́ nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

#  Nanị mgbe ọ ga-ezi ezi ka nwatakịrị nupụrụ ndị mụrụ ya isi bụ ma ha gwa ya ka o mee ihe megidere iwu Chineke.—Ọrụ 5:29.


Ajụjụ nke Paragraf Ndị A Na-Amụ Amụ

1. Gịnị bụ isi ihe na-eme ka ndụ ezinụlọ na-enye obi ụtọ?

2. Iji mee ka ezinụlọ anyị na-enwe obi ụtọ, gịnị ka anyị kwesịrị ịghọta?

3. Nkọwa dị aṅaa ka Bible nyere banyere otú ezinụlọ mmadụ si malite, oleekwa otú anyị si mara na ihe o kwuru bụ eziokwu?

4. (a) Olee otú onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ pụrụ isi nyere ezinụlọ ya aka inwe obi ụtọ? (b) N’ihi gịnị ka ịmụ banyere ndụ Jizọs ji dị nnọọ mkpa maka obi ụtọ ezinụlọ?

5, 6. (a) Olee otú ụzọ Jizọs si emeso ọgbakọ si bụrụ ihe nlereanya nye ndị bụ́ di? (b) Olee ihe mmadụ na-aghaghị ime iji nweta mgbaghara mmehie?

7. Gịnị ka Jizọs ghọtara banyere ndị na-eso ụzọ ya, ihe nlereanya dịkwa aṅaa ka o setịpụụrụ ndị bụ́ di?

8. (a) Olee otú o si bụrụ na di nke “hụrụ nwunye ya n’anya hụrụ onwe ya n’anya”? (b) Gịnị ka ịbụ ‘otu anụ ahụ́’ pụtara nye di nakwa nwunye ya?

9. Olee àgwà Jizọs nke e kwuru okwu banyere ya ná Ndị Filipaị 1:8, n’ihi gịnịkwa ka ndị bụ́ di ji kwesị ịdị na-egosipụta àgwà a n’ebe nwunye ha nọ?

10. Olee otú Jizọs si setịpụrụ ndị bụ́ nwunye ihe nlereanya?

11. Olee otú nwunye kwesịrị isi na-akpaso di ya àgwà, mmetụta dịkwa aṅaa ka àgwà ya pụrụ inwe n’ebe di ya nọ?

12. Gịnị mere na ọ dịghị njọ nwanyị iji nkwanye ùgwù kwupụta echiche ya?

13. (a) Gịnị ka Taịtọs 2:4, 5 na-agba ndị lụrụ di ume ime? (b) Gịnị ka Bible na-ekwu banyere nkewa na ịgba alụkwaghịm?

14. Olee otú Jizọs si mesoo ụmụaka, oleekwa ihe ọ dị mkpa ka ndị mụrụ ụmụ na-emere ụmụ ha?

15. Gịnị ka ndị nne na nna pụrụ ime iji chebe ụmụ ha?

16. Gịnị ka ndị nne na nna pụrụ ịmụta n’ihe Jizọs mere banyere ezughị okè nke ndị na-eso ụzọ ya?

17. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jizọs si setịpụrụ ụmụaka ihe nlereanya zuru okè?

18. N’ihi gịnị ka Jizọs ji na-erubere Nna ya isi mgbe nile, oleekwa onye na-enwe obi ụtọ mgbe ụmụaka rubeere ndị mụrụ ha isi?

19. (a) Olee otú Setan si anwa ụmụntakịrị? (b) Mmetụta dị aṅaa ka àgwà ọjọọ nke ụmụaka pụrụ inwe n’ebe ndị mụrụ ha nọ?

20. Iji nwee ndụ ezinụlọ na-enye obi ụtọ, gịnị ka onye nke ọ bụla nọ n’ezinụlọ na-aghaghị ime?

21. Ihe ndị dị aṅaa magburu onwe ha ka a na-atụ anya ha, oleekwa otú anyị pụrụ isi nwee ndụ ezinụlọ na-enye obi ụtọ ugbu a?

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Bụ Ofufe Ezinụlọ?

Chọpụta otú ofufe ezinụlọ ga-esi nyere gị aka ka ị bịaruo Chineke nso nakwa otú ọ ga-esi mee ka ezinụlọ gị dịrị n’otu.