Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 3: Nwoke Mbụ na Nwaanyị Mbụ

Akụkọ nke 3: Nwoke Mbụ na Nwaanyị Mbụ

OLEE ihe dị iche na foto nke a na nke dị n’akụkọ bu ụzọ? Ọ bụ mmadụ ndị nọ n’ime ya. Ha bụ nwoke mbụ na nwaanyị mbụ. Ònye kere ha? Ọ bụ Chineke. Ị̀ ma aha Ya? Ọ bụ Jehova. Ma, a kpọrọ nwoke na nwaanyị ahụ Adam na Iv.

Mgbe Adam na Iv nọ n’ogige Iden

Nke a bụ otú Jehova Chineke si kee Adam. O weere ájá n’ala ma jiri ya kpụọ otu ahụ́ zuru okè, ahụ́ mmadụ. Mgbe o mesịrị, ya ekunye ume ndụ n’imi mmadụ ahụ, Adam wee ghọọ onye dị ndụ.

Jehova Chineke nyere Adam ọrụ. Ọ gwara Adam ka ọ gụọ anụmanụ dị iche iche aha. O nwere ike bụrụ na Adam ekiriwo anụmanụ ndị a ruo ogologo oge, n’ihi ya, ọ raghị ya ahụ́ ịgụ ha niile aha kwesịrị ha. Ka Adam na-agụ anụmanụ niile ahụ aha, ọ dị ihe ọ malitere ịhụ. Ị̀ ma ihe ọ bụ?

Anụmanụ niile ahụ nwechara oké na nne. E nwere oké enyí na nne enyí, e nwekwara oké ọdụm na nne ọdụm. Ma Adam enweghị onye ibe. N’ihi nke a, Jehova mere ka oké ụra buru Adam, o wee wepụta otu ọgịrịga n’akụkụ ahụ́ ya. O weere ọgịrịga nke a meere Adam otu nwaanyị, o wee bụrụ nwunye ya.

Obi tọgburu Adam atọgbu! Cheekwa echiche ụdị obi ụtọ Iv nwere n’ihi ịbụ onye e debere ibi n’ogige a mara oké mma! Ugbu a, ha pụrụ ịmụ ụmụ na ibikọ n’obi ụtọ.

Jehova chọrọ ka Adam na Iv dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ọ chọrọ ka ha mee ka ụwa dum maa mma dị ka ogige Iden. Obi tọrọ Adam na Iv ezigbo ụtọ mgbe ha chere echiche banyere ime nke a! A sị na ị nọ n’ebe ahụ, ọ̀ gaara amasị gị iso mee ka ụwa bụrụ ebe mara mma? Ma Adam na Iv anọgideghị na-enwe obi ụtọ. Ka anyị chọpụta ihe kpatara ya.

Abụ Ọma 83:18; Jenesis 1:26-31; 2:7-25.



Ajụjụ

  • Olee ọdịiche e nwere n’etiti foto dị n’Akụkọ nke 2 na nke dị n’Akụkọ nke 3?
  • Ònye kere nwoke mbụ, gịnịkwa bụ aha nwoke ahụ?
  • Olee ọrụ Chineke nyere Adam ka ọ rụọ?
  • Gịnị mere Chineke ji mee ka oké ụra buru Adam?
  • Ogologo oge hà aṅaa ka Adam na Iv gaara adịru ndụ, oleekwa ọrụ Jehova chọrọ ka ha rụọ?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Abụ Ọma 83:18.

    Gịnị bụ aha Chineke, oleekwa ọnọdụ pụrụ iche o nwere n’ebe ụwa dị? (Jer. 16:21; Dan. 4:17)

  • Gụọ Jenesis 1:26-31.

    Olee ihe ikpeazụ Chineke kere n’ụbọchị nke isii, oleekwa otú ihe a o kere si dị iche n’ebe ụmụ anụmanụ dị? (Jen. 1:26)

    Olee ndokwa Jehova mere maka mmadụ na anụmanụ? (Jen. 1:30)

  • Gụọ Jenesis 2:7-25.

    Gịnị ka ọrụ e nyere Adam bụ́ ịgụ ụmụ anụmanụ aha gụnyere? (Jen. 2:19)

    Olee otú Jenesis 2:24 si enyere anyị aka ịghọta otú Jehova si ele alụmdi na nwunye, nkewa, na ịgba alụkwaghịm anya? (Mat. 19:4-6, 9)