Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 64: Solomọn Ewuo Ụlọ Nsọ

Akụkọ nke 64: Solomọn Ewuo Ụlọ Nsọ

TUPU Devid anwụọ, o nyere Solomọn ụkpụrụ Chineke tụrụ maka iwu ụlọ nsọ Jehova. N’ime afọ nke anọ nke ọchịchị ya, Solomọn malitere iwu ụlọ nsọ ahụ, o wekwara afọ asaa na ọkara iji wusịa ya. Ọtụtụ puku mmadụ rụrụ ọrụ n’iwu ụlọ nsọ ahụ, e mefukwara ego hiri nne n’iwu ya. Ọ bụ n’ihi na e ji ọtụtụ ọlaedo na ọlaọcha wuo ya.

Ụlọ nsọ ahụ nwere ime ụlọ ukwu abụọ, dị ka ụlọikwuu ahụ nwere. Ma ime ụlọ ndị a karịrị ndị nke ụlọikwuu ahụ okpukpu abụọ. Solomọn mere ka e debe igbe ọgbụgba ndụ ahụ n’otu n’ime ụlọ ndị dị n’ụlọ nsọ ahụ, werekwa ihe ndị ọzọ e debere n’ime ụlọikwuu ahụ debe n’ime ụlọ nke ọzọ.

Mgbe e wusịrị ụlọ ahụ, e mere oké ememe. Solomọn gburu ikpere n’ihu ụlọ nsọ ahụ wee kpee ekpere, dị ka ị na-ahụ na foto a. Ọ gwara Jehova, sị: ‘Eluigwe niile agaghịdị aba gị ka ọ fọdụzie ụlọ nsọ a? Ma biko, Chineke m, na-ege ndị gị ntị mgbe ha chere ihu n’ebe a na-ekpe ekpere.’

Mgbe Eze Solomọn na-ekpe ekpere

Mgbe Solomọn kpesịrị ekpere, ọkụ si n’eluigwe bịa. O repịara anụmanụ niile ahụ e ji chụọ àjà. Ìhè nke sitere n’ebe Jehova nọ wee jupụta n’ụlọ ahụ. Nke a na-egosi na Jehova na-ege ntị, nakwa na ụlọ ahụ na ekpere Solomọn dị ya mma. Ụlọ nsọ ahụ ghọziri ebe ndị Izrel na-abịa efe ofufe kama ịbụ ụlọikwuu ahụ.

Solomọn ji amamihe chịa ruo ogologo oge, obi dịkwa ụmụ Izrel ụtọ. Ma Solomọn lụrụ ọtụtụ ndị inyom ala ọzọ ndị na-adịghị efe Jehova. Ị̀ na-ahụ otu n’ime ha ka ọ na-efe arụsị ahụ? N’ikpeazụ, ndị inyom Solomọn dubara ya n’ife chi ọzọ. Ị̀ ma ihe mere mgbe Solomọn mere nke a? O mesoghịzi ndị Izrel ihe n’obiọma. O mesoro ha ihe n’obi ọjọọ, ha adịghịzikwa enwe obi ụtọ.

Ebe Eze Solomọn na-efe arụsị

Nke a mere ka Jehova wesa Solomọn iwe, o wee sị ya: ‘M ga-anapụ gị alaeze gị nye nwoke ọzọ. M gaghị eme nke a n’oge ndụ gị, kama n’oge ọchịchị nke nwa gị. Ma m gaghị ewepụ ndị niile nọ n’alaeze nwa gị.’ Ka anyị hụ ka nke a si mee.

1 Ihe E Mere 28:9-21; 29:1-9; 1 Ndị Eze 5:1-18; 2 Ihe E Mere 6:12-42; 7:1-5; 1 Ndị Eze 11:9-13.



Ajụjụ

  • Ogologo oge hà aṅaa ka o were Solomọn iwucha ụlọ nsọ Jehova, n’ihi gịnịkwa ka o ji fuo oké ego?
  • Ọnụ ụlọ ole dị n’ụlọ nsọ ahụ, gịnịkwa ka e debere n’ụlọ nke dị n’ime ime?
  • Gịnị ka Solomọn kpere n’ekpere mgbe e wuchara ụlọ nsọ ahụ?
  • Olee otú Jehova si gosi na ya nabatara ekpere Solomọn?
  • Gịnị ka ndị nwunye Solomọn mere ya ka o mee, gịnịkwa mere Solomọn?
  • N’ihi gịnị ka Jehova ji wesa Solomọn iwe, gịnịkwa ka Jehova gwara ya?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ 1 Ihe E Mere 28:9, 10.

    N’iburu n’uche ihe Devid kwuru na 1 Ihe E Mere 28:9, 10, gịnị ka anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ime ná ndụ anyị kwa ụbọchị? (Ọma 19:14; Fil. 4:8, 9)

  • Gụọ 2 Ihe E Mere 6:12-21, 32-42.

    Olee otú Solomọn si gosi na ọ dịghị ụlọ ọ bụla e ji aka wuo nke ga-aba Chineke Kasị Ihe Niile Elu? (2 Ihe 6:18; Ọrụ 17:24, 25)

    Gịnị ka okwu Solomọn nke dị na 2 Ihe E Mere 6:33 na-egosi banyere Jehova? (Ọrụ 10:34, 35; Gal. 2:6)

  • Gụọ 2 Ihe E Mere 7:1-5.

    Dị nnọọ ka a kpaliri ụmụ Izrel ito Jehova mgbe ha hụrụ ebube ya, olee mmetụta anyị kwesịrị inwe taa mgbe anyị tụgharịrị uche ná ngọzi Jehova na-agọzi ndị ya? (2 Ihe 7:3; Ọma 22:22; 34:1; 96:2)

  • Gụọ 1 Ndị Eze 11:9-13.

    Olee otú ụzọ ndụ Solomọn si gosi mkpa ọ dị mmadụ ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi ruo n’ọgwụgwụ nke ndụ ya? (1 Eze 11:4, 9; Mat. 10:22; Mkpu. 2:10)