Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

ISI NKE ITOOLU

Ànyị Na-ebi “n’Ụbọchị Ikpeazụ”?

Ànyị Na-ebi “n’Ụbọchị Ikpeazụ”?

Ihe ndị dị aṅaa na-eme n’oge anyị ka e buru n’amụma n’ime Bible?

Àgwà ndị dị aṅaa ka Okwu Chineke sịrị na ndị mmadụ ga na-akpa “n’ụbọchị ikpeazụ”?

Ihe ọma ndị dị aṅaa ka Bible buru n’amụma na a ga-enwe “n’ụbọchị ikpeazụ”?

Ì GETỤLA akụkọ ụwa na telivishọn ma chee, sị, ‘Gịnị ka ụwa a na-achọdị ịghọ aghọ?’ Ọdachi na-eme nnọọ na mberede nakwa n’ụzọ a na-atụghị anya ya nke na ọ dịghị onye pụrụ ikwu ihe echi ga-abụ. (Jems 4:14) Otú ọ dị, Jehova maara ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. (Aịsaịa 46:10) Mgbe dị anya gara aga, Okwu ya, bụ́ Bible, buru amụma banyere, ọ bụghị nanị ihe ọjọọ ndị na-eme n’ụbọchị anyị kamakwa ihe ndị dị ebube ga-eme n’ọdịnihu dị nso.

2 Jizọs Kraịst kwuru okwu banyere Alaeze Chineke, bụ́ nke ga-akwụsị ajọ omume ma mee ka ụwa ghọọ paradaịs. (Luk 4:43) Ndị mmadụ chọrọ ịma mgbe Alaeze ahụ ga-abịa. Ọbụna ndị na-eso ụzọ Jizọs jụrụ ya, sị: ‘Gịnị ga-abụ ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị nakwa nke ngwụsị nke usoro ihe a?’ (Matiu 24:3) Ná nzaghachi, Jizọs gwara ha na ọ bụ nanị Jehova Chineke maara kpọmkwem mgbe ọgwụgwụ nke usoro ihe a ga-abịa. (Matiu 24:36) Ma Jizọs buru amụma banyere ihe ndị ga-eme n’ụwa nwa obere oge tupu Alaeze ahụ ewetara ihe a kpọrọ mmadụ ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi. Ihe ndị o buru n’amụma na-emezu ugbu a!

3 Tupu anyị enyochaa ihe àmà ndị na-egosi na anyị na-ebi “ná ngwụsị nke usoro ihe” a, ka anyị tụlee ná mkpirikpi banyere otu agha nke ọ na-eyighị ka ọ̀ dị mmadụ ọ bụla hụrụ ya. A lụrụ ya n’eluigwe, ihe ndị si na ya pụta na-emetụtakwa anyị.

AGHA A LỤRỤ N’ELUIGWE

4Isiakwụkwọ nke bu nke a ụzọ kọwara na Jizọs Kraịst ghọrọ Eze n’eluigwe n’afọ 1914. (Daniel 7:13, 14) N’oge na-adịghị anya e chisịrị ya Eze, o mere ihe. Bible na-ekwu, sị: “Agha wee daa n’eluigwe.” “Maịkel [aha ọzọ nke Jizọs] na ndị mmụọ ozi ya busoro dragọn ahụ [Setan bụ́ Ekwensu] agha, dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya bukwara agha.”* E meriri Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya, e sikwa n’eluigwe chụdata ha n’ụwa. Ụmụ ndị ikom kwesịrị ntụkwasị obi nke Chineke ṅụrịrị ọṅụ na a chụpụwo Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya. Otú ọ dị, ndị mmadụ agajeghị inwe ụdị ọṅụ dị otú ahụ. Kama nke ahụ, Bible buru amụma, sị: “Ahụhụ ga-adịrị ụwa…n’ihi na Ekwensu arịdakwuruwo unu, na-ewe oké iwe, ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi.”—Mkpughe 12:7, 9, 12.

5 Nke a bụ ihe ga-esi n’agha ahụ a lụrụ n’eluigwe pụta. N’iwe, Setan ga-eme ka ahụhụ bịakwasị ndị nọ n’ụwa. Dị ka ị ga-ahụ, ugbu a, anyị na-ebi n’oge ahụhụ ahụ. Ma, ọ gaghị adịte aka—nanị “oge dị mkpirikpi.” Ọbụna Setan maara nke ahụ. Bible na-akpọ oge ahụ ‘ụbọchị ikpeazụ.’ (2 Timoti 3:1) Lee nnọọ ka obi si atọ anyị ụtọ na n’oge na-adịghị anya, Chineke ga-eme ka Ekwensu kwụsị ịkpa ike n’ụwa! Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ihe ndị e buru n’amụma na Bible, bụ́ ndị na-eme ugbu a. Ha na-egosi na anyị na-ebi n’ụbọchị ikpeazụ nakwa na n’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-ewetara ndị hụrụ Jehova n’anya ngọzi ga-adịru mgbe ebighị ebi. Nke mbụ, ka anyị tụlee akụkụ anọ nke ihe ịrịba ahụ Jizọs kwuru na ọ ga-aka oge anyị na-ebi n’ime ya akara.

IHE NDỊ BỤ́ ISI GA-EME N’ỤBỌCHỊ IKPEAZỤ

Agha, ụkọ nri na ọdachi ndị na-emere onwe ha

6“Mba ga-ebili megide mba, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze.” (Matiu 24:7) E gburu ọtụtụ nde mmadụ n’agha na narị afọ gara aga. Otu onye Britain bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme dere, sị: “Ọ bụ narị afọ nke 20 ka a kasị gbuo mmadụ n’akụkọ ihe mere eme nile…. Ọ bụ narị afọ nke ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ dịghị mgbe a kwụsịrị ịlụ agha na ya, nke nwere nanị oge ole na ole ndị dị mkpirikpi nke ọ na-adịghị ebe a na-alụ agha.” Otu akụkọ sitere n’aka ụlọ ọrụ bụ́ Worldwatch Institute na-ekwu, sị: “Ndị nwụrụ n’agha na narị afọ [nke 20] ji okpukpu atọ karịa ndị nwụrụ n’agha nile a lụrụ site na narị afọ mbụ nke O.A ruo n’afọ 1899.” Ihe karịrị 100 nde mmadụ anwụwo n’agha kemgbe afọ 1914. Ọ bụrụgodị na anyị maara mwute mmadụ na-enwe mgbe otu onye ọ hụrụ n’anya nwụrụ n’agha, anyị apụghị ịghọtacha ụdị obi mgbawa nke ọtụtụ nde mmadụ, bụ́ ndị ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ n’agha, na-enwe.

7“A ga-enwekwa ụkọ nri.” (Matiu 24:7) Ndị nnyocha na-ekwu na ihe oriri a na-emepụta amụbawo nke ukwuu n’ime afọ 30 gara aga. N’agbanyeghị nke ahụ, a ka na-enwe ụkọ nri n’ihi na ọtụtụ ndị enweghị ego zuru ezu iji zụrụ nri ma ọ bụ ala ha ga-akọ ihe. Agụụ na-agụgbu ọtụtụ nde mmadụ. Òtù Ahụ́ Ike Ụwa na-ekwu na nsogbu ndị na-esite n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ bụ ihe bụ́ isi na-egbu ihe karịrị nde ụmụaka ise kwa afọ.

8‘A ga-enwe oké ala ọma jijiji.’ (Luk 21:11) Dị ka Ụlọ Ọrụ Mba United States Na-enyocha Ọdịdị Ime Ala si kwuo, kemgbe afọ 1990 nke a ka gara aga, e nwewo nkezi nke ala ọma jijiji 17 kwa afọ, bụ́ ndị kpara ike ruo n’ókè nke ibibi ụlọ na ịgbawa ala. Ná nkezi, kwa afọ, a na-enwe ala ọma jijiji ndị na-akpa ike ruo n’ókè nke ibibi ụlọ kpamkpam. Ụlọ ọrụ ọzọ na-ekwu, sị: “Ala ọma jijiji egbuwo ọtụtụ narị puku mmadụ n’ime 100 afọ gara aga, ọganihu e nwekwara na nkà na ụzụ mere nanị ka ọnụ ọgụgụ mmadụ ọ na-egbu belatatụ.”

9“A ga-enwekwa…ọrịa na-efe efe.” (Luk 21:11) N’agbanyeghị ọganihu ndị a na-enwe na nkà mmụta ọgwụ na ahụ́ ike, ọrịa ndị ọhụrụ na ndị ochie na-emekpọ ndị mmadụ ọnụ. Otu akụkọ na-ekwu na n’iri afọ ndị na-adịbeghị anya, ọtụtụ ndị mmadụ rịara ọrịa 20 a maara nke ọma—gụnyere ụkwara nta, ịba, nakwa ọgbụgbọ na ọnyụnyụ—ọ na-esiwanyekwa ike iji ọgwụ agwọ ụdị ọrịa ụfọdụ. N’eziokwu, ọ dịkarịa ala, e nwewo ọrịa ọhụrụ dị 30. Ụfọdụ n’ime ha enweghị ọgwụgwọ, ha na-egbukwa mmadụ.

NDỊ BI N’ỤBỌCHỊ IKPEAZỤ

Ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ nduzi amamihe sitere n’Okwu Chineke

10 E wezụga ịkọwa ụfọdụ ihe ndị ga-eme n’ụwa, Bible bukwara amụma na a ga-eji mgbanwe a ga-enwe n’etiti ọha mmadụ mara ụbọchị ikpeazụ. Pọl onyeozi kọwara àgwà ndị mmadụ n’ozuzu ha ga-enwe. Na 2 Timoti 3:1-5, anyị na-agụ, sị: “N’ụbọchị ikpeazụ, oge pụrụ iche nke siri ike obibi gaje ịdị.” Ihe ụfọdụ Pọl kwuru bụ na ndị mmadụ ga-abụ

  • ndị hụrụ onwe ha n’anya
  • ndị hụrụ ego n’anya
  • ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi
  • ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe
  • ndị na-enweghị obi mmadụ
  • ndị na-enweghị njide onwe onye
  • ndị na-eme ihe ike ike
  • ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya
  • ndị na-enwe ọdịdị nke nsọpụrụ Chineke ma na-agọnarị ike ya

11 Ndị mmadụ hà nwere àgwà ndị a n’ebe i bi? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ha nwere ha. N’ebe nile, a na-ahụ ndị na-akpa àgwà ndị jọgburu onwe ha. Nke a na-egosi na n’oge na-adịghị anya, Chineke ga-eme ihe, n’ihi na Bible na-ekwu, sị: “Mgbe ndị na-emebi iwu na-ama akwụkwọ dị ka ihe ọkụkụ, mgbe ndị nile nke na-arụ ajọ ihe na-awakwa okooko osisi; ọ bụ ka e wee kpochapụ ha ruo mgbe nile ebighị ebi.”—Abụ Ọma 92:7.

IHE NDỊ DỊ MMA BỤ́ NDỊ NA-EMENỤ!

12 N’ezie, ahụhụ jupụtara n’ụbọchị ikpeazụ a, dị nnọọ ka Bible buru n’amụma. Otú ọ dị, n’ụwa a nọ ná nsogbu, e nwere ihe ndị dị mma na-eme n’etiti ndị na-efe Jehova.

“A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi.”—Matiu 24:14

Ebe Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma

13‘Ezi ihe ọmụma ga-aba ụba,’ ka akwụkwọ Bible bụ́ Daniel buru n’amụma. Olee mgbe nke ahụ ga-eme? Ọ bụ na “mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a.” (Daniel 12:4) Karịsịa kemgbe afọ 1914, Jehova enyeworo ndị chọrọ n’ezie ijere ya ozi aka ịghọtakwu Bible. Ha aghọtakwuwo eziokwu ndị dị oké ọnụ ahịa metụtara aha na nzube Chineke, àjà mgbapụta Jizọs Kraịst, ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ, na mbilite n’ọnwụ. Ọzọkwa, ndị na-efe Jehova amụtawo otú ha ga-esi na-ebi ndụ n’ụzọ ga-abara ha uru ma wetara Chineke otuto. Ha aghọtakwuwokwa ókè Alaeze Chineke na-ekere nakwa otú ọ ga-esi dozie ọnọdụ ụwa. Gịnị ka ha na-eji ihe ọmụma a eme? Ajụjụ ahụ na-eweta anyị n’amụma ọzọ nke na-emezu n’ụbọchị ikpeazụ ndị a.

14“A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi,” ka Jizọs Kraịst kwuru n’amụma o buru banyere “ngwụsị nke usoro ihe a.” (Matiu 24:3, 14) N’ụwa nile, a na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ—ihe Alaeze ahụ bụ, ihe ọ ga-eme, na otú anyị pụrụ isi nweta ngọzi ya—n’ihe karịrị ala 230 nakwa n’ihe karịrị asụsụ 400. Ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova na-eji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ. Ha sitere “ná mba na ebo na ndị na asụsụ nile.” (Mkpughe 7:9) Ndịàmà na-eduziri ọtụtụ nde ndị chọrọ ịma ihe Bible na-akụzi n’ezie ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu. Lee nnọọ ụzọ dị ịrịba ama amụma a si na-emezu, karịsịa ebe ọ bụ na Jizọs buru amụma na ezi Ndị Kraịst ga-abụ ndị ‘mmadụ nile ga-akpọ asị’!—Luk 21:17.

GỊNỊ KA Ị GA-EME?

15 Ebe ọ bụ na ọtụtụ amụma Bible na-emezu taa, í kweghị na anyị na-ebi n’ụbọchị ikpeazụ? Mgbe e kwusasịrị oziọma ahụ otú ọ dị Jehova mma, “ọgwụgwụ” aghaghị ịbịa. (Matiu 24:14) “Ọgwụgwụ” ahụ bụ oge Chineke ga-ekpochapụ mmebi iwu n’ụwa. Jehova ga-eji Jizọs na ndị mmụọ ozi dị ike bibie ndị nile kpachaara anya na-enupụrụ Ya isi. (2 Ndị Tesalonaịka 1:6-9) Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya agaghịzi eduhie mba nile. Mgbe nke ahụ gasịrị, Alaeze Chineke ga-awụsa ngọzi ya n’ahụ́ ndị nile doro onwe ha n’okpuru ọchịchị ezi omume ya.—Mkpughe 20:1-3; 21:3-5.

16 Ebe ọ bụ na ọgwụgwụ nke usoro ihe Setan dị nso, ọ dị mkpa ka anyị jụọ onwe anyị, sị, ‘Gịnị ka m kwesịrị ịdị na-eme?’ Ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịnọgide na-amụ banyere Jehova na ihe ndị ọ na-achọ n’aka anyị. (Jọn 17:3) Na-amụsi Bible ike. Mee ka ọ bụrụ àgwà gị iso ndị ọzọ bụ́ ndị na-achọ ime uche Jehova na-akpakọrịta mgbe nile. (Ndị Hibru 10:24, 25) Nweta ihe ọmụma bara ụba nke Jehova Chineke na-enye ndị mmadụ gburugburu ụwa, meekwa mgbanwe ndị dị mkpa ná ndụ gị ka i wee nweta ihu ọma Chineke.—Jems 4:8.

17 Jizọs buru amụma na ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ ga-eleghara ihe àmà ndị na-egosi na anyị na-ebi n’ụbọchị ikpeazụ anya. Mbibi a ga-ebibi ndị ajọ omume ga-abịa na mberede nakwa n’ụzọ a na-atụghị anya ya. Dị ka onye ohi ji abalị aga, ọ ga-abịakwute ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na mberede. (1 Ndị Tesalonaịka 5:2) Jizọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Dị nnọọ ka ụbọchị Noa dịrị, otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị. N’ihi na dị ka ha nọ n’ụbọchị ndị bu iju mmiri ahụ ụzọ, na-eri ihe ma na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ndị ikom ana-alụ nwunye, a na-enyekwa ndị inyom n’ọlụlụ di, ruo ụbọchị Noa banyere n’ụgbọ ahụ; ha amaghịkwa ruo mgbe iju mmiri ahụ bịara wee kpochapụ ha nile, otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị.”—Matiu 24:37-39.

18 N’ihi ya, Jizọs gwara ndị na-ege ya ntị, sị: “Lezienụ onwe unu anya ka a ghara inwe mgbe iribiga ihe ókè na ịṅụ oké mmanya na nchegbu nke ndụ ga-anyịgbu obi unu, ụbọchị ahụ ewee bịakwasị unu na mberede n’otu ntabi anya dị ka ọnyà. N’ihi na ọ ga-abịakwasị ndị nile bi n’elu ụwa nile. Ya mere, mụrụnụ anya, na-arịọsikwanụ arịrịọ ike mgbe nile ka unu wee nwee ihe ịga nke ọma n’ịgbanahụ ihe ndị a nile a kara aka na ha ga-ewere ọnọdụ, nakwa n’iguzo n’ihu Nwa nke mmadụ.” (Luk 21:34-36) Ọ bụ ihe amamihe dị na ya iji okwu Jizọs kpọrọ ihe. N’ihi gịnị? N’ihi na ndị nwere ihu ọma Jehova Chineke na “Nwa nke mmadụ,” bụ́ Jizọs Kraịst, nwere atụmanya nke ịlanarị ngwụsị nke usoro ihe Setan nakwa nke ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ ahụ dị ebube nke dị nnọọ nso!—Jọn 3:16; 2 Pita 3:13.

IHE BIBLE NA-AKỤZI

  • E ji agha, ụkọ nri, ala ọma jijiji, na ọrịa na-efe efe mara ụbọchị ikpeazụ.—Matiu 24:7; Luk 21:11.
  • N’ụbọchị ikpeazụ, ọtụtụ ndị na-ahụ onwe ha, ego, na ihe ụtọ, n’anya ma ha adịghị ahụ Chineke n’anya.—2 Timoti 3:1-5.
  • N’ụbọchị ikpeazụ ndị a, a na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ n’ụwa nile.—Matiu 24:14.

*  Iji nwetakwuo ihe ọmụma na-egosi na Maịkel bụ aha ọzọ nke Jizọs Kraịst, lee Ihe Odide Ntụkwasị.


Ajụjụ nke Paragraf Ndị A Na-Amụ Amụ

1. Ebee ka anyị pụrụ ịmata ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu?

2, 3. Ajụjụ dị aṅaa ka ndị na-eso ụzọ Jizọs jụrụ ya, gịnịkwa ka ọ zara ha?

4, 5. (a) Gịnị mere n’eluigwe n’oge na-adịghị anya e chisịrị Jizọs Eze? (b) Dị ka Mkpughe 12:12 si kwuo, gịnị si n’agha ahụ a lụrụ n’eluigwe pụta?

6, 7. Olee otú ihe ndị Jizọs kwuru banyere agha na ụkọ nri si na-emezu taa?

8, 9. Gịnị na-egosi na amụma ndị Jizọs buru banyere ala ọma jijiji na ọrịa ndị na-efe efe emezuwo?

10. Àgwà ndị dị aṅaa e buru n’amụma na 2 Timoti 3:1-5 ka ị na-ahụ ndị mmadụ na-akpa taa?

11. Olee otú Abụ Ọma 92:7 si kọwaa ihe ga-eme ndị ajọ omume?

12, 13. Olee otú ‘ezi ihe ọmụma’ siworo baa ụba na “mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a”?

14. N’ala ole ka a na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ taa, ole ndị kwa na-ekwusa ya?

15. (a) Ì kwere na anyị na-ebi n’ụbọchị ikpeazụ, n’ihi gịnịkwa? (b) Gịnị ka “ọgwụgwụ” ahụ ga-ewetara ndị na-enupụrụ Jehova isi nakwa ndị na-edo onwe ha n’okpuru ịchịisi nke Alaeze Chineke?

16. Olee ihe amamihe dị na ya nke i kwesịrị ime?

17. N’ihi gịnị ka mbibi nke ndị ajọ omume ga-eji bịakwute ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na mberede?

18. Olee ndụmọdụ Jizọs nke anyị kwesịrị iji kpọrọ ihe?

GỤKWUO GBASARA YA

Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị?

Baịbụl na-enyere ọtụtụ ndị aka ịmata azịza ajụjụ ndị dị ezigbo mkpa. Ị̀ ga-achọ ka Baịbụl nyere gị aka?