Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 9: Noa Ewuo Ụgbọ

Akụkọ nke 9: Noa Ewuo Ụgbọ
Ebe ndị mmadụ na-achị Noa ọchị

NOA nwere otu nwunye na ụmụ nwoke atọ. Aha ụmụ ya bụ Shem, Ham na Jefet. Nwa ya nke ọ bụla nwekwara nwunye. N’ihi ya, e nwere mmadụ asatọ n’ezinụlọ Noa.

Chineke mere ka Noa mee ihe dị ịtụnanya. Ọ gwara ya ka o wuo otu ụgbọ buru ibu. Ọ ha ka ụgbọ mmiri, ma o yiri ogologo nnukwu igbe. Chineke wee, sị: ‘Mee ka ọ dị okpukpu abụọ n’ịdị elu, ị ga-ekebisịkwa ime ya ekebisị.’ Nkebi ndị ahụ bụ maka Noa na ezinụlọ ya na anụmanụ na nri ndị ha ga-eri.

Chineke gwakwara Noa ka o dozie ụgbọ ahụ ka mmiri ghara ịba n’ime ya. Chineke sịrị ya: ‘M ga-eweta oké iju mmiri ibibi ụwa niile. Onye na-anọghị n’ime ụgbọ ahụ ga-anwụ.’

Noa na ụmụ ya gere Jehova ntị, wee malite iwu ụgbọ ahụ. Ma ndị ọzọ chịrị ha ọchị. Ha nọgidere na-eme ihe ọjọọ ha na-eme. Ha ekweghị ihe Noa kwuru mgbe ọ gwara ha ihe Chineke gaje ime.

Mgbe ezinụlọ Noa na-achịba anụmanụ, na-ebubakwa nri n’ụgbọ

Owuwu ụgbọ ahụ were ogologo oge, n’ihi na o buru ezigbo ibu. E wusịrị ya mgbe ọtụtụ afọ gasịrị. Chineke gwaziri Noa ka ọ kpọba anụ niile n’ime ụgbọ ahụ. Chineke sịrị ka a kpọba ụdị anụ ụfọdụ abụọ abụọ, ma oké ma nne. Ma, ọ sịrị ka a kpọba ụdị anụ ndị ọzọ asaa asaa. Chineke gwakwara Noa ka ọ nwụbata nnụnụ dị iche iche. Noa mere nnọọ ihe Chineke kwuru.

E mesịa, Noa na ezinụlọ ya banyere n’ụgbọ ahụ. Chineke wee mechie ụgbọ ahụ. Noa na ezinụlọ ya nọ n’ime ya na-echere. Were ya na i so ha nọrọ n’ime ụgbọ ahụ wee na-echere. Iju mmiri ahụ ọ̀ ga-abịa dị ka Chineke kwuru?

Jenesis 6:9-22; 7:1-9.



Ajụjụ

  • Ezinụlọ Noa hà dị mmadụ ole, gịnịkwa bụ aha ụmụ ya atọ?
  • Olee ihe dị ịtụnanya nke Chineke gwara Noa ka o mee, n’ihi gịnịkwa ka o ji gwa ya ka o mee otú ahụ?
  • Olee ihe ndị agbata obi Noa mere mgbe ọ gwara ha banyere ụgbọ ahụ?
  • Gịnị ka Chineke gwara Noa ka o mee banyere ụmụ anụmanụ?
  • Mgbe Chineke mechiri ọnụ ụzọ nke ụg̣bọ ahụ, gịnị ka Noa na ezinụlọ ya na-aghaghị ime?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Jenesis 6:9-22.

    Gịnị mere ka Noa bụrụ onye dị ịrịba ama nke fere ezi Chineke ahụ ofufe? (Jen. 6:9, 22)

    Olee otú Jehova si ele ime ihe ike anya, oleekwa otú nke a kwesịrị isi emetụta ụdị ihe ntụrụndụ ndị anyị na-ahọrọ? (Jen. 6:11, 12; Ọma 11:5)

    Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Noa mgbe e nyere anyị ntụziaka ná nzukọ Jehova? (Jen. 6:22; 1 Jọn 5:3)

  • Gụọ Jenesis 7:1-9.

    Olee otú eziokwu ahụ bụ́ na Jehova lere nwoke ahụ na-ezughị okè bụ́ Noa anya dị ka onye ezi omume si bụrụ ihe agbamume nye anyị taa? (Jen. 7:1; Ilu 10:16; Aịsa. 26:7)