Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 27: Eze Ọjọọ Amalite Ịchị Ijipt

Akụkọ nke 27: Eze Ọjọọ Amalite Ịchị Ijipt

NDỊ ikom a na-amanye ndị a ịrụ ọrụ. Lee nwoke a nke na-apịa otu n’ime ndị ọrụ a ụtarị! Ndị ọrụ ahụ bụ ndị ezinụlọ Jekọb, bụ́ ndị a na-akpọ ụmụ Izrel. Ndị ikom ahụ, bụ́ ndị na-amanye ha ịrụ ọrụ, bụ ndị Ijipt. Ụmụ Izrel aghọwo ndị ohu ndị Ijipt. Olee otú nke a si mee?

Ebe ndị Ijipt na-emekpọ ndị Izrel ọnụ

Ruo ọtụtụ afọ, ezinụlọ buru ibu nke Jekọb biri n’udo n’Ijipt. Josef onye bụ́ nwoke kasị mkpa n’Ijipt ma a gụpụ eze Fero, lekọtara ha anya. Ka e mesịrị, Josef nwụrụ. Fero ọhụrụ nke na-ahụghị ụmụ Izrel n’anya wee bụrụ eze Ijipt.

Fero ọjọọ a mere ka ụmụ Izrel bụrụ ndị ohu. O nyere ndị ikom dị obi ọjọọ ma bụrụ ndị arụrụala ọrụ nke ilekọta ha. Ha manyere ụmụ Izrel ịrụsi ọrụ ike n’iwuru Fero ọtụtụ obodo. Ma ụmụ Izrel nọgidere na-amụba n’ọnụ ọgụgụ. Mgbe nwa oge gasịrị, ndị Ijipt tụrụ egwu na ụmụ Izrel ga-adị ọtụtụ dịkwa ike karịa ha.

Ebe ndị Ijipt na-emekpọ ndị Izrel ọnụ

Ị̀ ma ihe Fero mere? Ọ gwara ndị inyom na-enyere ụmụ nwaanyị Izrel dị ime aka ịmụ nwa, sị: ‘Unu ga na-egbu nwa nwoke ọ bụla a mụrụ.’ Ma ndị inyom ahụ bụ ndị ezigbo mmadụ, ha egbughị ụmụ ọhụrụ ndị ahụ.

N’ihi ya, Fero nyere ndị ya niile iwu a, sị: ‘Na-egbunụ ụmụ nwoke nke ndị Izrel. Hapụnụ naanị ụmụ nwaanyị.’ Nke ahụ, ọ́ bụghị ihe dị egwu inye iwu ka e mee? Ka anyị hụ ụzọ e si zọpụta otu nwa nwoke a mụrụ ọhụrụ.

Ọpụpụ 1:6-22.



Ajụjụ

  • Na foto a, ònye bụ nwoke a ji ụtarị, ònyekwa ka ọ na-apịa ya?
  • Mgbe Josef nwụsịrị, gịnị mere ụmụ Izrel?
  • N’ihi gịnị ka ndị Ijipt ji malite ịtụ ụmụ Izrel egwu?
  • Olee iwu Fero nyere ụmụ nwaanyị na-enyere ndị inyom Izrel dị ime aka ịmụ nwa?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Ọpụpụ 1:6-22.

    Olee ụzọ Jehova si malite imezu nkwa o kwere Ebreham? (Ọpụ. 1:7; Jen. 12:2; Ọrụ 7:17)

    Olee otú ndị inyom Hibru na-enyere ndị dị ime aka ịmụ nwa si gosi nkwanye ùgwù maka ịdị nsọ nke ndụ? (Ọpụ. 1:17; Jen. 9:6)

    Olee otú e si kwụghachi ndị inyom ahụ na-ele ime ụgwọ maka ikwesị ntụkwasị obi n’ebe Jehova nọ? (Ọpụ. 1:20, 21; Ilu 19:17)

    Olee otú Setan si nwaa imebi nzube Jehova banyere Mkpụrụ Ebreham e kwere ná nkwa? (Ọpụ. 1:22; Mat. 2:16)