Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 103: N’Ime Ụlọ A Kpọchiri Akpọchi

Akụkọ nke 103: N’Ime Ụlọ A Kpọchiri Akpọchi

MGBE Pita na Jọn hapụsịrị ebe ahụ ozu Jizọs dịbu, ya afọdụzie naanị Meri. Meri malitere ịkwa ákwá. O wee hulata ala leba anya n’ime ili ahụ, dị ka anyị hụrụ na foto bu nke a ụzọ. Ọ hụrụ ndị mmụọ ozi abụọ n’ime ebe ahụ! Ha wee jụọ ya, sị: ‘Gịnị mere i ji na-akwa ákwá?’

Meri azaa, sị: ‘Ha ebupụwo Onyenwe m, amaghịkwa m ebe ha tọgbọrọ ya.’ Meri wee tụgharịa hụ otu nwoke. Nwoke ahụ wee jụọ ya, sị: ‘Ònye ka ị na-achọ?’

Meri chere na nwoke ahụ bụ onye na-elekọta ebe ahụ, nakwa na ma eleghị anya ọ bụ ya bupụrụ ozu Jizọs. N’ihi ya, ọ sịrị: ‘Ọ bụrụ na i bupụwo ya, gwa m ebe i debere ya.’ Ma n’ezie, nwoke ahụ bụ Jizọs. O yikwasịrị ahụ́ nke Meri na-amataghị. Ma mgbe Jizọs kpọrọ Meri aha, Meri matara na ọ bụ Jizọs. Ọ gbapụrụ ọsọ ịkọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs: ‘Ahụwo m Onyenwe anyị!’

Mgbe e mesịrị n’ụbọchị ahụ, ka ndị na-eso ụzọ abụọ na-aga obodo nta bụ́ Emeọs, otu nwoke sonyeere ha. Ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs nọ ná mwute n’ihi na e gbuwo Jizọs. Ma ka ha na-aga, nwoke ahụ kọwara ọtụtụ ihe dị na Bible bụ́ nke mere ka obi dịtụ ha ụtọ. E mesịa, mgbe ha kwụsịrị iri nri, ha matara na nwoke ahụ bụ Jizọs. Jizọs wee pụọ n’anya ha, ma mmadụ abụọ ahụ na-eso ụzọ ya laghachiri Jeruselem ọsọ ọsọ, ịkọrọ ndịozi banyere ya.

Mgbe nke a na-eme, Jizọs pụtara n’ihu Pita. Ndị ọzọ nwere obi ụtọ mgbe ha nụrụ nke a. Mmadụ abụọ ndị ahụ na-eso ụzọ ya gara Jeruselem iji chọọ ndịozi. Ha gwara ha otú Jizọs si mee ka ha hụ ya n’ụzọ. Mgbe ha nọ na-akọ nke a, ị̀ ma ihe dị ịtụnanya nke merenụ?

Lee anya na foto a. Jizọs batara n’ime ụlọ ebe ahụ kpọmkwem, n’agbanyeghị na a kpọchiri ụzọ akpọchi. Ndị na-eso ụzọ ya nwere nnọọ obi ụtọ! Ụbọchị ahụ ọ́ bụghị ụbọchị aṅụrị? Ị̀ pụrụ ịgụta ugboro ole Jizọs meworo ka ndị na-eso ụzọ ya hụ ya anya ruo ugbu a? Ị̀ gụtara ugboro ise?

Mgbe Jizọs pụtara n’ebe ndị na-eso ụzọ ya gbakọtara

Tọmọs onyeozi anọghị ya mgbe Jizọs mere ka ha hụ ya. Ndị na-eso ụzọ Jizọs wee sị ya: ‘Anyị ahụwo Onyenwe anyị!’ Ma Tọmọs sịrị na ya ga-ahụ Jizọs n’onwe ya tupu ya ekwere. Ụbọchị asatọ mgbe nke a gasịrị, ụmụazụ ya nọkọrọ ọzọ n’ime ụlọ a kpọchiri akpọchi, ma n’oge a, Tọmọs nọ ya. Na mberede, Jizọs batara n’ime ụlọ ahụ. Ọ bụ mgbe ahụ ka Tọmọs kweere.

Jọn 20:11-29; Luk 24:13-43.



Ajụjụ

  • Gịnị ka Meri gwara otu nwoke nke o chere na ọ bụ ya na-elekọta ogige ahụ, ma gịnị mere ka ọ ghọta na nwoke ahụ bụ Jizọs?
  • Olee ahụmahụ ndịozi abụọ ji ụkwụ na-aga obodo nta bụ́ Emeọs nwere?
  • Olee ihe ijuanya mere mgbe ndị na-eso ụzọ abụọ gwara ndịozi na ha hụrụ Jizọs?
  • Ugboro ole ka Jizọs pụtaworo n’ihu ụmụazụ ya?
  • Gịnị ka Tọmọs kwuru mgbe ọ nụrụ na ndị na-eso ụzọ ahụwo Onyenwe ha, ma gịnị mere mgbe ụbọchị asatọ gasịrị?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Jọn 20:11-29.

    Ihe Jizọs kwuru na Jọn 20:23 ọ̀ pụtara na mmadụ nwere ikike ịgbaghara mmehie? Kọwaa. (Ọma 49:2, 7; Aịsa. 55:7; 1 Tim. 2:5, 6; 1 Jọn 2:1, 2)

  • Gụọ Luk 24:13-43.

    Olee otú anyị pụrụ isi kwadebe obi anyị ka o nwee ike ịnabata eziokwu Bible? (Luk 24:32, 33; Ezra 7:10; Mat. 5:3; Ọrụ 16:14; Hib. 5:11-14)

GỤKWUO GBASARA YA

Ọtụtụ Narị Mmadụ Hụrụ Jizọs Tupu E Mee Ememme Pentikọst

N’oge a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ na tupu ya alaghachi eluigwe, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ihe ha ga-enweta nakwa ihe ha ga-eji ya eme.