Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 39: Okooko Osisi Epuo na Mkpanaka Erọn

Akụkọ nke 39: Okooko Osisi Epuo na Mkpanaka Erọn

LEE okooko osisi na mkpụrụ almọnd chara acha ndị puru na mkpanaka ma ọ bụ n’osisi a. Ọ bụ mkpanaka Erọn. Okooko osisi na mkpụrụ osisi ndị a chara acha pupụtara na mkpanaka Erọn n’otu ụbọchị! Ka anyị hụ ihe kpatara ya.

Mgbe Mozis na-enye Erọn mkpanaka ahụ okoko osisi puru na ya

N’oge ahụ, ụmụ Izrel awagharịwo n’ọzara ruo oge ụfọdụ. Ụfọdụ n’ime ha echeghị na Mozis kwesịrị ịbụ onye ndú ha, ha echeghịkwa na Erọn kwesịrị ịbụ nnukwu onye nchụàjà. Kora echeghị na Erọn kwesịrị ịbụ nnukwu onye nchụàjà, otú ahụkwa ka ọ dị Detan, Abaịram, na ndị ndú Izrel dị narị abụọ na iri ise. Ndị a niile bịakwutere Mozis wee sị ya: ‘Gịnị mere i ji ebuli onwe gị elu karịa anyị niile?’

Mozis gwara Kora na ndị so ya, sị: ‘Ụtụtụ echi, werenụ ihe ịgụ ọkụ, tinyekwanụ ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ime ha. Mgbe ahụ, bịanụ n’ụlọikwuu Jehova. Anyị ga-ahụ onye Jehova ga-ahọpụta.’

N’echi ya, Kora na narị ndị ikom abụọ na iri ise ndị so ya jere n’ụlọikwuu ahụ. Ọtụtụ ndị ọzọ bịakwara isonyere ha. Ezigbo iwe were Jehova. Mozis wee gwa ụmụ Izrel, sị: ‘Pụọnụ n’ụlọ ntu nke ndị ikom ọjọọ a. Unu emetụla ihe ọ bụla bụ nke ha aka.’ Ha gere ntị wee si n’ụlọ ntu Kora, Detan na Abaịram pụọ.

Mozis wee sị: ‘Na nke a ka unu ga-amara onye Jehova họpụtara. Ala ga-emeghe wee loo ndị ikom ndị a.’

Ngwa ngwa Mozis kwusịrị okwu, ala meghere. Ụlọ ntu Kora na ihe ya niile, na Detan na Abaịram na ndị so ha, dabara n’ime ya, ala wee kpuchie ha. Mgbe ndị Izrel nụrụ ákwá nke ndị dabara n’ime ala ahụ, ha tiri mkpu, sị: ‘Gbalaganụ! Ala nwekwara ike ilo anyị!’

Kora na narị ndị ikom abụọ na iri ise ya ka nọ ụlọikwuu ahụ nso. Jehova zitere ọkụ, o wee rechapụ ha niile. Mgbe ahụ, Jehova gwara Elieza nwa Erọn ka ọ chịrị ihe ịgụ ọkụ nke ndị ahụ nwụrụ anwụ ma were ha mee ihe a ga-eji na-ekpuchi ebe ịchụàjà. Ihe mkpuchi ebe ịchụàjà nke a ga-abụrụ ụmụ Izrel ihe ịdọ aka ná ntị na ọ dịghị onye ọzọ, ma e wezụga Erọn na ụmụ ya, kwesịrị ijere Jehova ozi dị ka ndị nchụàjà.

Ma Jehova chọrọ ime ka o doo anya na ọ bụ Erọn na ụmụ ya bụ ndị ọ họpụtara ịbụ ndị nchụàjà. N’ihi ya, ọ gwara Mozis, sị: ‘Gwa onye ndú ọ bụla nke ebo Izrel ka o weta mkpanaka ya. Maka ebo Livaị, gwa Erọn ka o weta mkpanaka ya. Debe mkpanaka ndị a n’ime ụlọikwuu n’ihu igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Okooko osisi ga-epu na mkpanaka nke nwoke m họpụtara ịbụ onye nchụàjà.’

N’echi ya, mgbe Mozis lere anya, okooko osisi ndị a na mkpụrụ osisi almọnd ndị chara acha epuola na mkpanaka Erọn! Ugbu a, ị̀ hụla ihe mere Jehova ji mee ka okooko osisi puo na mkpanaka Erọn?

Ọnụ Ọgụgụ 16:1-49; 17:1-11; 26:10.



Ajụjụ

  • Ole ndị nupụrụ isi megide ịbụisi Mozis na Erọn, gịnịkwa ka ha gwara Mozis?
  • Gịnị ka Mozis gwara Kora na narị mmadụ abụọ na iri ise na-akwado Kora ka ha mee?
  • Gịnị ka Mozis gwara ụmụ Izrel, gịnịkwa mere ozugbo ọ gwasịrị ha okwu?
  • Gịnị mere Kora na narị mmadụ abụọ na iri ise ndị na-akwado ya?
  • Gịnị ka Elieza nwa Erọn mere ihe ịgụ ọkụ nke ndị ahụ nwụrụ anwụ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
  • N’ihi gịnị ka Jehova ji mee ka okooko osisi puo na mkpanaka Erọn? (Lee foto.)

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 16:1-49.

    Gịnị ka Kora na ndị na-akwado ya mere, oleekwa ihe mere o ji bụrụ nnupụisi megide Jehova? (Ọnụ Ọgụ. 16:9, 10, 18; Lev. 10:1, 2; Ilu 11:2)

    Echiche dị aṅaa na-ezighị ezi ka Kora na ‘ndị isi nzukọ’ dị narị abụọ na iri ise nwere? (Ọnụ Ọgụ. 16:1-3; Ilu 15:33; Aịsa. 49:7)

  • Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 17:1-11 na 26:10.

    Gịnị ka okooko osisi puru na mkpanaka Erọn na-egosi, n’ihi gịnịkwa ka Jehova ji kwuo ka e debe mkpanaka ahụ n’ime igbe ahụ? (Ọnụ Ọgụ. 17:5, 8, 10)

    Olee ihe dị oké mkpa nke anyị na-amụta site n’okooko osisi nke puru na mkpanaka Erọn? (Ọnụ Ọgụ. 17:10; Ọrụ 20:28; Fil. 2:14; Hib. 13:17)

GỤKWUO GBASARA YA

Kaadị Akụkọ Erọn

Gịnị mere Chineke ekweghị ka ọ baa n’Ala Nkwa?