Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 84: Otu Mmụọ Ozi Eleta Meri

Akụkọ nke 84: Otu Mmụọ Ozi Eleta Meri

NWANYỊ ọma a bụ Meri. Ọ bụ nwaanyị Izrel, nke bi n’obodo Nazaret. Chineke maara na ọ bụ ezigbo mmadụ. Ọ bụ ya mere o ji zite mmụọ ozi ya bụ́ Gebriel ịgwa ya okwu. Ị̀ ma ihe Gebriel bịara ịgwa Meri? Ka anyị lee.

Gebriel sịrị ya: ‘Ekelee m gị, onye nwere amara hie nne. Jehova nọnyeere gị.’ Meri ahụtụbeghị onye a mbụ. Meri nwere nchegbu n’ihi na ọ maghị ihe Gebriel na-ekwu. Ma Gebriel mere ka obi ruo ya ala ozugbo ahụ.

Meri

‘Meri, atụla egwu,’ ka ọ gwara ya. ‘Omume gị dị Jehova ezi mma. Ọ bụ ya mere ọ na-aga imere gị otu ihe dị ebube. Ị ga-amụ nwa n’isi nso. Ị ga-akpọkwa ya Jizọs.’

Gebriel gara n’ihu ịkọwa, sị: ‘Nwata ahụ ga-abụ onye ukwu, a ga-akpọkwa ya Ọkpara nke Chineke Kasị Ihe Niile Elu. Jehova ga-eme ya eze, dị ka e mere Devid. Ma Jizọs ga-abụ eze ruo mgbe ebighị ebi, alaeze ya agaghịkwa akwụsị akwụsị!’

‘Olee otú nke a pụrụ isi mee?’ ka Meri jụrụ. ‘Alụbeghịdị m di. Mụ na nwoke ebibeghịkwa, olee otú m ga-esi mụọ nwa?’

Gebriel wee zaa ya, sị: ‘Ike nke Chineke ga-abịakwasị gị. A ga-akpọkwa nwata ahụ Ọkpara Chineke.’ O wee sị Meri: ‘Cheta Elizabet onye ikwu gị. Ndị mmadụ sịrị na o meela agadi nke ukwuu, na ọ gaghịzi amụta nwa. Ma, ọ ga-amụ nwa n’oge na-adịghị anya. Ị̀ hụlanụ na ọ dịghị ihe karịrị Chineke ime.’

N’egbughị oge, Meri sịrị ya: ‘Abụ m ohu nke Jehova! Ya dịrị m dị ka i kwuru.’ Mmụọ ozi ahụ wee laa.

Meri jere ngwa ngwa ileta Elizabet. Mgbe Elizabet nụrụ olu Meri, nwa nọ n’afọ Elizabet wụliri elu n’ọṅụ. Mmụọ Chineke jupụtara Elizabet n’ahụ́, o wee gwa Meri, sị: ‘I nwere ngọzi dị iche n’etiti ndị inyom.’ Meri nọnyeere Elizabet ruo ihe dị ka ọnwa atọ, o wee laghachi Nazaret bụ́ ebe o bi.

Meri na-aga ịlụ otu nwoke aha ya bụ Josef. Ma mgbe Josef matara na Meri na-aga ịmụ nwa, o cheghị na ya kwesịrị ịlụ ya. Mgbe ahụ ka mmụọ ozi Chineke sịrị ya: ‘Atụla egwu ịkpọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye gị. N’ihi na ọ bụ Chineke nyere ya nwa nwoke.’ Ya mere, Meri na Josef lụrụ di na nwunye, ha wee na-eche ka a mụọ Jizọs.

Luk 1:26-56; Matiu 1:18-25.



Ajụjụ

  • Ònye bụ nwaanyị a nọ na foto a?
  • Gịnị ka Gebriel gwara Meri?
  • Olee otú Gebriel si kọwaara Meri na ọ ga-amụ nwa n’agbanyeghị na ọ lụbeghị di?
  • Gịnị mere mgbe Meri gara ileta onye ikwu ya bụ́ Elizabet?
  • Gịnị ka Josef chere n’echiche mgbe ọ matara na Meri dị ime, ma gịnị mere o ji gbanwee obi ya?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Luk 1:26-56.

    Gịnị ka Luk 1:35 na-egosi banyere ezughị okè ọ bụla dị n’àkwá dị n’akpa nwa Meri mgbe e si n’ógbè ndị bụ́ mmụọ bufee ndụ nke Ọkpara Chineke n’akpa nwa Meri? (Hag. 2:11-13; Jọn 6:69; Hib. 7:26; 10:5)

    Olee otú Jizọs si bụrụ onye a sọpụụrụ ọbụna tupu a mụọ ya? (Luk 1:41-43)

    Ihe nlereanya ọma dị aṅaa ka Meri setịpụụrụ Ndị Kraịst nwetara ihe ùgwù ije ozi pụrụ iche taa? (Luk 1:38, 46-49; 17:10; Ilu 11:2)

  • Gụọ Matiu 1:18-25.

    N’agbanyeghị na e nyeghị Jizọs aha ahụ bụ́ Ịmanuel, olee otú ihe o mere mgbe ọ bụ mmadụ si mezuo ihe aha ahụ pụtara? (Mat. 1:22, 23; Jọn 14:8-10; Hib. 1:1-3)

GỤKWUO GBASARA YA

Ozi Abụọ Sí n’Aka Chineke

Mmụọ ozi Gebriel ezite ozi ndị siri ike nkweta.

Kaadị Akụkọ Meri

Gụọ ihe a ka ị mata ebe Meri ku Jizọs gaa mgbe ọ mụchara Jizọs abalị iri anọ agaa. Bipụta kaadị akụkọ Baịbụl a, chakapụta ya ma dozie ya.

Meri—“Lee! Abụ M Nwa Agbọghọ Bụ́ Ohu Jehova!”

Olee otú ihe Meri gwara mmụọ ozi Gebriel si gosi na o nwere okwukwe? Olee àgwà ndị ọzọ Meri kpara?