Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 55: Nwatakịrị Nke Na-ejere Chineke Ozi

Akụkọ nke 55: Nwatakịrị Nke Na-ejere Chineke Ozi

Ọ̀ BỤ na nwatakịrị nwoke a amaghị mma? Aha ya bụ Samuel. Onye bikwasịrị ya aka n’isi bụ Ilaị, onyeisi nchụàjà Izrel. Ndị ọzọ nọ n’ebe ahụ bụ Elkena nna Samuel, na Hana nne ya, bụ́ ndị duteere ya Ilaị.

Mgbe Samuel hụrụ onyeisi nchụàjà bụ́ Ilaị

Samuel dị naanị afọ anọ ma ọ bụ ise. Ma ọ ga-ebinyere Ilaị na ndị nchụàjà ndị ọzọ n’ebe a n’ụlọikwuu Jehova. Gịnị mere Elkena na Hana ji kpọta obere nwa hà ka Samuel ka ọ na-eje ozi n’ụlọikwuu Jehova? Ka anyị hụ.

Naanị afọ ole na ole tupu ha abịa ebe a, Hana nọ n’oké mwute. Ihe kpatara ya bụ na ọ mụtabeghị nwa, ọ chọkwara nnọọ ịmụta nwa. Ya mere, otu ụbọchị, mgbe o jere n’ụlọikwuu Jehova, o kpere ekpere na-asị: ‘Jehova, biko, echefula m! Ọ bụrụ na i nye m nwa nwoke, ana m ekwe nkwa inye gị ya ka ọ na-ejere gị ozi ná ndụ ya niile.’

Jehova zara ekpere Hana, ọ mụkwara Samuel mgbe ọtụtụ ọnwa gasịrị. Hana hụrụ obere nwa ya nwoke n’anya, o wee malite izi ya ihe banyere Jehova n’oge ọ ka dị nta. Hana gwara di ya, sị: ‘Mgbe Samuel tolitere nke ọma ma kwụsị ịṅụ ara, m ga-eduru ya jee n’ụlọikwuu ka o jewere Jehova ozi n’ebe ahụ.’

Nke a bụ ihe anyị na-ahụ Hana na Elkena na-eme na foto a. Ebe ọ bụkwa na ndị mụrụ Samuel eziwo ya ihe nke ọma, obi dị ya ụtọ inwe ike ijere Jehova ozi n’ụlọikwuu ya n’ebe a. Kwa afọ, Hana na Elkena na-eje ife ofufe n’ụlọ ntu ahụ pụrụ iche, na ileta nwa ha nwoke. N’afọ ọ bụla, Hana na-eweta uwe ọhụrụ na-enweghị aka nke ọ na-akwara Samuel.

Ka ọtụtụ afọ na-aga, Samuel nọgidere na-ejere Jehova ozi n’ụlọikwuu ahụ, omume ya dịkwa Jehova na ụmụ Izrel mma. Ma ụmụ ndị ikom Ilaị bụ́ onyeisi nchụàjà, bụ́ Họfnaị na Finihas, bụ ndị ọjọọ. Ha na-eme ọtụtụ ihe ọjọọ, na-edubakwa ndị ọzọ inupụrụ Jehova isi. Ilaị kwesịrị igbochi ha ịrụ ọrụ dị ka ndị nchụàjà, ma o meghị otú ahụ.

Nwata ahụ bụ́ Samuel ekweghị ka ihe ọjọọ ọ bụla a na-eme n’ụlọikwuu ahụ kwụsị ya ijere Jehova ozi. Ma ebe ọ bụ naanị mmadụ ole na ole hụrụ Jehova n’anya n’ezie, ọ dịwo anya Jehova gwara mmadụ ọ bụla okwu. Mgbe Samuel tolitetụrụ, lee ihe mere:

Samuel nọ na-ehi ụra n’ime ụlọikwuu mgbe otu olu kpọtere ya. O wee zaa, sị: ‘Lekwa m.’ O bilie gbakwuru Ilaị, sị ya: ‘Abịala m, ọ̀ kwa ị kpọrọ m?’

Ma Ilaị sịrị ya: ‘Akpọghị m gị, gaghachi dinara ala.’ Samuel laghachiri gaa dinara ala.

O wee nụ òkù nke abụọ: ‘Samuel!’ Samuel wee bilie ọzọ gbakwuru Ilaị. Ọ sị ya: ‘Ị kpọrọ m òkù, lekwa m.’ Ma Ilaị sịrị ya: ‘Akpọghị m gị, nwa m. Jee dinara ala.’ Samuel wee laghachi n’ihe ndina ya.

‘Samuel!’ ka olu ahụ kpọrọ nke ugboro atọ. Samuel wee gbakwurukwa Ilaị, sị ya: ‘Lekwa m, ọ ghaghị ịbụ gị kpọrọ m òkù na nke ugbu a.’ Mgbe ahụ ka Ilaị matara na ọ ghaghị ịbụ Jehova na-akpọ ya. O wee sị Samuel: ‘Jee dinara ala, ọ bụrụ na ọ kpọọ gị ọzọ, sị ya: “Kwuwe, Jehova, n’ihi na ohu gị na-anụ.”’

Ọ bụ ihe ahụ ka Samuel kwuru mgbe Jehova kpọrọ ya ọzọ. Jehova gwara Samuel na ya na-aga inye Ilaị na ụmụ ya ndị ikom ahụhụ. Ka e mesịrị, Họfnaị na Finihas nwụrụ n’oge ha na-ebuso ndị Filistia agha. Mgbe Ilaị nụrụ ihe merenụ, o si n’oche ọ nọ dalaa azụ ma gbajie olu, wee nwụọ. Okwu Jehova wee si otú a mezuo.

Samuel tolitere wee bụrụ onyeikpe ikpeazụ nke Izrel. Mgbe o mere agadi, ụmụ Izrel wee rịọ ya, sị: ‘Họpụtara anyị eze ga-achị anyị.’ Samuel achọghị ime nke a n’ihi na Jehova bụ n’ezie eze ha. Ma Jehova gwara ya ka o mee ihe ha rịọrọ.

1 Samuel 1:1-28; 2:11-36; 4:16-18; 8:4-9.



Ajụjụ

  • Gịnị bụ aha obere nwa a nke nọ na foto a, ndị ahụ ha na ya nọ hà bụ ole ndị?
  • Olee ekpere Hana kpere otu ụbọchị mgbe ọ gara n’ụlọikwuu Jehova, oleekwa otú Jehova si zaa ekpere ya?
  • Samuel ọ̀ dị afọ ole mgbe a kpọgara ya n’ụlọ ntu Jehova, gịnịkwa ka mama ya na-emere ya kwa afọ?
  • Gịnị bụ aha ụmụ Ilaị, ụdị mmadụ dịkwa aṅaa ka ha bụ?
  • Olee otú Jehova si kpọọ Samuel òkù, oleekwa ozi O ziri ya?
  • Gịnị ka Samuel ghọrọ mgbe o tolitere, gịnịkwa mere mgbe o mere agadi?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ 1 Samuel 1:1-28.

    Ezi ihe nlereanya dị aṅaa ka Elkena setịpụụrụ ndị isi ezinụlọ n’ibute ụzọ n’ezi ofufe? (1 Sam. 1:3, 21; Mat. 6:33; Fil. 1:10)

    Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta n’otú Hana si mee ihe banyere otu nsogbu tara akpụ? (1 Sam. 1:10, 11; Ọma 55:22; Rom 12:12)

  • Gụọ 1 Samuel 2:11-36.

    Olee otú Ilaị si sọpụrụ ụmụ ya karịa Jehova, oleekwa otú nke a si bụrụ ihe ịdọ aka ná ntị nye anyị? (1 Sam. 2:22-24, 27, 29; Deut. 21:18-21; Mat. 10:36, 37)

  • Gụọ 1 Samuel 4:16-18.

    Ozi dị aṅaa nke dị akụkụ anọ ka e si n’ọgbọ agha weta, oleekwa otú nke a si metụta Ilaị?

  • Gụọ 1 Samuel 8:4-9.

    Olee otú Izrel si mehie nke ukwuu megide Jehova, oleekwa otú anyị pụrụ isi nọgide na-akwado Alaeze Jehova taa? (1 Sam. 8:5, 7; Jọn 17:16; Jems 4:4)

GỤKWUO GBASARA YA

Mgbe Samuel Nọ n’Ụlọikwuu

Olee otú Jehova si gọzie Samuel? Bipụta foto a, soro kpọm kpọm ndị dị na ya sechapụ ya. Gụọkwa ebe a kọrọ akụkọ dị na foto a na Baịbụl.

Samuel “Wee Na-eto n’Ebe Jehova Nọ”

Gịnị mere ndụ Samuel ji pụọ iche mgbe ọ bụ nwata? Gịnị mere ka okwukwe ya sie ike mgbe ọ nọ n’ụlọikwuu?