Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!

 ISI NKE 22

Chineke Ga-eji Alaeze Ya Mee Uche Ya n’Ụwa

Chineke Ga-eji Alaeze Ya Mee Uche Ya n’Ụwa

IHE ISIOKWU A NA-EKWU

Chineke ga-eji Alaeze ya mezuo ihe o zubere maka ụwa na ụmụ mmadụ

1, 2. (a) Gịnị mere o nwere ike iji na-esiri anyị ike ikwetasi ike na Chineke ga-eme ka anyị biri na Paradaịs? (b) Olee ihe ga-enyere anyị aka ka obi sikwuo anyị ike na Chineke ga-emezu ihe o kwere anyị ná nkwa?

KA E were ya na e nwere otu ụbọchị otu nwanna nwoke ezigbo ike gwụrụ bịara ọmụmụ ihe. Ihe mere ka ezigbo ike gwụ ya bụ na ọ rụrụ ọrụ karịrị akarị n’ụbọchị ahụ. Ọga ya anaghị ekwe ya zuru ike. Ihe ọzọ bụ na ọ na-eche otú ọ ga-esi na-akpa afọ ezinụlọ ya nakwa ọrịa na-echi nwunye ya ọnụ n’ala. Mgbe a malitere ịbụ abụ e ji amalite ọmụmụ ihe, obi adịwa nwanna a ụtọ n’ihi na ya na ụmụnna ya nọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ugbu a. Abụ a na-abụ na-ekwu gbasara otú ihe ga-adịrị anyị na Paradaịs. E nwere ebe abụ ahụ kwuru ka ọ hụ onwe ya na Paradaịs. Abụ a na-atọ ya ụtọ. Ka ya na ezinụlọ ya na-abụ abụ a, obi bịara ruo ya ala, ya echefuo ihe ndị ahụ na-echu ya ụra.

2 Ụdị ihe a ò metụla gị? O metụla ọtụtụ n’ime anyị. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na otú ụwa ochie a si na-echi anyị ọnụ n’ala nwere ike ime ka o siere anyị ike ikwetasi ike na Chineke ga-eme ka anyị biri na Paradaịs. Oge a anyị bi n’ime ya ‘dị oké egwu, ma taa akpụ.’ Ọ dịtụkwanụghị otú e nwere ike isi jiri ụwa a tụnyere Paradaịs. (2 Tim. 3:1) Olee ihe nwere ike inyere anyị aka ikwetasi ike na Chineke ga-eme ka anyị biri na Paradaịs? Oleedị otú anyị si mara na Alaeze Chineke ga-achị ụwa niile n’oge na-adịghị anya? Ka anyị leba anya n’amụma ụfọdụ Jehova buru n’oge gara aga ndị mechara mezuo. Ndị ohu ya n’oge ahụ, ji anya ha hụ mgbe amụma ndị ahụ mezuru. Anyị ga-elebakwa anya n’otú amụma ndị ahụ nakwa amụma ndị ọzọ e buru si na-emezu n’oge anyị a. Anyị lebachaa ha anya, ọ ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike. Anyị ga-elebakwa anya n’uru amụma ndị ahụ ga-abara anyị n’ọdịnihu.

Otú Jehova Si Mezuoro Ndị Ya n’Oge Ochie Nkwa Ndị O Kwere Ha

3. Olee nkwa Jehova kwere ndị Juu nọ na Babịlọn?

3 Chegodị otú ihe si dịrị ndị Juu a dọọrọ n’agha laa Babịlọn, ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ ise gara aga. A mụrụ ọtụtụ n’ime ha na Babịlọn. Ihe na-esikwara ha ike n’ebe ahụ. Ndị Babịlọn na-akwa ha emo maka na ha kweere na Jehova  ga-eme ka ha nwere onwe ha. (Ọma 137:1-3) Jehova kwere ndị Juu nkwa na ya ga-eme ka ha laghachi n’obodo ha. N’agbanyeghị ọtụtụ afọ ha nọrọ na Babịlọn, obi ka siri ha ike na Jehova ga-emezu nkwa a. Jehova gwara ha na ihe ga-adịrị ha mma ma ha laghachi n’obodo ha. O kwudịrị na ala Juda ga-adị ka ogige Iden ma ọ bụ paradaịs. (Gụọ Aịzaya 51:3.) O doro anya na Jehova kwere ha nkwa ndị ahụ iji mee ka obi sie ha ike ma ha nwewe obi abụọ. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ka anyị leba anya n’amụma ụfọdụ ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ a.

4. Gịnị ka Jehova gwara ndị Juu iji mee ka obi sie ha ike?

4 Obi ga-eru ha ala. Ndị Juu a a dọọrọ n’agha agaghị alaghachi na paradaịs nkịtị. Ha ga-alaghachi n’ala tọgbọ nkịtị kemgbe afọ iri asaa. Ọtụtụ n’ime ha ahụtụbeghị ya mbụ. Obodo ha a dịkwa anya na Babịlọn. N’oge ahụ, ọdụm, nkịta ọhịa, agụ owuru, na anụ ọhịa ndị ọzọ na-eri mmadụ juru ebe niile. Nwoke ji ezinụlọ nwere ike na-eche, sị, ‘Olee otú m ga-esi kpọrọ nwaanyị m na ụmụ m lawa, anụ ọhịa ndị a aghara iri ha? Atụrụ m na ehi m kwanụ?’ O nweghị onye ọ ga-abụ, ya ahapụ ichewe ihe ndị ahụ. Ugbu a, lebazie anya n’ọmarịcha nkwa Chineke kwere ha n’Aịzaya 11:6-9. (Gụọ ya.) Ọ ga-abụrịrị na nkwa a kasiri ha obi. Jehova kwere ha nkwa ndị a iji mee ka obi sie ha ike na o nweghị ihe ga-eme ha na anụ ụlọ ha ma ha lọtawa. Chineke gwara ha na ọdụm ga-ata okporo ọka. Olee ihe ihe a o kwuru pụtara? Ọ pụtara na ọdụm agaghị akpa ehi ndị Juu aka. O nweghị ihe anụ ọhịa ndị ahụ na-eri mmadụ ga-eme ndị Juu ahụ ma ha lọghachi n’obodo ha. Jehova kwere ndị ya nkwa na o nweghị ihe ga-eme ha ma na Juda bụ́ obodo ha, ma n’ala ịkpa ma n’oké ọhịa.—Ezik. 34:25.

5. Olee amụma Aịzaya buru nke mere ka ndị Juu kwetasie ike na Jehova ga-egboro ha mkpa ha ma ha lọta?

5 Ha ga-enwe ọtụtụ ihe. E nwere ihe ndị ọzọ nwere ike ịna-echu onye ji ezinụlọ n’oge ahụ ụra. O nwere ike ịna-eche, sị, ‘M̀ ga-enwe ike ịkpa afọ ezinụlọ m ma anyị laa? Olee ebe anyị ga-ebi? Gịnị ka m ga na-arụ? Ebe ahụ ọ̀ ga-aka mma karịa ebe a a na-emekpọ anyị ọnụ?’ Jehova kwuru ihe ga-eme ka obi ruo ndị nwere ike ịna-eche ụdị ihe ndị a ala. Jehova kwuru na mmiri ga na-ezoro ndị ya ka mkpụrụ ha kụrụ n’ala nwee ike ‘ịma abụba, gbaakwa mmanụ.’ (Aịza. 30:23) A bịa n’okwu gbasara ebe ha ga-ebi na ọrụ ha ga-arụ, Jehova gwara ha, sị: “Ha ga-ewu ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akọkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie ya; ha agaghị akụ mkpụrụ, onye ọzọ erie ya.” (Aịza. 65:21, 22) Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe ga-aka adịrị ha mma ma ha laghachi n’obodo ha karịa n’obodo Babịlọn na-ekpere arụsị. Ma, oleekwanụ gbasara nsogbu kachanụ ha nwere, ya bụ, ihe ndị mere Chineke ji kwe ka a dọrọ ha n’agha?

6. Olee nsogbu ndị Juu nwere tupu a dọrọ ha n’agha? Oleekwa ihe Jehova kwuru na ya ga-emere ha ma ha lọta?

6 A ga-eme ka ha na Chineke dịghachi ná mma. Tupu a dọrọ ndị Juu n’agha, ha akwụsịla ife Chineke. Jehova si n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Aịzaya gwa ha, sị: “Isi dum na-arịa  ọrịa, obi dum dakwara mbà.” (Aịza. 1:5) A bịa n’ihe gbasara ife Chineke, ha kpuru ìsì, ntị chikwara ha. Ha achọzighị iji ntị anụ ihe Jehova na-agwa ha. Ha achọghịkwa iji anya ha hụ ụzọ Jehova chọrọ ka ha jee ije na ya. (Aịza. 6:10; Jere. 5:21; Ezik. 12:2) Ọ bụrụkwa na ha alọta, kwụsị ife Jehova, gịnị ga-eme ha? Jehova ọ́ gaghị ajụ ha otú ọ jụrụ ha mbụ? Jehova gwara ha ihe mere ka obi sie ha ike. O kwuru, sị: “N’ụbọchị ahụ, ndị ntị chiri ga-anụ ihe e kwuru n’akwụkwọ a, ọbụna anya ndị ìsì ga-ahụ ụzọ n’itiri nakwa n’ọchịchịrị.” (Aịza. 29:18) Jehova kwuru na ebe ọ bụ na ya adọọla ha aka ná ntị, ha echegharịa, na ya na ha ga-adị ná mma. Ọ bụrụ na ha ana-erubere ya isi, ọ ga-agwa ha ihe ndị ha ga-eme, ihe adịrị ha ná mma.

7. Olee otú Jehova si mezuo nkwa ndị ahụ o kwere ndị Juu? Olee uru nkwa ndị ahụ o mezuuru ha na-abara anyị taa?

7 Jehova ò meere ha ihe a niile o kwuru? Ihe ndị mechara mee n’oge ahụ gosiri na o mere ya. Jehova mere ka obi ruo ndị Juu lọghachirinụ ala. O mekwara ka ha nwee ọtụtụ ihe, ya na ha adịrịkwa ná mma. Dị ka ihe atụ, e nwere mba ndị ha na ha gba ka ha ike, kakwa ha hie nne. Ma, Jehova ekweghị ka mba ndị a mee ha ihe ọjọọ ọ bụla. Anụ ọhịa ndị na-eri mmadụ akpaghị anụ ụlọ ndị Juu aka. Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe a niile Jehova meere ndị Juu enweghị ihe ha bụ ma e jiri ya tụnyere ihe ọma ndị Jehova kwuru ya ga-emere ndị ya ma ụwa a ghọọ paradaịs. Aịzaya, Jeremaya na Ezikiel dere ihe ndị ahụ na Baịbụl. Ma, ihe ndị ahụ Jehova meere ndị ya n’oge ochie mere ka obi tọọ ha ụtọ n’ihi na ọ bụ ihe dị ha mkpa n’oge ahụ. Ọ bụrụ na anyị echeta ihe ndị ahụ Jehova meere ha n’oge ahụ, ọ ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike. Ebe ọ bụ na amụma ndị ahụ mezutụụrụ ndị Juu tọrọ ha ezigbo ụtọ, oleezi otú obi ga-adị anyị n’ụwa ọhụrụ ma Jehova meere anyị ihe ndị ahụ karịa otú ahụ o meere ya ndị Juu? Ugbu a, ka anyị leba anya n’ihe Jehova meerela anyị taa.

Otú Jehova Si Na-emezuru Anyị Nkwa Ya Taa

8. Olee ihe Jehova na-emere ndị ya taa?

8 Ndị Jehova taa abụghị mba nkịtị, ha ebikwanụghị n’otu ebe. Ma, Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ otu mba n’anya Chineke. Ha bụ “Izrel nke Chineke.” (Gal. 6:16) Ndị enyi ha bụ́ “atụrụ ọzọ” so ha bụrụ otu “mba” n’anya Chineke, ya bụ, ha niile nọ ná nzukọ Jehova jiri otu obi na-efe ya. Ha ji ofufe a ha na-efe ya kpọrọ ihe. (Jọn 10:16; Aịza. 66:8) Ha niile bi n’udo, dịrịkwa n’otu. Jehova emeela ka nzukọ ya taa nwee ụdị udo ahụ o kwere nkwa na a ga-enwe na Paradaịs. Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ mere anyị ji kwuo otú ahụ.

9, 10. (a) Olee otú ihe e kwuru n’Aịzaya 11:6-9 si na-emezu taa? (b) Olee ihe na-egosi na ndị Chineke dị n’udo?

9 Obi ga-eru ha ala. Amụma dị n’Aịzaya 11:6-9 kwuru na anụ ọhịa na anụ ụlọ ga-adị n’udo, anụ ọhịa na ụmụ mmadụ ga-adịkwa n’udo. Ụdị ihe a ọ̀ na-eme taa ná nzukọ Jehova? Ee, ọ na-eme. Amaokwu nke itoolu kwuru ihe mere e ji nwee ụdị udo a. O kwuru, sị: “N’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta  ụwa dị ka mmiri si kpuchie oké osimiri.” “Ihe ọmụma Jehova” ò nwere ike ime ka ụmụ anụmanụ gbanwee àgwà ha? Mba. Ọ bụ ụmụ mmadụ ka ihe ọmụma Chineke na-eme ka ha gbanwee àgwà ha. Ọ na-abụ ha mụọ gbasara Chineke Onye Kasị Ihe Niile Elu, ha amụta otú ha ga-esi na-eme udo ka Chineke. Ọ bụ ya mere a bịa ná nzukọ Jehova taa, anyị na-ahụ ka ihe ahụ e buru n’amụma na-emezu. Ndị Kraịst bụ́ ndị Alaeze Chineke na-achị na-amụta otú ha ga-esi kwụsị ịkpa àgwà ka anụ ọhịa, ka ha na ụmụnna ha nwee ike ịna-ebi n’udo ma dịrị n’otu.

10 Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ a, anyị amụtala ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru mere Ndị Kraịst na-ekwesịghị iji bụrụ nke ụwa. Anyị ahụkwala ọnụ a na-emekpọ ndị Chineke n’ihi na ha achọghị ịbụ nke ụwa. Obi dị anyị ụtọ taa na n’ụwa a tigbuo zọgbuo juru, e nwere otu ndị na-anaghị ekwe etinye aka na ya, ihe ọ sọkwara gị mee ha. Nke a na-egosi na ndị Eze anyị bụ́ Mesaya na-achị dị n’udo otú ahụ Aịzaya si kwuo ya. Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya ga-ahụ ibe ha n’anya, ndị mmadụ ejirikwa ya mara na ha bụ ndị na-eso ụzọ ya. (Jọn 13:34, 35) A bịa ná nzukọ Jehova, Kraịst ji “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, na-akụziri ezigbo Ndị Kraịst otú ha na ibe ha ga-esi na-ebi n’udo, na-ahụ ibe ha n’anya, ma jiri obiọma na-emeso ibe ha ihe.—Mat. 24:45-47.

11, 12. Olee ụdị ụnwụ na-echi ụwa ọnụ n’ala taa? Ma, olee otú Jehova si na-eme ka Okwu ya na-ezoro ndị ya ka mmiri?

 11 Ha ga-enwe ọtụtụ ihe. Ụnwụ na-echi ụwa a ọnụ n’ala ma a bịa n’ihe gbasara Okwu Chineke. Baịbụl kwuru, sị: “‘Lee! Ụbọchị na-abịa,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘mgbe m ga-eme ka e nwee ụnwụ n’ala a, ma ọ bụghị ụnwụ nri, meekwa ka e nwee akpịrị ịkpọ nkụ, ma ọ bụghị nke mmiri, kama ọ bụ nke ịnụ okwu Jehova.’” (Emọs 8:11) Ụdị ụnwụ a ọ̀ na-echikwa ụmụ amaala Alaeze Chineke ọnụ n’ala? Mbanụ. Jehova kwuru na a ga-enwe ihe dị iche ná ndị na-efe ya na ndị iro ya. Ọ sịrị: “Ndị ohu m ga-eri ihe, ma agụụ ga na-agụ unu. Lee! Ndị ohu m ga-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ma akpịrị ga na-akpọ unu nkụ. Lee! Ndị ohu m ga-aṅụrị ọṅụ, ma ihere ga na-eme unu.” (Aịza. 65:13) Ị̀ na-ahụ ka amụma a na-emezu taa?

12 Okwu Chineke na-ezoro anyị ka mmiri taa. Anyị na-enweta ọtụtụ akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl, nweekwa ihe ndị anyị na-egere egere na vidio. Anyị nwekwara ndị nke dị n’Ịntanet. A na-akụzikwara anyị ọtụtụ ihe n’ọmụmụ ihe na mgbakọ dị iche iche anyị na-aga. Ihe ndị a niile na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike n’ụwa a imirikitimi mmadụ na-amaghị Okwu Chineke. (Ezik. 47:1-12; Joel 3:18) Ọ̀ bụ na obi adịghị gị ụtọ na Jehova na-eme ka Okwu ya na-ezoro anyị ka mmiri otú ahụ o kwuru na ya ga-eme? Ị̀ na-ekwe ka Jehova na-akụziri gị ihe mgbe niile?

A na-akụziri anyị ọtụtụ ihe gbasara Chineke n’ọgbakọ anyị. Ọ na-emekwa ka obi na-eru anyị ala, na-emekwa ka anyị na Chineke dịrị ná mma

13. Olee otú i sirila hụ ka Jehova na-emepe anya ndị ìsì ma ọ bụ na-eme ka ndị ntị chiri na-anụ ihe n’oge anyị a?

13 A ga-eme ka ha na Chineke dịghachi ná mma. Ọtụtụ ndị taa kpuru ìsì, ntị echiekwa ha n’ihe gbasara Okwu Chineke. (2 Kọr. 4:4) Ma, Kraịst na-agwọ ọtụtụ n’ime ha n’ụwa niile. Ị̀ hụtụla ebe onye ìsì hụrụ ụzọ na ebe onye ntị chiri nụrụ ihe? E nweela ndị a kụziiri ụgha n’okpukpe ha, nke mere ka ha dị ka ndị ìsì na ndị ntị chiri, ha emechaa mụta eziokwu dị n’Okwu Chineke. Ọ bụrụ na ị hụtala ụdị ndị a, ọ pụtara na ị hụla ebe ihe a Aịzaya kwuru mezuru: “N’ụbọchị ahụ, ndị ntị chiri ga-anụ ihe e kwuru n’akwụkwọ a, ọbụna anya ndị ìsì ga-ahụ ụzọ n’itiri nakwa n’ọchịchịrị.” (Aịza. 29:18) N’ụwa niile, a na-enyere ọtụtụ puku ndị mmadụ aka kwa afọ ịmụta eziokwu banyere Chineke. Mgbe ọ bụla mmadụ si na Babịlọn Ukwu ahụ pụta ma bata n’ọgbakọ Jehova soro anyị na-efe Chineke, ọ na-egosi na Jehova na-emezu nkwa a o kwere.

14. Gịnị ka anyị ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike?

14 Ihe ndị e kwuru n’isiokwu nke ọ bụla n’akwụkwọ a gosiri na Kraịst na-eme ka ndị ya na-abata ná nzukọ Jehova n’oge ọgwụgwụ a. Anyị kwesịrị ịna-echeta ọtụtụ ihe ọma Jehova na-emere anyị n’ọgbakọ ya. Ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, ọ ga-eme ka obi na-esikwu anyị ike na Jehova ga-emezu nkwa ndị o kwere.

“Ka Alaeze Gị Bịa”

15. Gịnị mere obi ji sie anyị ike na ụwa a ga-aghọ paradaịs?

15 Kemgbe ụwa, Jehova zubere ime ka ụwa niile bụrụ paradaịs. Mgbe o kere Adam na Iv, o mere ka ha biri na paradaịs.  Ọ gwakwara ha ka ha mụọ ọmụmụ ma jupụta ụwa, nakwa ka ha na-elekọta ihe ndị ọzọ dị n’ụwa. (Jen. 1:28) Ma, Adam na Iv nupụụrụ Jehova isi otú Setan mere. Isi a ha nupụụrụ Chineke mere ka ụmụ ha bụrụ ndị na-ezughị okè na ndị mmehie. O mekwara ka ha na-anwụ anwụ. Ma, Chineke agbanwebeghị ihe o zubere ime. Ihe ọ bụla o kwuru na ya ga-eme, ga-emerịrị. (Gụọ Aịzaya 55:10, 11.) N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na ụwa a ga-aghọ paradaịs, nakwa na ụmụ Adam na Iv ga-ejupụta na ya ma na-elekọta ihe niile dị n’ime ya. Ọ bụ n’oge ahụ ka Jehova ga-emezuru ụmụ mmadụ ihe ndị ahụ o kwere ndị Juu ná nkwa na ya ga-emere ha ma ha lọta n’obodo ha. Ka anyị lebazie anya n’otú nkwa ndị ahụ ga-esi emezu n’ọdịnihu.

16. Gịnị ka Baịbụl kwuru gosiri na obi ga-eru anyị ala na Paradaịs?

16 Obi ga-eru ha ala. Ihe ahụ Aịzaya buru n’amụma n’Aịzaya 11:6-9 ga-emecha mezuo n’ụwa niile na paradaịs. Obi ga-eru mmadụ niile ala, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị ma ụmụaka. O nweghị onye ga-enye ha nsogbu, ma mmadụ ma anụmanụ. O nweghị ebe ị ga-aga n’ụwa a chịrị obi n’aka. O nweghị ihe ị ga-atụ egwu ya ma i gwuwe mmiri. Ị ga-arị ugwu ọ bụla ị chọrọ ịrị ma ọ bụ wagharịa n’ọhịa dị iche iche n’enweghị ọkọ ga-akọ gị. Ị nọrọ ebe ahụ chi ejie, ị gaghị atụ ụjọ ihe ọ bụla. Jehova ga-emezu ihe o kwuru n’Ezikiel 34:25, ya bụ, ọ ga-eme ka ndị ya nwee ike ‘ibi n’ala ịkpa n’obi iru ala, hiekwa ụra n’oké ọhịa.’

17. Olee ihe ga-eme ka obi sie anyị ike na Jehova ga-egboro anyị mkpa anyị niile ma Alaeze ya chịwa ụwa niile?

17 Ha ga-enwe ọtụtụ ihe. Chetụdị otú ọ ga-adị ma ị nọrọ n’ụwa mgbe a na-enweghịzi ndị dara ogbenye, ụkọ nri adịghịzi, onye ọ bụla na-erizi nri ndị na-edozi ahụ́, agaghịzi enwe ụlọ ọrụ ndị na-agbatara ndị mmadụ ọsọ enyemaka. Ọtụtụ ihe a na-akụziri anyị taa na-egosi na Eze anyị bụ́ Mesaya ga-emere anyị ọtụtụ ihe na paradaịs. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o ji ogbe achịcha ole na ole na azụ̀ ole na ole nyejuo ọtụtụ puku mmadụ afọ. Ma na paradaịs, ọ ga-enyeju mmadụ niile afọ. (Mat. 14:17, 18; 15:34-36; Mak 8:19, 20) Ọ bụrụ na Alaeze Chineke achịwa ụwa niile, Chineke ga-emezu amụma a: “Ọ ga-emekwa ka mmiri zooro mkpụrụ ị kụrụ n’ala, nyekwa gị ihe oriri dị ka mkpụrụ nke ala, bụ́ nke ga-ama abụba, gbaakwa mmanụ. Anụ ụlọ gị ga-ata nri n’ụbọchị ahụ n’ebe ịta nri nke sara mbara.”—Aịza. 30:23.

18, 19. (a) Olee uru ihe e kwuru n’Aịzaya 65:20-22 baara gị? (b) Baịbụl kwuru na “dị ka osisi si anọ ogologo ndụ, otú ahụ ka ndị m ga-anọ ogologo ndụ.” Gịnị ka okwu a pụtara?

18 Ọtụtụ ndị taa enweghị ezigbo ọrụ, nke ha jikwanụ enwe ezigbo ụlọ. N’ụwa ọjọọ a, ọtụtụ ndị na-arụrụ ibe ha ọrụ si n’ụtụtụ ruo n’abalị, ma a naghị akwụ ha ihe ga-ezuru ha na ezinụlọ ha. Ọ bụ n’akpa ndị ọgaranya na ndị anyaukwu ka ihe niile ahụ ha rụtara na-aba. Chetụgodị otú obi ga-adị anyị niile mgbe amụma a ga-emezu n’ụwa niile: “Ha ga-ewu ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akọkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie ya; ha agaghị akụ mkpụrụ, onye  ọzọ erie ya. N’ihi na dị ka osisi si anọ ogologo ndụ, otú ahụ ka ndị m ga-anọ ogologo ndụ; ndị m họọrọ ga-eji ihe aka ha rụpụtara mee ihe n’uju.”—Aịza. 65:20-22.

19 Baịbụl kwuru na “dị ka osisi si anọ ogologo ndụ, otú ahụ ka ndị m ga-anọ ogologo ndụ.” Olee ihe okwu a pụtara? Ọ bụrụ na ị nọrọ n’úkwù otu nnukwu osisi ma na-ele ya anya, i nwere ike na-eche afọ ole ọ nọrọla. I nwekwara ike ikwu n’obi gị na osisi a anọọla ọtụtụ afọ tupu a mụọ ndị nna nna gị hà. I nwekwara ike kwuo na ọ bụrụ na ihe adịrị otú ọ dị ugbu a na-aga, osisi a nwere ike ịnọ gị anwụọ, nọrọkwa ruo ọtụtụ afọ mgbe ị nwụchara. Jehova na-emesi anyị obi ike na anyị ga-adị ogologo ndụ na Paradaịs n’enweghị ọkọ ga-akọ anyị. (Ọma 37:11, 29) N’eziokwu, oge ga-abịa mgbe osisi nọrọla ọtụtụ afọ ga-adị anyị ka ahịhịa nkịtị pulitere taa, kpọnwụọ echi, ma anyịnwa adịrị ndụ na-aga ruo mgbe ebighị ebi!

20. Olee otú Chineke ga-esi mee ka ndị Alaeze ya na-achị kwụsị ịrịa ọrịa?

20 Ọrịa ga-ala kpamkpam. Ọrịa na ọnwụ na-akpa mmadụ niile aka ọjọọ taa. E nwere otu ọrịa anyị niile na-arịa. Ọrịa ahụ bụ mmehie. Ọ bụ ya mere anyị ji anwụ anwụ. Naanị ihe ga-agwọ anyị ọrịa a bụ àjà mgbapụta Kraịst. (Rom 3:23; 6:23) Mgbe Jizọs na ndị ha na ya ga-eso achị ga-achị ụwa otu puku afọ, a ga-eme ka àjà ahụ Jizọs ji ndụ ya chụọ baara anyị ezigbo uru. Ha ga-eji nwayọọ nwayọọ wepụ mmehie n’ahụ́ anyị. Ọ bụ mgbe ahụ ka Jehova ga-akacha mezuo amụma a Aịzaya buru: “Ọ dịghị onye bi na ya nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’ Ndị bi n’ala a ga-abụ ndị a gbaghaara njehie ha.” (Aịza. 33:24) Chineke ga-eme ka ndị ìsì hụwa ụzọ, mee ka ndị ntị chiri nụwa ihe, mee ka ndị ogbi kwuwe okwu, meekwa ka ndị ngwọrọ gawa ije. (Gụọ Aịzaya 35:5, 6.) Jizọs ga-agwọ ụdị ọrịa ọ bụla. Ndị niile Alaeze Chineke na-achị mgbe ahụ agaghịzi arịa ọrịa.

21. Gịnị ka Chineke ga-eme ọnwụ? Olee ihe mere obi ji na-atọ gị ụtọ n’ihe a Jehova ga-eme?

21 Ma ọrịa ma mmehie na-akpatacha ọnwụ. Gịnị ga-emekwanụ ọnwụ ma ọrịa na mmehie laa? Baịbụl kwuru na ọnwụ bụ “onye iro ikpeazụ” anyị nwere. O nweghị mmadụ ọ bụla nyịrị ọnwụ. (1 Kọr. 15:26) Ma, ò nwere ihe Jehova ga-emeli ọnwụ? Lekwa ihe Aịzaya kwuru Jehova ga-eme: “Ọ ga-eloda ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu niile.” (Aịza. 25:8) Chetụgodị echiche otú oge ahụ ga-adị. A gaghịzi enwe ebe a na-akwa ozu na ebe a na-eli ozu. Ọ dịghịkwa ndị anya mmiri ga na-agba n’ihi ọnwụ mmadụ. Anya mmiri ga na-agba ndị mmadụ mgbe ahụ bụ n’ihi ọṅụ ha na-enwe maka na Jehova akpọlitela ndị ha nwụrụ anwụ otú ahụ o kwuru na ya ga-eme. (Gụọ Aịzaya 26:19.) Jehova ga-eme ka nsogbu niile ọnwụ kpatara kwụsị.

22. Gịnị ga-eme ma Jizọs jiri Alaeze Mesaya mezuo uche Chineke n’ụwa a?

22 Jizọs Kraịst ga-eji otu puku afọ ahụ ọ ga-achị ụwa mezuo ihe niile Chineke zubere maka ụwa a. Ya chịchaa otu puku afọ ahụ, ya enyeghachi Nna ya ọchịchị. (1 Kọr. 15: 25-28) Mmadụ niile ga-ezu oké mgbe ahụ. A ga-akpọpụtakwa Setan n’abis ka o lee ha ule ikpeazụ. Ya lechaa ha ule a, Kraịst ebibie agwọ ọjọọ ahụ bụ́ Setan na ndị niile na-akwado ya. (Jen. 3:15; Mkpu. 20:3, 7-10) Ma, o nwere ihe a ga-emere ndị niile kwụsiri ike n’ebe Jehova nọ. Ọ bụ naanị Baịbụl kwuru ihe a a ga-emere ha. Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụ nkwa Chineke kwere ndị niile na-erubere ya isi. O kwuru na ha ga-enweta “nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.”—Rom 8:21.

Chineke ga-eji Alaeze ya mezuo ihe o zubere maka ụwa na ụmụ mmadụ

23, 24. (a) Gịnị mere anyị ji kwere na Chineke ga-emezurịrị nkwa ọ bụla o kwere? (b) Olee ihe i kpebisiri ike na ị ga na-eme?

23 Nkwa niile a abụghị nkwa elu ọnụ. Jehova ga-emezu nkwa ọ bụla o kwere. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ì chetara ihe Jizọs kwuru anyị kọwara n’isi mbụ nke akwụkwọ a? Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-arịọ Jehova, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Mat. 6:9, 10) Alaeze Chineke adịghị ka ogbenye ọnụ ntụ nọ ná nrọ zụọ ụgbọelu. Ọ bụ ọchịchị dị adị. Ọ na-achị n’eluigwe ugbu a. Kemgbe otu narị afọ ugbu a, Jehova ejirila Alaeze ya a meere anyị ọtụtụ ihe ọma n’ọgbakọ Ndị Kraịst. N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na Alaeze Chineke chịwa ụwa niile, Jehova ga-emezu nkwa niile o kwere anyị.

24 O doro anyị anya na Alaeze Chineke ga-abịa. Anyị makwa na Jehova ga-emezu nkwa niile o kwere. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na ALAEZE CHINEKE AMALITELA ỊCHỊ! Ihe onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya ugbu a bụ, ‘Alaeze Chineke ọ̀ na-achị m?’ Ka anyị niile na-agbalịsi ike akpa àgwà otú Chineke chọrọ ka ndị Alaeze ya na-achị na-akpa. Anyị na-eme otú ahụ, anyị ga-eso ná ndị Alaeze a n’enweghị atụ ga-achị ruo mgbe ebighị ebi.

GỤKWUO GBASARA YA

Nwee Okwukwe Siri Ike n’Alaeze Chineke

Jehova ji ọgbụgba ndụ isii mee ka obi sie anyị ike na Alaeze ya ga-emezu nzube ya. Olee otú ọgbụgba ndụ ndị ahụ ga-esi mee ka okwukwe anyị sikwuo ike?