Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!

 ISI NKE 13

Okwu Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze Chineke Wepụrụ n’Ụlọikpe

Okwu Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze Chineke Wepụrụ n’Ụlọikpe

IHE ISIOKWU A NA-EKWU

Jizọs kwuru na ndị ọchịchị ga-enye ndị na-eso ụzọ ya nsogbu n’ihi ozi ọma ha na-ezi. Ndị ọchịchị malitere ime ihe a

1, 2. (a) Olee ihe ndị isi okpukpe mere banyere ozi ọma ndịozi Jizọs na-ezi? Ma, olee ihe ndịozi Jizọs mere? (b) Gịnị mere ndịozi Jizọs ji na-ekwusa ozi ọma a sị ha ekwusakwala?

O NWERE ihe mere obere oge e mechara ememme Pentikọst afọ 33. Ọgbakọ Ndị Kraịst dị na Jeruselem ka malitere amalite. Ma, obi adịghị Setan mma na ọ malitere. N’ihi ya, ọ chọrọ ka e kposaa ya. Ọ kpara nkata ozugbo mee ka ndị isi okpukpe machie ndịozi Jizọs izi ozi ọma Alaeze Chineke. Ma, ndịozi Jizọs katara obi na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. Ọtụtụ ndị bịakwara “kwere n’Onyenwe anyị.”—Ọrụ 4:18, 33; 5:14.

Ndịozi Jizọs ṅụrịrị ọṅụ “n’ihi na a gụwo ha ná ndị ruru eru ịbụ ndị a ga-emenye ihere n’ihi aha ya”

2 Ozi ọma a ndịozi Jizọs na-ezi gbawara ndị isi okpukpe obi, ha ejide ha, tụọkwa ha mkpọrọ. Ma, mmụọ ozi Jehova bịara n’abalị kpọpụta ha. Mgbe chi bọrọ, ndịozi ahụ bidokwara na-ezi ozi ọma. Ka ha nọ na-ezi ozi ọma, ndị agha bịara jide ha ma kpụta ha n’ihu ndị ọchịchị. Ndị ọchịchị ahụ kwuru na ndịozi ahụ adaala iwu n’ihi na a sị ha ekwusakwala ozi ọma, ha esie ọnwụ na-ekwusa ya. Ndịozi ahụ katara obi gwa ha, sị: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.” Ihe a ndịozi a kwuru were ndị ọchịchị ahụ ezigbo iwe nke na ha chọwara “igbu ha.” Ma, ka ha na-akpa nkata otú ha ga-esi egbu ha, otu nwoke a na-akwanyere ùgwù, nke na-akụzi Iwu, dọrọ ndị ọchịchị a aka ná ntị. Aha nwoke a bụ Gameliel. Ọ gwara ndị ọchịchị ahụ, sị: “Lezienụ anya . . . Unu etinyela aka n’ihe metụtara ndị a, kama hapụnụ ha.” Ndị ọchịchị ahụ gere nwoke a ntị, hapụ ndịozi a. Olee ihe ndịozi a mere mgbe a hapụrụ ha? Ha nọ “na-akụzi ihe n’akwụsịghị akwụsị, na-ezisa ozi ọma banyere Kraịst, bụ́ Jizọs.”—Ọrụ 5:17-21, 27-42; Ilu 21:1, 30.

3, 4. (a) Olee nkata Setan na-akpa kemgbe ụwa o ji na-echi ndị Chineke ọnụ n’ala? (b) Olee ihe ndị anyị ga-eleba anya na ha n’isiokwu a na n’isiokwu abụọ ndị na-eso nke a?

3 Ikpe ahụ e kpere ndịozi n’afọ 33 bụ ikpe mbụ ndị ọchịchị kpere Ndị Kraịst. Ma, ọ bụghị ya bụ nke ikpeazụ. (Ọrụ 4:5-8; 16:20; 17:6, 7) Taa, Setan ka na-eji ndị iro anyị eme ka ndị ọchịchị machie anyị izi ozi ọma. Ndị iro anyị ebola anyị ebubo ndị na-enweghị isi. Ha na-asị na anyị na-akpaghasị obodo. Ha na-asịkwa na anyị na-agba ọchịchị mgba okpuru, nakwa na ihe anyị na-eme bụ ire akwụkwọ, ọ bụghị izi ozi ọma. Ihe ndị a ha na-ekwu emeela mgbe ụfọdụ ka anyị gbaa ha akwụkwọ n’ụlọikpe iji gosi na ha na-aghagide anyị ụgha. Olee otú ikpe ndị a si gaa? Olee otú ikpe ndị e kpere ọtụtụ afọ gara aga si abara gị uru taa? Ka anyị leba anya n’ole na ole n’ime ha. Anyị ga-elebakwa anya n’otú  ha si nye aka “n’ịkwado ozi ọma na iji iwu mee ka o guzosie ike.”—Fil. 1:7.

4 Ihe anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a bụ otú anyị sirila zara ọnụ anyị n’ụlọikpe ka e kwe anyị na-ezisa ozi ọma. N’isiokwu abụọ na-eso isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ụfọdụ ikpe ndị anyị wepụrụ n’ụlọikpe n’ihi na anyị achọghị ịbụ nke ụwa nakwa na anyị chọrọ ịna-akpa àgwà otú Chineke chọrọ.

Ànyị Na-akpaghasị Obodo Ka Ànyị Na-ekwusa Banyere Alaeze Chineke?

5. N’agbata afọ 1937 na afọ 1939, gịnị mere e ji nwụchie ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke? Gịnị ka ndị na-elekọta nzukọ a mere?

5 N’agbata afọ 1937 na afọ 1939, steeti niile dị n’Amerịka kwuru na tupu ụmụnna anyị eziwe ozi ọma, ha ga-anatarịrị ha akwụkwọ ikike. Ma, ụmụnna anyị ekweghị aga ka e nye ha ụdị ikike ahụ. Ha ma na e nwere ike inye mmadụ ikike taa, napụ ya ikike ahụ echi. Ha makwa na o nweghị onye ọchịchị n’ụwa a nwere ike ịkwụsị ozi ọma Jizọs nyere Ndị Kraịst iwu ka ha na-ezi. (Mak 13:10) A kpọchiri ọtụtụ ụmụnna anyị n’ihi na ha ekweghị aga ka e nye ha akwụkwọ ikike ahụ. Ọ bụ ya mere ndị na-elekọta nzukọ a ji gbaa akwụkwọ n’ụlọikpe. Ha chọrọ ime ka o doo anya na ihe a a chọrọ ka Ndịàmà Jehova mee tupu ha eziwe ozi ọma megidere iwu, n’ihi na ọ ga-eme ka ha ghara ife Chineke otú ọ chọrọ. Ma, e nwere otu ikpe e kpere n’afọ 1938, nke mere ihe akụkọ. Ka anyị chọpụta ihe merenụ.

6, 7. Olee ihe e mere Nwanna Cantwell na ezinụlọ ya mgbe ha na-ezi ozi ọma?

6 N’ụtụtụ Tuzdee, abalị iri abụọ na isii n’ọnwa Eprel, afọ 1938, ụmụnna anyị ise, bụ́cha ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, gawara ozi ọma n’obodo Niu Hevụn, dị na Kọnektikọt. Ha si n’otu ezinụlọ. Ha bụ: Newton Cantwell, dị afọ iri isii, na Esther nwunye ya, nakwa ụmụ ha atọ bụ́ Henry, Russell, na Jesse. Ha jikeere ịnọ karịa otu ụbọchị n’ebe ahụ n’ihi na ha chere na e nwere ike ịnwụchi ha. Gịnị mere ha ji chee otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na a nwụchiela ha ugboro ugboro ebe ha na-ezi ozi ọma. Ma, ihe a emeghị ka ha kwụsị ịna-ezi ozi ọma. Ha ji ụgbọala abụọ gaa ebe ahụ ha chọrọ izi ozi ọma. Nwanna Cantwell ji otu buru ezinụlọ ya, burukwa akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, nakwa gramafon. Ma, Henry nwa ha nwoke dị afọ iri abụọ na abụọ nyatara nke a rụnyere ígwè okwu. N’awa ole na ole ha rutere na-ezi ozi ọma, ihe ahụ ha chere ga-eme mere. Ndị uwe ojii bịara kwụsị ha izi ozi ọma.

7 Onye mbụ ha nwụchiri bụ Russell dị afọ iri na asatọ. Ha mechakwara nwụchie Nwanna Cantwell na nwunye ya. Jesse, bụ́ nwa ha nwoke dị afọ iri na isii, nọ ebe dịtụ anya hụ ka ndị uwe ojii kpụ papa ya na mama ya na nwanne ya nwoke na-aga. Henry nọ ná mpaghara ọzọ na-ezi ozi ọma nke ya. Ọ bụzi naanị Jesse nọ. N’agbanyeghị na ọ bụ naanị ya nọ, ọ kpọnyere gramafon ya, jiri ya na-ezi ozi ọmaa ọ nọ na-ezi. Ka ọ na-ezi ozi ọma a, ụmụ nwoke abụọ bụ́ ndị chọọchị Katọlik bịara gwa ya ka ọ kpọnyere ha okwu Nwanna Rutherford. Isiokwu ya bụ “Ndị Iro.” Jesse kpọnyeere ha okwu ahụ. Ka ha na-ege ya, ezigbo iwe were ha, ha achọọ ịkụ Jesse ihe. Ma, Jesse ji nwayọọ were ihe ya pụọ. Obere oge ihe a  mechara, otu onye uwe ojii nwụchiri Jesse. Otú a ka Jesse si gaa mkpọrọ nke ya. Ndị uwe ojii sị na Nwanna Nwaanyị Cantwell adaghị iwu. Ma, ha sịrị na Nwanna Cantwell na ụmụ ya dara iwu. A gbapụtakwara ha n’ụbọchị ahụ a nwụchiri ha.

8. Gịnị mere ụlọikpe ji ma Jesse ikpe?

8 Na Septemba afọ 1938, e wepụrụ okwu Nwanna Cantwell na ụmụ ya abụọ ahụ n’ụlọikpe dị na Niu Hevụn. A mara Nwanna Cantwell na ụmụ ya abụọ bụ́ Russell na Jesse ikpe na ha anataghị akwụkwọ ikike n’aka gọọmenti tupu ha agwawa ndị mmadụ ka e nye ha onyinye. A makwara Jesse ikpe na ọ na-akpaghasị obodo. Ma, e wepụrụ okwu a n’Ụlọikpe Kasị Elu na Kọnektikọt. Ụlọikpe a makwara Jesse ikpe. Gịnị mere ha ji ma ya ikpe? Ọ bụ n’ihi na ụmụ nwoke abụọ ndị Katọlik ahụ Jesse kpọnyeere okwu Nwanna Rutherford bịara gbaa akaebe na a kparịrị chọọchị ha n’okwu ahụ. Ha kwukwara na okwu ahụ were ha ezigbo iwe. Ụmụnna anyị na-elekọta nzukọ Jehova hà gbara nkịtị mgbe e kpechara ikpe a? Mbanụ. Ha wepụrụ okwu a ozugbo n’Ụlọikpe Kasị Elu n’Amerịka.

9, 10. (a) Gịnị ka Ụlọikpe Kasị Elu n’Amerịka kpebiri n’ikpe Nwanna Cantwell na ezinụlọ ya? (b) Olee uru ikpe ahụ baara anyị taa?

9 A malitere ilebagharị okwu a anya n’abalị iri abụọ na itoolu n’ọnwa Mach afọ 1940. Ọ bụ Ọkàikpe Ukwu bụ́ Charles E. Hughes na ndị ọkàikpe asatọ ndị ọzọ lebagharịrị ya anya. Nwanna Hayden Covington bụ ọkàiwu na-ekpechite ọnụ Ndịàmà Jehova. O kwuru ihe mere o ji chee na ikpe ahụ Ụlọikpe Kasị Elu na Kọnektikọt mara  Jesse ezighị ezi. * Ọkàiwu na-ekpechite ọnụ steeti Kọnektikọt kwuru n’ihu ụlọikpe a ihe mere o ji chee na Ndịàmà Jehova na-akpaghasị obodo. Ma, otu n’ime ndị ọkàikpe ahụ jụrụ ya, sị: “Ị̀ ma na ozi ọma Jizọs Kraịst ziri ndị mmadụ adịghị ọtụtụ ndị n’oge ahụ mma?” Ọkàiwu ahụ zara ya, sị: “Ama m. Baịbụl kwukwara ihe ha mere Jizọs n’ihi ozi ọma ahụ o ziri ha.” Ihe a ọkàiwu a zara mere ka eziokwu gbaa ka ọnwa. Ọ maghị na ya ejirila aka ya kwuo na Ndịàmà Jehova nọchiri anya Jizọs, ebe steeti Kọnektikọt nọchikwaranụ anya ndị gburu Jizọs. N’abalị iri abụọ n’ọnwa Mee afọ 1940, Ụlọikpe a kagburu ihe ụlọikpe Kọnektikọt kpere ma sị na ikpe amaghị Ndịàmà Jehova.

Ọ bụ Nwanna Hayden Covington nọ n’etiti ndị nọ n’ihu. Nwanna Glen How nọ n’aka nri ya. Ihe a bụ mgbe ha na ndị ọzọ si n’ụlọikpe na-apụta mgbe anyị merichara n’ikpe

10 Olee uru ihe a Ụlọikpe a kpebiri bara? O mere ka o doo anya na gọọmenti Amerịka, ya bụ, ma nke etiti, ma nke steeti, ma nke ime obodo, e kwesịghị igbochi nwa amaala ya ikpe okpukpe ya otú masịrị ya. Ụlọikpe a kwukwara na ‘o nweghị ihe ọ bụla gosiri na Jesse na-akpaghasị obodo.’ Ihe a e kpebiri mere ka o doo anya na Ndịàmà Jehova anaghị akpaghasị obodo. Otú a ka ndị Jehova si merie n’ikpe ahụ kpọtụrụ akpọtụ. Olee uru ikpe a baara anyị? Otu nwanna bụ́ onye ọkàiwu sịrị: “Ihe a e kpebiri emeela ka anyị na-ezi ozi ọma otú masịrị anyị n’obodo anyị dị iche iche n’enweghị onye na-asị anyị ezikwala.”

Ànyị Na-agba Ọchịchị Mgba Okpuru, Ka Ànyị Na-akụzi Eziokwu?

Ihe a bụ traktị anyị ahụ a na-akpọ Quebec’s Burning Hate for God and Christ and Freedom Is the Shame of All Canada

11. Olee ihe ụmụnna anyị nọ na Kanada mere n’afọ 1946? Gịnị mere ha ji mee ya?

11 N’agbata afọ 1941 na afọ 1949, gọọmenti Kanada mekpọrọ Ndịàmà Jehova ọnụ. Ha mere ka o siere ụmụnna anyị ike ikpe okpukpe ha otú masịrị ha. N’ihi ya, n’afọ 1946, Ndịàmà Jehova bipụtara traktị ha ji mee ka ọhaneze mara ihe na-emenụ. Isiokwu traktị a bụ Quebec’s Burning Hate for God and Christ and Freedom Is the Shame of All Canada (ya bụ, Oké Asị Ndị Kwebek Kpọrọ Chineke na Kraịst na Nnwere Onwe Bụụrụ Ndị Kanada Niile Ihe Ihere). Traktị a dị peeji anọ. Ụmụnna anyị jikwa abalị iri na isii kesaa ya. Traktị a kọrọ otú ndị ụkọchukwu si na-ehinye ndị mmadụ ájá n’úkwù ka ha na-enye ụmụnna anyị nsogbu, na otú ndị uwe ojii si na-echi ụmụnna anyị ọnụ n’ala, nakwa arụrụala ndị ọzọ a na-arụsa ụmụnna anyị na Kwebek. E kwuru otú “e si na-akpọchi Ndịàmà Jehova aka ha dị ọcha.” E kwukwara na e nwere narị ebubo asatọ e boro Ndịàmà Jehova na Greta Mọntrịyọl.”

12. (a) Olee ihe ndị iro anyị mere n’ihi traktị ahụ ụmụnna anyị kesara? (b) Olee ihe a sị na ụmụnna anyị mere? (Gụọkwa ihe e dere n’ala ala peeji.)

12 Obi gbawara Maurice Duplessis, bụ́ onye na-achị Kwebek, nakwa ụkọchukwu chọọchị Katọlik bụ́ Kadinal Villeneuve. Ha abụọ jikọrọ aka na-emegide Ndịàmà Jehova n’ihi traktị ahụ. Ha gwara ndị obodo ha na onye ọ bụla hụrụ Onyeàmà Jehova mee ya ihe masịrị ya. Ebubo a na-ebo anyị mechara ruo otu puku na narị isii. Otu nwanna nwaanyị, bụ́ onye ọsụ ụzọ, sịrị: “Ndị uwe ojii nwụchiri anyị ọtụtụ ugboro nke na anyị enweghịzi ike ịgụta ugboro ole ha nwụchiri anyị.” E nwere ụmụnna anyị ndị a nwụchiri ebe ha na-ekesa traktị anyị ahụ, bo ha ebubo na ha na-ekesa akwụkwọ e ji “agba ọchịchị mgba okpuru.” *

13. Olee ndị mbụ e kpere ikpe na ha na-agba ọchịchị mgba okpuru? Oleekwa ihe ụlọikpe kpebiri n’okwu ahụ?

 13 N’afọ 1947, a kpụpụrụ Nwanna Aimé Boucher na ụmụ ya ndị nwaanyị abụọ n’ụlọikpe. Aha ụmụ ya ndị ahụ bụ Gisèle na Lucille. Gisèle dị afọ iri na asatọ, ebe Lucille dị afọ iri na otu. Nwanna Boucher na ụmụ ya a bụ ndị mbụ a kpụpụrụ n’ụlọikpe sị na ha na-agba ọchịchị mgba okpuru. Naanị ihe ha mere bụ na ha gara n’ebe dị nso n’ugbo ha, kesaara ndị mmadụ traktị anyị ahụ. O nweghị onye ma ha ga-asị na ha na-akpaghasị obodo. Nwanna Boucher dị umeala n’obi, o nweghịkwa onye ya na ya na-ese okwu. Ọ na-abụ ya gaa n’ugbo ya, rụọ ọrụ, jiri ịnyịnya ya gbagharịa n’ime obodo mgbe ụfọdụ, okwu agwụ. Ma, ezinụlọ ya so ná ndị e mekpọrọ ọnụ otú ahụ e si kọọ ya na traktị anyị ahụ. Ọkàikpe kpere ikpe a anaghị achọ iji anya ahụ Ndịàmà Jehova. O kwetaghị ka a kọọrọ ụlọikpe ahụ ihe ndị gosiri na ọ dịghị iwu Nwanna Boucher na ụmụ ya dara. Ma, ọ nabatara ihe ọkàiwu gbara ha akwụkwọ gwara ụlọikpe ahụ. Ọkàiwu a kwuru na traktị ahụ Nwanna Boucher na ụmụ ya kesara na-akpata ọgba aghara n’obodo. N’ihi ya, na e kwesịrị ịma ha ikpe. Ọkàikpe ahụ gbakwasịrị ụkwụ n’ihe a ọkàiwu ahụ kwuru ma Nwanna Boucher na Gisèle nwa ya nwaanyị ikpe, sị na ha gbara ọchịchị mgba okpuru. Ha kpọchidịrị Lucille, bụ́ nwa ya nwaanyị nke obere, n’ụlọ mkpọrọ ruo abalị abụọ. Ihe ikpe a ọ mara ha na-egosi bụ na onye kwuru eziokwu adaala iwu. Ụmụnna anyị wepụrụ okwu a n’Ụlọikpe Kasị Elu na Kanada. Ụlọikpe a kwetakwara ikpegharị ya.

14. Gịnị ka ụmụnna anyị nọ na Kwebek mere mgbe ahụ a na-emekpọ ha ọnụ?

14 Ka ihe a niile na-eme, ụmụnna anyị katara obi na-ezi ozi ọma na Kwebek n’agbanyeghị ọnụ a na-emekpọ ha. Ihe a niile a na-eme ha emeghị ka ndị mmadụ ghara ịbata n’ọgbakọ. Mgbe ha malitere ikesa traktị a na Kwebek n’afọ 1946, Ndịàmà Jehova e nwere na Kwebek dị narị atọ. Ma n’afọ 1950, ha dịzi otu puku. *

15, 16. (a) Gịnị ka Ụlọikpe Kasị Elu na Kanada kpebiri n’ikpe Nwanna Boucher na ezinụlọ ya? (b) Olee uru ikpe a nwanna a na ezinụlọ ya meriri baara ụmụnna anyị ndị obodo ahụ na ndị ọzọ?

15 Na Jun afọ 1950, Ụlọikpe Kasị Elu na Kanada tinyere okwu Nwanna Boucher ọnụ. Ọ bụ ndị ọkàikpe itoolu na-ekpe ikpe n’ụlọikpe a. N’abalị iri na asatọ n’ọnwa Disemba afọ 1950, Ụlọikpe a kagburu ikpe ahụ a mara Nwanna Boucher na nwa ya nwaanyị, sị na ikpe amaghị ha. Gịnị mere e ji kpebie ikpe a otú a? Nwanna Glen How bụ ọkàiwu kpechitere ọnụ Ndịàmà Jehova. Ọ gwara Ụlọikpe ahụ na e kwuo na mmadụ “gbara ọchịchị mgba okpuru,” ihe ọ pụtara bụ na onye ahụ mere ka ndị mmadụ na-enupụrụ gọọmenti isi. Ụlọikpe a kwuru na ihe ahụ o kwuru bụ eziokwu. Ma, ọ dịghị ebe traktị ahụ kwuru ka ndị mmadụ nupụrụ gọọmenti isi. Ihe dị na ya bụ okwu nkịtị nwa amaala ọ bụla nwere ike ikwu. Nwanna How kwukwara, sị: “Eji m anya m hụ otú Jehova si mee ka anyị merie n’ikpe ahụ.” *

16 Ikpe ahụ Ụlọikpe Kasị Elu kpelaara anyị gosiri na Alaeze Chineke na-emeri ndị iro ya. A gbakwasịkwara ụkwụ na ya kagbuo otu narị ikpe na iri abụọ na abụọ ndị ọzọ a na-ekpe Ndịàmà Jehova n’ebe dị iche iche na Kwebek gbasara ịgba ọchịchị mgba okpuru. Ikpe a emeekwala ka o doo anya na ụmụ amaala Kanada na ụmụ amaala ndị ọzọ nọ ná mba ndị Briten chịrị nwere ike ịgwa ọhaneze ihe gọọmenti na-eme ha. Ikpe a mekwara ka ndị chọọchị na ndị ọchịchị Kwebek kwụsị imekpọ Ndịàmà Jehova ọnụ. *

 Ànyị Na-ere Akwụkwọ, Ka Ànyị Ji Obi Anyị Niile Na-ezi Ozi Ọma Alaeze Chineke?

17. Olee otú gọọmenti ụfọdụ si chọọ ịtụrụ anyị ụka n’ozi ọma anyị na-ezi?

17 Ndị mbụ soro ụzọ Kraịst “abụghị ndị na-ere okwu Chineke ere.” Ndị Jehova taa anaghịkwa ere okwu Chineke ere. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 2:17.) Ma, ụfọdụ ndị ọchịchị ekworola n’ihi iwu ha tiri maka ndị na-azụ ahịa sị na Ndịàmà Jehova ga na-atụ ụtụ isi maka na ha na-ere akwụkwọ ha ere. Ugbu a, ka anyị leba anya n’ụzọ ikpe abụọ e kpere Ndịàmà Jehova. Otú e si kpebie ha ga-enyere anyị aka ịmata ma hà bụ ndị na-ere ahịa ka hà bụ ndị na-ezisa ozi ọma.

18, 19. Olee nkata ndị ọchịchị Denmak kpara ka ha kwụsị anyị izi ozi ọma?

18 Denmak. N’abalị mbụ n’ọnwa Ọktoba afọ 1932, e tiri iwu n’obodo a na onye ọ bụla na-ere akwụkwọ n’ebughị ụzọ nata akwụkwọ ikike adaala iwu. Ma, ụmụnna anyị agaghị ka e nye ha ikike. N’ụbọchị na-eso ụbọchị e tiri iwu a, ụmụnna anyị ise gara ozi ọma n’obodo Roskilde. Isi n’obodo a gawa isi obodo Denmak bụ́ Kọpenhegin dị ihe karịrị kilomita iri atọ. Mgbe ha mechiri ozi ọma ná mgbede ụbọchị ahụ, a hụghịzi otu onye n’ime ha bụ́ Nwanna August Lehmann. E mechara chọpụta na ndị uwe ojii nwụchiri ya, sị na ọ na-ere akwụkwọ n’anataghị ikike.

19 N’abalị iri na itoolu n’ọnwa Disemba afọ 1932, a kpụpụrụ Nwanna August Lehmann n’ụlọikpe. Ọ gwara ụlọikpe na ya nyere ndị mmadụ akwụkwọ e ji amụ Baịbụl, ma na ya ereghị ha ere. Ọkàikpe na-ekpe ikpe a kwetara n’ihe a o kwuru. Ọkàikpe ahụ sịrị: “Onye a na-azara ọnụ ya . . . ji aka ya akpa afọ ya, a naghị akwụ ya ụgwọ n’ihe a ọ na-eme. Ọ bụkwa ego ya ka o ji na-eme ya.” Ọkàikpe ahụ kpelaara anyị ikpe, sị na ekwesịghị iwere ihe a Nwanna Lehmann na-eme ka “ire ahịa.” N’agbanyeghị ihe a e kpebiri, ndị iro anyị fooro ntutu taa na ha ga-emerịrị ka a kwụsị anyị izi ozi ọma na Denmak. (Ọma 94:20) Onye ọkàiwu na-ekpechitere mba Denmak ọnụ gbara akwụkwọ n’Ụlọikpe Kasị Elu na Denmak. Olee ihe ụmụnna anyị mere?

20. Gịnị ka Ụlọikpe Kasị Elu na Denmak kpebiri n’okwu anyị na ndị ọchịchị obodo ahụ? Gịnịkwa ka ụmụnna anyị mere?

20 Mgbe ọ fọrọ otu izu ka Ụlọikpe a leba okwu a anya, Ndịàmà Jehova niile nọ na Denmak wepụtakwuru oge na-ezi ozi ọma. Na Tuzdee, abalị atọ n’ọnwa Ọktoba afọ 1933, Ụlọikpe a kpebiri ikpe a. Ha kwetara n’ihe ụlọikpe mbụ ahụ kpere. Ha kwuru na Nwanna Lehmann adaghị iwu ọ bụla. Ihe ụlọikpe a na-ekwu bụ na Ndịàmà Jehova nwere ike izi ozi ọma ebe ọ bụla na Denmak. Ụmụnna anyị wepụtakwuru oge na-ezi ozi ọma iji kelee Chineke maka otú o si mee ka ha merie. Kemgbe ahụ Ụlọikpe a kpechara ikpe a, gọọmenti Denmak enyebeghị Ndịàmà Jehova nsogbu.

Ụmụnna ndị a katara obi na-ezi ozi ọma na Denmak n’agbata afọ 1931 na afọ 1939

21, 22. Gịnị ka Ụlọikpe Kasị Elu n’Amerịka kpebiri n’okwu Nwanna Murdock?

21 Amerịka. Na Sọnde, abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Febụwarị afọ 1940, ndị uwe ojii nwụchiri Nwanna Robert Murdock, Jr., bụ́ onye ọsụ ụzọ, na ụmụnna anyị asaa ndị ọzọ ebe ha na-ezi ozi ọma na Jenet. Obodo a dị nso na Pitsbọg dị na steeti Pensụlvenịa. A kpụpụrụ ha n’ụlọikpe, mechaakwa ma ha ikpe n’ihi na a sị na ha anataghị akwụkwọ ikike tupu nyewe ndị mmadụ akwụkwọ anyị. Ma ụmụnna anyị wepụrụ okwu a n’Ụlọikpe Kasị Elu n’Amerịka. Ụlọikpe a kwetakwara ikpegharị ya.

 22 N’abalị atọ n’ọnwa Mee afọ 1943, ụlọikpe a lebara anya n’okwu a ma kwuo na iwu amaghị Ndịàmà Jehova. Ụlọikpe a kwuru na e kwesịghị ịgwa Ndịàmà Jehova ka ha nweta akwụkwọ ikike tupu ha enye ndị mmadụ akwụkwọ n’ihi na “o megidere iwu gọọmenti Amerịka.” Ụlọikpe a kagburu iwu ahụ steeti Pensụlvenịa tiri. Ha kwuru na iwu ahụ “ga-eme ka ndị mmadụ ghara ikpe okpukpe masịrị ha, meekwa ka ha ghara ikesara ọhaneze akwụkwọ ha otú ha chọrọ.” Otu ọkàikpe a na-akpọ Justice William O. Douglas gụpụtara ihe ụlọikpe ahụ kpebiri. O kwuru na ihe Ndịàmà Jehova na-eme “abụghị naanị izi ozi ọma; ọ bụghịkwa naanị inye ndị mmadụ akwụkwọ ha. Kama, ha na-eme ha abụọ.” O kwukwara, sị: “Ozi ọma a ha na-ezi na akwụkwọ ha na-enye ndị mmadụ dị ka . . . ịga ụlọ ụka gere okwuchukwu na ịnọ n’ọlta ekwu okwuchukwu.”

23. Gịnị mere anyị ga-eji sị na ikpe ndị ahụ e kpelaara anyị n’afọ 1943 baara anyị uru taa?

23 Ihe a ụlọikpe a kpebiri baara Ndịàmà Jehova niile uru. O mere ka ọhaneze mata na anyị bụ ndị ozi Chineke, anyị abụghị ndị na-ere akwụkwọ. N’otu ụbọchị ahụ e kpebiri ikpe a n’afọ 1943, Ụlọikpe Kasị Elu kpelaara anyị ikpe iri na abụọ n’ime ikpe iri na atọ anyị nwere n’ụlọikpe a. Ikpe ahụ Ụlọikpe Kasị Elu kpelaara Nwanna Murdock so n’ikpe iri na abụọ ahụ anyị meriri. Kemgbe e kpechara ikpe ndị a, ndị iro anyị ka na-akpụpụkwa anyị n’ụlọikpe, na-asị na anyị ekwesịghị ịna-ezi ndị mmadụ ozi ọma  Alaeze Chineke n’ihu ọha nakwa n’ụlọ n’ụlọ. Ma, a na-agbakwasị ụkwụ n’ikpe ndị ahụ Ụlọikpe Kasị Elu kpelaara anyị na-akagbu akwụkwọ ndị a ndị iro anyị na-agba anyị.

“Anyị Aghaghị Irubere Chineke Isi Dị Ka Onye Na-achị Achị Karịa Mmadụ”

24. Olee ihe anyị na-eme ma gọọmenti sị anyị ekwusakwala ozi ọma?

24 Ebe anyị bụ ndị Jehova, obi na-atọ anyị ezigbo ụtọ ma ndị gọọmenti kwe ka anyị na-ezi ozi ọma Alaeze Chineke otú masịrị anyị. Ma, ọ bụrụ na ha enye anyị iwu, sị anyị ezikwala ozi ọma, anyị anaghị akwụsị. Ihe anyị na-eme bụ ịgbanwe otú anyị si ezi ozi ọma. Anyị na-eme ihe a ndịozi kwuru: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.” (Ọrụ 5:29; Mat. 28:19, 20) Ma, anyị na-agbakwa akwụkwọ n’ụlọikpe ka ụlọikpe kagbuo iwu gọọmenti machiri anyị izi ozi ọma. Ka anyị lebagodị anya n’ikpe abụọ e kpelaara anyị.

25, 26. Olee ihe ndị mere ka ụmụnna anyị wepụ okwu ha n’Ụlọikpe Kasị Elu na Nikaragụa? Oleekwa ihe ụlọikpe a kpebiri?

25 Nikaragụa. N’abalị iri na itoolu n’ọnwa Nọvemba afọ 1952, Nwanna Donovan Munsterman gara n’ọfis ndị na-ahụ maka ndị si mba ọzọ na-abata Nikaragụa. Ọfis a dị na Managụa bụ́ isi obodo Nikaragụa. Nwanna Munsterman bụ onye ozi ala ọzọ na onye na-elekọta alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Nikaragụa. Ihe mere o ji gaa ebe ahụ bụ na a gwara ya ka ọ wụchaa n’ọfis onyeisi ndị na-ahụ maka ndị si mba ọzọ na-abata Nikaragụa. Aha onyeisi a bụ Arnoldo García. Mgbe Nwanna Munsterman batara n’ọfis onyeisi a, onyeisi a gwara ya na a machiela Ndịàmà Jehova nọ na Nikaragụa “ịkụziri ndị mmadụ ihe ndị ha kweere na ime ihe ndị ọzọ ha na-eme n’okpukpe ha.” Nwanna a jụrụ onyeisi a ihe mere e ji tie iwu ọkụ a, ya agwa ya na ọ bụ n’ihi na gọọmenti enyeghị Ndịàmà Jehova akwụkwọ ikike izi ozi ọma. O kwukwara na ndị mmadụ sị na Ndịàmà Jehova na-akwado ọchịchị Kọmunist. Ole ndị boro anyị ụdị ebubo a? Ọ bụ ndị ụkọchukwu Katọlik.

Ndị a bụ ụmụnna anyị ndị Nikaragụa n’oge ahụ a machiri ọrụ anyị

 26 Nwanna Munsterman degaara ụlọ ọrụ gọọmenti na-edeba aha okpukpe n’akwụkwọ akwụkwọ ozugbo. O degakwaara onyeisi ala obodo Nikaragụa aha ya bụ Anastasio Somoza García akwụkwọ. Ọ gwara ha ka ha wepụ iwu ahụ ha tiri, ha ajụ. N’ihi ya, ụmụnna anyị gbanwere otú ha si ezi ozi ọma. Ha kwụsịrị ịmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, kee onwe ha ekee, nọrọzie n’ebe dị iche iche amụ ihe. Ha kwụsịkwara izi ozi ọma n’okporo ámá. Ma, ha akwụsịghị izi ozi ọma Alaeze Chineke. Ha gbakwara akwụkwọ n’Ụlọikpe Kasị Elu na Nikaragụa ka a kagbuo iwu ahụ gọọmenti tiri. Akwụkwọ akụkọ dị iche iche kọrọ banyere iwu ahụ gọọmenti tiri nakwa ihe mere anyị ji gbaa akwụkwọ. Ụlọikpe ahụ kwetara ileba okwu a anya. Gịnị ka e kpetara n’ikpe a? N’abalị iri na itoolu n’ọnwa Jun afọ 1953, Ụlọikpe a kpelaara Ndịàmà Jehova ikpe, sị na mmachi ahụ gọọmenti machiri anyị megidere iwu mba Nikaragụa nke kwuru na onye ọ bụla nwere ike ikwu uche ya, meekwa ihe ọ bụla akọnuche ya gwara ya. Iwu a kwukwara na onye ọ bụla nwere ike ịkọrọ ndị ọzọ ihe ndị o kweere. Ụlọikpe ahụ kwukwara na ha chọrọ ka gọọmenti Nikaragụa na Ndịàmà Jehova dịghachi ná mma.

27. Gịnị mere ihe e kpebiri ji ju ndị Nikaragụa anya? Oleekwa otú ụmụnna anyị si lee mmeri a ha meriri anya?

27 Ihe a Ụlọikpe a kpebiri juru ndị Nikaragụa anya n’ihi na tupu e kpebie ikpe a, ọ bụ ndị ụkọchukwu na-ekwu ihe na-eme n’obodo. Ọ bụ ya mere ndị ọkàikpe anaghị achọ ihe ọ bụla ga-esere ha na ha. Ihe ọzọkwa mere o ji ju ha anya bụ na ndị ọnụ na-eru n’okwu na gọọmenti na-akpa ike dị egwu na Nikaragụa nke na ọ na-esitụrụ ndị ọkàikpe ike ịma ha ikpe. Ma, ụmụnna anyị ma na ihe mere e ji kpelaara ha ikpe a bụ n’ihi na Eze anyị kwụ ha n’azụ nakwa na ha akwụsịghị izi ozi ọma.—Ọrụ 1:8.

28, 29. Olee ihe ndị a na-atụghị anya ha mere n’ihe dị ka n’afọ 1985 na Zaire?

28 Zayee. N’ihe dị ka afọ 1985, Ndịàmà Jehova nọ ná mba a dị puku iri atọ na puku ise. Ihe a na-akpọ Zayee ugbu a bụ Demokratik Ripọblik ọf Kongo. N’ihi otú ọtụtụ ndị si na-abata n’ọgbakọ, a malitere iwu alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ n’ebe ahụ. N’ọnwa Disemba afọ 1985, e nwere mgbakọ mba niile n’isi obodo a bụ́ Kinshasa. Puku mmadụ iri atọ na puku abụọ si ná mba dị iche iche bịa mgbakọ a n’ámá egwuregwu dị na Kinshasa. Ma, obere oge, ihe malitere dawara Ndịàma Jehova ájá ájá. Gịnị mere?

29 Otu nwanna aha ya bụ Marcel Filteau na-eje ozi na Zayee n’oge ahụ. Ọ kọrọ ihe merenụ. Ọ bụ onye ozi ala ọzọ. O si n’obodo Kwebek dị na Kanada. O so ná Ndịàmà Jehova onye ọchịchị aha ya bụ Duplessis mekpọrọ ọnụ na Kanada. Nwanna a kọrọ, sị: “N’abalị iri na abụọ n’ọnwa Mach afọ 1986, gọọmenti nyere ụmụnna na-ahazi ọrụ anyị na Zayee akwụkwọ e ji machie Ndịàmà Jehova ikpe okpukpe ha n’obodo a.” Ọ bụ Mobutu Sese Seko, bụ́ onyeisi ala obodo ahụ, bịanyere aka na ya.

30. Olee ihe Kọmitii Alaka nọ na-eche ma hà ga-eme? Oleekwa ihe ha mechara mee?

30 N’ụbọchị na-eso ya, a mara ọkwa n’ụlọ ọrụ redio mba Zayee, sị: “Si ugbu a gawa, a gaghị anụkwa mkpatụ Ndịàmà Jehova ọzọ na [Zayee].” A malitere ozugbo imekpọ ụmụnna anyị ọnụ. A kụkpọrọ Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche iche, zuo ụfọdụ ụmụnna anyị ohi, kpọchie ụfọdụ, tụọ ụfọdụ mkpọrọ, kụọkwa ụfọdụ isi aba okpu. A tụdịrị ụfọdụ ụmụaka Ndịàmà Jehova mkpọrọ.  N’abalị iri na abụọ n’ọnwa Ọktoba afọ 1988, gọọmenti weghaara alaka ụlọ ọrụ anyị, ndị agha ha ebichiekwa ebe ahụ. Ụmụnna anyị degaara onyeisi ala akwụkwọ ka o mee ka a kwụsị ihe a ha na-eme anyị, ma ọ zaghị ha ihe ọ bụla. Ka ihe ndị a nọ na-eme, Kọmitii Alaka nọ na-eche ma hà ga-ewepụ okwu a n’Ụlọikpe Kasị Elu ma ọ̀ bụkwanụ cheretụ. Nwanna Timothy Holmes nọ oge ihe ndị a nọ na-eme. Ọ bụ onye ozi ala ọzọ nakwa onye na-ahaziri Kọmitii Alaka ọrụ n’oge ahụ. Ọ sịrị: “Anyị rịọrọ Jehova ka o nye anyị amamihe, nakwa ka o nyere anyị aka ịmata ihe anyị ga-eme.” Mgbe Kọmitii Alaka zukọrọ leba okwu a anya, ha kpebiri na ha ga-ahapụtụgodị iwepụ okwu a n’ụlọikpe. Ihe bụ mkpa ha ugbu a bụzi inyere ụmụnna anyị n’obodo ahụ aka, nakwa ichepụta otú ka mma ụmụnna ga-esizi na-ezi ozi ọma.

“N’oge ahụ okwu anyị nọ n’ụlọikpe, anyị hụrụ aka Jehova n’ihe niile merenụ”

31, 32. Olee ihe Ụlọikpe Kasị Elu na Zayee kpebiri n’okwu anyị na gọọmenti obodo ahụ? Oleekwa uru ọ baara ụmụnna anyị?

31 Mgbe ọtụtụ afọ gachara, a kwụsịtụrụ imekpọ ụmụnna anyị ọnụ, gọọmenti malitekwara ikwe ka ụmụ amaala ya na-enweta ihe ndị ruuru ha. Ọ bụzi mgbe ahụ ka Kọmitii Alaka kpebiri na ha ga-agba akwụkwọ n’Ụlọikpe Kasị Elu, ka ha mee ka e wepụ iwu ahụ a machiri anyị. Ụlọikpe a kwetakwara itinye okwu a ọnụ. Ọ fọrọ obere ka o ruo afọ asaa onyeisi ala machiri okpukpe anyị n’obodo ahụ. Ma, n’abalị asatọ n’ọnwa Jenụwarị afọ 1993, Ụlọikpe ahụ kpelaara anyị ikpe, sị na iwu ahụ gọọmenti machiri anyị adịghị mma. N’ihi ya, a kagburu iwu ahụ gọọmenti machiri anyị. Ị̀ ma na ikpe a ndị ọkàikpe kpebiri otú a nwere ike ịta isi ha n’ihi na ọ pụtara na ha akagbuola iwu onyeisi ala nyere? Nwanna Holmes sịrị: “N’oge ahụ okwu anyị nọ n’ụlọikpe, anyị hụrụ aka Jehova n’ihe niile merenụ.” (Dan. 2:21) Mmeri a mere ka okwukwe ụmụnna anyị sikwuo ike. O doro ụmụnna ndị ahụ anya na Eze anyị bụ́ Jizọs mere ka ha mara mgbe ha kwesịrị ime ihe n’okwu ahụ nakwa otú ha ga-esi eme ya.

Ebe ụmụnna anyị nọ na Kongo na-aṅụrị ọṅụ mgbe e wepụrụ iwu a machiri ha ife Jehova

 32 Mgbe e wepụrụ iwu ahụ a machiri anyị, gọọmenti kwere ka alaka ụlọ ọrụ kpọta ndị ozi ala ọzọ, kwekwa ka anyị rụọ alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ, nakwa ka anyị na-ebubata akwụkwọ anyị. * Obi dị anyị niile ụtọ ịnụ akụkọ ọma ndị a na-egosi otú Jehova si na-eme ka a ghara ịkwụsị ndị ya ife ya.—Aịza. 52:10.

“Jehova Bụ Onye Na-enyere M Aka”

33. Gịnị ka anyị na-amụta n’ikpe ole na ole ndị anyị kwuru okwu ha n’isiokwu a?

33 Otú e si kpebie ikpe ụfọdụ anyị nwere n’ụlọikpe n’oge gara aga na-egosi anyị na Jizọs na-emezu nkwa a o kwere anyị: “M ga-eme ka unu nwee ọnụ na amamihe, nke ndị niile na-emegide unu na-agaghị enwe ike iguzogide ma ọ bụ ịgbagha.” (Gụọ Luk 21:12-15.) Ihe ndị a na-emenụ na-egosi na mgbe ụfọdụ, Jehova na-eji ụfọdụ ndị na-anaghị efe ya enyere ndị ya aka n’oge a, otú ahụ o ji Gameliel nyere ndịozi Jizọs aka. Jehova e meekwala ka ụfọdụ ndị ọkàikpe na ndị ọkàiwu kata obi kpee ikpe ziri ezi. O meekwala ka ngwá ọgụ ndị iro anyị chọrọ iji alụso anyị ọgụ ghara ịrụ ọrụ. (Gụọ Aịzaya 54:17.) Nsogbu ndị iro anyị na-enye anyị enweghị ike ime ka anyị kwụsị ịrụrụ Chineke ọrụ.

34. Gịnị mere ikpe ndị ahụ anyị meriri na ha ji bụrụ nnukwu ihe? Oleekwa ihe ha na-egosi? (Gụọkwa ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ “ Ikpe Ndị Mere Ka Anyị Kwusasiwe Ozi Ọma Ike.”)

34 Gịnị mere ikpe ndị ahụ anyị meriri na ha ji bụrụ nnukwu ihe? Ọ bụ n’ihi na Ndịàmà Jehova abụghị ndị ọnụ na-eru n’okwu na gọọmenti. Anyị anaghị eme ntụli aka, anyị anaghị achụ nta vootu, anyị anaghịkwa azụrụ ụtọ ndị ọchịchị. Ihe ọzọkwa bụ na a na-ele ọtụtụ n’ime anyị a na-akpụpụ n’ụlọikpe anya ka “ndị na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị.” (Ọrụ 4:13) E lee ihe anya otú mmadụ si ele ihe anya, o nweghị onye nwere ike ikweta n’ụwa a na anyị na ndị ụkọchukwu na ndị ọchịchị a na-atụ ụjọ nwee ikpe, na ndị ọkàikpe ga-ekpelara anyị ikpe. Ma, ha ekpelaarala anyị ikpe ọtụtụ ugboro. Nke a na-egosi na anyị na-eje ije “n’ihu Chineke, ná mmekọrịta anyị na Kraịst.” (2 Kọr. 2:17) Ọ bụ ya mere anyị ji ekwu ihe Pọl onyeozi kwuru. Ọ sịrị: “Jehova bụ onye na-enyere m aka; agaghị m atụ egwu.”—Hib. 13:6.

^ para. 9 Ikpe a Nwanna Cantwell na Steeti Kọnektikọt kpere n’Ụlọikpe Kasị Elu n’Amerịka bụ nke mbụ n’ime ikpe iri anọ na atọ Nwanna Hayden Covington kpechitere ọnụ ụmụnna anyị n’ụlọikpe a. Nwanna a nwụrụ n’afọ 1978. Aha nwunye ya bụ Dorothy. O ji obi ya niile jeere Jehova ozi ruo mgbe ọ nwụrụ n’afọ 2015. Ọ gbara afọ 92.

^ para. 12 Ọ bụ n’ihi iwu e tiri n’afọ 1606 mere e ji bo ha ebubo ahụ. Iwu ahụ kwuru na onye ọkàikpe nwere ike ịma mmadụ ikpe ma ọ bụrụ na o chere na ihe onye ahụ kwuru kpatara ọgba aghara, ọ bụrụgodị na ihe onye ahụ kwuru bụ eziokwu.

^ para. 14 Ndị ozi oge niile e nwere n’afọ 1950 na Kwebek dị otu narị na iri isii na anọ. Iri isii na atọ n’ime ha bụ ndị gụchara akwụkwọ na Gilied. Ha ji obi ha niile kweta ije ozi na Kwebek n’agbanyeghị na a ga-emekpọ ha ọnụ.

^ para. 15 Nwanna W. Glen How bụ ọkàiwu ọnụ kara. E nwere ọtụtụ narị ikpe o kpechiteere Ndịàmà Jehova nọ na Kanada na ndị nke nọ ná mba ọzọ malite n’afọ 1943 ruo afọ 2003.

^ para. 16 Ị chọọ ịmatakwu otú ikpe a si gaa, gụọ ihe e dere n’isiokwu bụ́ “Ọ Bụghị Unu Nwe Agha nke A, Kama Ọ Bụ Chineke.” Ọ dị na Teta! May 8, 2000, peeji nke 18 ruo na nke 24.

^ para. 32 Ndị agha ahụ bi n’alaka ụlọ ọrụ anyị mechara kwapụ. Ma, anyị rụrụ alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ n’ebe ọzọ.