Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 115: Paradaịs Ọhụrụ n’Elu Ụwa

Akụkọ nke 115: Paradaịs Ọhụrụ n’Elu Ụwa

LEE osisi ndị ahụ toro ogologo, okooko osisi ndị mara mma na ugwu ndị dị elu. Ebe a ọ́ maghị mma? Lee ka mgbada na-eri ihe dị n’aka nwatakịrị ahụ. Leekwa ọdụm na ịnyịnya ndị nọ n’ala ahịhịa ebe ahụ. Ị́ gaghị achọ ibi n’ụlọ nke dị n’ebe dị otú a?

Chineke chọrọ ka ị dị ndụ ebighị ebi n’ụwa n’ime paradaịs. Ọ chọghịkwa ka i nwee ihe mgbu na ahụ́ ụfụ ọ bụla nke ndị mmadụ na-enwe taa. Nke a bụ nkwa Bible na-ekwe ndị ga-ebi n’ime paradaịs ọhụrụ ahụ: ‘Chineke ga-anọnyere ha. Ọnwụ ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ́ ụfụ agaghị adị ọzọ. Ihe ochie niile agabigawo.’

Jizọs ga-ahụ na e nwere mgbanwe a dị ebube. Ị̀ ma mgbe ọ ga-abụ? Ọ bụ mgbe o kpochapụsịrị ihe ọjọọ niile na ndị ajọ mmadụ niile n’ụwa. Cheta na mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ gwọrọ ndị nwere ọrịa dị iche iche, ọbụna o mekwara ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie. Jizọs mere nke a iji gosi ihe ọ ga-eme n’ụwa niile mgbe ọ ga-abụ Eze nke alaeze Chineke.

Cheedị nnọọ otú ihe ga-esi magbuo onwe ya n’ime paradaịs ọhụrụ elu ala ahụ! Jizọs na ụfọdụ ndị ọ họpụtara ga na-achị n’eluigwe. Ndị ọchịchị a ga-elekọta ndị ọ bụla nọ n’ụwa, hụkwa na ha nwere obi ụtọ. Ka anyị lee ihe ọ dị mkpa ka anyị mee iji jide n’aka na Chineke ga-enye anyị ndụ ebighị ebi n’ime paradaịs ọhụrụ ya.

Mkpughe 21:3, 4; 5:9, 10; 14:1-3.

Otú paradaịs ga-adị


Ajụjụ

  • Olee ọnọdụ ndị Bible na-egosi na anyị ga-anọ na ha n’ime Paradaịs elu ala?
  • Gịnị ka Bible na-ekwe ndị ga-ebi na Paradaịs nkwa ya?
  • Olee mgbe Jizọs ga-eweta mgbanwe a dị ebube?
  • Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, gịnị ka o mere iji gosi ihe ọ ga-eme dị ka Eze nke Alaeze Chineke?
  • Gịnị ka Jizọs na ndị ha na ya ga-eso chịa n’eluigwe ga-ahụ na e nwere mgbe ha ga-anọ n’eluigwe na-achị ụwa?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Mkpughe 5:9, 10.

    N’ihi gịnị ka anyị ga-eji nwee obi ike na ndị ga-achị ụwa n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri ahụ ga-abụ ndị eze na ndị nchụàjà nwere ọmịiko na obi ebere? (Efe. 4:20-24; 1 Pita 1:7; 3:8; 5:6-10)

  • Gụọ Mkpughe 14:1-3.

    Gịnị ka odide e dere aha Nna ahụ na aha Nwa Atụrụ ahụ n’egedege ihu otu narị puku na iri puku anọ na anọ ahụ na-egosi? (1 Kọr. 3:23; 2 Tim. 2:19; Mkpu. 3:12)

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Ka Alaeze Chineke Ga-eme?

Chọpụta ihe Alaeze Chineke ga-emere ụmụ mmadụ ma ọ chịwa ụwa.