Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 81: Ha Tụkwasịrị Chineke Obi na Ọ Ga-enyere Ha Aka

Akụkọ nke 81: Ha Tụkwasịrị Chineke Obi na Ọ Ga-enyere Ha Aka

ỌTỤTỤ puku mmadụ mere njem ahụ dị anya si na Babilọn laa Jeruselem. Ma mgbe ha laruru, Jeruselem bụ naanị mkpọmkpọ ebe. Ọ dịghị onye bi na ya. Ndị Izrel malitere n’isi iwughachi ihe niile.

Otu n’ime ihe ndị mbụ ha wuru bụ ebe ịchụàjà. Nke a bụ ebe ha na-eji ụmụ anụmanụ achụrụ Jehova àjà, ma ọ bụ enye ya onyinye. Mgbe ọnwa ole na ole gasịrị, ụmụ Izrel malitere iwu ụlọ nsọ ahụ. Ma ndị iro ndị bi nso n’ala ahụ achọghị ka ụmụ Izrel wuo ya. Ya mere, ha nwara iyi ha egwu iji mee ka ha kwụsị ọrụ. N’ikpeazụ, ndị iro a mere ka eze ọhụrụ nke Peshia nye iwu ka a kwụsị ọrụ iwu ụlọ ahụ.

Ọtụtụ afọ wee gafee. O ruwo afọ iri na asaa ugbu a kemgbe ụmụ Izrel si Babilọn lọta. Jehova wee ziga Hagaị na Zekaraya ndị amụma ya ka ha gwa ha ka ha maliteghachi iwu ụlọ nsọ ahụ. Ụmụ Izrel tụkwasịrị Chineke obi na ọ ga-enyere ha aka, ha wee gee ndị amụma ahụ ntị. Ha maliteghachiri iwu ụlọ ahụ n’agbanyeghị na iwu sịrị ha ewula.

Otu n’ime ndị isi ọchịchị Peshia, bụ́ Tatenaị, bịara ịjụ ụmụ Izrel onye nyere ha ikike iwu ụlọ nsọ ahụ. Ụmụ Izrel gwara ya na mgbe ha nọ na Babilọn, na Eze Saịrọs gwara ha, sị: ‘Laanụ Jeruselem ka unu wuo ụlọ nsọ Jehova, bụ́ Chineke unu.’

Tatenaị zigara akwụkwọ ozi na Babilọn iji jụọ ma Saịrọs ò kwuru nke ahụ n’eziokwu n’oge ọ nọ ndụ. N’oge na-adịghị anya, akwụkwọ ozi si n’aka eze ọhụrụ nke Peshia bịa. Ọ sịrị na Saịrọs kwuru otú ahụ n’ezie. N’ihi ya, eze dere akwụkwọ, sị: ‘Hapụnụ ndị Izrel ka ha wuo ụlọ nsọ nke Chineke ha. Ana m enyekwa unu iwu ka unu nyere ha aka.’ E wusịrị ụlọ nsọ ahụ n’ime afọ anọ, obi tọkwara ndị Izrel ezigbo ụtọ.

Ọtụtụ afọ ndị ọzọ agafewo. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ iri anọ na asatọ ugbu a kemgbe e wusịrị ụlọ nsọ ahụ. Ndị bi na Jeruselem dara ogbenye, obodo ha na ụlọ nsọ Chineke amaghịkwa mma n’anya. N’ime Babilọn, onye Izrel bụ́ Ezra matara mkpa e nwere iwuzi ụlọ nsọ Chineke. Ị̀ ma ihe o mere?

Ezra jere hụ Atakzazis, bụ́ eze Peshia, eze ọma ahụ wee nye Ezra ọtụtụ onyinye ọ ga-eburu laa Jeruselem. Ezra rịọrọ ndị Izrel nọ na Babilọn ka ha nyere ya aka ibuga ihe ndị ahụ na Jeruselem. Ihe dị ka puku mmadụ isii sịrị na ha ga-eje. Ha nwere ọtụtụ ọlaọcha na ọlaedo na ihe ndị ọzọ dị oké ọnụ ahịa ha ga-ebu.

Ezra nwere nchegbu n’ihi na ndị ọjọọ na-anọ n’ụzọ. Ndị ahụ pụrụ izunara ha ọlaọcha na ọlaedo ha, ma gbuo ha. N’ihi ya, Ezra kpọkọtara ndị ahụ, dị ka ị na-ahụ na foto a. Ha wee kpekuo Jehova ekpere ka o chebe ha n’ogologo njem ha ga-eme laghachi Jeruselem.

Mgbe Ezra na ụmụ Izrel na-ekpe ekpere

Jehova chebere ha. Mgbe ha mesịrị njem ruo ọnwa anọ, ha ruru Jeruselem n’udo. Nke a ọ́ dịghị egosi na Jehova pụrụ ichebe ndị nwere ntụkwasị obi na ọ ga-enyere ha aka?

Ezra isi 2 ruo 8.



Ajụjụ

  • Mmadụ ole mere ogologo njem ahụ si na Babilọn laa Jeruselem, ma gịnị ka ha hụrụ mgbe ha laruru?
  • Gịnị ka ndị Izrel malitere iwu mgbe ha lọrutere, ma gịnị ka ndị iro ha mere?
  • Hagaị na Zekaraya hà bụ ole ndị, gịnịkwa ka ha gwara ụmụ Izrel?
  • N’ihi gịnị ka Tatenaị ji ziga akwụkwọ ozi na Babilọn, gịnịkwa ka a zara ya?
  • Gịnị ka Ezra mere mgbe ọ nụrụ banyere mkpa e nwere iwughachi ụlọ nsọ Chineke?
  • Gịnị ka Ezra na-ekpe ekpere banyere ya na foto a, olee otú e si zaa ekpere ya, gịnịkwa ka nke a na-akụziri anyị?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Ezra 3:1-13.

    Ọ bụrụ na anyị enweta onwe anyị n’ebe a na-enweghị ọgbakọ ndị Chineke, gịnị ka anyị kwesịrị ịnọgide na-eme? (Ezra 3:3, 6; Ọrụ 17:16, 17; Hib. 13:15)

  • Gụọ Ezra 4:1-7.

    Olee ihe nlereanya Zerubabel setịpụụrụ ndị Jehova ma a bịa n’ihe banyere ngwakọta okpukpe? (Ọpụ. 34:12; 1 Kọr. 15:33; 2 Kọr. 6:14-17)

  • Gụọ Ezra 5:1-5, 17 na 6:1-22.

    Gịnị mere ndị mmegide ahụ enwelighị ike igbochi ọrụ ụlọ nsọ ahụ? (Ezra 5:5; Aịsa. 54:17)

    Olee otú ihe ndị okenye nke ndị Juu mere si agba Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye ume ịchọ nduzi Jehova mgbe ha na-eche ndị mmegide ihu? (Ezra 6:14; Ọma 32:8; Rom 8:31; Jems 1:5)

  • Gụọ Ezra 8:21-23, 28-36.

    Tupu anyị emewe ihe anyị chọrọ ime, ihe nlereanya dị aṅaa nke Ezra setịpụrụ ka ọ ga-adị mma ka anyị ṅomie? (Ezra 8:23; Ọma 127:1; Ilu 10:22; Jems 4:13-15)