Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 93: Jizọs Enye Ọtụtụ Mmadụ Nri

Akụkọ nke 93: Jizọs Enye Ọtụtụ Mmadụ Nri

IHE jọgburu onwe ya emewo. Ọ dịbeghị anya e gburu Jọn Onye na-eme baptizim. Herọdịas, nwunye eze, achọghị iji anya ahụ Jọn. O mere ka eze gbupụ Jọn isi.

Mgbe Jizọs nụrụ ya, o wutere ya nke ukwuu. O jere ebe ndị mmadụ na-adịghị anọkarị ma nọrọ naanị ya. Ma ndị mmadụ sooro ya. Mgbe Jizọs hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, o nwere ọmịiko n’ahụ́ ha. O wee na-agwa ha okwu banyere alaeze Chineke, na-agwọkwa ndị ọrịa nọ n’etiti ha.

N’anyasị ahụ, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya, sị ya: ‘Chi ejiwela, ndị mmadụ adịghịkwa anọkarị n’ebe a. Zipụ ndị a ka ha nwee ike ịga zụrụ ihe oriri n’obodo nta ndị dị nso.’

Ebe Jizọs chọrọ inye igwe mmadụ nri

Jizọs sịrị: ‘Ọ dịghị mkpa ka ha laa. Nyenụ ha ihe ka ha rie.’ O chigharịkwuuru Filip, jụọ ya, sị: ‘Olee ebe anyị pụrụ ịzụta nri ga-ezu ndị a niile?’

Filip wee sị ya: ‘Ọ ga-ewe ego hiri nne iji zụta nri ga-ezu mmadụ niile a iri ọbụna ntakịrị ntakịrị.’ Andru wee sị: ‘Nwata nwoke a nwere ogbe achịcha ise na azụ abụọ. Ma ọ gaghị ezuru mmadụ niile a.’

‘Gwanụ ha ka ha nọdụ ala n’elu ahịhịa,’ ka Jizọs sịrị. O kelee Chineke n’ihi nri ahụ, wee malite ịnyawa ya. Ndị na-eso ụzọ ya wee nyezuo mmadụ niile achịcha na azụ ahụ. Ha dị puku ndị ikom ise na ọtụtụ puku ndị inyom na ụmụntakịrị. Ha niile rijuru afọ. Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs chịkọtara ihe fọdụrụ, o juru nkata iri na abụọ!

Jizọs meziri ka ndị na-eso ụzọ ya baa n’ụgbọ gabiga Osimiri Galili. N’abalị, oké ifufe malitere ife, ebili mmiri wee na-ebugharị ụgbọ ahụ ihu na azụ. Ndị na-eso ụzọ ya wee tụọ nnọọ egwu. N’etiti abalị ahụ, ha hụrụ onye na-eje ije n’elu mmiri na-abịakwute ha. Ha wee tie mkpu n’ụjọ, n’ihi na ha amaghị ihe ha na-ahụ.

Jizọs wee sị ha: ‘Unu atụla egwu. Ọ bụ m!’ Ha ekwetaghị. Pita wee sị ya: ‘Ọ bụrụ na ọ bụ gị, Onyenwe anyị, gwa m ka m jee ije n’elu mmiri bịakwute gị.’ Jizọs wee sị ya: ‘Bịa!’ Pita wee pụta jee ije n’elu mmiri! Ma ọ tụrụ egwu wee malite imikpu, ma Jizọs zọpụtara ya.

E mesịa, Jizọs nyere ọtụtụ puku mmadụ nri ọzọ. N’oge nke a, o ji ogbe achịcha asaa na azụ nta ole na ole mee nke ahụ. Ọzọkwa, mmadụ niile rijuru afọ. Otú Jizọs si elekọta ndị mmadụ ọ́ dịghị ịtụnanya? Mgbe ọ ga na-achị dị ka eze nke Chineke, anyị agaghị echegbu onwe anyị maka ihe ọ bụla!

Matiu 14:1-32; 15:29-38; Jọn 6:1-21.



Ajụjụ

  • Olee ihe jọgburu onwe ya nke mere Jọn Onye Na-eme Baptizim, oleekwa otú o si metụ Jizọs n’ahụ́?
  • Olee otú Jizọs si nye ìgwè mmadụ ahụ so ya nri, nri hàkwa aṅaa fọdụrụ?
  • N’ihi gịnị ka ụjọ ji jide ndị na-eso ụzọ Jizọs n’abalị, gịnịkwa mere Pita?
  • Olee otú Jizọs si nye ọtụtụ puku mmadụ nri na nke ugboro abụọ ya?
  • N’ihi gịnị ka ọnọdụ ga-eji magbuo onwe ya mgbe Jizọs ga-achị ụwa dị ka Eze nke Chineke họpụtara?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Matiu 14:1-32.

    Olee ihe akụkọ dị na Matiu 14:23-32 na-eme ka anyị ghọta banyere àgwà Pita?

    Olee otú ihe ndị e dekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ si egosi na Pita bịara tozuo okè ma kwụsị ịdị na-eme ihe n’ebughị ụzọ chebara ya echiche? (Mat. 14:27-30; Jọn 18:10; 21:7; Ọrụ 2:14, 37-40; 1 Pita 5:6, 10)

  • Gụọ Matiu 15:29-38.

    Olee otú Jizọs si gosi nkwanye ùgwù maka ihe oriri nke Nna ya nyere? (Mat. 15:37; Jọn 6:12; Kọl. 3:15)

  • Gụọ Jọn 6:1-21.

    Olee otú Ndị Kraịst taa pụrụ isi gbasoo ihe nlereanya Jizọs n’ihe banyere ọchịchị? (Jọn 6:15; Mat. 22:21; Rom 12:2; 13:1-4)

GỤKWUO GBASARA YA

Jizọs Enyejuo Ọtụtụ Mmadụ Afọ

Chọpụta ihe a na-esetaghị na foto a, teekwa ya kreyọn.