Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 97: Jizọs Abịa Dị Ka Eze

Akụkọ nke 97: Jizọs Abịa Dị Ka Eze

NWA oge mgbe ọ gwọsịrị ndị arịrịọ abụọ ahụ kpuru ìsì, Jizọs bịaruru otu obodo nta dị nso na Jeruselem. Ọ gwara mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya, sị: ‘Gaanụ n’ime obodo, unu ga-ahụkwa nwa ịnyịnya ibu e liwere eliwe. Tọpụnụ ya ma kpụtara m ya.’

Mgbe a kpụtaara ya ịnyịnya ibu ahụ, Jizọs nọkwasịrị n’elu ya. O wee gbara ya ruo Jeruselem nke dị nso. Mgbe ọ na-eru obodo ahụ nso, oké ìgwè mmadụ wee bịa izute ya. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha yipụrụ uwe ha ma gbasaa ha n’ụzọ. Ndị ọzọ gbutere igu nkwụ. Ha wee na-atụsa ha n’okporo ụzọ ahụ, na-eti mkpu, sị: ‘Ka Chineke gọzie eze nke na-abịa n’aha Jehova!’

Ebe ndị mmadụ na-anabata Jizọs

Mgbe dị anya gara aga n’Izrel, ndị e chiri eze ọhụrụ na-agbara nwa ịnyịnya ibu abanye n’ime Jeruselem iji gosi ndị mmadụ onwe ha. Ọ bụ ihe Jizọs na-eme ugbu a. Ndị a na-egosikwa na ha chọrọ ka Jisọs bụrụ eze ha. Ma ọ bụghị mmadụ niile chọrọ ya. Anyị pụrụ ịhụ nke a site n’ihe mere mgbe Jizọs na-abanye n’ụlọ nsọ Chineke.

N’ụlọ nsọ ahụ, Jizọs gwọrọ ndị ìsì na ndị ngwụrọ. Mgbe ụmụntakịrị hụrụ nke a, ha tiri mkpu otuto nye Jizọs. Ma nke a kpasuru ndị nchụàjà iwe, ha wee sị Jizọs: ‘Ị̀ na-anụ ihe ụmụntakịrị a na-ekwu?’

‘Ana m anụ ya,’ ka Jizọs zara ha. ‘Ọ̀ bụ unu agụtụbeghị ebe Bible na-asị: “Chineke ga-esi n’ọnụ ụmụ ọhụrụ mee ka otuto pụta?”’ N’ihi ya, ụmụntakịrị ahụ nọgidere na-eto eze nke Chineke.

Anyị kwesịrị ịdị ka ụmụntakịrị ahụ, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị? Ụfọdụ ndị pụrụ ịnwa igbochi anyị ikwu okwu banyere alaeze Chineke. Ma anyị ga-anọgide na-akọrọ ndị ọzọ banyere ihe ndị dị ebube nke Jizọs ga-emere ụmụ mmadụ.

Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, oge erubeghị ka ọ malite ịchị dị ka eze. Olee mgbe oge ahụ ga-eru? Ndị na-eso ụzọ ya chọrọ ịmata. Anyị ga-agụ nke a n’akụkọ na-esonụ.

Matiu 21:1-17; Jọn 12:12-16.



Ajụjụ

  • Mgbe Jizọs bịara n’otu obodo nta dị nso na Jeruselem, gịnị ka ọ gwara ndịozi ya ka ha gaa mee?
  • Na foto a, gịnị na-eme ka Jizọs rutewere obodo Jeruselem?
  • Gịnị ka ụmụntakịrị mere mgbe ha hụrụ Jizọs ka ọ na-agwọ ndị ìsì na ndị ngwụrọ?
  • Gịnị ka Jizọs gwara ndị nchụàjà ahụ iwe ji?
  • Olee otú anyị pụrụ isi dị ka ụmụntakịrị ahụ toro Jizọs?
  • Gịnị ka ndịozi ahụ chọrọ ịmata?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Matiu 21:1-17.

    Olee otú ụzọ Jizọs si banye na Jeruselem dị ka Eze si dị iche n’otú ndị ọchịagha nwere mmeri n’oge ndị Rom si abanye n’obodo? (Mat. 21:4, 5; Zek. 9:9; Fil. 2:5-8; Kọl. 2:15)

    Gịnị ka ndị na-eto eto pụrụ ịmụta site n’aka ụmụ okoro Izrel ndị ahụ, bụ́ ndị hotara ihe e kwuru n’Abụ Ọma 118 mgbe Jizọs na-abanye n’ụlọ nsọ ahụ? (Mat. 21:9, 15; Ọma 118:25, 26; 2 Tim. 3:15; 2 Pita 3:18)

  • Gụọ Jọn 12:12-16.

    Gịnị ka ojiji ndị ahụ na-eto Jizọs ji igu nkwụ n’aka na-ese onyinyo ya? (Jọn 12:13; Fil. 2:10; Mkpu. 7:9, 10)

GỤKWUO GBASARA YA

Eze Jizọs Ejiri Nwa Ịnyịnya Ibu Banye na Jeruselem

Jizọs mezuru amụma e buru narị afọ ise tupu oge ọ banyere Jeruselem dị ka eze.