Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 59: Ihe Mere Devid Ji Gbaa Ọsọ

Akụkọ nke 59: Ihe Mere Devid Ji Gbaa Ọsọ

MGBE Devid gbusịrị Golayat, Abna onyeisi agha Izrel duuru ya jekwuru Sọl. Sọl nwere mmasị n’ebe Devid nọ. O wee mee ya onyeisi agha ya, wee kpọrọ ya ka o biri n’ụlọ eze.

E mesịa, mgbe ndị agha Sọl na-alọta ka ha busosịrị ndị Filistia agha, ụmụ nwaanyị bụrụ abụ, sị: ‘Sọl egbuwo ọtụtụ puku, ma Devid gburu ọtụtụ iri puku.’ Nke a mere ka Sọl mewere Devid anyaụfụ n’ihi na e nyere Devid otuto karịa ya. Ma Jonatan nwa Sọl adịghị emere Devid anyaụfụ. Ọ hụrụ Devid n’anya nke ukwuu, otú ahụ ka Devid hụkwara Jonatan. Ha abụọ kwerịtara ibe ha nkwa ịbụ ndị enyi mgbe niile.

Ebe Eze Sọl na-atụ ube

Devid maara akpọ ụbọ akwara nke ọma, olu ụtọ ọ na-akpọ na-amasịkwa Sọl. Otu ụbọchị, anyaụfụ Sọl kpaliri ya ime ihe dị egwu. Mgbe Devid na-akpọ ụbọ ya, Sọl tụrụ ube ya, na-asị: ‘M ga-atụgide Devid ná mgbidi!’ Devid wee zee ya, ube ahụ atụtaghịkwa ya. Mgbe e mesịrị, Devid zere ube ọzọ Sọl tụrụ ya. Nke ahụ mekwara ka Devid mata na ya aghaghị ịkpachapụ anya.

Ì chetara nkwa ahụ Sọl kwere? O kwuru na ya ga-akpọnye nwoke ga-egbu Golayat ada ya ka ọ lụwa. N’ikpeazụ, Sọl gwara Devid ka o duru ada ya Maịkal, ma tupu ya emee nke ahụ, ọ ghaghị ibu ụzọ gbuo otu narị ndị iro bụ́ ndị Filistia. Chee echiche banyere nke ahụ! Sọl chere n’ezie na ndị Filistia ga-egbu Devid. Ma ha egbughị ya, Sọl wee kpọnye Devid ada ya ka ọ bụrụ nwunye ya.

Otu ụbọchị, Sọl gwara Jonatan nakwa ndị ohu ya niile na ya chọrọ igbu Devid. Ma Jonatan sịrị nna ya: ‘Emerụla Devid ahụ́. Ọ dịbeghị ihe ọjọọ ọ bụla o mere gị. Kama o nyeworo gị aka nke ukwuu. O tinyere ndụ ya n’ihe ize ndụ mgbe o gburu Golayat, obi tọkwara gị ụtọ mgbe ị hụrụ ya.’

Ebe Devid na-eze ube

Sọl gere nwa ya ntị wee kwe nkwa na ya agaghị emerụ Devid ahụ́. E dulatara Devid, o wee na-ejere Sọl ozi ọzọ n’ụlọ ya dị ka ọ na-eme ná mbụ. Ma otu ụbọchị, mgbe Devid na-akpọ ụbọ, Sọl tụrụ ube ya ọzọ n’ebe Devid nọ. Devid wee zee, ube ahụ wee magide ná mgbidi. Nke a bụ nke ugboro atọ ya! Devid wee mara ugbu a na ya aghaghị ịgba ọsọ!

N’abalị ahụ, Devid lara n’ụlọ ya. Ma Sọl zipụrụ ndị ikom igbu ya. Maịkal matara ihe nna ya chọrọ ime. O wee sị di ya: ‘Ma ị gbapụghị n’abalị a, ị ga-abụ onye nwụrụ anwụ echi.’ Maịkal nyeere Devid aka n’abalị ahụ isi na windo gbapụ. Ruo ihe dị ka afọ asaa, Devid nọ na-ezogharị n’ebe niile, ka Sọl ghara ịchọta ya.

1 Samuel 18:1-30; 19:1-18.



Ajụjụ

  • N’ihi gịnị ka Sọl ji emere Devid anyaụfụ, oleekwa otú nwa Sọl bụ́ Jonatan si dị iche?
  • Gịnị mere n’otu ụbọchị mgbe Devid na-akpọrọ Sọl ụbọ akwara?
  • Gịnị ka Sọl sịrị na Devid ga-eme tupu ya akpọnye ya ada ya bụ́ Maịkal ka ọ lụwa, n’ihi gịnịkwa ka Sọl ji kwuo otú ahụ?
  • Mgbe Devid na-akpọrọ Sọl ụbọ akwara, gịnị mere nke ugboro atọ ya, dị ka anyị na-ahụ na foto a?
  • Olee otú Maịkal si nye aka chebe ndụ Devid, gịnịkwa ka Devid meweziri ruo afọ asaa?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ 1 Samuel 18:1-30.

    Olee otú ịhụnanya siri ike Jonatan nwere n’ebe Devid nọ si ese onyinyo ịhụnanya dị n’etiti “atụrụ ọzọ” ahụ na “ìgwè atụrụ nta” ahụ? (1 Sam. 18:1; Jọn 10:16; Luk 12:32; Zek. 8:23)

    N’iburu n’uche na ọ bụ Jonatan kwesịrị ịnọchi anya Sọl, olee otú 1 Samuel 18:4 si akọwa otú Jonatan si doo onwe ya n’okpuru onye a họpụtara ịbụ eze, bụ́ nke kwesịrị ịrịba ama?

    Olee otú ihe atụ Sọl si egosi na ekworo pụrụ iduga mmadụ n’ime mmehie dị oké njọ, gịnịkwa ka nke a na-adọ anyị aka ná ntị banyere ya? (1 Sam. 18:7-9, 25; Jems 3:14-16)

  • Gụọ 1 Samuel 19:1-17.

    Olee otú Jonatan si tinye ndụ ya n’ihe ize ndụ mgbe ọ na-agwa Sọl okwu banyere Devid? (1 Sam. 19:1, 4-6; Ilu 16:14)