Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 43: Jọshụa Aghọọ Onye Ndú

Akụkọ nke 43: Jọshụa Aghọọ Onye Ndú

MOZIS chọrọ iso ụmụ Izrel baa n’ala Kenan. N’ihi ya, ọ rịọrọ, sị: ‘Jehova, kwe ka m gafee Osimiri Jọdan ma hụ ala ahụ mara mma.’ Ma Jehova sịrị ya: ‘O zuworo gị! Ekwula ya ọzọ!’ Ị̀ ma ihe mere Jehova ji kwuo otú ahụ?

Ọ bụ n’ihi ihe mere mgbe Mozis tiri nkume ahụ ihe. Cheta na ya na Erọn asọpụrụghị Jehova. Ha agwaghị ụmụ Izrel na ọ bụ Jehova ga-enye ha mmiri site na nkume ahụ. N’ihi nke a, Jehova sịrị na ya agaghị ekwe ka ha baa n’ala Kenan.

Ọnwa ole na ole mgbe Erọn nwụsịrị, Jehova gwara Mozis, sị: ‘Kpọrọ Jọshụa, guzo ya n’ihu Elieza onye nchụàjà na n’ihu ndị Izrel. N’ihu ha niile, gwa mmadụ niile na Jọshụa bụ onye ndú ọhụrụ ha.’ Mozis mere ihe Jehova kwuru, dị ka ị pụrụ ịhụ na foto a.

Mgbe Mozis na-agwa mmadụ niile na Jọshụa ga-abụzi onye ndú ha

Jehova wee sị Jọshụa: ‘Dị ike, atụla egwu. Ị ga-eduru ụmụ Izrel baa n’ala Kenan nke m kwere nkwa inye ha, m ga-anọnyekwara gị.’

N’ikpeazụ, Jehova gwara Mozis ka ọ rịgoro n’elu Ugwu Nebo nke dị n’ala Moab. Site n’ebe ahụ, Mozis lere anya n’ofe Osimiri Jọdan wee hụ ala Kenan ahụ mara mma. Jehova sịrị ya: ‘Nke a bụ ala ahụ m kwere nkwa inye ụmụ Ebreham, Aịzik, na Jekọb. Ekwewo m ka ị hụ ya, ma m gaghị ekwe ka ị baa na ya.’

Mozis nwụrụ n’elu Ugwu Nebo ahụ. Ọ gbara otu narị afọ na iri afọ abụọ. Ọ ka dị ike, na-ahụkwa ụzọ nke ọma. O wutere ụmụ Izrel nke ukwuu, ha wee kwaa ákwá n’ihi ọnwụ Mozis. Ma obi tọrọ ha ụtọ inwe Jọshụa dị ka onye ndú ọhụrụ ha.

Ọnụ Ọgụgụ 27:12-23; Deuterọnọmi 3:23-29; 31:1-8, 14-23; 32:45-52; 34:1-12.



Ajụjụ

  • Na foto a, ole ndị bụ ndị ikom ahụ ha na Mozis guzo?
  • Gịnị ka Jehova gwara Jọshụa?
  • N’ihi gịnị ka Mozis ji rịgoo n’Ugwu Nebo, gịnịkwa ka Jehova gwara ya?
  • Afọ ole ka Mozis dị mgbe ọ nwụrụ?
  • N’ihi gịnị ka ụmụ Izrel ji na-enwe mwute, oleekwanụ ihe mere ha ga-eji nwee obi ụtọ?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 27:12-23.

    Olee nnukwu ọrụ Jehova nyere Jọshụa, oleekwa otú Jehova si elekọta ndị Ya taa? (Ọnụ Ọgụ. 27:15-19; Ọrụ 20:28; Hib. 13:7)

  • Gụọ Deuterọnọmi 3:23-29.

    Gịnị mere Jehova ekweghị ka Mozis na Erọn banye n’ala nkwa ahụ, gịnịkwa ka anyị na-amụta site na nke a? (Deut. 3:25-27; Ọnụ Ọgụ. 20:12, 13)

  • Gụọ Deuterọnọmi 31:1-8, 14-23.

    Olee otú okwu ikpeazụ Mozis gwara ụmụ Izrel si gosi na o ji umeala n’obi nakwere ntaramahụhụ Jehova nyere ya? (Deut. 31:6-8, 23)

  • Gụọ Deuterọnọmi 32:45-52.

    Olee otú Okwu Chineke kwesịrị isi metụta ndụ anyị? (Deut. 32:47; Lev. 18:5; Hib. 4:12)

  • Gụọ Deuterọnọmi 34:1-12.

    Ọ bụ ezie na ọ dịghị mgbe Mozis ji anya nkịtị hụ Jehova, gịnị ka Deuterọnọmi 34:10 na-agwa anyị banyere mmekọrịta ya na Jehova? (Ọpụ. 33:11, 20; Ọnụ Ọgụ. 12:8)

GỤKWUO GBASARA YA

Kaadị Akụkọ Jọshụa

Olee otú Jọshụa na ndị agha ya si kwatuo mgbidi Jeriko? Bipụta kaadị a ka ị matakwuo gbasara nwoke a na-anaghị atụ ụjọ a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl.