Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 74: Nwoke nke Na-atụghị Egwu

Akụkọ nke 74: Nwoke nke Na-atụghị Egwu

LEE ka ndị a ji nwa okorobịa a na-eme ihe ọchị. Ị̀ ma onye ọ bụ? Ọ bụ Jeremaya. Ọ bụ onye amụma dị mkpa nke Chineke.

Ebe ndị mmadụ na-achị Jeremaya ọchị

Ngwa ngwa Eze Josaya malitesịrị imebi arụsị ndị dị n’ala Juda, Jehova gwara Jeremaya ka ọ bụrụ onye amụma Ya. Ma Jeremaya chere na ya etorubeghị ịbụ onye amụma. Ma Jehova sịrị na ya ga-enyere ya aka.

Jeremaya gwara ụmụ Izrel ka ha kwụsị ime ihe ọjọọ. ‘Chi niile nke ndị mba ọzọ na-efe ofufe bụ chi ụgha,’ ka ọ sịrị. Ma ọtụtụ ndị Izrel họọrọ ife arụsị kama ife ezi Chineke bụ́ Jehova. Mgbe Jeremaya gwara ha na Chineke ga-ata ha ahụhụ n’ihi ajọ omume ha, ha chịrị ya ọchị.

Ọtụtụ afọ agaa. Josaya wee nwụọ, mgbe afọ atọ gasịkwara, Jehoyakim nwa ya wee bụrụ eze. Jeremaya nọgidere na-agwa ụmụ Izrel, sị: ‘A ga-ebibi Jeruselem ma ọ bụrụ na unu agbanweghị omume ọjọọ unu.’ Ndị nchụàjà jidere Jeremaya wee tie mkpu na-asị: ‘I kwesịrị ogbugbu n’ihi ihe ndị a i kwuru.’ Ha wee gwa ndị isi Izrel, sị: ‘E kwesịrị igbu Jeremaya, n’ihi na o kwujọọla obodo anyị.’

Gịnị ka Jeremaya ga-eme ugbu a? Ọ tụghị egwu! Ọ gwara ha niile, sị: ‘Jehova zitere m ịgwa unu ihe ndị a. Ọ bụrụ na unu agbanweghị ndụ ọjọọ unu na-adị, Jehova ga-ebibi Jeruselem. Ma maranụ nke a: Ọ bụrụ na unu egbuo m, unu na-egbu onye na-emeghị ihe ọjọọ ọ bụla.’

Ndị isi ahụ kwere ka Jeremaya dị ndụ, ma ndị Izrel agbanweghị ụzọ ọjọọ ha. E mesịa, Nebukadneza, bụ́ eze Babilọn, bịara busoo Jeruselem agha. N’ikpeazụ, Nebukadneza mere ụmụ Izrel ndị ohu ya. Ọ dọọrọ ọtụtụ puku n’ime ha n’agha laa Babilọn. Chegodị ihe ọ ga-adị ka ya ma ọ bụrụ na ndị ị na-amaghị esi n’ala gị dọrọ gị n’agha laa n’ala ị na-amaghị!

Jeremaịa 1:1-8; 10:1-5; 26:1-16; 2 Ndị Eze 24:1-17.



Ajụjụ

  • Ònye bụ nwa okorobịa a nọ na foto a?
  • Gịnị ka Jeremaya chere banyere ọchịchọ a chọrọ ka ọ bụrụ onye amụma, ma gịnị ka Jehova gwara ya?
  • Olee ozi Jeremaya nọgidere na-ezi ụmụ Izrel?
  • Olee otú ndị isi nchụàjà si nwaa igbochi Jeremaya izi ozi ya, ma olee otú o si gosi na ụjọ anaghị atụ ya?
  • Gịnị mere mgbe ụmụ Izrel na-agbanweghị omume ọjọọ ha?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Jeremaịa 1:1-8.

    Dị ka ihe atụ banyere Jeremaya na-egosi, gịnị na-eme ka mmadụ ruo eru ijere Jehova ozi? (2 Kọr. 3:5, 6)

    Olee agbamume nke ihe atụ banyere Jeremaya na-enye ndị ntorobịa bụ́ Ndị Kraịst taa? (Ekli. 12:1; 1 Tim. 4:12)

  • Gụọ Jeremaịa 10:1-5.

    Olee ihe atụ bụ́ ịgba nke Jeremaya ji gosi na ọ dịghị uru ọ bara ịtụkwasị arụsị obi? (Jer. 10:5; Aịsa. 46:7; Hab. 2:19)

  • Gụọ Jeremaịa 26:1-16.

    Mgbe ha na-ezi ozi ịdọ aka ná ntị ahụ taa, olee otú ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ siworo buru n’uche iwu Jehova nyere Jeremaya bụ́ ka ọ ‘ghara iwepụ ihe n’okwu ndị ahụ’? (Jer. 26:2; Deut. 4:2; Ọrụ 20:27)

    Olee ihe nlereanya magburu onwe ya Jeremaya setịpụụrụ Ndịàmà Jehova taa n’ịkpọsara ndị nke mba niile ozi ịdọ aka ná ntị Jehova? (Jer. 26:8, 12, 14, 15; 2 Tim. 4:1-5)

  • Gụọ 2 Ndị Eze 24:1-17.

    Olee ihe ọjọọ ndị Juda nwetara n’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi nye Jehova? (2 Eze 24:2-4, 14)

GỤKWUO GBASARA YA

Kaadị Akụkọ Jeremaya

Olee mgbe Chineke họpụtara Jeremaya ka ọ bụrụ onye amụma ya? Danloduo kaadị a ka ị chọpụta mgbe ọ bụ.