Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 114: Ngwụsị nke Ihe Ọjọọ Niile

Akụkọ nke 114: Ngwụsị nke Ihe Ọjọọ Niile

GỊNỊ ka ị na-ahụ n’ebe a? Ọ bụ ụsụụ ndị agha nọkwasịrị n’ịnyịnya ọcha. Ma lee ebe ha si na-abịa. Ha si n’eluigwe na-agbadata! È nwere ịnyịnya n’ezie n’eluigwe?

Jizọs bụ́ Eze nọ n’eluigwe

Ee e, ha abụghị ịnyịnya nkịtị. Anyị maara nke ahụ n’ihi na ịnyịnya apụghị ịgba ọsọ n’igwe ojii, hà pụrụ? Ma Bible na-ekwu banyere ịnyịnya ndị dị n’eluigwe. Ị̀ ma ihe mere o ji na-ekwu nke a?

Ọ bụ n’ihi na e ji ịnyịnya buo ọtụtụ agha n’oge gara aga. N’ihi ya, Bible na-ekwu banyere ndị si n’eluigwe gbara ịnyịnya na-agbadata iji gosi na Chineke ga-ebuso ndị nọ n’ụwa agha. Ị̀ ma ihe a na-akpọ ebe a ga-anọ lụọ agha ahụ? Ọ bụ Amagedọn. Agha ahụ ga-ekpochapụ ihe ọjọọ niile n’ụwa.

Jizọs ga-abụ Onyeisi n’agha Amagedọn ahụ. Cheta na Jizọs bụ onye Jehova họpụtara ịbụ eze nke ọchịchị Ya. Nke a mere Jizọs ji kpuru okpueze. Mma agha o ji na-egosi na ọ ga-egbu ndị iro niile nke Chineke. Ò kwesịrị iju anyị anya na Chineke ga-ebibi ndị ọjọọ niile?

Leghachi anya n’Akụkọ nke 10. Gịnị ka ị na-ahụ n’ebe ahụ? Ọ bụ oké iju mmiri ahụ bibiri ndị ajọ mmadụ. Ònye wetara Iju Mmiri ahụ? Ọ bụ Jehova Chineke. Ugbu a, lee anya n’Akụkọ nke 15. Gịnị na-eme n’ebe ahụ? Ọkụ nke Jehova zitere na-ebibi Sọdọm na Gọmọra.

Saghee Akụkọ nke 33. Lee ihe na-eme ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya ndị Ijipt. Ònye mere ka mmiri ahụ rikpuo ha? Ọ bụ Jehova. O mere ya iji chebe ndị ya. Lee anya n’Akụkọ nke 36 na nke 76. Ị ga-ahụ n’ebe ahụ na Jehova kwere ka e bibie ọbụna ndị Izrel bụ́ ndị ya, n’ihi ajọ omume ha.

Ya mere, o kwesịghị iju anyị anya na Jehova ga-ezite ndị agha ya nke eluigwe ịkwụsị ihe ọjọọ niile n’ụwa. Cheedị ihe nke ahụ ga-apụta! Sapeta peeji nke na-esonụ ka anyị lee.

Mkpughe 16:16; 19:11-16.



Ajụjụ

  • N’ihi gịnị ka Bible ji ekwu okwu banyere ịnyịnya ndị dị n’eluigwe?
  • Gịnị bụ aha agha Chineke ga-alụso ndị ajọ mmadụ n’ụwa, gịnịkwa mere a ga-eji lụọ agha a?
  • Dị ka foto a na-egosi, ònye ga-ebute ụzọ n’agha ahụ, n’ihi gịnị ka o ji kpuru okpueze, gịnịkwa ka mma agha ya na-anọchi anya ya?
  • N’ileghachi anya azụ n’Akụkọ nke 10, nke 15, na nke 33, n’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị inwe ihe ijuanya na Chineke ga-ebibi ndị ajọ mmadụ?
  • Olee otú Akụkọ nke 36 na nke 76 si egosi anyị na Chineke ga-ebibi ndị ajọ mmadụ n’agbanyeghị na ha na-azọrọ na ha na-efe ya?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Mkpughe 19:11-16.

    Olee otú Akwụkwọ Nsọ si mee ka o doo anya na Jizọs Kraịst bụ onye ahụ nọ n’elu ịnyịnya ọcha ahụ? (Mkpu. 1:5; 3:14; 19:11; Aịsa. 11:4)

    Olee otú ọbara e fesara n’uwe elu Jizọs si egosi na ọ ga-enwe mmeri zuru ezu? (Mkpu. 14:18-20; 19:13; Aịsa. 63:1-6)

    Ole ndị ka o yiri ka à gụnyere n’ụsụụ ndị agha so Jizọs ka ọ nọkwasịrị n’elu ịnyịnya ọcha ya? (Mkpu. 12:7; 19:14; Mat. 25:31, 32)