Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 105: Ha Nọ na Jeruselem Na-echere

Akụkọ nke 105: Ha Nọ na Jeruselem Na-echere

NDỊ a nọ n’ebe a bụ ụmụazụ Jizọs. Ha erubeworo ya isi ma nọrọ na Jeruselem. Mgbe ha na-echere n’otu ebe, oké ụzụ jupụtara n’ụlọ ahụ ha nọ na ya. Ọ na-ada ka oké ifufe. A malitere ịhụ ire ọkụ n’elu isi onye nke ọ bụla n’ime ndị ahụ na-eso ụzọ. Ị̀ na-ahụ ọkụ ahụ n’elu isi onye nke ọ bụla n’ime ha? Gịnị ka ọ pụtara?

Mgbe mmụọ nsọ dakwasịrị ndị na-eso ụzọ Jizọs na narị afọ mbụ

Ọ bụ ọrụ ebube! Jizọs alaghachikwuruwo Nna ya n’eluigwe, ọ na-awụsakwa ndị na-eso ụzọ ya mmụọ nsọ Chineke. Ị̀ ma ihe mmụọ ahụ na-eme ka ha mee? Ha niile malitere ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche.

Ọtụtụ ndị nọ na Jeruselem nụrụ ụzụ ahụ na-ada ka nke oké ifufe, ha wee bịa ịhụ ihe na-emenụ. Ụfọdụ n’ime ha si ná mba ndị ọzọ, ha bịara maka ememe ndị Izrel bụ́ Pentikọst. Lee ihe ijuanya ndị ahụ bịara abịa nwere! Ha nụrụ ka ndị na-eso ụzọ Jizọs na-ekwu okwu n’asụsụ ha banyere ihe ndị dị ebube Chineke meworo.

Ndị ọbịa ahụ sịrị: ‘Ndị a niile bụ ndị Galili. Olee otú ha sizi nwee ike ikwu okwu n’asụsụ ndị a dị iche iche a na-asụ n’ala niile ebe anyị si bịa?’

Pita wee guzoo ọtọ iji kọwaara ha ihe kpatara ya. O welie olu ya gwa ha ụzọ e si gbuo Jizọs, na otú Jehova si mee ka o si n’ọnwụ bilie. ‘Jizọs nọ n’eluigwe ugbu a n’aka nri Chineke,’ ka Pita gwara ha. ‘Ọ wụsawokwa anyị mmụọ nsọ ahụ o kwere anyị ná nkwa. Ọ bụ ya mere unu ji na-anụ ma na-ahụ ọrụ ebube ndị a.’

Ma mgbe Pita na-ekwu ihe ndị a, ọtụtụ n’ime ndị ọ na-agwa okwu nwere mwute banyere ihe e mere Jizọs. Ha jụrụ, sị: ‘Gịnị ka anyị ga-eme?’ Pita sịrị ha: ‘Ọ dị mkpa ka unu gbanwee omume unu ma mee baptizim.’ N’ihi ya, n’ụbọchị ahụ, ihe dị ka puku mmadụ atọ mere baptizim, ha ewee ghọọ ụmụazụ Jizọs.

Ọrụ 2:1-47.



Ajụjụ

  • Dị ka anyị na-ahụ na foto a, gịnị mere ụmụazụ Jizọs, bụ́ ndị nọ na Jeruselem na-echere?
  • Olee ihe juru ndị bịara na Jeruselem anya?
  • Gịnị ka Pita kọwaara ndị ahụ bịara na Jeruselem?
  • Olee mmetụta ndị ahụ nwere mgbe ha gesịrị Pita ntị, gịnịkwa ka ọ gwara ha ka ha mee?
  • Ọ̀ bụ mmadụ ole ka e mere baptizim n’ụbọchị Pentikọst nke afọ 33?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Ọrụ Ndịozi 2:1-47.

    Olee otú ihe Pita kwuru n’Ọrụ Ndịozi 2:23, 36 si egosi na mba ndị Juu dum so kpata ọnwụ Jizọs? (1 Tesa. 2:14, 15)

    Olee otú Pita si setịpụ ezi ihe nlereanya n’ịtụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ? (Ọrụ 2:16, 17, 29, 31, 36, 39; Kọl. 4:6)

    Olee otú Pita si jiri nke mbụ n’ime “mkpịsị ugodi nke alaeze eluigwe,” nke Jizọs kwere nkwa inye ya, mee ihe? (Ọrụ 2:14, 22-24, 37, 38; Mat. 16:19)

GỤKWUO GBASARA YA

Ọtụtụ Narị Mmadụ Hụrụ Jizọs Tupu E Mee Ememme Pentikọst

N’oge a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ na tupu ya alaghachi eluigwe, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ihe ha ga-enweta nakwa ihe ha ga-eji ya eme.