Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 15: Nwunye Lọt Lere Anya n’Azụ

Akụkọ nke 15: Nwunye Lọt Lere Anya n’Azụ

LỌT na ezinụlọ ya so Ebreham biri n’ala Kenan. Otu ụbọchị, Ebreham sịrị Lọt: ‘Ọ dịghị ala ga-ezuru anụ ụlọ anyị niile n’ebe a. Biko, ka anyị kewaa. I jee n’otu ụzọ, m ga-eje n’ụzọ nke ọzọ.’

Lọt lere ala niile ahụ anya. Ọ hụrụ otu akụkụ mara mma nke ala ahụ bụ́ nke nwere mmiri na ezigbo ahịhịa ndụ maka anụ ụlọ ya. Nke a dị n’Ógbè Jọdan. Lọt kpọọrọ ezinụlọ ya na anụ ụlọ ya laa ebe ahụ. Ha mesịrị biri n’obodo Sọdọm.

Ndị Sọdọm bụ nnọọ ndị ọjọọ. Nke a wutere Lọt n’ihi na ọ bụ ezigbo mmadụ. O wutekwara Chineke. E mesịa, Chineke zigara ndị mmụọ ozi abụọ ịgwa Lọt na ya ga-ebibi Sọdọm na obodo Gọmọra nke dị ya nso n’ihi ajọ omume ha.

Ndị mmụọ ozi ahụ sịrị Lọt: ‘Mee ngwa! Kpọrọ nwunye gị na ụmụ gị abụọ si n’ebe a pụọ!’ Lọt na ndị ezinụlọ ya emeghị ngwa ịpụ, n’ihi ya, ndị mmụọ ozi ahụ jidere ha n’aka dupụ ha n’obodo ahụ. Otu n’ime ndị mmụọ ozi ahụ wee sị ha: ‘Gbalaganụ n’ihi ndụ unu! Unu elela anya n’azụ. Gbalaganụ n’ugwu ka a ghara igbu unu.’

Lọt na ụmụ ya ndị inyom gere ntị wee gbapụ na Sọdọm. Ha akwụsịtụghị akwụsị, ha eleghịkwa anya n’azụ. Ma nwunye Lọt egeghị ntị. Mgbe ha jeruru ebe dịtụ anya, ọ kwụsịrị, wee lee anya n’azụ. Nwunye Lọt wee ghọọ ogidi nnu. Ị̀ na-ahụ ya na foto a?

Anyị pụrụ ịmụta ezi ihe na nke a. Ọ na-egosi na Chineke na-azọpụta ndị na-ege ya ntị, ma ndị na-adịghị ege ya ntị ga-anwụ.

Jenesis 13:5-13; 18:20-33; 19:1-29; Luk 17:28-32; 2 Pita 2:6-8.

Mgbe Lọt na-agbapụ na Sọdọm


Ajụjụ

  • N’ihi gịnị ka Ebreham na Lọt ji kewaa?
  • N’ihi gịnị ka Lọt ji họrọ ibi na Sọdọm?
  • Ụdị ndị dị aṅaa ka ndị Sọdọm bụ?
  • Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka ndị mmụọ ozi abụọ nyere Lọt?
  • N’ihi gịnị ka nwunye Lọt ji ghọọ ogidi nnu?
  • Gịnị ka ihe mere nwunye Lọt na-akụziri anyị?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Jenesis 13:5-13.

    A bịa n’ihe banyere idozi esemokwu n’etiti mmadụ na ibe ya, gịnị ka anyị pụrụ ịmụta n’aka Ebreham? (Jen. 13:8, 9; Rom 12:10; Fil. 2:3, 4)

  • Gụọ Jenesis 18:20-33.

    Olee otú ụzọ Jehova si mesoo Ebreham ihe si emesi anyị obi ike na Jehova na Jizọs ga-ekpe ikpe ziri ezi? (Jen. 18:25, 26; Mat. 25:31-33)

  • Gụọ Jenesis 19:1-29.

    Gịnị ka akụkọ a dị na Bible na-egosi banyere otú Chineke si ele mmadụ idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya anya? (Jen. 19:5, 13; Lev. 20:13)

    Gịnị bụ ọdịiche dị n’otú Lọt si nakwere ntụziaka Chineke nakwa otú Ebreham si nakwere ya, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site na nke a? (Jen. 19:15, 16, 19, 20; 22:3)

  • Gụọ Luk 17:28-32.

    Àgwà dị aṅaa ka nwunye Lọt nwere n’ebe ihe onwunwe dị, oleekwa otú nke a si bụrụ ihe ịdọ aka ná ntị nye anyị? (Luk 12:15; 17:31, 32; Mat. 6:19-21, 25)

  • Gụọ 2 Pita 2:6-8.

    N’iṅomi Lọt, gịnị kwesịrị ịbụ àgwà anyị n’ebe ụwa nke na-adịghị asọpụrụ Chineke nke anyị bi n’ime ya dị? (Ezik. 9:4; 1 Jọn 2:15-17)

GỤKWUO GBASARA YA

Nwunye Lọt Ghọrọ Ogidi Nnu

Gụọ gbasara nwunye Lọt, sorokwa kpọm kpọm ndị dị na foto a sechapụ ya. Gịnị ka ị mụtara n’ihe mere nwunye Lọt?

Katuun E Sere Ese nke Lọt na Ezinụlọ Ya

Danloduo katuun a, leekwa ma ò nwere ihe ị ga-amụta n’aka Lọta na ezinụlọ ya.