Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 101: E Gbuo Jizọs

Akụkọ nke 101: E Gbuo Jizọs

LEE ihe ọjọọ nke na-emenụ! A na-egbu Jizọs. Ha akpọgidewo ya n’osisi. E ji ntu kpọgide aka na ụkwụ ya. Gịnị mere e ji mee Jizọs ihe a?

Mgbe Jizọs na-anwụ

Ọ bụ n’ihi na ụfọdụ ndị kpọrọ ya asị. Ị̀ ma ndị ha bụ? Otu n’ime ha bụ ajọ mmụọ ozi ahụ bụ́ Setan Ekwensu. Ọ bụ ya mere ka Adam na Iv nupụrụ Jehova isi. Ọ bụkwa Setan kpaliri ndị iro Jizọs ime oké ihe ọjọọ a.

Ọbụna tupu a kpọgide Jizọs n’osisi ebe a, ndị iro ya rụsara ya arụrụala. Ì chetara otú ha si bịa n’ogige Getsemeni duru ya pụọ? Ole ndị bụ ndị iro ahụ? Ha bụ ndị ndú okpukpe. Ka anyị hụ ihe ọzọ merenụ.

Mgbe ndị ndú okpukpe duuru Jizọs, ndịozi ya gbara ọsọ. Ha hapụrụ Jizọs n’aka ndị iro ya n’ihi ụjọ. Ma ndịozi bụ́ Pita na Jọn agbateghị aka. Ha sooro ha n’azụ iji hụ ihe ga-eme Jizọs.

Ndị nchụàjà ahụ duuru Jizọs jekwuru otu agadi nwoke aha ya bụ Anas, onye bụbu nnukwu onye nchụàjà. Ìgwè mmadụ ahụ anọghị ọdụ n’ebe ahụ. Ha duuru Jizọs gazie n’ụlọ Keifas, onye bụ́ nnukwu onye nchụàjà ugbu a. Ọtụtụ ndị ndú okpukpe zukọrọ n’ụlọ ya.

Ha kpere ya ikpe ebe ahụ n’ụlọ Keifas. A kpọtara ndị mmadụ ikwu okwu ụgha megide Jizọs. Ndị ndú okpukpe ahụ niile sịrị: ‘Jizọs kwesịrị ogbugbu.’ Ha bụrụ ya asọ mmiri n’ihu, tiekwa ya ọkpọ.

Mgbe ihe a niile na-eme, Pita nọ n’èzí ogige ụlọ ahụ. Ọ bụ abalị oyi na-atụ, ndị mmadụ wee kwanye ọkụ. Mgbe ha nọ gburugburu na-anya ọkụ, otu nwa agbọghọ bụ́ odibo lere Pita anya wee sị: ‘Nwoke a na Jizọs nọrọ.’

‘Ee e, mụ na ya anọghị!’ ka Pita zara.

Ugboro atọ ka ndị mmadụ gwara Pita na ya na Jizọs nọrọ. Ma Pita gọrọ agụgọ n’oge nke ọ bụla. Na nke ugboro atọ o kwuru nke a, Jizọs wee tụgharịa lee ya anya. O wutere Pita n’ihi ụgha ndị a ọ ghara, o wee pụọ kwaa ákwá.

Mgbe anyanwụ malitere ịwapụta n’ụtụtụ Friday, ndị nchụàjà duuru Jizọs gaa n’ebe buru ibu ha na-enwe nzukọ ha, bụ́ ụlọ nzukọ Sanhedrin. N’ebe ahụ ka ha nọ kwurịtaa ihe ha ga-eme ya. Ha wee duru ya jekwuru Pọntiọs Paịlet, bụ́ onye na-achị ógbè Judia.

Ndị nchụàjà sịrị Paịlet: ‘Onye a bụ ajọ mmadụ. O kwesịrị ogbugbu.’ Mgbe ọ jụsịrị Jizọs ajụjụ, Paịlet sịrị ha: ‘Ahụghị m ihe ọjọọ ọ bụla o mere.’ Paịlet wee ziga Jizọs na nke Herọd Antipas. Herọd bụ onye na-achị Galili, ma ọ nọ na Jeruselem. Herọd ahụghịkwa ihe ọjọọ Jizọs mere, o wee zighachiri ya Paịlet.

Paịlet chọrọ ịhapụ Jizọs. Ma ndị iro Jizọs chọrọ ka a hapụ onye mkpọrọ ọzọ kama ịhapụ Jizọs. Onye ha chọrọ ka a hapụ bụ Barabas, onye ohi. O ruwo ihe dị ka n’etiti ehihie ugbu a mgbe Paịlet kpọpụtara Jizọs n’èzí. O wee sị ha: ‘Leenụ! Eze unu!’ Ma ndị isi nchụàjà ahụ tiri mkpu, sị: ‘Kpọrọnụ ya! Gbuonụ ya! Gbuonụ ya.’ Ya mere, Paịlet hapụrụ Barabas ka ọ laa, ha duru Jizọs jee igbu ya.

N’ehihie Friday, a kpọgidere Jizọs n’osisi. A kpọgidekwara ndị omekome abụọ n’osisi n’ebe ahụ, ma ị pụghị ịhụ ha na foto a. Otu nọ n’aka nri Jizọs, nke ọzọ nọ n’aka ekpe ya. A hapụkwara ha n’ebe ahụ ka ha nwụọ. N’oge na-adịghị anya tupu Jizọs anwụọ, otu n’ime ndị omekome ahụ sịrị ya: ‘Cheta m mgbe ị banyere n’alaeze gị.’ Jizọs wee sị ya: ‘M na-ekwe gị nkwa na mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.’

Nke ahụ ọ́ bụghị nkwa dị ebube? Ị̀ ma paradaịs Jizọs na-ekwu okwu ya? Olee ebe paradaịs ahụ nke Chineke mere na mbụ dịbu? Ọ bụ n’elu ala. Mgbe Jizọs ga na-achịkwa dị ka eze n’eluigwe, ọ ga-eme ka nwoke ahụ dịghachi ndụ iji biri na Paradaịs ọhụrụ n’elu ala. Nke ahụ ọ́ dịghị eme anyị obi ụtọ?

Matiu 26:57-75; 27:1-50; Luk 22:54-71; 23:1-49; Jọn 18:12-40; 19:1-30.



Ajụjụ

  • Olee onye bụ́ isi nke kpatara ọnwụ Jizọs?
  • Gịnị ka ndịozi Jizọs mere mgbe ndị ndú okpukpe kpụụrụ Jizọs?
  • Gịnị mere n’ụlọ Keifas, bụ́ nnukwu onye nchụàjà?
  • Gịnị mere Pita ji pụọ gaa kwaa ákwá?
  • Mgbe a kpọghachitere Jizọs n’ihu Paịlet, gịnị ka ndị isi nchụàjà tiri ná mkpu?
  • Gịnị mere Jizọs n’ehihie Friday, nkwa dịkwa aṅaa ka o kwere onye mmebi iwu a kpọgidere n’osisi dị n’akụkụ ya?
  • Olee ebe Paradaịs ahụ Jizọs kwuru okwu ya ga-adị?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Matiu 26:57-75.

    N’ụzọ dị aṅaa ka ndị òtù ụlọikpe ukwu nke ndị Juu si gosi na ha nwere obi ọjọọ? (Mat. 26:59, 67, 68)

  • Gụọ Matiu 27:1-50.

    N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na ụta ahụ Judas kwara esighị ya n’obi? (Mat. 27:3, 4; Mak 3:29; 14:21; 2 Kọr. 7:10, 11)

  • Gụọ Luk 22:54-71.

    Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta ná ngọnahụ Pita gọnahụrụ Jizọs n’abalị ahụ a raara Jizọs nye ma jide ya? (Luk 22:60-62; Mat. 26:31-35; 1 Kọr. 10:12)

  • Gụọ Luk 23:1-49.

    Olee otú Jizọs si meghachi omume n’ikpe na-ezighị ezi e kpere ya, oleekwa ihe anyị pụrụ ịmụta site na nke a? (Luk 23:33, 34; Rom 12:17-19; 1 Pita 2:23)

  • Gụọ Jọn 18:12-40.

    Gịnị ka eziokwu ahụ bụ́ na Pita tụrụ egwu mmadụ ruo nwa oge, ma mesịakwa kwụsị ịtụ egwu ma ghọọ onyeozi dị ịrịba ama na-egosi? (Jọn 18:25-27; 1 Kọr. 4:2; 1 Pita 3:14, 15; 5:8, 9)

  • Gụọ Jọn 19:1-30.

    Olee ụzọ ziri ezi Jizọs si lee ihe onwunwe anya? (Jọn 2:1, 2, 9, 10; 19:23, 24; Mat. 6:31, 32; 8:20)

    Olee otú ihe ndị Jizọs kwuru tupu ya anwụọ si egosi na ọ kwadoro ọbụbụeze Jehova? (Jọn 16:33; 19:30; 2 Pita 3:14; 1 Jọn 5:4)

GỤKWUO GBASARA YA

Ndị Sanhedrin Ekpee Jizọs Ikpe, Mechaa Kpọgara Ya Paịlet

Ndị ndú okpukpe ndị Juu ekwupụta ihe bụ uche ha.

Eze Aka Ya Dị Ọcha Anọrọ n’Elu Osisi Na-ahụsi Anya

Jizọs ekwee otu n’ime ndị omekome a kpọgidere ya na ya n’osisi nkwa.

Gbalịa Bute Ihe E Dere na Jọn 3:16 n’Isi

Ị ga-amụta ihe e dere na Jọn 3:16, gị ewerezie ya zie ndị mmadụ ozi ọma ma ị gaa ozi ọma.