Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 11: Eke na Egwurugwu Mbụ

Akụkọ nke 11: Eke na Egwurugwu Mbụ

Ị̀ MA ihe mbụ Noa mere mgbe ya na ezinụlọ ya si n’ụgbọ ahụ pụta? Ọ chụụrụ Chineke àjà, ma ọ bụ nye ya onyinye. Ị pụrụ ịhụ ka ọ na-eme nke a na foto dị n’okpuru ebe a. Noa ji ụmụ anụmanụ a chụọrọ Chineke àjà iji kelee ya maka ịzọpụta ya na ezinụlọ ya n’oké iju mmiri ahụ.

Ụgbọ ahụ na eke na egwurugwu

Ì chere na onyinye ahụ dị Jehova mma? Ee, ọ dị ya. Ọ gwakwara Noa na ya agaghị eji iju mmiri bibie ụwa ọzọ.

Ọ dịghị anya, ala niile wee kọọ, Noa na ezinụlọ ya wee malite ndụ ọhụrụ mgbe ha pụtasịrị n’ụgbọ ahụ. Chineke gọziri ha wee sị ha: ‘Unu ga-amụ ọtụtụ ụmụ. Unu ga-abakwa ụba ruo mgbe mmadụ ga-ebizu n’ala niile.’

Ma, mgbe ndị mmadụ ga-emesị nụ banyere oké iju mmiri ahụ, ha pụrụ ịtụ egwu na a ga-enwe iju mmiri yiri ya ọzọ. N’ihi ya, Chineke nyere ihe ga na-echetara ndị mmadụ nkwa o kwere nke bụ́ na ya agaghị eme ka iju mmiri rikpuo ụwa ọzọ. Ị̀ ma ihe o wepụtara iji na-echetara ha? Ọ bụ eke na egwurugwu.

Noa na ezinụlọ ya

A na-ahụkarị ya na mbara igwe n’oge anyanwụ na-amụ mgbe mmiri zosịrị. Ha pụrụ inwe ọtụtụ àgwà mara mma. Ị̀ hụtụla otu? Ị̀ na-ahụ nke dị na foto a?

Chineke wee sị: ‘Ana m ekwe nkwa na iju mmiri agaghị ebibi mmadụ niile na anụmanụ niile ọzọ. M na-etinye eke na egwurugwu m n’igwe ojii. Mgbe ọ pụtara, m ga-ahụ ya wee cheta nkwa nke a mụ onwe m kwere.’

Ya mere, mgbe ị na-ahụ eke na egwurugwu, gịnị ka ọ na-echetara gị? Ọ bụ nkwa ahụ Chineke kwere na ya agaghị eji oké iju mmiri ebibi ụwa ọzọ.

Jenesis 8:18-22; 9:9-17.



Ajụjụ

  • Dị ka e gosiri na foto a, gịnị ka Noa buru ụzọ mee mgbe o si n’ụgbọ ahụ pụta?
  • Olee iwu Chineke nyere Noa na ezinụlọ ya mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị?
  • Olee nkwa Chineke kwere?
  • Mgbe anyị hụrụ eke na egwurugwu, gịnị ka o kwesịrị ichetara anyị?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Jenesis 8:18-22.

    Olee otú anyị pụrụ isi na-esurere Jehova ‘ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ’ taa? (Jen. 8:21; Hib. 13:15, 16)

    Gịnị ka Jehova kwuru banyere obi mmadụ, gịnịkwanụ ka anyị kwesịrị ịkpachara anya banyere ya? (Jen. 8:21; Mat. 15:18, 19)

  • Gụọ Jenesis 9:9-17.

    Ọgbụgba ndụ dị aṅaa ka Jehova so ihe niile e kere eke nọ n’ụwa nwee? (Jen. 9:10, 11)

    Ogologo oge hà aṅaa ka ọgbụgba ndụ eke na egwurugwu ahụ ga-adị irè? (Jen. 9:16)

GỤKWUO GBASARA YA

E Chebere Noa “na Mmadụ Asaa Ndị Ọzọ”

Olee otú Chineke si chebe Noa na ezinụlọ ya n’oge o ji iju mmiri bibie ụwa?