Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 23: Nrọ Fero

Akụkọ nke 23: Nrọ Fero

AFỌ abụọ agafeela, Josef ka nọkwa n’ụlọ mkpọrọ. Onye ahụ na-eburu Fero ihe ọṅụṅụ echetaghị ya. N’otu abalị, Fero rọrọ nrọ abụọ pụrụ nnọọ iche, o wee na-eche ihe nrọ ahụ pụtara. Ị̀ na-ahụ ya ka ọ na-arahụ ụra n’ebe a? N’ụtụtụ echi ya, Fero kpọrọ ndị amamihe ya wee kọọrọ ha ihe ọ rọrọ ná nrọ. Ma ha apụghị ịkọrọ ya ihe nrọ ya pụtara.

Ọ bụ ugbu a ka onye ahụ na-eburu ya ihe ọṅụṅụ chetara Josef. O wee sị Fero: ‘Mgbe m nọ n’ụlọ mkpọrọ, ọ dị otu nwoke nke pụrụ ịkọwa nrọ.’ Ngwa ngwa, Fero mere ka a kpọpụta Josef n’ụlọ mkpọrọ.

Fero kọọrọ Josef nrọ ya niile, sị: ‘Ahụrụ m ehi asaa ndị buru ibu, maakwa mma. Ahụkwara m ehi asaa ndị tara ahụ́, bụrụ naanị ọkpụkpụ ọkpụkpụ. Ma ehi ndị ahụ tara ahụ́ riri ndị ahụ buru ibu.

Ebe Fero na-arọ nrọ

‘Ná nrọ m nke abụọ, ahụrụ m ogbe ọka asaa gbara agba bụ́ ndị na-eto n’otu úkwù ọka. Ahụkwara m ogbe ọka asaa fịkpọrọ afịkpọ, bụ́ ndị anyanwụ chakpọrọ. Ma ogbe ọka ndị ahụ fịkpọrọ afịkpọ malitere ilo ogbo ọka asaa ndị ahụ dị mma.’

Josef wee sị Fero: ‘Nrọ abụọ ahụ pụtara otu ihe. Ehi asaa ndị ahụ buru ibu na ogbe ọka asaa ndị ahụ buru ibu pụtara afọ asaa, ma ehi asaa ndị ahụ tara ahụ́ na ogbe ọka asaa ndị ahụ fịkpọrọ afịkpọ pụtara afọ asaa ọzọ. A ga-enwe afọ asaa mgbe ala Ijipt ga-emepụta ọtụtụ ihe oriri. A ga-enwekwa afọ asaa ọzọ mgbe ala Ijipt ga-emepụta obere ihe oriri.’

Josef gwara Fero, sị: ‘Họpụta nwoke maara ihe ma mee ya onye ga na-achịkọta ihe oriri n’ime afọ asaa ọma ahụ nri ga-adị. Mgbe ahụ, agụụ agaghị egbu ndị mmadụ n’ime ajọ afọ asaa ọzọ ahụ ala ga-emepụta obere ihe oriri.’

Aro ahụ dị Fero mma. O wee họpụta Josef ịchịkọta ihe oriri na ichekwa ya. Josef ghọrọ nwoke kachasị mkpa n’Ijipt, ma a gụpụ Fero.

Mgbe afọ asatọ gasịrị, mgbe a banyere n’oge ụnwụ, Josef hụrụ ndị ikom ụfọdụ ka ha na-abịa. Ị̀ ma ndị ha bụ? Ha bụ ụmụnne ya iri ndị tọrọ ya! Nna ha bụ́ Jekọb zitere ha n’Ijipt n’ihi na ihe oriri nke ha nwere na Kenan na-agwụ. Josef matara ụmụnne ya, ma ha amataghị ya. Ị̀ ma ihe kpatara ya? Ọ bụ n’ihi na Josef etoola, o yikwa uwe dị iche.

Josef chetara na mgbe ya bụ nwatakịrị na ya rọrọ nrọ ebe ụmụnne ya na-akpọ isiala nye ya. Ì chetara mgbe ị gụrụ ihe banyere ya? O doola Josef anya na ọ bụ Chineke zitere ya n’Ijipt, nakwa na e nwere ezi ihe mere o ji mee otú ahụ. Gịnị ka i chere Josef mere? Ka anyị hụ.

Jenesis 41:1-57; 42:1-8; 50:20.



Ajụjụ

  • Gịnị mere Fero n’otu abalị?
  • N’ihi gịnị ka onye na-eburu Fero ihe ọṅụṅụ ji mechaa cheta Josef?
  • Dị ka e gosiri na foto a, olee nrọ abụọ ndị Fero rọrọ?
  • Gịnị ka Josef sịrị na nrọ ndị ahụ pụtara?
  • Olee otú Josef si ghọọ onye kasị mkpa n’Ijipt ma a gụpụ Fero?
  • N’ihi gịnị ka ụmụnne Josef ji bịa Ijipt, gịnịkwa mere na ha amataghị ya?
  • Olee nrọ Josef chetara, gịnịkwa ka o nyeere ya aka ịghọta?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Jenesis 41:1-57.

    Olee otú Josef si dọrọ uche gaa n’ebe Jehova nọ, oleekwa otú Ndị Kraịst taa pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya ya? (Jen. 41:16, 25, 28; Mat. 5:16; 1 Pita 2:12)

    Olee otú afọ ndị ahụ e nwere nri n’ụba n’Ijipt na afọ ndị sochiri ha e nwere ụnwụ nri, si egosi nnọọ ọdịiche dị n’etiti ọnọdụ ime mmụọ nke ndị Jehova taa na nke Krisendọm? (Jen. 41:29, 30; Emọs 8:11, 12)

  • Gụọ Jenesis 42:1-8 na 50:20.

    Ọ̀ dị njọ onye na-efe Chineke ihulata isi n’ihu mmadụ iji sọpụrụ ya ma kwanyere ya ùgwù maka ọkwá ya ma ọ bụrụ na ọ bụ omenala nke mba onye ahụ? (Jen. 42:6)

GỤKWUO GBASARA YA

Josef Zọrọ Ndị Mmadụ Ndụ

Danloduo katuun a e sere ese ma jiri ya mata banyere Josef, onye Chineke ji zọpụta otu mba.