Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

ISI NKE ANỌ

Ònye Bụ Jizọs Kraịst?

Ònye Bụ Jizọs Kraịst?

Ókè dị aṅaa pụrụ iche ka Jizọs na-ekere?

Olee ebe o si bịa?

Ụdị onye dị aṅaa ka ọ bụ?

E NWERE ọtụtụ ndị a ma ama n’ụwa. Ụfọdụ bụ ndị a ma nnọọ ama n’ógbè, n’obodo, ma ọ bụ ná mba ha. Ndị ọzọ abụrụ ndị a ma ama n’ụwa nile. Otú ọ dị, nanị ịma aha onye a ma ama apụtaghị na ị ma ya n’ezie. Ọ pụtaghị na ị maara ihe nile banyere otú e si zụlite ya na ụdị mmadụ ọ bụ n’ezie.

2 Ndị mmadụ gburugburu ụwa anụtụwo banyere Jizọs Kraịst, ọ bụ ezie na o biri n’ụwa ihe dị ka afọ 2,000 gara aga. Ma, ọtụtụ ndị na-enwe mgbagwoju anya banyere onye Jizọs bụ n’ezie. Ụfọdụ ndị na-ekwu na ọ bụ nanị ezi mmadụ. Ndị ọzọ na-azọrọ na ọ dịghị ihe ọzọ ọ bụ ma e wezụga onye amụma. Ndị ọzọkwa kweere na Jizọs bụ Chineke nakwa na e kwesịrị ife ya ofufe. È kwesịrị ime otú ahụ?

3 Ọ dị mkpa ka ị mara ihe ndị bụ́ eziokwu banyere Jizọs. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Bible na-ekwu, sị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ee, ịmara eziokwu banyere Jehova Chineke na banyere Jizọs Kraịst pụrụ iduga ná ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ala. (Jọn 14:6) Ọzọkwa, Jizọs setịpụrụ ihe nlereanya kasị mma nke ụzọ isi na-ebi ndụ na ụzọ isi na-emeso ndị ọzọ. (Jọn 13:34, 35) N’isi nke mbụ nke akwụkwọ a, anyị tụlere eziokwu banyere Chineke. Ka anyị tụlezie ihe Bible na-akụzi n’ezie banyere Jizọs Kraịst.

MEZAỊA AHỤ E KWERE NÁ NKWA

4 Ogologo oge tupu a mụọ Jizọs, Bible buru amụma banyere ọbịbịa nke onye ahụ Chineke ga-ezite dị ka Mezaịa, ma ọ bụ Kraịst. Utu aha ahụ bụ́ “Mezaịa” (nke sitere n’okwu Hibru) na “Kraịst” (nke sitere n’okwu Grik) pụtachara “Onye E Tere Mmanụ.” Onye a e kwere ná nkwa ga-abụ onye e tere mmanụ, ya bụ, onye Chineke họpụtara ịnọ n’ọkwá pụrụ iche. N’isiakwụkwọ ndị na-esonụ, anyị ga-amụtakwu banyere ókè dị mkpa Mezaịa ahụ na-ekere n’imezu nkwa Chineke. Anyị ga-amụtakwa ngọzi ndị Jizọs pụrụ iwetara anyị ọbụna ugbu a. Otú ọ dị, tupu a mụọ Jizọs, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọtụtụ ndị chere, sị, ‘Ònye ga-abụ Mezaịa ahụ?’

5 Na narị afọ mbụ O.A., ndị na-eso ụzọ Jizọs onye Nazaret kwenyesiri ike na ọ bụ Mezaịa ahụ e buru n’amụma. (Jọn 1:41) Otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ nwoke aha ya bụ Saịmọn Pita, gwara Jizọs hoo haa, sị: “Ị bụ Kraịst ahụ.” (Matiu 16:16) Otú ọ dị, olee otú ndị ahụ na-eso ụzọ—oleekwa otú anyị—pụrụ isi jide n’aka na Jizọs bụ n’ezie Mezaịa ahụ e kwere ná nkwa?

6 Ndị amụma Chineke, bụ́ ndị dịrị ndụ tupu Jizọs abịa, buru ọtụtụ ihe n’amụma banyere Mezaịa ahụ. Ihe ndị a ha buru n’amụma ga-enyere ndị ọzọ aka ịmata ya. Dị ka ihe atụ: Ka e were ya na a gwara gị ka ị gaa n’ọdụ ụgbọala ma ọ bụ n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè ma ọ bụ n’ọdụ ụgbọelu na-ekwo ekwo bute onye ị na-ezutebeghị mbụ. Ọ́ gaghị enye aka ma ọ bụrụ na mmadụ enye gị nkọwa ụfọdụ banyere onye ahụ? N’otu aka ahụ, site n’ọnụ ndị amụma Bible, Jehova nyere nkọwa zuru ezu banyere ihe Mezaịa ga-eme na ihe ndị ga-eme ya. Mmezu nke ọtụtụ amụma ndị a ga-enyere ndị kwesịrị ntụkwasị obi aka ịmata Mezaịa nke ọma.

7 Tụlee nanị ihe atụ abụọ. Nke mbụ, ihe karịrị afọ 700 tupu a mụọ onye ahụ e kwere ná nkwa, onye amụma bụ́ Maịka buru n’amụma na a ga-amụ ya na Betlehem, bụ́ obodo nta dị n’ala Judia. (Maịka 5:2) Ebee n’ezie ka a mụrụ Jizọs? Kpọmkwem, n’obodo ahụ! (Matiu 2:1, 3-9) Nke abụọ, ọtụtụ narị afọ tupu Mezaịa abịa, amụma ahụ e dekọrọ na Daniel 9:25 zoro aka n’afọ ahụ ọ gaje ịpụta kpọmkwem—29 nke O.A.* Mmezu nke amụma ndị a na ndị ọzọ na-egosi na Jizọs bụ Mezaịa ahụ e kwere ná nkwa.

E mee Jizọs baptizim

Mgbe e mere Jizọs baptizim, ọ ghọrọ Mezaịa, ma ọ bụ Kraịst

8 Ihe àmà ọzọ na-egosi na Jizọs bụ Mezaịa ahụ bịara doo anya ná ngwụsị nke afọ 29 nke O.A. Ọ bụ n’afọ ahụ ka Jizọs gakwuuru Jọn Onye Na-eme Baptizim ka e mee ya baptizim n’Osimiri Jọdan. Jehova ekwewo nkwa inye Jọn ihe àmà ga-eme ka ọ mata Mezaịa ahụ. Jọn hụrụ ihe àmà ahụ mgbe e mere Jizọs baptizim. Lee ihe Bible na-ekwu merenụ: “Mgbe e mesịrị ya baptizim, Jizọs siri na mmiri ahụ pụta ozugbo; ma, lee! eluigwe meghere, o wee hụ ka mmụọ Chineke na-efedata dị ka nduru na-abịakwasị ya. Lee! E nwekwara olu sitere n’eluigwe nke sịrị: ‘Nke a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye m nwapụtaworo.’ ” (Matiu 3:16, 17) Mgbe ọ hụrụ ma nụ ihe ahụ merenụ, Jọn enweghị obi abụọ ọ bụla na ọ bụ Chineke zitere Jizọs. (Jọn 1:32-34) Mgbe a wụsara ya mmụọ Chineke, ma ọ bụ ike Ya nọ n’ọrụ, n’ụbọchị ahụ, Jizọs ghọrọ Mezaịa, ma ọ bụ Kraịst, bụ́ onye a họpụtara ịbụ Onye Ndú na Eze.—Aịsaịa 55:4.

9 Mmezu nke amụma Bible na akaebe nke Jehova Chineke n’onwe ya, na-egosi n’ụzọ doro anya na Jizọs bụ Mezaịa ahụ e kwere ná nkwa. Ma, Bible na-aza ajụjụ abụọ ọzọ dị mkpa banyere Jizọs Kraịst: Olee ebe o si bịa, ụdị onye dịkwa aṅaa ka ọ bụ?

OLEE EBE JIZỌS SI BỊA?

10 Bible na-akụzi na Jizọs biri n’eluigwe tupu ya abịa n’ụwa. Maịka buru n’amụma na a ga-amụ Mezaịa ahụ na Betlehem, o kwukwara na ọ malitere “na mgbe ochie.” (Maịka 5:2) Ọtụtụ mgbe, Jizọs n’onwe ya kwuru na ya ebiwo n’eluigwe tupu a mụọ ya dị ka mmadụ. (Jọn 3:13; 6:38, 62; 17:4, 5) Dị ka mmụọ e kere eke n’eluigwe, Jizọs sooro Jehova nwee mmekọrịta pụrụ iche.

11 Jizọs bụ Ọkpara Jehova hụrụ n’anya karịsịa—e nwekwara ezi ihe kpatara ya. A kpọrọ ya “onye e buru ụzọ mụọ n’ime ihe nile e kere eke,” n’ihi na ọ bụ ihe mbụ Chineke kere.# (Ndị Kọlọsi 1:15) Ọ dị ihe ọzọ mere Ọkpara a ji pụọ iche. Ọ bụ “ọkpara [a] mụrụ nanị ya.” (Jọn 3:16) Nke a pụtara na ọ bụ nanị Jizọs ka Chineke kere n’onwe ya. Ọ bụkwa nanị Jizọs ka Chineke ji mee ihe mgbe O kere ihe ndị ọzọ nile. (Ndị Kọlọsi 1:16) A kpọkwara Jizọs “Okwu ahụ.” (Jọn 1:14) Nke a na-agwa anyị na o kwuchiteere Chineke, ihe ịrụ ụka adịghị ya na o wegaara ụmụ ndị ọzọ nke Nna ahụ, ma ndị mmụọ ozi ma ndị mmadụ, ozi na ntụziaka.

12 Ọkpara ahụ e buru ụzọ mụọ na Chineke, ha hà nhata, dị ka ụfọdụ kweere? Nke ahụ abụghị ihe Bible na-akụzi. Dị ka anyị hụrụ na paragraf bu ụzọ, e kere Ọkpara ahụ eke. Mgbe ahụ, o doro anya na o nwere mmalite, ebe Jehova Chineke na-enweghị mmalite ma ọ bụ ọgwụgwụ. (Abụ Ọma 90:2) Ọ dịtụbeghị mgbe Ọkpara ahụ a mụrụ nanị ya chere echiche ịha ka Nna ya. Bible na-akụzi n’ụzọ doro anya na Nna ahụ ka Ọkpara ahụ ukwuu. (Jọn 14:28; 1 Ndị Kọrint 11:3) Ọ bụ nanị Jehova bụ “Chineke Nke pụrụ ime ihe nile.” (Jenesis 17:1) N’ihi ya, ọ dịghị onye ya na ya hà.%

13 Jehova na Ọkpara ya e buru ụzọ mụọ nwere mmekọrịta chiri anya ruo ọtụtụ ijeri afọ—ogologo oge tupu e kee eluigwe nke jupụtara na kpakpando nakwa ụwa. Ọ ga-abụrịrị na ha hụrụ onwe ha n’anya nke ukwuu! (Jọn 3:35; 14:31) Ọkpara a a hụrụ n’anya dị nnọọ ka Nna ya. Ọ bụ ya mere Bible ji na-ezo aka n’ebe Ọkpara ahụ nọ dị ka “onyinyo nke Chineke a na-apụghị ịhụ anya.” (Ndị Kọlọsi 1:15) Ee, dị ka nwa nwoke bụ́ mmadụ pụrụ nnọọ iyi nna ya n’ụzọ dịgasị iche iche, Ọkpara a nke sitere n’eluigwe gosipụtara àgwà na ụdị onye Nna ya bụ.

14 Ọkpara Jehova mụrụ nanị ya kwetara ịhapụ eluigwe ma gbadata n’ụwa iji bie ndụ dị ka mmadụ. Ma, ị pụrụ iche, sị, ‘Olee otú o si kwe omume ịmụ mmụọ e kere eke dị ka mmadụ?’ Iji mezuo nke a, Jehova rụrụ ọrụ ebube. O si n’eluigwe bufee ndụ Ọkpara ya n’akpa nwa nke nwa agbọghọ Juu na-amaghị nwoke bụ́ Meri. E jighị nna bụ́ mmadụ mee ihe. N’ụzọ dị otú a, Meri mụrụ nwa nwoke zuru okè ma kpọọ aha ya Jizọs.—Luk 1:30-35.

ỤDỊ ONYE DỊ AṄAA KA JIZỌS BỤ?

15 Ihe Jizọs kwuru ma mee mgbe ọ nọ n’ụwa na-enyere anyị aka ịmara ya nke ọma. Ọ bụghị nanị nke ahụ, site n’aka Jizọs, anyị na-amata Jehova nke ọma karị. N’ihi gịnị ka o ji dị otú a? Cheta na Ọkpara a na-eme nnọọ ka Nna ya. Ọ bụ ya mere Jizọs ji gwa otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Onye hụrụ m ahụwokwa Nna m.” (Jọn 14:9) Akwụkwọ anọ nke Bible bụ́ ndị a maara dị ka Oziọma ndị ahụ—Matiu, Mak, Luk, na Jọn—na-agwa anyị ọtụtụ ihe banyere ndụ, ọrụ, na àgwà Jizọs Kraịst.

16 A maara Jizọs nke ọma dị ka “Onye Ozizi.” (Jọn 1:38; 13:13) Gịnị ka ọ kụziri? N’ụzọ bụ́ isi, ozi ya bụ “ozi ọma alaeze ahụ”—ya bụ́, Alaeze Chineke, ọchịchị eluigwe nke ga-achị ụwa dum, nke ga-ewetakwara ụmụ mmadụ na-erube isi ngọzi na-adịghị agwụ agwụ. (Matiu 4:23) Ònye ka ozi a sitere n’aka ya? Jizọs n’onwe ya kwuru, sị: “Ihe m na-ezi abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye zitere m,” ya bụ́, Jehova. (Jọn 7:16) Jizọs maara na Nna ya chọrọ ka ụmụ mmadụ nụ ozi ọma nke Alaeze ahụ. N’Isi nke 8 nke akwụkwọ a, anyị ga-amụtakwu banyere Alaeze Chineke na ihe ndị ọ ga-arụzu.

Ebe Jizọs na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya ihe

Jizọs mere nkwusa n’ebe ọ bụla ọ hụrụ ndị mmadụ

17 Ebe ndị dịgasị aṅaa ka Jizọs ziri ihe? N’ebe ọ bụla ọ hụrụ ndị mmadụ—n’ime ime obodo nakwa n’obodo ukwuu, n’obodo nta, n’ọma ahịa, nakwa n’ebe obibi ha. Jizọs atụghị anya ka ndị mmadụ bịakwute ya. Ọ gakwuuru ha. (Mak 6:56; Luk 19:5, 6) N’ihi gịnị ka Jizọs ji tinye mgbalị na oge dị ukwuu otú ahụ n’ime nkwusa nakwa n’izi ihe? Ọ bụ n’ihi na Chineke zubere ka o mee otú ahụ. Jizọs mere uche Nna ya mgbe nile. (Jọn 8:28, 29) Ma, ọ dị ihe ọzọ mere o ji mee nkwusa. O nwere ọmịiko n’ahụ́ ìgwè mmadụ ahụ pụtara ịhụ ya. (Matiu 9:35, 36) Ndị ndú okpukpe ha, bụ́ ndị kwesịrị ịdị na-akụziri ha eziokwu banyere Chineke na nzube ya leghaara ha anya. Jizọs maara ókè ọ dịruru ndị ahụ mkpa ịnụ ozi Alaeze ahụ.

18 Jizọs bụ nwoke nwere ọmịiko na mmetụta miri emi. N’ihi ya, ndị ọzọ hụrụ ya dị ka onye a pụrụ ijekwuru na onye nwere obiọma. Ọbụna ahụ́ ruru ụmụaka ala mgbe ha na ya nọ. (Mak 10:13-16) Jizọs adịghị ele mmadụ anya n’ihu. Ọ kpọrọ arụrụala na ikpe na-ezighị ezi asị. (Matiu 21:12, 13) N’oge mgbe a na-adịchaghị akwanyere ndị inyom ùgwù nakwa mgbe a na-adịghị enye ha ohere ime ihe ụfọdụ, o jiri nsọpụrụ mesoo ha. (Jọn 4:9, 27) Jizọs dị obi umeala n’ezie. N’otu oge, ọ sara ụkwụ ndịozi ya, bụ́ ọrụ ohu nkịtị na-arụ.

1. Ebe Jizọs na-ekwusa ozi ọma; 2. Ebe Jizọs na-agwọ ndị ọrịa

19 Jizọs chebaara mkpa nke ndị ọzọ echiche. Nke a pụtara ìhè mgbe o ji ike mmụọ nsọ Chineke gwọọ ọrịa n’ụzọ ọrụ ebube. (Matiu 14:14) Dị ka ihe atụ, otu nwoke nke na-arịa ekpenta bịakwutere Jizọs ma kwuo, sị: “Ọ bụrụ nnọọ na ị chọọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” Ihe mgbu na nhụjuanya nke nwoke ahụ metụrụ Jizọs n’ahụ́. N’ịbụ onye ọmịiko kpaliri, Jizọs matịrị aka ya bitụ nwoke ahụ, wee sị: “Achọrọ m. Ka e mee ka ị dị ọcha.” Nwoke ahụ gbakekwara! (Mak 1:40-42) Chegodị otú obi ga-adị nwoke ahụ.

O KWESỊRỊ NTỤKWASỊ OBI RUO ỌGWỤGWỤ

20 Jizọs setịpụrụ ihe nlereanya kasị mma nke iji iguzosi ike n’ihe na-erubere Chineke isi. Ọ nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi n’ebe Nna ya nke eluigwe nọ n’ụdị ọnọdụ nile, n’agbanyeghịkwa ụdị mmegide na nhụjuanya nile. Jizọs guzogidesiri ọnwụnwa Setan ike n’ụzọ gara nke ọma. (Matiu 4:1-11) N’otu oge, ụfọdụ n’ime ndị ikwu Jizọs egosipụtaghị okwukwe n’ebe ọ nọ, ọbụna na-asị na “uche ezukwaghị ya okè.” (Mak 3:21) Ma Jizọs ekweghị ka ha mee ka o nwee nkụda mmụọ, ọ nọgidere na-arụ ọrụ Chineke. N’agbanyeghị mkparị na nkwutọ, Jizọs nọgidere na-enwe njide onwe onye, ọ dịghị mgbe ọ gbalịrị imerụ ndị na-emegide ya ahụ́.—1 Pita 2:21-23.

21 Jizọs nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ—ọnwụ ike na nke ahụhụ bụ́ nke ndị iro ya kpatara. (Ndị Filipaị 2:8) Tụlee ihe ndị o diri n’ụbọchị ikpeazụ nke ndụ ya dị ka mmadụ. E jidere ya, ndị àmà ụgha boro ya ebubo, ndị ikpe na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi mara ya ikpe, ìgwè na-eme ihe ike mere ya akaje, ndị agha mekpọkwara ya ọnụ. N’ịbụ onye a kpọgidere n’osisi ịta ahụhụ, tupu ya ekubie ume, o tiri mkpu, sị: “E mechawo ya!” (Jọn 19:30) Otú ọ dị, n’ụbọchị nke atọ mgbe Jizọs nwụsịrị, Nna ya nke eluigwe kpọlitere ya ịghọ mmụọ. (1 Pita 3:18) Izu ole na ole mgbe nke ahụ gasịrị, ọ laghachiri eluigwe. N’ebe ahụ, ọ ‘nọdụrụ ala n’aka nri Chineke’ ma na-echere ka ọ nata ikike ịbụ eze.—Ndị Hibru 10:12, 13.

22 Gịnị ka Jizọs rụzuru ná nnọgide ọ nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ? Ọnwụ Jizọs megheere anyị ohere n’ezie ibi ndụ na paradaịs elu ala, bụ́ nke kwekọrọ ná nzube mbụ nke Jehova. A ga-atụle otú ọnwụ Jizọs si mee ka nke ahụ kwe omume n’isiakwụkwọ na-esonụ.

IHE BIBLE NA-AKỤZI

  • Amụma ndị mezurunụ na akaebe nke Chineke gbara n’onwe ya, na-egosi na Jizọs bụ Mezaịa ahụ, ma ọ bụ Kraịst.—Matiu 16:16.
  • Jizọs biri n’eluigwe dị ka mmụọ e kere eke ogologo oge tupu ya abịa n’ụwa.—Jọn 3:13.
  • Jizọs bụ onye nkụzi, nwoke nwere ọmịiko, bụrụkwa ihe nlereanya nke onye rubeere Chineke isi n’ụzọ zuru ezu.—Matiu 9:35, 36.

*  Iji nwetakwuo nkọwa nke amụma Daniel nke mezuru n’ebe Jizọs nọ, lee Ihe Odide Ntụkwasị.

#  A na-akpọ Jehova Nna n’ihi na ọ bụ Onye Okike. (Aịsaịa 64:8) Ebe ọ bụ Chineke kere Jizọs, a na-akpọ Jizọs Ọkpara Chineke. N’otu aka ahụ kwa, a na-akpọ mmụọ ndị ọzọ e kere eke nakwa ọbụna nwoke ahụ bụ́ Adam ụmụ Chineke.—Job 1:6; Luk 3:38.

%  Iji nwetakwuo ihe àmà na-egosi na Ọkpara ahụ e buru ụzọ mụọ na Chineke ahaghị nhata, lee Ihe Odide Ntụkwasị.


Ajụjụ nke Paragraf Ndị A Na-Amụ Amụ

1, 2. (a) N’ihi gịnị ka ịmara banyere onye a ma ama na-apụtaghị na ị ma ya n’ezie? (b) Mgbagwoju anya dị aṅaa ka e nwere banyere Jizọs?

3. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka ị mara ihe ndị bụ́ eziokwu banyereJizọs?

4. Gịnị ka utu aha ahụ bụ́ “Mezaịa” na “Kraịst” pụtara?

5. Gịnị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs kwenyesiri ike banyere ya?

6. Nye ihe atụ nke otú Jehova siworo nyere ndị kwesịrị ntụkwasị obi aka ịmata Mezaịa ahụ.

7. Olee abụọ n’ime amụma ndị mezuru n’ebe Jizọs nọ?

8, 9. Ihe àmà dị aṅaa nke na-egosi na Jizọs bụ Mezaịa ahụ bịara doo anya mgbe e mere ya baptizim?

10. Gịnị ka Bible na-akụzi banyere ndụ Jizọs dịrị tupu ya abịa n’ụwa?

11. Olee otú Bible si gosi na Jizọs bụ Ọkpara Jehova hụrụ n’anya karịsịa?

12. Olee otú anyị si mara na Ọkpara ahụ e buru ụzọ mụọ na Chineke ahaghị nhata?

13. Gịnị ka Bible na-ekwu mgbe o zoro aka n’ebe Ọkpara ahụ nọ dị ka “onyinyo nke Chineke a na-apụghị ịhụ anya”?

14. Olee otú e si mụọ Ọkpara Jehova mụrụ nanị ya dị ka mmadụ?

15. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na ọ bụ site n’aka Jizọs ka anyị si mara Jehova nke ọma karị?

16. Gịnị bụ ozi bụ́ isi Jizọs ziri, oleekwa ebe ozizi ya sitere?

17. Ebe ndị dịgasị aṅaa ka Jizọs ziri ihe, oleekwa ihe mere o ji tinye mgbalị dị ukwuu iji zie ndị ọzọ ihe?

18. Olee àgwà Jizọs ndị kasị amasị gị?

19. Ihe atụ dị aṅaa na-egosi na Jizọs chebaara mkpa nke ndị ọzọ echiche?

20, 21. Olee otú Jizọs si setịpụ ihe nlereanya n’iji iguzosi ike n’ihe na-erubere Chineke isi?

22. Gịnị ka Jizọs rụzuru site n’ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ?