Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 78: Ihe Aka Dere ná Mgbidi

Akụkọ nke 78: Ihe Aka Dere ná Mgbidi
Aka nke na-ede ihe ná Mgbidi

GỊNỊ na-eme n’ebe a? Ndị a nọ n’oké oriri. Eze Babilọn kpọrọ otu puku mmadụ bụ́ ndị ukwu oriri. Ha ji iko ọlaedo na iko ọlaọcha na arịa ndị e weere n’ụlọ nsọ Jehova dị na Jeruselem na-aṅụ mmanya. Ma, na mberede, a hụrụ mkpịsị aka mmadụ nke malitere ide ihe ná mgbidi ụlọ ahụ. Egwu jidere mmadụ niile.

Belshaza na ndị ọ kpọrọ oriri

Ọ bụ Belshaza, nwa nwa Nebukadneza, bụ eze nke na-achị mgbe ahụ. O tiri mkpu ka e duta ndị amamihe ya. Ọ sị ha: ‘Onye ọ bụla nke pụrụ ịgụ ihe odide nke a na ịkọrọ m isi ya, aga m enye ya ọtụtụ onyinye, m ga-emekwa ya onyeisi nke atọ kachasị mkpa n’alaeze m.’ Ma, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ndị amamihe ya pụrụ ịgụ ihe ahụ e dere ná mgbidi ma ọ bụ ịkọ isi ya.

Nne eze wee nụ mkpọtụ ahụ, wee bata n’ime ụlọ oriri ahụ. O wee sị eze: ‘Biko atụla egwu hie nne. Ọ dị otu nwoke nọ n’alaeze gị nke maara chi dị nsọ. Mgbe nna nna gị bụ́ Nebukadneza bụ eze, o mere ya onyeisi ndị amamihe ya. Aha ya bụ Daniel. Zie ozi ka a kpọọ ya, ọ ga-akọrọ gị isi ihe a niile.’

E dutara Daniel ngwa ngwa. Mgbe ọ jụsịrị ịnara onyinye ọ bụla, ọ malitere ịkọ ihe mere Jehova ji chụtuo nna nna Belshaza, bụ́ Nebukadneza, n’ocheeze ya. Daniel sịrị: ‘Ọ dị mpako nke ukwuu. Jehova wee nye ya ahụhụ.’

Daniel wee sị Belshaza: ‘Gị onwe gị maara ihe niile mere ya, ma gị agaa n’ihu na-adị mpako dị ka Nebukadneza. I jiwo iko na arịa niile a chịtara n’ụlọ nsọ Jehova ṅụọ ihe ọṅụṅụ. I fewo chi ndị e ji osisi na nkume mee, ị sọpụrụghịkwa Onye Okike ukwu anyị. Ọ bụ ya mere Chineke ji zite aka ahụ ide okwu ndị a.

‘Nke a bụ ihe e dere,’ ka Daniel sịrị: ‘ME′NE, ME′NE, TE′KEL na PAR′SIN.’

‘ME′NE pụtara na Chineke agụwo ụbọchị alaeze gị ọnụ, ma weta ya ná njedebe. TE′KEL pụtara na a tụwo gị n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ wee hụ na ị bụghị ezigbo mmadụ. PAR′SIN pụtara na e nyewo ndị Midia na ndị Peshia alaeze gị.’

Mgbe Daniel ka kpụ nnọọ okwu n’ọnụ, ndị Midia na ndị Peshia malitere ibuso Babilọn agha. Ha dọọrọ obodo ahụ n’agha, wee gbuo Belshaza. Ihe ahụ aka dere ná mgbidi mezuru kpọmkwem n’abalị ahụ! Ma gịnị ga-eme ụmụ Izrel ugbu a? E mesịa, anyị ga-achọpụta nke ahụ, ma, ka anyị buru ụzọ hụ ihe mere Daniel.

Daniel 5:1-31.



Ajụjụ

  • Gịnị mere mgbe eze Babilọn kpọrọ oké oriri ma jiri iko na arịa ndị e weere n’ụlọ nsọ Jehova dị na Jeruselem mee ihe?
  • Gịnị ka Belshaza gwara ndị amamihe ya, ma gịnị ka ha na-enweghị ike ime?
  • Gịnị ka nne eze ahụ gwara ya ka o mee?
  • Dị ka Daniel gwara eze ahụ, gịnị mere Chineke ji zite aka ahụ ka o dee ihe ná mgbidi?
  • Olee otú Daniel si kọwaa ihe ahụ aka dere na mgbidi?
  • Gịnị mere mgbe Daniel ka kpụ okwu n’ọnụ?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Daniel 5:1-31.

    Olee ọdịiche dị n’etiti ịtụ egwu Chineke na egwu Belshaza tụrụ mgbe ọ hụrụ ihe ahụ aka dere ná mgbidi. (Dan. 5:6, 7; Ọma 19:9; Rom 8:35-39)

    Olee otú Daniel si gosipụta obi ike dị ukwuu mgbe ọ na-agwa Belshaza na ndị ukwu ya okwu? (Dan. 5:17, 18, 22, 26-28; Ọrụ 4:29)

    Olee otú Daniel isi 5 si eme ka ọbụbụ Jehova bụ eze eluigwe na ala pụta ìhè? (Dan. 4:17, 25; 5:21)