Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Nkebi nke 5: Site ná Ndọrọ n’Agha Laa Babilọn Ruo ná Mwughachi nke Mgbidi Jeruselem

Nkebi nke 5: Site ná Ndọrọ n’Agha Laa Babilọn Ruo ná Mwughachi nke Mgbidi Jeruselem

Mgbe ụmụ Izrel nọ na Babilọn, bụ́ ebe a dọọrọ ha n’agha laa, ha nwetara ọtụtụ ule nke okwukwe. A tụbara Shedrak, Mishak, na Abednego n’ime ọkụ na-enwu ajọ onwunwu, ma Chineke napụtara ha. E mesịa, mgbe ndị Midia na ndị Peshia meriri Babilọn, a tụbara Daniel n’olulu ọdụm ma Chineke chebere ya site n’imechi ọnụ ọdụm ndị ahụ.

N’ikpeazụ, eze Saịrọs nke Peshia tọhapụrụ ụmụ Izrel. Ha laghachiri n’ala ha mgbe naanị afọ iri asaa a dọọrọ ha n’agha laa Babilọn gasịrị. Otu n’ime ihe mbụ ha mere mgbe ha laruru Jeruselem bụ ịmalite iwu ụlọ nsọ Jehova. Ma, n’oge na-adịghị anya, ndị iro kwụsịrị ọrụ ahụ. Ya mere, ọ bụ ihe dị ka afọ iri abụọ na abụọ mgbe ha laghachisịrị Jeruselem ka ha wusịrị ụlọ nsọ ahụ.

Ọzọkwa, anyị ga-amụ banyere nlaghachi Ezra laghachiri Jeruselem iji chọọ ụlọ nsọ ahụ mma. Nke a bụ ihe dị ka afọ iri anọ na asaa e wusịrị ụlọ nsọ ahụ. Mgbe afọ iri na atọ gafesịrị kemgbe Ezra lọtasịrị, Nehemaya nyere aka n’iwughachi mgbidi Jeruselem ahụ e tikpọrọ etikpọ. NKEBI NKE 5 na-akọ akụkọ ihe ndị mere n’ime otu narị afọ na afọ iri ise na abụọ nke batara n’oge anyị a.

Mgbe Ezra na ndị mmadụ na-ekpe ekpere