Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!

 ISI NKE 14

Iji Obi Anyị Niile Na-akwado Naanị Ọchịchị Chineke

Iji Obi Anyị Niile Na-akwado Naanị Ọchịchị Chineke

IHE ISIOKWU A NA-EKWU

Ndị Chineke abụghị nke ụwa n’ihi na ha ji obi ha niile na-akwado Alaeze Chineke

1, 2. (a) Olee ihe Jizọs kwuru na-eduzi ezigbo ndị na-eso ụzọ ya kemgbe ụwa? (b) Olee mbọ ndị iro anyị gbara ka ha memilaa anyị? Mbọ niile ha gbara ò nwere isi?

E NWERE otu ihe Jizọs kwuru mgbe Paịlet na-ekpe ya ikpe. Paịlet bụ ọkàikpe kachanụ e nwere n’obodo ndị Juu n’oge ahụ. Ihe ahụ Jizọs kwuru na-eduzi ezigbo ndị na-eso ụzọ ya kemgbe ụwa. Jizọs kwuru, sị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a. A sị na alaeze m bụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara alụ ọgụ ka a ghara inyefe m n’aka ndị Juu. Otú ọ dị, alaeze m esighị n’ebe a.” (Jọn 18:36) Paịlet nyefere Jizọs n’aka ndị Juu, ha egbuo ya. Ma, Jehova mechara kpọlite Jizọs n’ọnwụ. Ndị eze chịrị Alaeze Ukwu Rom gbalịrị ka ha memilaa ndị na-eso ụzọ Jizọs, ma ihe niile ha mere kụrụ afọ n’ala. Ndị Kraịst gbara mbọ zie ozi ọma ebe niile n’ụwa n’oge ahụ.—Kọl. 1:23.

2 Mgbe Alaeze Chineke malitere ịchị n’eluigwe n’afọ 1914, ụfọdụ mba ndị kacha ike n’ụwa gbara mbọ ka ha kpochapụ ndị Chineke. Ma, mbọ niile ha gbara enweghị isi. Ọtụtụ gọọmenti ha na ibe ha na-ese okwu, nakwa òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche nwara ka ha manye anyị ịkwado ha n’okwu ha na-ese. Ihe niile ha nwara ime kụrụ afọ n’ala. Ndị niile na-akwado Alaeze Chineke bi ná mba dị iche iche taa. N’agbanyeghị ebe anyị bi n’ụwa a, anyị hụrụ ibe anyị n’anya ma dịrị n’otu. Aka anyị adịghịkwa n’ihe ọ bụla gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Otú a anyị si dịrị n’otu na-egosi na Alaeze Chineke amalitela ịchị, nakwa na Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst na-eduzi anyị, na-echebe anyị ma na-eme ka anyị na-adị ọcha n’ụzọ niile. Ugbu a, ka anyị leba anya n’otú o si na-eme ihe ndị a. Anyị ga-elebakwa anya n’ikpe ndị o mere ka anyị merie na ha n’ihi na anyị na-agba mbọ ka ‘anyị ghara ịbụ nke ụwa.’ Ikpe ndị a ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike.—Jọn 17:14.

Okwu E Mechara Mee Ka O Dokwuo Anya

3, 4. (a) Olee ihe ndị mere mgbe Alaeze Chineke malitere ịchị n’eluigwe? (b) Ndị Chineke hà ma ihe niile ha ga-eme n’okwu gbasara ịga agha? Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

3 Agha dara n’eluigwe mgbe Alaeze Chineke malitere ịchị. Ọ bụ n’agha a ka a chụdara Setan n’ụwa. (Gụọ Mkpughe 12:7-10, 12.) Agha dakwara n’ụwa. Agha a mere ka a mara ma ndị Chineke hà ji obi ha niile na-erubere Chineke isi. Ha kpebisiri ike na ha agaghị abụ nke ụwa otú ahụ Jizọs na-abụghị nke ụwa. Ma ná mmalite, ha aghọtachaghị ihe niile ha kwesịrị ime ka ha ghara ịbụ nke ụwa.

 4 Dị ka ihe atụ, akwụkwọ anyị a na-akpọ Millennial Dawn, * Nke Isii, e bipụtara n’afọ 1904, gwara Ndị Kraịst ka ha ghara ịga agha. Ma, akwụkwọ ahụ kwuru na ọ bụrụ na e jide Onye Kraịst ka ọ gaa agha, o kwesịrị ikwu ka e nye ya ọrụ ọzọ kama ịga agha. Ma, ọ bụrụ na ndị isi ajụ ma ziga ya n’ọgbọ agha, ọ ga-agbalịsi ike hụ na o gbughị mmadụ ọ bụla. E nwere otu nwanna aha ya bụ Herbert Senior kwuru otú ihe si kwụrụ n’oge ahụ. Nwanna a bi na Briten mgbe ahụ, e mekwara ya baptizim n’afọ 1905. Ọ sịrị: “Ụmụnna anyị amaghị ihe ha ga-eme eme n’oge ahụ. Ha amaghị ma ọ̀ dị mma ịbanye amị ma na-arụrụ ha ọrụ n’enweghị ihe jikọrọ ya na ịga agha.”

5. Olee otú Ụlọ Nche Bekee nke September 1, 1915, si mee ka ụmụnna anyị ghọtakwuo ihe ha ga-eme n’okwu gbasara ịga agha?

5 Ma, ihe e kwuru n’Ụlọ Nche Bekee nke September 1, 1915, mere ka ụmụnna ghọtakwuo ihe ha ga-eme. Ụlọ Nche a kọwakwuru ihe ahụ e kwuru n’akwụkwọ anyị ahụ bụ́ Studies in the Scriptures. Ọ sịrị: “Ànyị nwere ike ikwu n’eziokwu na mmadụ banye amị ma na-arụ naanị ọrụ ndị ọzọ na-agbasaghị ịga agha, na onye ahụ ka bụ ezigbo Onye Kraịst?” Ma, olee ihe Onye Kraịst ga-eme ma a gwa ya na a ga-agbagbu ya ma ọ jụ ịbanye amị? Ụlọ Nche ahụ kwuru, sị: “Ọ́ gaghị aka mma na a gbagburu mmadụ n’ihi na ọ na-erubere Onyeisi Udo isi karịa na a gbagburu onye ahụ ebe ọ na-eme ihe ga-adị ndị ọchịchị ụwa mma ma nupụrụ Eze anyị nọ n’eluigwe isi? Ọ ga-akara anyị mma ịnwụ maka na anyị na-erubere Eze anyị nọ n’eluigwe isi.” Ma Ụlọ Nche ahụ kwukwara, sị: “Anyị anaghị asị ka mmadụ kwere ka a gbagbuo ya. Naanị ihe anyị mere bụ ịtụ aro.”

6. Gịnị ka ị mụtara n’ihe Nwanna Herbert Senior mere?

6 Ụfọdụ ụmụnna ghọtara na ha ekwesịghị ịbanye amị, ha jikekwaara maka ihe ọ bụla a ga-eme ha ma ha jụ ịbanye. Nwanna Herbert Senior, kwukwara, sị: “Ahụghị m ihe ọ bụla dị iche na mmadụ isi n’ụgbọ mmiri na-ebutusị mgbọ égbè [ya bụ, ọrụ na-abụghị ịga agha] na itinye mgbọ égbè ndị ahụ n’égbè ka e jiri ha gbagbuo mmadụ.” (Luk 16:10) E mechara tụọ Nwanna Senior mkpọrọ n’ihi na o kwuru na akọnuche ya ekweghị ya banye amị. Ya na ụmụnna anọ ndị ọzọ so ná mmadụ iri na isii a tụrụ mkpọrọ n’ihi na ha sị na akọnuche ha ekweghị ha banye amị. Ụfọdụ n’ime mmadụ iri na isii a na-ekpe okpukpe ọzọ. Ha niile nọtụrụ n’ụlọ mkpọrọ dị n’obodo a na-akpọ Richmọnd. E nwere mgbe o ruru, e zoro ezoro buru Nwanna Senior na ndị ọzọ a tụrụ ha na ya mkpọrọ gaa n’ọgbọ agha na Frans. A nọ ebe ahụ ma ha ikpe ọnwụ. Ha kwụ n’ahịrị mgbe a chọrọ ịgbagbu ha, ma e mechara hapụ ịgbagbu ha. Ihe e meziri bụ ịtụ ha mkpọrọ afọ iri.

“Isiokwu ahụ nyeere m aka ịghọta na ndị Chineke kwesịrị ịgbalị ka ha na mmadụ niile dịrị n’udo, ma à na-alụ agha ma ọ bụ na a naghị alụ agha.”—Simon Kraker (Ihe a ka nwanna a kwuru na paragraf nke 7)

7. Tupu Agha Ụwa nke Abụọ amalite, olee ihe ndị Chineke ghọtakwuru n’okwu gbasara ịga agha?

7 Tupu Agha Ụwa nke Abụọ e biri ọkụ, o dokwuola ndị Jehova niile anya na ha ekwesịghị ịbanye amị, ha aghọtakwala ihe ha kwesịrị ime ka ha ghara ịbụ nke ụwa otú Jizọs na-abụghị. (Mat. 26:51-53; Jọn 17:14-16; 1 Pita 2:21) Dị ka ihe atụ, e nwere otu isiokwu dị mkpa gbara n’Ụlọ Nche Bekee nke November 1, 1939. Isiokwu ahụ bụ “Nnọpụiche.” E kwuru n’isiokwu ahụ, sị: “Ndị ha na Jehova gbara ndụ ga-ahụrịrị na o nweghị otú aka ha si dịrị n’agha mba na mba na-alụ.” Otu nwanna aha ya bụ Simon Kraker kwuru okwu banyere isiokwu ahụ gbara n’Ụlọ Nche. Nwanna a  mechara jewe ozi n’isi ụlọ ọrụ anyị dị na Bruklin, nke dị na Niu Yọk. Ọ sịrị: “Isiokwu ahụ nyeere m aka ịghọta na ndị Chineke kwesịrị ịgbalị ka ha na mmadụ niile dịrị n’udo, ma à na-alụ agha ma ọ bụ na a naghị alụ agha.” Oge ahụ isiokwu a pụtara dabara adaba. O nyeere ndị Chineke n’oge ahụ aka ka ha jikere ejikere maka nsogbu ndị tara akpụ a ga-enye ha n’ihi na ha ji obi ha niile na-akwado Alaeze Chineke.

Mgbe Ndị Iro Chọrọ Ikpochapụ Anyị

8, 9. Olee otú e si mezuo amụma ahụ Jọn onyeozi buru?

8 Jọn onyeozi buru amụma na Alaeze Chineke malite ịchị n’eluigwe n’afọ 1914, Setan bụ́ Ekwensu, onye a kpọrọ dragọn, ga-agbọpụta mmiri yiri osimiri n’ọnụ ya ka osimiri ahụ kpochapụ ndị niile na-akwado Alaeze Chineke. * (Gụọ Mkpughe 12:9, 15.) Olee otú amụma a si mezuo? Site n’afọ 1921 gawa, a malitere ịkpagbu ndị Chineke aghara aghara. A tụrụ Nwanna Kraker mkpọrọ n’ihi na o ji obi ya niile na-akwado Alaeze Chineke. A tụkwara ọtụtụ ụmụnna anyị nọ n’Amerịka, Kanada na Meksiko mkpọrọ n’oge ahụ a na-alụ agha ụwa nke abụọ. N’oge agha ahụ, a tụrụ ọtụtụ ndị mkpọrọ n’ụlọ mkpọrọ dị iche iche nke gọọmenti Amerịka n’ihi na akọnuche ha ekweghị ha gaa agha. A bịa ná ndị a niile a tụrụ mkpọrọ, ihe dị ka mmadụ abụọ n’ime mmadụ atọ ọ bụla bụ Ndịàmà Jehova.

 9 Ekwensu na ndị òtù ya fooro ntutu taa na ha ga-eme ka ndị ji obi ha niile na-akwado Alaeze Chineke kwụsị ịna-akwado ya n’agbanyeghị ebe ọ bụla ha bi n’ụwa a. A malitere ịkpụpụ ndị Chineke n’ụlọikpe ndị dị ma n’Afrịka ma na Yurop ma n’Amerịka. Ma, ndị Chineke kpebisiri ike na mee elu mee ala, ha agaghị aga agha. Ọ bụ ya mere e ji tụọ ụfọdụ mkpọrọ, kwarụọ ụfọdụ ndị, ma kụọ ụfọdụ isi aba okpu. Na Jamanị, e mekpọrọ ndị Chineke ọnụ n’ihi na ha ekweghị eto Hitler ma ọ bụ kwado agha a na-alụ. A tụrụ ihe dị ka puku Ndịàmà Jehova isii mkpọrọ n’oge Hitler na-achị. Ihe karịkwara otu puku Ndịàmà Jehova na narị isii nwụrụ n’ebe a na-emekpọ ha ọnụ. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị Jamanị. N’agbanyeghị ihe a niile Ekwensu mere ndị Chineke, o nwebeghị ike ikpochapụ ha.—Mak 8:34, 35.

“Ala” Meghere Ọnụ Ya “Loo Osimiri Ahụ”

10. Olee ihe “ụwa” Baịbụl kwuru okwu ya nọchiri anya ya? Oleekwa otú o sirila gbatara ndị Chineke ọsọ enyemaka?

10 Amụma ahụ Jọn onyeozi dere na Baịbụl kwuru na “ala” ga-emeghe ọnụ ya loo “osimiri ahụ” Ekwensu gbọpụtara. “Ala” ahụ pụtara ndị nọ n’isi ma ọ bụ ndị ọnụ na-eru n’okwu, bụ́ ndị mmegbu na-agbakasị ahụ́. Gịnị ka ala ilo osimiri pụtara? Ọ pụtara ọsọ enyemaka ndị a mmegbu na-agbakasị ahụ́ gbataara ndị Chineke mgbe a na-akpagbu ha. Olee otú amụma a sirila mezuo? Ọtụtụ afọ a lụchara Agha Ụwa nke Abụọ, ndị nọchiri anya “ala” agbatarala ndị ji obi ha niile na-akwado Alaeze Mesaya ahụ ọsọ enyemaka. (Gụọ Mkpughe 12:16.) Dị ka ihe atụ, Ụlọikpe dị iche iche a na-anụ aha ha ekpelaarala Ndịàmà Jehova ikpe ma ha jụ ịga agha ma ọ bụ jụ ime ihe ndị e ji eto mba. Ugbu a, ka anyị leba anya n’ikpe ụfọdụ Jehova mere ka ndị ya merie mgbe ha jụrụ ịrụ ọrụ amị.—Ọma 68:20.

11, 12. Olee nsogbu bịaara Nwanna Sicurella na Nwanna Thlimmenos? Oleekwa ihe mechara mee?

11 Amerịka. E nwere otu nwanna a kpụpụrụ n’ụlọikpe n’ihi na akọnuche ya ekweghị ya ịbụ onye amị. Aha ya bụ Anthony Sicurella. Nne na nna ya bụ Ndịàmà Jehova. E mere ya baptizim mgbe ọ dị afọ iri na ise. Mgbe ọ gbara afọ iri abụọ na otu, ọ gara n’ụlọ ọrụ gọọmenti nke na-akpọ ndị mmadụ ịbanye amị, ha edenye aha ya n’ebe a na-edenye aha ndị sị na ha bụ ndị ozi Chineke. Mgbe ihe dị ka afọ abụọ gachara, ya bụ, n’afọ 1950, o kwuru ka e denye aha ya n’ebe a na-edeba aha ndị akọnuche ha na-ekweghị ha ịga agha. Ụlọ Ọrụ Etiti nke Na-eme Nchọpụta Maka Mpụ lebachara okwu ya anya ma kweta ka e deba aha ya, ma Ngalaba Okwu Ikpe dị n’aka jụrụ ajụ. N’ihi ya, a kpụpụrụ nwanna a n’ụlọikpe, ụlọikpe emechaakwa ma ya ikpe. Ma, e wepụrụ okwu a n’Ụlọikpe Kasị Elu n’Amerịka. Mgbe ha lebachara okwu a anya, ha kagburu ihe ụlọikpe mbụ kpere, ma kpelaara Nwanna Sicurella ikpe. Ihe a e kpebiri meziri ka a na-ahapụ nwa amaala Amerịka ọ bụla akọnuche ya na-ekweghị ya banye amị.

12 Gris. N’afọ 1983, a mara Nwanna Iakovos Thlimmenos ikpe ma tụọ ya mkpọrọ n’ihi na ọ jụrụ ịbanye amị. Mgbe o si na mkpọrọ pụta, ọ gara n’otu ụlọ ọrụ ka e wee ya n’ọrụ ka ya bụrụ onye mpịazi ego. Ma, ụlọ ọrụ ahụ jụrụ iwe ya n’ọrụ n’ihi na ha sị  na aha ya dị n’ebe e debara aha ndị omekome. Ọ gbara akwụkwọ n’ụlọikpe dị iche iche dị na Gris, ma ha machara ya ikpe. O wepụziri okwu a n’Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop. N’afọ 2000, Òtù Ikpe Kacha Elu nke Ụlọikpe Yurop a kpelaara nwanna a ikpe. E nwere ndị ọkàikpe iri na asaa so n’Òtù Ikpe Kacha Elu nke Ụlọikpe a. Ikpe a ka a na-agbakwasị ụkwụ na ya na-ekpebi ikpe ndị ọzọ dị ka nke a. Tupu ụlọikpe ahụ ekpebie okwu ahụ, e nwere ụmụnna nwoke karịrị puku atọ na narị ise na Gris aha ha dị n’akwụkwọ ebe e debara aha ndị omekome. Ihe mere e ji deba aha ha ebe ahụ bụ na akọnuche ha ekweghị ha ịbanye amị. Mgbe Òtù Ikpe Kacha Elu nke Ụlọikpe Yurop kpechara ikpe Nwanna Thlimmenos, gọọmenti Gris tiri iwu mere ka e wepụ aha ụmụnna ndị ahụ n’ebe ha dere aha ndị omekome. E nwekwara iwu ọzọ ha tiri afọ ole na ole tupu Òtù Ikpe Kacha Elu nke Ụlọikpe Yurop ekpee ikpe Nwanna Thlimmenos. Iwu a kwuru na nwa amaala Gris ọ bụla akọnuche ya na-ekweghị ya ịbanye amị nwere ike ịrụ ọrụ ọzọ na-abụghị ọrụ amị. E mesiri iwu a ike mgbe gọọmenti degharịrị iwu obodo Gris.

“Tupu mụ abanye n’ụlọikpe, arịọrọ m Jehova ka o nyere m aka. Ozugbo m rịọchara ya ihe a, obi ruru m ala.”—Ivailo Stefanov (Ihe a ka nwanna a kwuru na paragraf nke 13)

13, 14. Olee ihe ị mụtara n’ikpe e kpere Ivailo Stefanov na Vahan Bayatyan?

13 Bọlgeria. N’afọ 1994, gọọmenti debara aha Nwanna Ivailo Stefano n’akwụkwọ a na-edeba aha ndị a chọrọ ịzụ n’amị. Nwanna a dị afọ iri na itoolu mgbe ahụ. Nwanna a jụrụ ịbanye amị, jụkwa ịrụ ọrụ ọ bụla ọzọ gbasara ndị amị. N’ihi ya, a kpụpụrụ ya n’ụlọikpe ma mechaa tụọ ya mkpọrọ otu afọ na ọnwa isii. Ma, ọ gbara akwụkwọ n’ụlọikpe ọzọ ka ha lebagharịa okwu a anya. Ihe mere o ji gbaa akwụkwọ a bụ na iwu kwuru na nwa amaala obodo a nwere ike ịjụ ịbanye amị ma ọ bụrụ na akọnuche ya ekweghị ya. E mechara wepụrụ Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop okwu ahụ. N’afọ 2001, tupu Ụlọikpe a etinye okwu a ọnụ, Nwanna Stefanov na gọọmenti obodo ha ekpeziela. Gọọmenti Bọlgeria kwetara ka Nwanna Stefanov rụwa ọrụ ọzọ na-agbasaghị ndị amị. Ha kwukwara na nwa amaala ya ọ bụla akọnuche ya na-ekweghị ya ịbanye amị rụwa ọrụ ọzọ na-agbasaghị ndị amị. *

14 Aminia. N’afọ 2001, gọọmenti kpọrọ otu nwanna aha ya bụ Vahan Bayatyan ka ọ bịa banye amị n’ihi na o ruola afọ ndụ ọ na-abụ mmadụ ruo, e deba aha ya na ndị ga-abanye amị. * Ma, nwanna a sịrị na akọnuche ya agaghị ekwe ya banye amị. N’ihi ya, e wepụrụ okwu a n’ụlọikpe ụfọdụ n’Aminia, ha niile ama ya ikpe. Na Septemba afọ 2002, a tụrụ Nwanna Bayatyan mkpọrọ afọ abụọ na ọnwa isii. Ma, a hapụrụ ya mgbe ọ nọchara ọnwa iri na izu abụọ. Mgbe a hapụrụ ya, ọ gbara akwụkwọ n’Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop ka ha leba okwu a anya. Ma, n’abalị iri abụọ na asaa n’ọnwa Ọktoba afọ 2009, Ụlọikpe a lebara okwu ahụ anya, makwa ya ikpe. Ihe a Ụlọikpe a kpebiri mere ka o yie ka ọ dịghị ebe ụmụnna anyị ndị ụdị okwu a gbasara n’Aminia ji azụ aga. Ma, Òtù Ikpe Kacha Elu n’Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop lebagharịrị okwu ahụ anya. N’abalị asaa n’ọnwa Julaị, afọ 2011, ha kpelaara  Vahan Bayatyan ikpe. Nke a bụ nke mbụ Ụlọikpe a na-ekweta na mmadụ nwere ike ịjụ ịbanye amị ma ọ bụrụ na akọnuche ya ekweghị ya n’ihi ihe ndị o kweere. A gbakwasịrị ụkwụ n’otu ihe iwu kwuru kpebie ihe a. Iwu ahụ kwuru na onye ọ bụla nwere ike iche ihe ọ chọrọ iche, nwee ike ime ihe akọnuche ya gwara ya, nweekwa ike ikpe okpukpe ọ bụla masịrị ya. Ihe a e kpebiri emeela ka ma Ndịàmà Jehova ma ọtụtụ nde ndị ọzọ nọ n’obodo niile so n’Òtù Na-ahụ Maka Udo na Yurop nwee ike ịjụ ịbanye amị n’ihi akọnuche ha. *

Ihe a bụ mgbe a tọhapụrụ ụmụnna anyị na mkpọrọ n’Amenia. Ọ bụ Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop kpebiri ka a tọhapụ ha

Okwu Gbasara Ito Mba

15. Gịnị mere ndị Jehova anaghị ekwe eme ihe ọ bụla e ji eto mba?

15 Ndị Jehova na-eji obi ha niile akwado Alaeze Mesaya. Ọ bụ ihe mere ha anaghị arụ ọrụ amị, ha anaghịkwa eme ihe ọ bụla e ji eto mba. Kemgbe ụwa, ụmụ amaala mba dị iche iche na-eme ihe ndị ha ji egosi na mba ha ka mba ndị ọzọ mma. Ma, a bịara mesiwe ya ike kemgbe a lụrụ Agha Ụwa nke Abụọ. Ọtụtụ mba e kwuola na ọ bụ iwu na ụmụ amaala ha ga na-eme ihe ndị gosiri  na ha na-erubere mba ha isi karịa onye ọ bụla ọzọ. Ha na-agwa ha ka ha na-ekwe ukwe e ji eto mba, ma na-egbuchapụkwara ọkọlọtọ ha. Ma, ọ bụ naanị Jehova ka anyị na-efe ofufe. (Ọpụ. 20:4, 5) Ọ bụ ya mere e ji akpagbu anyị ọtụtụ mgbe. Ma, Jehova ka na-eji ndị e nwere ike iji tụnyere “ala” agbatara anyị ọsọ enyemaka. Ka anyị lebagodị anya n’ụfọdụ ikpe ndị Jehova si n’aka Kraịst mee ka anyị merie n’okwu gbasara mmadụ irubere mba ya isi karịa onye ọ bụla ọzọ.—Ọma 3:8.

16, 17. Olee ihe mere okwu ụmụ Nwanna Gobitas ji pụọ n’ụlọikpe? Oleekwa ihe ị mụtara n’otú e si kpee ikpe ha?

16 Amerịka. N’afọ 1940, Ụlọikpe Kasị Elu n’Amerịka lebara anya n’okwu Nwanna Gobitas na ụlọ akwụkwọ a na-akpọ Minersville School District. Ụlọ akwụkwọ a chụrụ ụmụ Nwanna Gobitas n’akwụkwọ n’ihi na ha jụrụ ikele ọkọlọtọ na ikwe ukwe e ji eto mba. Aha ụmụ ya ndị ahụ bụ Lillian, * onye dị afọ iri na abụọ, na William, onye dị afọ iri. Ụmụaka a jụrụ ikele ọkọlọtọ n’ihi na ha achọghị inupụrụ Jehova isi. Mgbe Ụlọikpe a na-ekpebi ikpe a, ndị ọkàikpe asatọ n’ime ndị ọkàikpe itoolu e nwere n’ụlọikpe a mara ụmụ nwanna a ikpe. Ụlọikpe a kwuru na ọchụchụ ụlọ akwụkwọ ahụ chụrụ ụmụaka ahụ dabara adaba n’iwu mba Amerịka n’ihi na ọ ga-eme ka “udo dịrị n’Amerịka.” Ihe a Ụlọikpe a kpebiri mere ka e mekpọwa Ndịàmà Jehova ọnụ n’ike n’ike n’Amerịka. A chụkwuru ụmụ Ndịàmà Jehova n’ụlọ akwụkwọ, chụọ ụfọdụ Ndịàmà Jehova n’ọrụ, ndị tigbuo zọgbuo emerụọkwa ụfọdụ ezigbo ahụ́. Otu akwụkwọ a na-akpọ The Lustre of Our Country kwuru na “a bịa na ndị niile e mekpọrọ ọnụ n’Amerịka n’ihi okpukpe ha, malite n’afọ 1901 ruo n’afọ 1999, e nwebeghị ndị e mekpọrọ ọnụ karịa otú e si mekpọọ Ndịàmà Jehova n’agbata afọ 1941 na afọ 1943.”

17 Ma, ihere mechara mee ndị iro anyị. N’afọ 1943, Ụlọikpe Kasị Elu n’Amerịka kpere ikpe ọzọ yiri nke Nwanna Gobitas na ụlọ akwụkwọ ahụ. Ikpe a bụ ikpe Nwanna Barnette na otu ụlọ ọrụ gọọmenti a na-akpọ West Virginia State Board of Education. Na nke ugbu a, Ụlọikpe a kpelaara Ndịàmà Jehova ikpe. Nke a bụ nke mbụ Ụlọikpe a na-ekpecha ikpe nọtụ, gbanwee ihe ha kpere. Ihe a ụlọikpe a kpebiri mere ka ndị iro anyị kwụsịtụ ọnụ ahụ ha na-emekpọ anyị n’Amerịka. O mekwara ka ụmụ amaala Amerịka matakwuo ihe ndị ruuru ha.

18, 19. Gịnị nyeere Pablo Barros aka ịkwụsi ike mgbe a na-enye ya nsogbu? Olee otú anyị nwere ike isi mee ka ya?

18 Ajentina. N’afọ 1976, a chụrụ ụmụ Nwanna Barros abụọ aha ha bụ Pablo na Hugo n’akwụkwọ. Pablo dị afọ asatọ, ma Hugo dị afọ asaa. A chụrụ ụmụaka a n’akwụkwọ n’ihi na ha esoghị mee ememme e ji a kwụwa ọkọlọtọ. O nwere ụbọchị onyeisi ụlọ akwụkwọ ha kwara Pablo aka ma tie ya ihe n’isi. Mgbe a gbasachara akwụkwọ n’ụbọchị ahụ, o jichiri ụmụaka ahụ ruo otu awa, na-amanye ha ka ha soro n’ememme ahụ. Pablo kwuru otú Jehova si nyere ya aka n’oge ahụ. Ọ sịrị: “E wezụga Jehova, agaraghị m enwe ike imeri n’oge ahụ a na-enye m nsogbu ka m nupụrụ ya isi.”

19 Mgbe e wepụrụ okwu a n’ụlọikpe, ọkàikpe kpere ya kwadoro ọchụchụ ụlọ akwụkwọ ahụ chụrụ Pablo na Hugo. Ma,  n’afọ 1979, a gbara akwụkwọ mkpegharị ikpe n’Ụlọikpe Kasị Elu n’Ajentina. Ụlọikpe a kagburu ihe ụlọikpe nke mbụ ahụ kpebiri. Mgbe ha na-ekpebi ikpe a, ha kwuru, sị: “Ọchụchụ a chụrụ ụmụ akwụkwọ a adabaghị adaba n’ihi na e nwere iwu obodo ahụ kwuru na nwa amaala ọ bụla n’obodo ahụ nwere ikike ịga akwụkwọ, nweekwa iwu nke kwuru na gọọmenti steeti ọ bụla ga-ahụrịrị na nwa amaala ya ọ bụla gara ụlọ akwụkwọ praịmarị.” Ihe a Ụlọikpe a kpebiri baara ụmụ Ndịàmà Jehova ruru ihe dị ka otu puku uru. E nwere ụfọdụ n’ime ha ụlọ akwụkwọ ha chọrọ ịchụ achụ ma ha achụzighị ha. Ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ kpọghachikwara ụmụ Ndịàmà Jehova ha chụrụ achụ, dị ka Pablo na Hugo.

N’agbanyeghị nsogbu a na-enye ọtụtụ ụmụ Ndịàmà Jehova, ha na-eme ihe Jehova chọrọ

20, 21. Olee otú ikpe e kpere Roel Embralinag na Emily nwanne ya nwaanyị ga-esi mee ka okwukwe gị sikwuo ike?

20 Filipinz. N’afọ 1990, a chụrụ ihe dị ka ụmụ Ndịàmà Jehova iri isii na isii n’akwụkwọ maka na ha jụrụ ikele ọkọlọtọ. A chụrụ Roel Embralinag, * onye dị afọ itoolu, na Emily nwanne ya nwaanyị, onye dị afọ iri n’ụlọ akwụkwọ. Nwanna Leonardo bụ́ papa ha gara n’ụlọ akwụkwọ ahụ ka ya na ndị isi ụlọ akwụkwọ a kwurịta okwu a, ma o nweghị ihe ha kwutere ya. Mgbe okwu a bịara  dawa ike ike, Nwanna Leonardo wepụrụ ya n’Ụlọikpe Kasị Elu n’obodo a. Ma, nwanna a enweghị ego, o nweghịkwanụ onye ọkàiwu ga-ekpechite ọnụ ya. Ihe ya na ezinụlọ ya meziri bụ ịna-arịọ Jehova ka o nyere ha aka n’okwu a. Ka ihe a niile nọ na-eme, ndị mmadụ ji ụmụaka ya eme ihe egwuregwu. Nwanna Leonardo chere na ya emekataghị merie n’ikpe a n’ihi na ya amaghị ihe iwu na-akọ.

21 Ma, ihe mechara gbanwee. Otu onye ọkàiwu aha ya bụ Felino Ganal pụtara ka o kpechite ọnụ nwanna a na ezinụlọ ya. Onye ọkàiwu a na-arụburu otu ụlọ ọrụ ndị ọkàiwu so ná ndị a kacha mara amara n’obodo a ọrụ. Ọ bụ n’oge ihe niile a nọ na-eme ka Nwanna Ganal hapụrụ ọrụ ahụ ọ na-arụ, ghọọ Onyeàmà Jehova. Mgbe e wepụrụ okwu a n’Ụlọikpe Kasị Elu, ndị ọkàikpe niile nọ n’Ụlọikpe a kpelaara Ndịàmà Jehova ikpe ma sị ka a kpọghachi ụmụ Ndịàmà Jehova ahụ a chụrụ achụ. Mbọ niile ndị iro anyị gbara ka anyị mebie iwu Chineke kụrụ afọ n’ala.

Otú Anyị Si Dịrị Iche n’Ụwa Na-eme Ka Anyị Dịrị n’Otu

22, 23. (a) Gịnị mere anyị ji merie n’ọtụtụ ikpe ndị anyị nwere n’ụlọikpe? (b) Gịnị ka otú anyị si dịrị n’otu n’ụwa niile na-egosi?

22 Gịnị mere anyị ji merie n’ọtụtụ ikpe ndị anyị nwere n’ụlọikpe? N’agbanyeghị na anyị esoghị ná ndị ọchịchị, ndị ọkàikpe na-anaghị ele mmadụ anya n’ihu ekpelaarala anyị ikpe n’ọtụtụ mba nakwa n’ọtụtụ ụlọikpe mgbe ndị iro anyị na-emekpọ anyị ọnụ. A na-agbakwasị ụkwụ n’ikpe ndị a ha kpelaara anyị ekpebi ikpe ndị ọzọ yiri ha. O doro anya na ọ bụ Kraịst mere ka anyị merie n’ikpe ndị ahụ. (Gụọ Mkpughe 6:2.) Gịnị medịrị anyị ji wepụ okwu ndị ahụ n’ụlọikpe? Ọ bụghị ka a gbanwee iwu obodo anyị dị iche iche. Kama, ọ bụ ka anyị hụ na anyị ga na-ejere Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst ozi otú ọ chọrọ.—Ọrụ 4:29.

23 N’ụwa a ịkpọasị na tigbuo zọgbuo juru, Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst na-agọzi mbọ ndị ya na-agba n’ụwa niile ka ha ghara ime ihe otú ụwa Setan si eme. Mbọ niile Setan na-agba ka anyị ghara ịdị n’otu akụọla afọ n’ala. Jehova ejirila Alaeze ya mee ka e nwee ọtụtụ nde mmadụ ndị jụrụ ‘ịmụ otú e si alụ agha.’ Otú a anyị si dịrị n’otu n’ụwa niile bụ aka ọrụ Chineke. Ọ na-egosi n’eziokwu na Alaeze Chineke amalitela ịchị.—Aịza. 2:4.

^ para. 4 Aha ọzọ a na-akpọ akwụkwọ Millennial Dawn Nke Isii, bụ The New Creation. E mechara kpọwa akwụkwọ Millennial Dawn niile Studies in the Scriptures.

^ para. 8 Ị chọọ ịgụ ebe a kọwara amụma a, gụọ ihe e dere n’isi nke 27, peeji nke 184-186 n’akwụkwọ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!

^ para. 13 Ihe ọzọ e kwuru iji dozie okwu ahụ bụ na e nwee ụmụ amaala Bọlgeria akọnuche ha na-ekweghị ha gaa agha, gọọmenti ha ga-enye ha ọrụ ndị ọzọ n’agbasaghị ndị amị.

^ para. 14 Ị chọọ ịma ihe niile merenụ, gụọ Ụlọ Nche Nọvemba 1, 2012, peeji nke 29 ruo na nke 31.

^ para. 14 N’ime afọ iri abụọ naanị, gọọmenti mba Aminia atụọla ihe karịrị narị ụmụnna anyị ndị na-eto eto anọ na iri ise mkpọrọ. Ọ bụ n’ọnwa Nọvemba afọ 2013, ka a hapụrụ onye nke ikpeazụ n’ime ụmụnna anyị ndị a.

^ para. 16 Ụlọikpe a dejọrọ aha ezinụlọ a.

^ para. 20 Ụlọikpe a dejọrọ aha ezinụlọ a. Ha dere Ebralinag kama ide Embralinag.