Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 46: Mgbidi Jeriko

Akụkọ nke 46: Mgbidi Jeriko

GỊNỊ mere mgbidi Jeriko ndị a ji na-ada? O yiri ka à ga-asị na a tụrụ ha otu nnukwu bọmbụ. Ma n’oge ahụ, e nweghị bọmbụ; e nweghịdị égbè ọ bụla. Ọ bụ ọrụ ebube ọzọ nke Jehova! Ka anyị hụ otú o si mee.

Mgbe mgbidi Jeriko na-ada

Gee ntị n’ihe Jehova gwara Jọshụa: ‘Gị na ndị agha gị ga-agagharị gburugburu obodo ahụ. Gagharịanụ ya gburugburu otu ugbo n’ụbọchị ruo ụbọchị isii. Burunụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ mgbe unu na-agagharị. Ndị nchụàjà asaa ga-anọ n’ihu na-afụ opi.

‘N’ụbọchị nke asaa, unu ga-agagharị obodo ahụ gburugburu ugboro asaa. Fụọnụ opi ike ruo ogologo oge, meekwanụ ka mmadụ niile tie oké mkpu agha. Mgbidi ahụ ga-adaru ala!’

Jọshụa na ndị Izrel mere ihe Jehova kwuru. Mgbe ha na-azọ ije, mmadụ niile gbachiri nkịtị. Ọ dịghị onye kwuru okwu. Naanị ihe a pụrụ ịnụ bụ opi ike na ije ụkwụ. Ndị iro nke ndị Chineke nọ na Jeriko aghaghị ịtụworị egwu. Ị̀ na-ahụ eriri uhie ahụ nke e kedoro na windo? Windo ònye ka ọ bụ? N’ezie, Rehab emewo ihe ndị nledo ahụ gwara ya mee. Ya na ndị ezinụlọ ya niile nọ n’ime ụlọ ahụ na-ekiri ihe na-emenụ.

Jọshụa

N’ikpeazụ, n’ụbọchị nke asaa, mgbe ha gagharịrị obodo ahụ gburugburu ugboro asaa, opi ike nọ na-ada, ndị agha ana-eti mkpu, mgbidi ahụ niile wee daa. Jọshụa wee sị ha: ‘Gbuonụ onye ọ bụla n’ime obodo ahụ, suokwanụ ya ọkụ. Suonụ ihe niile ọkụ. Chebenụ naanị ọlaọcha, ọlaedo, ọla kọpa na ígwè, weganụ ha n’ụlọ akụ̀ nke ụlọikwuu Jehova.’

Jọshụa gwara ndị nledo abụọ ahụ, sị: ‘Gaanụ n’ụlọ Rehab, kpọpụtanụ ya na ndị ezinụlọ ya nile.’ A zọpụtara Rehab na ndị ya dị ka ndị nledo ahụ kwere ya nkwa.

Joshua 6:1-25.



Ajụjụ

  • Gịnị ka Jehova gwara ndị agha na ndị nchụàjà ka ha mee ruo ụbọchị isii?
  • Gịnị ka ha ga-eme n’ụbọchị nke asaa?
  • Dị ka ị na-ahụ na foto a, gịnị na-eme mgbidi Jeriko?
  • N’ihi gịnị ka e ji kwụnye eriri uhie na windo a?
  • Gịnị ka Jọshụa gwara ndị agha ka ha mee ndị obodo ahụ na obodo ha, gịnịkwa ka ọ gwara ha mee ọlaọcha, ọlaedo, ọla kọpa, na ígwè?
  • Gịnị ka a gwara ndị nledo abụọ ahụ ka ha gaa mee?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Joshua 6:1-25.

    Olee otú gburugburu ụmụ Izrel gbara Jeriko n’ụbọchị nke asaa si yie ọrụ nkwusa nke Ndịàmà Jehova na-arụ n’ụbọchị ikpeazụ ndị a? (Josh. 6:15, 16; Aịsa. 60:22; Mat. 24:14; 1 Kọr. 9:16)

    Olee otú amụma e dekọrọ na Joshua 6:26 si mezuo mgbe ihe dị ka narị afọ ise gasịrị, gịnịkwa ka nke a na-akụziri anyị banyere okwu Jehova? (1 Eze 16:34; Aịsa. 55:11)