Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 12: Ụmụ Mmadụ Ewuo Nnukwu Ụlọ Elu

Akụkọ nke 12: Ụmụ Mmadụ Ewuo Nnukwu Ụlọ Elu

ỌTỤTỤ afọ agafewo. Ụmụ Noa mụrụ ọtụtụ ụmụ. Ụmụ ha wee tolite, mụtakwa ụmụ nke ha. Ọ dịghị anya, e nwee ọtụtụ mmadụ n’ụwa.

Otu n’ime ha bụ Nimrọd, bụ́ nwa nwa nke nwa Noa. Ọ bụ ajọ mmadụ nke chụgharịrị ma na-egbu ma mmadụ ma anụmanụ. Nimrọd mekwara onwe ya eze na-achị ndị ọzọ. Omume Nimrọd adịghị Chineke mma.

Ndị niile nọ n’oge ahụ na-asụ otu asụsụ. Nimrọd chọrọ ime ka ha niile nọkọta ọnụ ka o wee nwee ike ịchị ha. Ị̀ ma ihe o mere? Ọ gwara ha ka ha wuo otu obodo ma wunye otu nnukwu ụlọ elu n’ime ya. Lee ha na foto a ka ha na-akpụ brik.

Obi adịghị Jehova Chineke mma maka ụlọ a ha na-ewu. Chineke chọrọ ka ha pụọ ebe ahụ ma biri n’elu ụwa niile. Ma ha sịrị: ‘Ngwanụ! Ka anyị wuo obodo na ụlọ elu nke elu ya ga-eru n’eluigwe. Anyị ga-emere onwe anyị aha!’ Ha chọrọ imere onwe ha aha, ọ bụghị imere Chineke aha.

N’ihi ya, Chineke mere ka ha kwụsị iwu ụlọ elu ahụ. Ị̀ ma ụzọ o si mee ya? Ọ bụ site n’ime ka ha malite ịsụ asụsụ dị iche iche na mberede kama ịsụ otu asụsụ. Ndị ahụ na-ewu ụlọ ahụ anaghịzi aghọta okwu ibe ha ọzọ. Nke a mere e ji kpọọ obodo ha Bebel, ma ọ bụ Babilọn, nke pụtara “Aghara.”

Mgbe ahụ, ha malitere isi na Bebel pụọ. Ìgwè nke ọ bụla asụsụ ha dakọtara ha ejee biri n’akụkụ ọzọ nke ụwa.

Jenesis 10:1, 8-10; 11:1-9.

Ebe ha na-ewu nnukwu ụlọ elu


Ajụjụ

  • Ònye bụ Nimrọd, oleekwa otú Chineke si lee ya anya?
  • N’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji na-akpụ brik na foto a?
  • Olee ihe mere na ọrụ ihe owuwu ahụ adịghị Jehova mma n’obi?
  • Olee otú Chineke si kwụsị owuwu nke nnukwu ụlọ elu ahụ?
  • Gịnị ka a kpọrọ obodo ahụ, gịnịkwa ka aha ahụ pụtara?
  • Gịnị mere ndị ahụ mgbe Chineke ghagburu asụsụ ha?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Jenesis 10:1, 8-10.

    Olee ụdị àgwà Nimrọd nwere, oleekwa otú nke a si bụrụ ihe ịdọ aka ná ntị nye anyị? (Ilu 3:31)

  • Gụọ Jenesis 11:1-9.

    Gịnị bụ nzube e ji na-ewu nnukwu ụlọ elu ahụ, oleekwa ihe mere owuwu ya ji kụọ afọ n’ala? (Jen. 11:4; Ilu 16:18; Jọn 5:44)