Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!

 ISI NKE 21

Chineke Ga-eji Alaeze Ya Bibie Ndị Iro Ya

Chineke Ga-eji Alaeze Ya Bibie Ndị Iro Ya

IHE ISIOKWU A NA-EKWU

Ihe ndị ga-eme tupu a lụọ agha Amagedọn

1, 2. (a) Olee ihe ndị na-egosi na Eze anyị na-achị kemgbe afọ 1914? (b) Olee ihe ndị anyị ga-eleba anya n’isiokwu a?

ANYỊ elebala anya n’ihe Chineke jirila Alaeze ya mee n’etiti ndị iro ya. Ihe ndị a anyị lebara anya emeela ka okwukwe anyị sikwuo ike. (Ọma 110:2) Eze anyị enweela ọtụtụ ndị ji obi ha wepụta onwe ha na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. O nyerela anyị aka ka anyị na-akụzi eziokwu dị na Baịbụl. O nyekwarala anyị aka ịna-akpa àgwà ọma. N’agbanyeghịkwa mbọ niile ndị iro Alaeze Chineke gbarala ka anyị ghara ịdị n’otu, anyị dị n’otu n’ụwa niile. Ihe ndị a na ọtụtụ ihe ndị ọzọ anyị lebarala anya Chineke ji Alaeze ya mee na-egosi n’eziokwu na kemgbe afọ 1914, Eze anyị na-achị n’etiti ndị iro Alaeze Chineke.

2 Ma, e nwere ihe ndị dị ịtụnanya Chineke ga-eji Alaeze ya mee n’oge na-adịghị anya. Alaeze ya ‘ga-abịa gwepịa ndị iro ya, ma mee ka ha ghara ịdịkwa.’ (Mat. 6:10; Dan. 2:44) Ma tupu oge ahụ eruo, e nwere ihe ndị ọzọ dị ịtụnanya ga-emenụ. Gịnị ka ha bụ? Ọtụtụ amụma ndị e buru na Baịbụl ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ a. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime amụma ndị ahụ ma mata ihe ndị ahụ ga-eme n’oge na-adịghị anya.

Ihe Ndị Ga-eme Tupu “Mbibi Mberede” Abịakwasị Ha

3. Olee ihe mbụ anyị na-atụ anya ya ga-emenụ?

3 Ịkpọsa udo. Mgbe Pọl onyeozi degaara ndị Tesalonaịka akwụkwọ, ọ gwara ha ihe mbụ anyị na-atụ anya ya ga-eme n’ụwa tupu ụbọchị Jehova eruo. (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:2, 3.) N’akwụkwọ ozi a, Pọl kwuru banyere “ụbọchị Jehova.” Ụbọchị Jehova a ga-amalite mgbe ndị ọchịchị ga-ebido ibibi “Babịlọn Ukwu ahụ.” (Mkpu. 17:5) Ma, tupu ụbọchị Jehova amalite, mba niile ga na-asị, “Udo na obi iru ala!” Ha nwere ike ikwu ihe a otu ugboro ma ọ bụkwanụ ya abụrụ ihe ha ga na-ekwu mgbe ọ bụla. Ndị isi chọọchị dị iche iche hà ga-eso na-ekwu okwu udo a? Ebe ọ bụ na ha bụ nke ụwa, ha nwere ike iso mba niile na-asị, “Udo dị!” (Jere. 6:14; 23:16, 17; Mkpu. 17:1, 2) Udo na obi iru ala a ha ga na-ekwu ga-egosi  na ụbọchị Jehova na-aga ịmalite. Ndị iro Alaeze Chineke “agaghịkwa agbanahụ ya ma ọlị.”

4. Otú a anyị ghọtarala ihe Pọl kwuru gbasara okwu udo na obi iru ala mba niile ga-ekwu, ò nwere uru ọ baara anyị?

4 Otú a anyị ghọtarala otú amụma a ga-esi emezu, ò nwere uru ọ baara anyị? Pọl kwuru, sị: ‘Unu anọghị n’ọchịchịrị, nke mere ụbọchị ahụ ga-eji bịakwasị unu na mberede dị ka chi ọbụbọ si abịakwasị ndị ohi.’ (1 Tesa. 5:3, 4) Ọtụtụ ndị taa amaghị ihe ihe ndị na-eme ugbu a na-egosi, ma, anyị ma. Olee otú mba niile ga-esi kwuo okwu udo na obi iru ala a Baịbụl sị na ha ga-ekwu? Anyị amaghị. N’ihi ya, “ka anyị mụrụ anya ma nwee uche ziri ezi.”—1 Tesa. 5:6; Zef. 3:8.

Otú Oké Mkpagbu Ukwu ahụ Ga-esi Malite

5. Olee otú “oké mkpagbu” ahụ ga-esi malite?

5 A ga-ebibi okpukpe ụgha. Ì chetara ihe ahụ Pọl gwara ndị Tesalonaịka? Ọ gwara ha, sị: “Mgbe ọ bụla ha na-asị: ‘Udo na obi iru ala!’ mgbe ahụ ka mbibi mberede ga-abịakwasị ha n’otu ntabi anya.” Otú ahụ ọ na-abụ àmụ̀mà gbuo, égbè eluigwe agbaa ozugbo, otú ahụkwa ka “mbibi mberede” ga-abịa ozugbo mba niile malitere ịsị, “Udo na obi iru ala!” Gịnị ka a ga-ebibi? Ihe mbụ a ga-ebibi bụ “Babịlọn Ukwu ahụ,” ya bụ, okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa. A na-akpọkwa Babịlọn Ukwu a “nwaanyị akwụna.” (Mkpu. 17:5, 6, 15) Mbibi a a ga-ebibi Krisendọm na okpukpe ụgha niile ga-abụ mmalite nke “oké mkpagbu.” (Mat. 24:21; 2 Tesa. 2:8) Ọ ga-eju ọtụtụ ndị anya ma ihe a mee. Maka gịnị? Maka na tupu e bibie nwaanyị akwụna a, ọ ka ga na-eme ka “eze nwaanyị,” na-asịkwa na ‘ọ dịghị mgbe ya ga-ahụ iru uju.’ Ma, ọ gaghị ete aka ya ejiri anya ya hụ ọnwụ ya. A ga-ebibi ya n’otu ntabi anya, nke na e nwere ike ịsị na e bibiri ya “n’otu ụbọchị.”—Mkpu. 18:7, 8.

6. Olee otú a ga-esi bibie “Babịlọn Ukwu ahụ”?

6 Olee otú a ga-esi bibie “Babịlọn Ukwu ahụ”? A ga-eji “anụ ọhịa” nwere “mpi iri” bibie ya. Akwụkwọ Mkpughe kwuru ihe gosiri na anụ ọhịa ahụ bụ Òtù Mba Ụwa. Mpi iri ahụ nọchiri anya ọchịchị niile e nwere ugbu a nke na-akwado “anụ ọhịa nke na-acha uhie uhie.” (Mkpu. 17:3, 5, 11, 12) Hà ga-ebibi Babịlọn Ukwu ahụ kpamkpam? Ee. Mba niile ndị so n’Òtù Mba Ụwa ga-ebukọrọ akụnụba nwaanyị akwụna a, bibie ya, ma “kpọọ ya ọkụ kpamkpam.”—Gụọ Mkpughe 17:16. *

7. Olee otú ihe Jizọs kwuru na Matiu 24:21, 22 si mezuo n’oge ndịozi? Oleekwa otú ọ ga-esi emezu n’oge anyị a?

7 A ga-eme ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpirikpi. Eze anyị bụ́ Jizọs kwuru ihe ga-eme n’oge oké mkpagbu ahụ. O kwuru, sị: “Ma n’ihi ndị a họọrọ, a ga-eme ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpirikpi.” (Gụọ Matiu 24:21, 22.) Oge mbụ ihe a Jizọs kwuru mezuru bụ n’afọ 66. N’oge ahụ, Jehova mere ka agha ndị agha Rom na-alụso Jeruselem “dị mkpirikpi.”  (Mak 13:20) Nke a mere ka a zọpụta Ndị Kraịst bi na Judia na Jeruselem. Oleezi otú a ga-esi emezu amụma a n’ụwa niile n’oge oké mkpagbu? Jehova ga-esi n’aka Eze anyị mee ka oge mbibi ahụ Òtù Mba Ụwa ga-ebibi okpukpe ụgha “dị mkpirikpi,” ka a ghara ibibi ezigbo Ndị Kraịst mgbe a na-ebibi okpukpe ụgha. Ọ bụ otú ahụ ka a ga-esi zọpụta ezigbo Ndị Kraịst, ma laa okpukpe ụgha n’iyi. (Ọma 96:5) Ugbu a, ka anyị leba anya n’ihe ndị ọzọ ga-emenụ mgbe e bibichara okpukpe ụgha n’oké mkpagbu ahụ.

Ihe Ndị Ga-eme Tupu Agha Amagedọn Amalite

8, 9. Olee ihe ndị dị egwu ga-eme n’ụwa Jizọs kwuru okwu ha? Oleekwa ihe ndị mmadụ ga-eme ma ha hụ ihe ndị ahụ?

8 Amụma Jizọs buru banyere oge ikpeazụ na-egosi na a ga-enwe ihe ụfọdụ gbara ọkpụrụkpụ ga-emenụ tupu agha Amagedọn amalite. Anyị ga-eleba anya n’abụọ ndị mbụ n’ime ha. E kwuru banyere ha n’akwụkwọ Matiu, Mak, na Luk.—Gụọ Matiu 24:29-31; Mak 13:23-27; Luk 21:25-28.

9 Ihe ndị dị egwu ga-eme n’eluigwe. Jizọs kwuru, sị: “Anyanwụ ga-agba ọchịchịrị, ọnwa agaghịkwa enye ìhè ya, kpakpando ga-esikwa n’eluigwe daa.” Ndị mmadụ weere ndị isi okpukpe taa ka ìhè ha ji ahụ ụzọ. Ma, e bibie okpukpe ụgha, o doro anya na ndị mmadụ agaghịzi na-abịakwute ndị isi okpukpe ka ha na-eduzi ha. Ma, e wezụga nke a, è nwere mgbe a ga-enwe ihe ndị dị egwu ga-eme n’eluigwe otú ahụ Jizọs kwuru? E nwekwara ike inwe. (Aịza. 13:9-11; Joel 2:1, 30, 31) Gịnị ka ndị mmadụ ga-eme mgbe ha hụrụ ka ihe a na-eme? Baịbụl kwuru na ha ga-anọ “ná nhụjuanya” n’ihi na ha ‘amaghị ihe ha ga-eme.’ (Luk 21:25; Zef. 1:17) N’eziokwu, ndị iro Alaeze Chineke, ma “ndị eze” ma “ndị ohu,” ‘ga-atụbọ n’ihi egwu nakwa n’ihi ihe ndị ha na-atụ anya ga-abịakwasị’ ụwa. Ha ga-achọkwa ebe ha ga-ezo onwe ha. Ma, o nweghị ebe ha ga-ezo ga-eme ka Eze anyị ghara ibibi ha.—Luk 21:26; 23:30; Mkpu. 6:15-17.

10. Olee ikpe Jizọs ga-ekpe? Gịnị ka ndị na-akwado Alaeze Chineke ga-eme? Gịnịkwa ka ndị iro ya ga-eme?

10 Ikpe ụwa ikpe. A ga-emezi ka ndị iro niile nke Alaeze Chineke hụ otu ihe ga-emenụ nke ga-agbawakwu ha obi. Jizọs kwuru, sị: “Ha ga-ahụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’ígwé ojii n’ike na ebube dị ukwuu.” (Mak 13:26) Ihe a ga-eme mgbe Jizọs bịara ikpe ikpe. N’amụma ahụ Jizọs buru banyere mgbe ikpeazụ, ọ kọwakwuru otú ọ ga-esi ekpe ikpe a. Ọ kọwara ihe a mgbe o ji ewu na atụrụ mee ihe atụ. (Gụọ Matiu 25:31-33, 46.) Ndị a ga-akpọ “atụrụ” bụ ndị ji obi ha niile na-akwado Alaeze Chineke. Ha ‘ga-eweli isi ha elu,’ n’ihi na ha ma na ‘nnapụta ha erula nso.’ (Luk 21:28) Ma, ndị a ga-akpọ “ewu” bụ ndị niile na-emegide Alaeze Chineke. Ha “ga-eti aka n’obi, kwaa ákwá arịrị,” n’ihi na ha  ma na ha “ga-anwụ ọnwụ ebighị ebi.”—Mat. 24:30; Mkpu. 1:7.

11. Olee ihe anyị kwesịrị iburu n’obi ka anyị na-eleba anya n’ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu?

11 Jizọs kpechaa “mba niile” ikpe, a ka ga-enwe ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ ga-emenụ tupu agha Amagedọn amalite. (Mat. 25:32) Anyị ga-eleba anya n’abụọ n’ime ha. Nke mbụ bụ gbasara ọgụ Gọg ga-alụso ndị Chineke. Nke abụọ abụrụ ịchịkọta ndị e tere mmanụ. Ka anyị na-eleba anya n’ihe abụọ a ga-emenụ, anyị kwesịrị iburu n’obi na o nweghị ebe Okwu Chineke kwuru oge nke ọ bụla n’ime ha ga-eme. Nke bụ́ eziokwu bụ na o nwere ike mgbe otu nọ na-eme nke ọzọ ebido.

12. Olee ihe Setan ga-achọ ime ndị na-akwado Alaeze Chineke?

12 Ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ. Gọg nke Megọg ga-alụso ndị e tere mmanụ fọrọ n’ụwa ọgụ, lụsokwa ndị enyi ha bụ́ atụrụ ọzọ ọgụ. (Gụọ Ezikiel 38:2, 11.) Kemgbe Alaeze Chineke malitere ịchị n’eluigwe, a chụpụkwa Setan, Setan nọ na-alụso ndị e tere mmanụ fọrọ n’ụwa ọgụ. Ma, ọgụ nke ugbu a bụ nke ikpeazụ Setan ga-alụso ndị Chineke n’ụwa a. (Mkpu. 12:7-9, 17) Kemgbe a malitere ịchịkọta ndị e tere mmanụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge anyị a, Setan a gbaala mbọ ime ka ha na Chineke ghara ịdị ná mma. Ma mbọ niile ọ gbarala kụrụ afọ n’ala. (Mat. 13:30) Ma, e bibichaa okpukpe ụgha niile, ndị Chineke ga-eyi ndị ‘bi n’ebe na-enweghị mgbidi, ndị na-enweghịdị ihe ntụchi ụzọ na ibo ụzọ.’ Setan ga-eji ohere ahụ chọọ imemila ndị Chineke. Ọ ga-eme ka ndị agha ya obi tara mmiri gaa ịlụso ndị a na-akwado Alaeze Chineke ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ.

13. Gịnị ka Jehova ga-emere ndị ya?

13 Ezikiel kwuru ihe ga-eme n’oge ahụ. O buru amụma banyere Gọg, sị: ‘Ị ga-esi n’ala gị bịa, site n’ime ime ebe ugwu, gị na ọtụtụ ndị so gị. Ha niile na-agba ịnyịnya. Ha bụ ìgwè mmadụ, ee, ọtụtụ ndị agha. Ị ga-abịakwa ibuso ndị m agha, ka i kpuchie ala ha dị ka ígwé ojii.’ (Ezik. 38:15, 16) Olee ihe Jehova ga-eme n’ọgụ a Gọg ga-alụso ndị ya, nke yiri ka o nweghị onye ga-akwụsịli ya? Jehova kwuru ihe ọ ga-eme. Ọ sịrị: “Ọnụma m ga-adị ọkụ nke ukwuu.” O kwukwara, sị: “M ga-emekwa ka mma agha bịakwasị ya.” (Ezik. 38:18, 21; gụọ Zekaraya 2:8.) Jehova ga-alụchitere ndị ya nọ n’ụwa ọgụ. Ọ bụ mgbe ahụ ka agha Amagedọn ga-ada.

14, 15. Gịnị ga-eme n’agbata oge Setan ga-amalite ịlụso ndị Jehova ọgụ na oge Jehova ga-alụchitere ndị ya ọgụ?

14 Tupu anyị ekwuwe banyere otú Jehova ga-esi lụchitere ndị ya ọgụ n’agha Amagedọn, ka anyị burugodị ụzọ leba anya n’otu ihe ọzọ gbara ọkpụrụkpụ ga-eme n’ụwa. Ihe a ga-eme n’agbata oge ahụ Setan ga-alụso ndị Jehova ọgụ na mgbe ahụ Jehova ga-alụchitere ndị ya ọgụ n’agha Amagedọn. Cheta na anyị kwuru na paragraf nke iri na otu na ihe nke abụọ n’ime ihe ndị ahụ gbara ọkpụrụkpụ ga-emenụ bụ ịchịkọta ndị e tere mmanụ fọrọ n’ụwa.

 15 Ịchịkọta ndị e tere mmanụ. Ma Matiu ma Mak dechara ihe Jizọs kwuru gbasara “ndị a họọrọ.” Ndị a a họọrọ bụ ndị Kraịst e tere mmanụ. Ihe Jizọs kwuru gosiri na ịhọrọ ndị a e tere mmanụ ga-eso n’ihe ndị ga-emenụ tupu agha Amagedọn amalite. (A kọwara ya na paragraf nke 7.) Jizọs kwuru ihe ọ ga-eme mgbe ọ ga-aghọ Eze. Ọ sịrị: “Mgbe ahụ, ọ ga-ezipụ ndị mmụọ ozi, ha ga-esikwa n’akụkụ anọ nke ụwa chịkọta ndị ọ họọrọ, site na nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ eluigwe.” (Mak 13:27; Mat. 24:31) Ole ndị ka Jizọs kwuru okwu ha ebe a na ya ga-achịkọta? Ihe ọ na-ekwu okwu ya abụghị akara ikpeazụ a ga-aka Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ nke ga-eme tupu oké mkpagbu amalite. (Mkpu. 7:1-3) Kama, ihe Jizọs na-ekwu bụ ihe ga-eme n’oge oké mkpagbu. N’ihi ya, o doro anya na obere oge Setan malitechara ịlụso ndị Chineke ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ, a ga-achịkọta ndị e tere mmanụ fọrọ n’ụwa, ha agaa eluigwe.

16. Olee ihe ndị e tere mmanụ e si n’ọnwụ kpọlite ga-eme ma a lụwa agha Amagedọn?

16 Olee otú ịchịkọta ndị e tere mmanụ si gbasa agha Amagedọn? Oge a a ga-achịkọta ndị e tere mmanụ fọrọ n’ụwa gosiri na ha niile ga-aga eluigwe tupu agha Amagedọn amalite. Mgbe otu narị puku na iri puku anọ na puku anọ ha na Kraịst ga-eso achị gachara eluigwe, ha ga-anata ikike iso Jizọs jiri “mkpanaka ígwè” bibie ndị iro niile nke Alaeze Chineke. (Mkpu. 2:26, 27) Ha natachaa ikike a, ha na ndị mmụọ ozi ga-eso Kraịst, bụ́ Onye Agha na Eze anyị, lụso “ọtụtụ ndị agha” ọgụ. Ndị a ha ga-alụso ọgụ bụ ndị iro chọrọ iji ndị Jehova mere anụ oriri. (Ezik. 38:15) Ha bidohaala agha a, ọ bụ ya bụ na Amagedọn ebidola.—Mkpu. 16:16.

Otú Oké Mkpagbu ahụ Ga-esi Ebi

Ihe a bụ agha Amagedọn

17. Gịnị ga-eme ndị ahụ Jizọs kpọrọ “ewu” n’agha Amagedọn?

17 Ibibi ndị ajọ omume. Oké mkpagbu ahụ ga-ebi n’agha Amagedọn. N’oge ahụ, Jizọs ga-arụ ọrụ ọzọ Chineke nyere ya. Ya kpechaa “mba niile” ikpe, ya egbuo ndị niile ọ kpọrọ “ewu.” (Mat. 25:32, 33) Eze anyị a ga-eji ‘ogologo mma agha dị nkọ gbuo mba niile.’ Ndị niile a yiri ewu, ma “ndị eze” ma “ndị ohu,” “ga-anwụ ọnwụ ebighị ebi.”—Mkpu. 19:15, 18; Mat. 25:46.

18. (a) Olee otú egwú ga-esi dagharịara ndị ahụ Jizọs kpọrọ “atụrụ”? (b) Olee ihe Jizọs ga-eme mgbe o merichara ndị niile na-emegide Alaeze Chineke?

18 Otú a ka egwú ga-esi dagharịa. Ndị iro nke ndị ahụ Jizọs kpọrọ “atụrụ,” ya bụ, “oké ìgwè mmadụ” agazighị enwe ike ibibi ndị a ha chere na ha bụ anụ oriri. Oké ìgwè mmadụ a ga-esi “n’oké mkpagbu ahụ pụta.” (Mkpu. 7:9, 14) Mgbe Jizọs merichara ndị niile na-emegide Alaeze Chineke, ọ ga-atụba Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’abis. Ha ga-anọ ebe ahụ ka ndị nwụrụ anwụ n’enweghị ike ime ihe ọ bụla ruo otu puku afọ.—Gụọ Mkpughe 6:2; 20:1-3.

 Otú Anyị Ga-esi Ejikere Maka Ihe Ndị A Na-aga Ime

19, 20. Olee otú anyị nwere ike isi mee ihe e kwuru n’Aịzaya 26:20, nakwa n’Aịzaya 30:21?

19 Olee otú anyị ga-esi jikere maka ihe ndị ahụ dị egwu ga-eme n’ụwa a? Ihe e kwuru n’Ụlọ Nche n’oge gara aga ga-enyere anyị aka ịmata otú anyị ga-esi ejikere. E kwuru, sị: “Nlanarị ga-adabere ná nrubeisi.” Maka gịnị? Ihe Jehova gwara ndị Izrel a dọọrọ n’agha gaa Babịlọn n’oge ochie ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ a. Jehova kwuru na a ga-emeri Babịlọn. Ma, olee otú ndị Chineke bi na ya ga-esi ejikere maka mbibi a? Jehova kwuru, sị: “Ndị m, gaanụ banye n’ọnụ ụlọ unu dị n’ime, mechiekwanụ ọnụ ụzọ mgbe unu banyesịrị. Zoonụ ruo nwa mgbe nta, ruo mgbe oké iwe gafere.” (Aịza. 26:20) Ị̀ hụrụ ihe a chọrọ ka ụmụ Izrel mee? A gwara ha ‘gaa’ n’ụlọ ha dị n’ime, gwakwa ha “banye” na ya. A gwakwara ha ‘mechie’ ọnụ ụzọ ha, nakwa ka ha ‘zoo’ onwe ha. Ihe a niile bụ iwu e nyere ha enye. Ndị Juu niile mere ihe a a gwara ha apụtaghị n’èzí mgbe a na-emeri Babịlọn. N’ihi ya, ihe mere ha ji dịrị ndụ bụ n’ihi na ha mere ihe ndị ahụ Jehova gwara ha mee. *

20 Olee ihe anyị na-amụta n’ihe a merenụ? Ihe anyị na-amụta bụ na ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị ndụ mgbe Jehova ga-ebibi ụwa ọjọọ a, anyị ga-eme ihe niile ọ gwara anyị mee otú ahụ ndị Izrel mere. (Aịza. 30:21) Jehova na-esi n’ọgbakọ ya agwa anyị ihe ndị ahụ ọ chọrọ ka anyị mee. N’ihi ya, anyị kwesịrị iji obi anyị dum na-eme ihe niile a gwara anyị n’ọgbakọ. (1 Jọn 5:3) Ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ taa, ọ ga-adịrị anyị mfe iji obi anyị niile na-eme ihe ndị a ga-agwa anyị n’ọdinihu. Nna anyị bụ́ Jehova, na Eze anyị bụ́ Jizọs, ga-echebekwa anyị. (Zef. 2:3) Ha chebe anyị, anyị ga-eji anya anyị hụ otú Alaeze Chineke ga-esi ebibi ndị iro ya kpamkpam. Anyị agaghị echefu ihe a Jehova ga-emere anyị echefu.

^ para. 6 E nwere ike ikwu na mbibi a a ga-ebibi “Babịlọn Ukwu ahụ” bụ karịchaa, ime ka òtù okpukpe ụgha niile ghara ịdị ọzọ, ọ bụghị na a ga-egbu ndị niile na-ekpe okpukpe ụgha otu mgbe. N’ihi ya, a gaghị egbu ọtụtụ n’ime ha. N’oge ahụ, ha nwere ike ịna-eme ka ndị na-enweghị ihe jikọrọ ha na okpukpe ụgha ndị ahụ, otú ahụ e kwuru na Zekaraya 13:4-6.

^ para. 19 Ị chọọ ịmatakwu banyere akụkọ a, gụọ akwụkwọ anyị a na-akpọ Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ, Mpịakọta nke I, peeji nke 282 na nke 283.

GỤKWUO GBASARA YA

Nọsie Ike na Ndagwurugwu Jehova Ji Echebe Anyị

Gịnị bụ ndagwurugwu Jehova ji echebe anyị? Oleekwa otú e nwere ike isi chebe ndị ohu Jehova n’ebe ahụ?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ—Mee 2015

Ònye bụ Gọg nke Megọg e kwuru okwu ya n’akwụkwọ Ezikiel?

Ole Ndị Taa Bụ Ndị Ọzụzụ Atụrụ Asaa na Ndị Isi Asatọ?

Olee otú Hezekaya, Aịzaya, Maịka, na ndị isi Jeruselem si gosi na ha bụ ezigbo ndị ọzụzụ atụrụ? Ole ndị taa bụ ndị ọzụzụ atụrụ asaa na ndị isi asatọ?