Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 83: Mgbidi Jeruselem

Akụkọ nke 83: Mgbidi Jeruselem
Ebe ndị ikom na-ewughachi mgbidi Jeruselem

LEE ọrụ niile a na-arụ n’ebe a. Ụmụ Izrel na-arụsi ọrụ ike n’iwu mgbidi Jeruselem. Mgbe Eze Nebukadneza bibiri Jeruselem otu narị afọ na afọ iri ise na abụọ gara aga, o tidara mgbidi ya, wee gbaa ọnụ ụzọ ámá niile nke obodo ahụ ọkụ. Ndị Izrel ewughachighị mgbidi ahụ ozugbo ha si Babilọn lọta.

Olee otú i chere ọ dị ha ibi n’ebe a afọ niile ahụ n’enweghị mgbidi gburugburu obodo ha? Obi erughị ha ala. Ndị iro ha pụrụ ịbata n’enweghị ihe mgbochi ma busoo ha agha. Ma ugbu a, nwoke a bụ́ Nehemaya na-enyere ha aka iwughachi mgbidi ahụ. Ị̀ ma onye Nehemaya bụ?

Nehemaya bụ onye Izrel nke si n’obodo Shushan, bụ́ ebe Mọdekaị na Esta bi. Nehemaya rụrụ ọrụ n’obí eze, n’ihi ya, ọ pụrụ ịbụ na ọ bụ ezigbo enyi Mọdekaị na Eze Nwaanyị bụ́ Esta. Ma Bible asịghị na Nehemaya rụụrụ Eze Ahazuirọs, bụ́ di Esta, ọrụ. Ọ rụụrụ eze nke sochiri ya, bụ́ Eze Atazaksis, ọrụ.

Cheta na Atazaksis bụ eze ọma ahụ nke nyere Ezra ego niile ahụ o bu laa Jeruselem iji dozie ụlọ nsọ Jehova. Ma Ezra ewughị mgbidi obodo ahụ nke e tikpọrọ etikpọ. Ka anyị hụ otú Nehemaya si bịa rụwazie ọrụ a.

Afọ iri na atọ agafewo kemgbe Atazaksis nyere Ezra ego iji dozie ụlọ nsọ ahụ. Nehemaya bụzi onyeisi ndị obu ihe ọṅụṅụ nke Eze Atazaksis. Nke a pụtara na ọ bụ ya na-enye eze mmanya, na-ahụkwa na ọ dịghị onye ga-anwa inye eze nsí. Ọ bụ ọrụ dị oké mkpa.

Otu ụbọchị, Hanenaị, bụ́ nwanne nwoke nke Nehemaya, na ndị ikom ndị ọzọ sitere n’ala Izrel, bịara ileta Nehemaya. Ha gwara ya nsogbu ndị ụmụ Izrel na-enwe na otú mgbidi Jeruselem ka si bụrụ nke e tikpọrọ etikpọ. Nke a wutere Nehemaya nke ukwuu, o wee kpekuo Jehova ekpere banyere ya.

Otu ụbọchị, eze chọpụtara na obi adịghị Nehemaya ụtọ, o wee jụọ ya, sị: ‘Gịnị mere ihu gị ji gbarụọ agbarụ?’ Nehemaya wee gwa ya na ọ bụ n’ihi na Jeruselem nọ n’ọnọdụ ọjọọ, na mgbidi ya dasịrị ada. Eze wee jụọ ya, sị: ‘Ọ̀ bụ gịnị ka ị chọrọ?’

Ebe Nehemaya na-agwa ndị na-ewu ụlọ ahụ otú ọrụ ga-esi na-aga

Nehemaya wee sị ya: ‘Kwe ka m gaa Jeruselem ka m wee wughachi mgbidi ya.’ Eze Atazaksis bụ nwoke obiọma. Ọ sịrị na Nehemaya nwere ike ije, o nyekwaara ya aka inweta osisi ụfọdụ a ga-eji wuo ihe owuwu ahụ. Ngwa ngwa Nehemaya ruru Jeruselem, ọ gwara ndị ahụ nzube ya. Nzube ya dị ha mma, ha wee sị: ‘Ngwanụ ka anyị malite iwu ya.’

Mgbe ndị iro ụmụ Izrel hụrụ ka mgbidi ahụ na-ala elu, ha sịrị: ‘Anyị ga-arịgo wee gbuo ha ma kwụsị ọrụ iwu ihe ahụ.’ Ma Nehemaya nụrụ banyere nke a, o wee nye ndị ọrụ ahụ mma agha na ube. O wee gwa ha, sị: ‘Unu atụla ndị iro anyị egwu. Lụọnụ ọgụ iji chebe ụmụnne unu, ụmụ unu, nwunye unu, na ụlọ unu.’

Ndị ahụ nwere obi ike. Ha debere ihe agha ha nso ehihie na abalị, wurukwa mgbidi ahụ na-aga. N’ihi ya, n’ime naanị ụbọchị iri ise na abụọ, ha wuchara mgbidi ahụ. Ugbu a, obi pụrụ iru ha ala n’ime obodo ahụ. Nehemaya na Ezra kụziiri ha iwu Chineke, obi tọkwara ha ụtọ.

Ma ihe adịghịzi otú ha dị tupu a dọrọ ndị Izrel n’agha laa Babilọn. Ọ bụ eze Peshia na-achị ha, ha aghaghịkwa ijere ya ozi. Ma Jehova kwere nkwa izitere ha eze ọhụrụ, nakwa na eze ahụ ga-ewetara ha udo. Ònye bụ eze nke a? Olee otú ọ ga-esi weta udo n’ụwa? Ihe dị ka narị afọ anọ na afọ iri ise gasịrị tupu a nụ ihe ọzọ banyere nke a. Mgbe ahụ ka a mụrụ otu nwa ọhụrụ, ọmụmụ ya bụkwa ọmụmụ kasị mkpa e nwetụworo. Ma nke ahụ bụ akụkọ ọzọ.

Nehemaịa isi 1 ruo 6.



Ajụjụ

  • Olee otú ọ dị ụmụ Izrel mgbe a na-enweghị mgbidi gbara obodo ha bụ́ Jeruselem gburugburu?
  • Ònye bụ Nehemaya?
  • Gịnị bụ ọrụ Nehemaya, n’ihi gịnịkwa ka o ji bụrụ ọrụ dị mkpa?
  • Olee ozi mere Nehemaya obi ọjọọ, gịnịkwa ka o mere?
  • Olee otú Eze Atakzasis si gosi Nehemaya obiọma?
  • Olee otú Nehemaya si hazie ọrụ iwu ihe ahụ iji mee ka ndị iro ụmụ Izrel ghara ịkwụsị ya?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Nehemaịa 1:4-6 na 2:1-20.

    Olee otú Nehemaya si chọọ nduzi Jehova? (Nehe. 2:4, 5; Rom 12:12; 1 Pita 4:7)

  • Gụọ Nehemaịa 3:3-5.

    Gịnị ka ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi pụrụ ịmụta site n’ọdịiche dị n’etiti ndị Tekoa na “ndị ukwu ha”? (Nehe. 3:5, 27; 2 Tesa. 3:7-10; 1 Pita 5:5)

  • Gụọ Nehemaịa 4:1-23.

    Gịnị kpaliri ụmụ Izrel ịnọgide na-ewu ihe owuwu n’agbanyeghị na a na-emegide ha n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ? (Nehe. 4:6, 8, 9; Ọma 50:15; Aịsa. 65:13, 14)

    Olee ụzọ ihe nlereanya ụmụ Izrel setịpụrụ si agba anyị ume taa?

  • Gụọ Nehemaịa 6:15.

    Gịnị ka mwusị e wusịrị mgbidi Jeruselem n’ime ọnwa abụọ na-egosi banyere ikike nke okwukwe? (Ọma 56:3, 4; Mat. 17:20; 19:26)