Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 95: Ụzọ Jizọs Si Akụzi Ihe

Akụkọ nke 95: Ụzọ Jizọs Si Akụzi Ihe

OTU ụbọchị, Jizọs gwara otu nwoke na o kwesịrị ịhụ onye agbata obi ya n’anya. Nwoke ahụ jụrụ Jizọs, sị: ‘Ònye bụ onye agbata obi m?’ Jizọs maara ihe nwoke a na-eche. Ọ na-eche na ọ bụ naanị ndị agbụrụ ya na ndị okpukpe ya bụ ndị agbata obi ya. Ka anyị lee ihe Jizọs gwara ya.

Mgbe ụfọdụ, Jizọs na-akụzi ihe site n’ịkọ akụkọ. Nke a bụ ihe o mere n’oge ahụ. Ọ kọrọ akụkọ banyere otu onye Juu na otu onye Sameria. Anyị amụworị na ihe ndị Sameria adịghị amasị ọtụtụ ndị Juu. Nke a bụ akụkọ Jizọs kọrọ:

Otu ụbọchị, otu onye Juu nọ na-aga n’ụzọ ndịda ugwu nke na-aga Jeriko. Ndị ohi wee jide ya. Ha naara ya ego ya, tie ya ọ dị ndụ ọnwụ ka mma.

Mgbe nke ahụ gasịrị, onye nchụàjà bụ́ onye Juu si n’ụzọ ahụ na-agafe. O wee hụ nwoke ahụ e tiri ihe. Gịnị ka i chere o mere? O si n’akụkụ ụzọ nke ọzọ gafere, wee jewe ebe ọ na-eje. Mgbe nke ahụ gasịrị, onye ọzọ na-ekpesi okpukpe ike sikwa n’ụzọ ahụ na-agafe. Ọ bụ onye Livaị. Ọ̀ kwụsịrị? Mba, ọ kwụsịghịkwa iji nyere nwoke ahụ e tiri ihe aka. Ị pụrụ ịhụ onye nchụàjà na onye Livaị ahụ ka ha na-agbada n’ụzọ ebe ahụ.

Ma lee onye na-enyere nwoke ahụ e tiri ihe aka. Ọ bụ onye Sameria. Ọ na-enyere onye Juu ahụ aka. Ọ na-ete ya ọgwụ n’ebe ndị e merụrụ ya ahụ́. E mesịa, ọ kpọgara onye Juu ahụ n’ebe ọ pụrụ izuru ike ma gbakee.

Onye Sameria bụ́ ezigbo onye agbata obi

Mgbe ọ kọsịrị akụkọ ya, Jizọs jụrụ nwoke ahụ jụrụ ya ajụjụ, sị: ‘Ònye n’ime mmadụ atọ ndị a ka i chere mere ihe dị ka onye agbata obi nke nwoke ahụ e tiri ihe? Ọ̀ bụ onye nchụàjà ahụ, onye Livaị ahụ, ka ọ̀ bụ onye Sameria ahụ?’

Nwoke ahụ zara, sị: ‘Ọ bụ onye Sameria ahụ. O nwere obiọma n’ahụ́ nwoke ahụ e tiri ihe.’

Jizọs sịrị ya: ‘Ị zatara ya. Ya mere, gaa na-emere ndị ọzọ otú ahụ o mere.’

Ụzọ Jizọs si akụzi ihe, ọ́ dịghị gị mma? Anyị pụrụ ịmụta ọtụtụ ihe ndị dị mkpa, ma ọ bụrụ na anyị na-ege ntị n’ihe Jizọs kwuru n’ime Bible, ọ̀ bụ anyị apụghị?

Luk 10:25-37.



Ajụjụ

  • Olee ajụjụ otu nwoke jụrụ Jizọs, n’ihi gịnịkwa?
  • Olee ihe Jizọs na-eji eme ihe mgbe ụfọdụ ma ọ na-akụzi ihe, gịnịkwa ka anyị mụtaworo banyere ndị Juu na ndị Sameria?
  • N’akụkọ ahụ Jizọs kọrọ, gịnị mere otu onye Juu nke na-aga Jeriko?
  • Gịnị mere mgbe onye nchụàjà bụ́ onye Juu na otu onye Livaị si n’ụzọ ahụ na-agafe?
  • Na foto a, ònye na-enyere onye Juu ahụ e merụrụ ahụ́ aka?
  • Mgbe Jizọs kọsịrị akụkọ ahụ, ajụjụ dị aṅaa ka ọ jụrụ, oleekwa ihe nwoke ahụ zara?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Luk 10:25-37.

    Kama ịgwa ya azịza ya ozugbo, olee otú Jizọs si nyere otu nwoke nke maara Iwu aka ịtụgharị uche n’otu okwu? (Luk 10:26; Mat. 16:13-16)

    Olee otú Jizọs si jiri ihe atụ mee ihe iji katọọ asị na-enweghị isi nke ndị na-ege ya ntị kpọrọ ndị ọzọ? (Luk 10:36, 37; 18:9-14; Taị. 1:9)

GỤKWUO GBASARA YA

Onye Sameria Emee Ihe Gosiri na Ọ Bụ Ezigbo Onye Agbata Obi

Olee otú Jizọs si jiri akụkọ banyere onye Sameria bụ́ ezigbo onye agbata obi kụziere anyị ihe?

Nwa Furu Efu Alọta

Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe atụ Jizọs mere banyere nwa mmefu?