Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 82: Mọdekaị na Esta

Akụkọ nke 82: Mọdekaị na Esta

KA ANYỊ laghachi azụ n’afọ ole na ole tupu Ezra agaa Jeruselem. Mọdekaị na Esta bụ ndị Izrel a ma nnọọ ama n’alaeze Peshia. Esta bụ nwunye eze, nwa nwanne nna ya, bụ́ Mọdekaị, bụ onye na-esote eze n’ọchịchị. Ka anyị hụ otú ihe si bịa dịrị otú ahụ.

Ndị mụrụ Esta nwụrụ mgbe ọ bụ nwata, Mọdekaị wee zụlite ya. Ahazuirọs, bụ́ eze Peshia, nwere obí n’obodo ukwu bụ́ Shushan, Mọdekaị bụkwa otu n’ime ndị ohu ya. Otu ụbọchị, Vashtaị, bụ́ nwunye eze, nupụụrụ eze isi, eze wee họrọ nwunye ọhụrụ ịbụ lọọlọ ya. Ị̀ ma nwaanyị ọ họọrọ? Ọ bụ Esta, bụ́ nwa agbọghọ mara mma.

Mgbe iwe ji Heman n’ihi na Mọdekaị ekweghị akpọrọ ya isi ala

Ị̀ na-ahụ nwoke mpako a ndị mmadụ na-akpọrọ isi ala? Aha ya bụ Heman. Ọ bụ nwoke a ma ama na Peshia. Heman na-achọkwa ka Mọdekaị, bụ́ onye ahụ ị na-ahụ nọdụrụ ala n’ebe ahụ, kpọọrọ ya isi ala. Ma Mọdekaị ekweghị akpọrọ ya isi ala. Mọdekaị echeghị na o ziri ezi ịkpọrọ ajọ mmadụ dị otú ahụ isi ala. Nke a kpasuru Heman iwe. N’ihi ya, lezienụ ihe o mere.

Heman gwara eze okwu ụgha banyere ndị Izrel. Ọ sịrị: ‘Ha bụ ndị ọjọọ, ndị na-adịghị erube isi n’iwu gị. Ha kwesịrị ogbugbu.’ Ahazuirọs amaghị na Esta nwunye ya bụ onye Izrel. Ya mere, o gere Heman ntị wee mee iwu na a ga-egbu ndị Izrel niile n’otu ụbọchị a kara aka.

Mgbe Mọdekaị nụrụ banyere iwu ahụ, o wutere ya nke ukwuu. O wee zigara Esta ozi, sị ya: ‘Ị ghaghị ịgwa eze, rịọ ya ka ọ zọpụta anyị.’ O megidere iwu n’ala Peshia bụ́ mmadụ ịga n’ihu eze ọ gwụla ma ọ kpọrọ onye ahụ. Ma Esta gara n’ihu eze mgbe ọ na-akpọghị ya. Eze matịrị mkpọ ọlaedo ya, bụ́ nke na-egosi na a gaghị egbu ya. Esta kpọrọ eze na Heman oké oriri. N’ebe ahụ ka eze nọ jụọ Esta ihe ọma ọ chọrọ ka ya meere ya. Esta wee sị na ya ga-agwa ya ma ọ bụrụ na ya na Heman ga-abịa n’oriri ọzọ n’echi ya.

N’oriri ahụ, Esta gwara eze, sị: ‘A na-aga igbu mụ na ndị m.’ Iwe were eze. ‘Ònye na-anwa ime ihe nke a?’ ka ọ jụrụ ya.

Esta wee sị ya: ‘Onye iro ahụ bụ ajọ nwoke a bụ́ Heman?’

Ebe Nwunye Eze bụ́ Esta na-agwa Eze na ọ bụ Heman na-akpata nkata ka e gbuo ndị Izrel

Ezigbo iwe ji eze ugbu a. O wee nye iwu ka e gbuo Heman. N’ikpeazụ, eze mere Mọdekaị onye na-esote ya n’ọchịchị. Mgbe ahụ, Mọdekaị hụrụ na e mere iwu ọhụrụ nke nyere ndị Izrel ikike ịlụ ọgụ maka ndụ ha n’ụbọchị ahụ e zubere igbusị ha. Ebe ọ bụ na Mọdekaị bụ nwoke a ma ama ugbu a, ọtụtụ ndị nyeere ndị Izrel aka, e wee zọpụta ha n’aka ndị iro ha.

Akwụkwọ Bible bụ́ Esta.



Ajụjụ

  • Mọdekaị na Esta hà bụ ole ndị?
  • N’ihi gịnị ka Eze Ahaziurọs ji chọọ nwunye ọhụrụ, ònyekwa ka ọ họọrọ?
  • Ònye bụ Heman, gịnịkwa na-ewe ya iwe?
  • Iwu dị aṅaa ka e mere, gịnịkwa ka Esta mere mgbe o nwetasịrị ozi sitere n’aka Mọdekaị?
  • Gịnị mere Heman, gịnịkwa mere Mọdekaị?
  • Olee otú e si zọpụta ụmụ Izrel n’aka ndị iro ha?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Esta 2:12-18.

    Olee otú Esta si gosipụta uru ịzụlite ‘mmụọ dị jụụ na nke dị nwayọọ’ bara? (Esta 2:15; 1 Pita 3:1-5)

  • Gụọ Esta 4:1-17.

    Dị nnọọ ka e nyere Esta ohere ime ihe maka ọdịmma nke ezi ofufe, olee ohere a na-enye anyị taa iji gosipụta na anyị na-anọgidesi ike n’akụkụ Jehova? (Esta 4:13, 14; Mat. 5:14-16; 24:14)

  • Gụọ Esta 7:1-6.

    Olee otú ọtụtụ n’ime ndị Chineke taa siworo mee ihe maka ndị ọzọ n’agbanyeghị na ọ pụrụ ịkpatara ha mkpagbu, dị nnọọ ka Esta mere? (Esta 7:4; Mat. 10:16-22; 1 Pita 2:12)

GỤKWUO GBASARA YA

Kaadị Akụkọ Esta

Olee ihe Esta katara obi mee nke zọrọ ndị mmadụ ndụ? Bipụta kaadị a ka ị mụta ihe n’aka Esta.