Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

IHE ODIDE NTụKWASị

À Mụrụ Jizọs Na December?

À Mụrụ Jizọs Na December?

BIBLE agwaghị anyị mgbe a mụrụ Jizọs. Otú ọ dị, ọ na-enye anyị ihe ọmụma gbara ọkpụrụkpụ mere anyị ga-eji kwubie na a mụghị ya na December.

Chee banyere otú ihu igwe na-adị n’oge ahụ n’afọ n’obodo Betlehem, bụ́ ebe a mụrụ Jizọs. Ọnwa ndị Juu bụ́ Chislev (nke kwekọrọ na November/December) bụ ọnwa oge oyi na udu mmiri. Ọnwa na-esochi ya bụ Tebeth (December/January). Ọ bụ oge oyi kasị atụ n’afọ, bụ́ mgbe a na-enwe snow n’ebe ndị bụ́ ugwu. Ka anyị lee ihe Bible na-agwa anyị banyere otú ihu igwe na-adị ógbè ahụ.

Ezra, bụ́ onye so dee Bible, na-egosi na ọnwa Chislev bụ n’ezie ọnwa e ji oge oyi na udu mmiri mara. Mgbe o kwusịrị na ìgwè mmadụ gbakọrọ na Jeruselem ‘n’ọnwa nke itoolu [Chislev], n’ụbọchị nke [iri abụọ] n’ọnwa ahụ,’ Ezra kọrọ na ndị mmadụ nọ “na-ama jijiji…site n’oké mmiri ozuzo nile.” Banyere ọnọdụ ihu igwe e nwere n’oge ahụ n’afọ, ndị ahụ gbakọtaranụ kwupụtara n’onwe ha, sị: ‘Ọ bụ mgbe oké mmiri ozuzo, ike adịghịkwa anyị iguzo n’èzí.’ (Ezra 10:9, 13; Jeremaịa 36:22) Ka a sịkwa ihe mere ndị ọzụzụ atụrụ biri n’akụkụ ụwa ahụ ji ahụ na ha na ìgwè atụrụ ha anọghị n’èzí n’abalị n’ọnwa December!

Ndị ọzụzụ atụrụ na ìgwè atụrụ ha

Mgbe a mụrụ Jizọs, ndị ọzụzụ atụrụ na ìgwè atụrụ ha nọ n’ọhịa n’abalị

Otú ọ dị, Bible kwuru na ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’ọhịa na-elekọta ìgwè atụrụ ha n’abalị ahụ a mụrụ Jizọs. N’eziokwu, Luk, bụ́ onye so dee Bible, kwuru na n’oge ahụ, ndị ọzụzụ atụrụ “bi ebi n’ọhịa, na-echekwa ìgwè atụrụ ha nche n’abalị.” (Luk 2:8-12) Rịba ama na ndị ọzụzụ atụ ahụ bi ebi n’ọhịa, ọ bụghị na ha nọ nanị na-agagharị agagharị n’ehihie. Ha na ìgwè atụrụ ha nọ n’ọhịa n’abalị. Nkọwa dị otú ahụ e nyere nke bụ́ na ha bi n’ọhịa ọ̀ ga-ekwe omume n’oge oké oyi na mmiri ozuzo a na-enwe na Betlehem na December? Mbanụ, ọ gaghị ekwe omume. N’ihi ya, ọnọdụ ndị e nwere n’oge a mụrụ Jizọs na-egosi na a mụghị ya na December.*

Okwu Chineke gwara anyị kpọmkwem oge Jizọs nwụrụ, ma o nyere ihe ọmụma dị nta banyere oge a mụrụ ya. Nke a na-echetara anyị ihe Eze Solomọn kwuru: “Ezi aha dị mma karịa ezi mmanụ otite na-esi ísì ụtọ; ọzọ, ụbọchị ọnwụ mmadụ dị mma karịa ụbọchị a mụrụ ya.” (Eklisiastis 7:1) Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na Bible na-enye ihe ọmụma dị ukwuu banyere ozi na ọnwụ Jizọs ma na-enye ihe ọmụma dị nta banyere oge a mụrụ ya.


*  Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee Ụlọ Nche nke December 15, 2000, peeji nke 3-7, bụ́ nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

← Gụọ isiokwu

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Agba Krismas?

Ọtụtụ ndị na-agba Krismas n’agbanyeghị na ha ma otú o si malite. Gụọ ihe a ka ị mata ihe mere Ndịàmà Jehova anaghị agba Krismas.