Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 58: Devid na Golayat

Akụkọ nke 58: Devid na Golayat

NDỊ Filistia bịara ọzọ ibuso Izrel agha. Ụmụnne atọ Devid ndị kasị okenye nọzi n’ụsụụ ndị agha Sọl. Otu ụbọchị, Jesi gwara Devid, sị: ‘Wegara ụmụnne gị mkpụrụ ọka na ogbe achịcha ụfọdụ. Chọpụtakwa otú ha na-eme.’

Golayat

Mgbe Devid ruru ebe ndị agha ahụ nọ, ọ gbagara n’ọgbọ agha ahụ ịga hụ ụmụnne ya. Dike ndị Filistia bụ́ Golayat pụtara iji ndị Izrel mee ihe ọchị. Ọ nọwo na-eme nke a ụtụtụ na anyasị ruo ụbọchị iri anọ. O ji oké olu kwuo, sị: ‘Họpụtanụ otu onye n’etiti unu ibuso m agha. Ọ bụrụ na o merie wee tigbuo m, anyị ga-abụ ndị ohu unu. Ma ọ bụrụ na m merie wee tigbuo ya, unu ga-abụ ndị ohu anyị. M na-asị unu, họpụtanụ otu onye ibuso m agha.’

Devid wee jụọ ụfọdụ ndị agha ahụ, sị: ‘Gịnị ka a ga-enye onye ga-etigbu onye Filistia nke a wee wepụ ihere nke a n’ihu Izrel?’

‘Sọl ga-enye onye ahụ nnukwu akụ̀,’ ka otu onye agha sịrị. ‘Ọ ga-akpọnyekwa ya ada ya ka ọ lụọ.’

Ma ndị Izrel niile na-atụ Golayat ụjọ, n’ihi na ọ dị nnọọ ukwuu. O toro ogologo karịa rula itoolu (ihe dị ka mita atọ), o nwekwara onye agha ọzọ nke na-eburu ya ọta ya.

Ụfọdụ ndị agha jere gwa Eze Sọl na Devid chọrọ ibuso Golayat agha. Ma Sọl gwara Devid, sị: ‘Ị pụghị ibuso onye Filistia nke a agha. Ị ka bụ nwatakịrị, ma ya onwe ya anọwo na-ebu agha ná ndụ ya niile.’ Devid zara ya, sị: ‘Egburu m bea na ọdụm ndị buuru atụrụ nna m. Onye Filistia nke a ga-adị ka otu n’ime ha. Jehova ga-enyere m aka.’ Sọl wee sị ya: ‘Jee, ka Jehova nọnyekwara gị.’

Devid jere n’akụkụ iyi weta nkume ise na-akwọ mụrụmụrụ, tinye ha n’ime akpa ya. O wee were katapọọtụ ya jee izute dike ahụ. Mgbe Golayat hụrụ ya, ọ pụghị ikwere ihe anya ya hụrụ. O chere na ọ dị nnọọ mfe igbu Devid.

Mgbe Devid ji katapọọtụ ya gbapụ nkume

‘Naanị bịakwute m,’ ka Golayat kwuru, ‘m ga-ewerekwa ahụ́ gị nye anụ ufe na ụmụ anụmanụ ka ha rie.’ Ma Devid sịrị ya: ‘I ji mma agha na ube na-abịakwute m, ma mụ onwe m ji aha Jehova na-abịakwute gị. Taa ka Jehova ga-enye gị n’aka m, m ga-etigbukwa gị.’

Devid wee gbara ọsọ jekwuwe Golayat. O wepụta otu nkume n’akpa ya, tinye ya na katapọọtụ ya, were ike ya niile gbapụ ya. Nkume ahụ gbabanyere Golayat n’isi, o wee daa n’ala nwụọ! Mgbe ndị Filistia hụrụ na dike ha adawo, ha niile tụgharịrị ma gbaa ọsọ. Ndị Izrel chụwara ha wee merie n’agha ahụ.

1 Samuel 17:1-54.



Ajụjụ

  • Olee otú Golayat si maa ndị agha Izrel aka?
  • Olee otú Golayat gbaruru na dimkpa, gịnịkwa ka Eze Sọl kwere nkwa inye onye ga-egbu Golayat?
  • Gịnị ka Devid kwuru mgbe Sọl gwara ya na ọ gaghị alụsoli Golayat ọgụ n’ihi na Devid bụ obere nwa?
  • Olee otú Devid si gosi na ya tụkwasịrị Jehova obi site n’ihe ọ zaghachiri Golayat?
  • Dị ka ị pụrụ ịhụ na foto a, gịnị ka Devid ji gbuo Golayat, gịnịkwa mere ndị Filistia mgbe nke ahụ gasịrị?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ 1 Samuel 17:1-54.

    Gịnị mere Devid atụghị egwu, oleekwa otú anyị pụrụ isi ṅomie obi ike ya? (1 Sam. 17:37, 45; Efe. 6:10, 11)

    N’ihi gịnị ka Ndị Kraịst ji kwesị izere mmụọ ịsọ mpi dị ka nke Golayat mgbe ha na-eme egwuregwu ma ọ bụ na-enwe ntụrụndụ? (1 Sam. 17:8; Gal. 5:26; 1 Tim. 4:8)

    Olee otú ihe Devid kwuru si gosi na o nwere okwukwe na Chineke ga-anọnyere ya? (1 Sam. 17:45-47; 2 Ihe 20:15)

    Kama ịkọwa na agha ahụ bụ n’etiti ụsụụ ndị agha abụọ na-emegiderịta onwe ha, olee otú akụkọ a si gosi na agha ahụ bụ n’ezie n’etiti chi ụgha dị iche iche na ezi Chineke ahụ bụ́ Jehova? (1 Sam. 17:43, 46, 47)

    Olee otú ihe ahụ fọdụrụnụ e tere mmanụ si eṅomi ihe nlereanya Devid bụ́ ịtụkwasị Jehova obi? (1 Sam. 17:37; Jer. 1:17-19; Mkpu. 12:17)