Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 33: Ịgafe Oké Osimiri Uhie

Akụkọ nke 33: Ịgafe Oké Osimiri Uhie

LEE ihe na-eme n’ebe a! Lee ka Mozis na-esetị mkpanaka ya n’elu Oké Osimiri Uhie. Ndị ha na ya nọ n’enweghị nsogbu n’ofe nke ọzọ bụ ụmụ Izrel. Ma Fero na usuu ndị agha ya niile ka mmiri na-erikpu n’ime osimiri. Ka anyị hụ ụzọ nke a si mee.

Mgbe mmiri na-eri ndị agha Ijipt

Dị ka anyị mụworo, mgbe Chineke wetasịịrị ndị Ijipt ihe otiti nke iri, Fero gwara ụmụ Izrel ka ha hapụ Ijipt. Ihe dị ka narị puku isii ndị ikom Izrel hapụrụ Ijipt, ha na ọtụtụ ndị inyom na ụmụntakịrị. E nwekwara ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị ọzọ kweere na Jehova, bụ́ ndị sooro ụmụ Izrel pụọ. Ha niile chịịrị atụrụ ha na ewu ha na ehi ha pụọ.

Tupu ha apụọ, ụmụ Izrel rịọrọ ndị Ijipt maka uwe na ihe ndị e ji ọlaedo na ọlaọcha mee. Ndị Ijipt tụrụ egwu nke ukwuu n’ihi ihe otiti ikpeazụ ahụ e tiri ha. N’ihi ya, ha nyere ụmụ Izrel ihe niile ha rịọrọ.

Mgbe ụbọchị ụfọdụ gasịrị, ụmụ Izrel rutere n’Oké Osimiri Uhie. Ha zuru ike n’ebe ahụ. Ma ugbu a, Fero na ndị ya malitere inwe mwute maka ikwe ka ụmụ Izrel laa. Ha sịrị: ‘Anyị ahapụwo ndị ohu anyị ka ha laa!’

N’ihi nke a, Fero gbanwere obi ya ọzọ. O wee kwadebe ụgbọ ịnyịnya ya na ndị agha ya ọsọ ọsọ. O weere narị ụgbọ inyịnya isii pụrụ iche, werekwa ụgbọ ịnyịnya ndị ọzọ nke Ijipt, malite ịchụ ụmụ Izrel.

Mgbe ụmụ Izrel hụrụ ka Fero na ndị agha ya na-achụ ha, ha tụrụ egwu nke ukwuu. Ọ dịghị ụzọ ha ga-esi gbalaga. Oké Osimiri Uhie dị ha n’ihu, ndị Ijipt na-abịakwa ha n’azụ. Ma Jehova mere ka igwe ojii dị n’agbata ndị ya na ndị Ijipt. Nke ahụ mere ka ndị Ijipt ghara ịhụ ụmụ Izrel iji busoo ha agha.

Jehova wee gwa Mozis ka o setịpụ mkpanaka ya n’elu Oké Osimiri Uhie ahụ. Mgbe o mere nke a, Jehova mere ka oké ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ fee. E kewara mmiri osimiri ahụ, mmiri niile ahụ wee kwụsị n’akụkụ abụọ.

Ụmụ Izrel amalitezie ịgafe oké osimiri ahụ n’ala akọrọ. O were ọtụtụ nde mmadụ ahụ na anụ ụlọ ha ọtụtụ awa isi n’ime oké osimiri ahụ gafee n’ofe nke ọzọ n’udo. N’ikpeazụ, ndị Ijipt hụrụ ụmụ Izrel ọzọ. Ndị ohu ha na-agbalaga! N’ihi ya, ha chụụrụ ha banye n’ime osimiri ahụ.

Mgbe ha banyere, Chineke mere ka ụkwụ ụgbọ ịnyịnya ha dapụsịa. Ndị Ijipt tụrụ egwu nke ukwuu wee malite iti mkpu, sị: ‘Jehova na-eburu ndị Izrel agha megide anyị. Ka anyị gbapụ n’ebe a!’ Ma oge aganahụwo ha.

Ọ bụ mgbe ahụ ka Jehova gwara Mozis ka o setịpụ mkpanaka ya n’elu Oké Osimiri Uhie, dị ka ị na-ahụ na foto a. Mgbe Mozis mere otú ahụ, akụkụ abụọ nke mmiri ahụ malitere ịlọghachi wee rikpuo ndị Ijipt na ụgbọ ịnyịnya ha. Ndị agha ha dum esorowo ndị Izrel baa n’ime osimiri. Ma ọ dịghị onye Ijipt ọ bụla pụtara ná ndụ!

Lee obi ụtọ nke ndị Chineke niile nwere na a zọpụtara ha! Ndị ikom bụkuru Jehova abụ ekele, na-asị: ‘Jehova enwewo mmeri dị ebube. Ọ tụbawo ịnyịnya na ndị ha bu n’ime oké osimiri.’ Miriam nwanne Mozis nke nwaanyị wee bulie ịgbà ya, ndị inyom niile sonyekwaara ya bulie ịgbà ha. Ma ka ha na-ete egwú ọṅụ, ha bụrụ otu abụ ahụ ndị ikom ha na-abụ, sị: ‘Jehova enwewo mmeri dị ebube. Ọ tụbawo ịnyịnya na ndị ha bu n’ime oké osimiri.’

Ọpụpụ isi 12 ruo 15.



Ajụjụ

  • Ndị ikom Izrel ole, tinyere ndị inyom na ụmụaka, si n’Ijipt pụọ, oleekwa ndị so ha pụọ?
  • Olee otú ọ dị Fero mgbe ọ hapụsịrị ụmụ Izrel ka ha laa, gịnịkwa ka o mere?
  • Gịnị ka Jehova mere iji gbochie ndị Ijipt ịwakpo ndị ya?
  • Gịnị mere mgbe Mozis tiri mkpara ya n’Oké Osimiri Uhie ahụ, gịnịkwa ka ụmụ Izrel mere?
  • Gịnị mere mgbe ndị Ijipt chụụrụ ụmụ Izrel banye n’oké osimiri ahụ?
  • Olee otú ụmụ Izrel si gosi na ha nwere obi ụtọ na obi ekele n’ebe Jehova nọ maka nzọpụta a zọpụtara ha?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Ọpụpụ 12:33-36.

    Olee ihe Jehova mere iji hụ na a kwụghachiri ndị ya ụgwọ maka afọ niile ha ji gbaara ndị Ijipt ohu? (Ọpụ. 3:21, 22; 12:35, 36)

  • Gụọ Ọpụpụ 14:1-31.

    Olee otú okwu Mozis nke e dekọrọ n’Ọpụpụ 14:13, 14 si emetụta ndị ohu Jehova taa ka ha na-eche agha Amagedọn na-abịanụ ihu? (2 Ihe 20:17; Ọma 91:8)

  • Gụọ Ọpụpụ 15:1-8, 20, 21.

    N’ihi gịnị ka ndị ohu Jehova ji kwesị ịbụ abụ otuto nye ya? (Ọpụ. 15:1, 2; Ọma 105:2, 3; Mkpu. 15:3, 4)

    Ka ha nọ n’Oké Osimiri Uhie ahụ, olee ihe nlereanya Miriam na ndị inyom ndị ọzọ setịpụụrụ ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst taa n’ihe banyere inye Jehova otuto? (Ọpụ. 15:20, 21; Ọma 68:11)